Ụlọikpe amaala Donald Trump ikpe n'ebubo 34 niile e boro ya maka ime mpụ
Akụkọ dị mkpa na Naijiria na mbaụwa n'ọnwa Mee, afọ 2024.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Uche Akolisa, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu
Nwaeze Harry, Meghan nwunye ya awụchiela na Naijiria
Nkọwa foto, Nwaeze Harry na nwunye ya bụ Meghan oge ha wuchiri n'Abuja
'Duke' na 'Duchess' nke Sussex bụ Nwaeze Harry na nwunye ya bụ Meghan awuchiela na Naijiria
Ha rutere isi ụlọọrụ nchekwa ndịagha Naijiria dị n' Abuja n'ehihe Tọzde.
Ndịisi agha kwuru na ọbịbịa ha metụtara ndịagha merụrụ ahụ na ndị ezinaụlọ ha.
Ọbịbịa ha Naịjirịa sochiri ọkpụkpọ oku nke ndị isi agha kpọrọ ha banyere nsonye Naịjirịa n’egwuregwu ‘Invictus Games’ afọ 2023, nke e mere na Düsseldorf, Germany.
Egwuregwu ‘Invictus Games’ bụ nke Prince Harry bidoro n’afọ 2014 maka ịkwado ndịagha merụrụ ahụ iji nye ha ọgwụgwọ.
Akụkọ sitere n’isiụlọọrụ nchekwa nke Air Vice Marshal Abidemi Marquis binyere aka na ya kwuru na pasentị 80 ndịagha Naịjiria bụ ndị nwere ihe mmeru ahụ dị iche iche ma na-anara ọgwụgwọ.
A na-atụ anya na ọbịbịa Prince Harry ga-enyere aka guzobe ogige ‘Egwuregwu Invictus Games’ n’Abuja ma nwere maka ịghazi egwuregwu ‘Invictus Games’ na Naịjirịa n’oge na-adighị anya.
Tijani Babangida anwụghị n'ihe mberede okporoụzọ
Ebe foto si, Tijani Babangida/Instagram
Dịka akụkọ na-efegharị na onye gbabuuru Super Eagle bọọlụ bụ Tijani Babangida, anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ, nchọpụta anyị gosiri na ọ dị ndụ.
Tijani Babangida, nwunye ya, na nwanne ya nwoke nọ n'ụgbọala nwere ihe mberede ụbọchị Tọzdee abalị Itoolu nke ọnwa Mee, afọ 2024 n'okporo ụzọ awara awara si Kaduna gawa Zaria.
Ya na nwunye ya pụtara na ndụ , e buga ha ụlọọgwụ akpọghị aha ya maka nletaebe nwanne ya nwoke nke ọ tọrọ bụ Ibrahim Babangida nwụrụ n'ihe mberede ahụ.
Akụkọ na-efegharị na soshal midia kwuru na Tijani Babangida so ndị ogbo dịka Kanu Nwakwo, Daniel Amokachi dịka 'Dream Team gbara Naijiria bọọlụ n'asọmpi Olipik nke afọ 1996 , danyere n'ihe mberede okporoụzọ tara isi ya Mana ozi nke bụ eziokwu bụ na nwamadi ahụ na,nwunye napụtara isi ha, ebe nwa nne ya nwoke bụ Ibram Babagida nwụrụ.
Mịnịsta na-ahụ maka egwuregwu bụ Sịnetọ John Owan Enoh kasiri ezinaụlọ Tijjani Babangida obi maka ihe mberede ahụ mere.
N'ozi nke ọnụ na-ekwuru minịsta ahụ Diana-Mary Nsan binyere aka ma wepụta ụbọchị Friade, Sinetọ John Owan Enoh gara n'ihu kpọkuo ọha na eze ka ha kwado ma tinye ezinaụlọ Tijani Babangida n'ekpere n'oge ihe iri uju a.
Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Tijani Babangida
Tijjani Babangida, onye nwetara ihe nrite ọla edo 'Gold' n'asọmpi Olympic nke Atlanta 1996 ma bụrụ onyeisi otu ndị ọkachamara n'egwuregwu bọọlụ na Naijiria (PFAN.)
Ndị ya na ya gbara otu egwuregwu Super Eagles gụnyere Sunday Oliseh, Finidi George, Taribo West, Emmanuel Amunike, Uche Okechukwu, Victor Ikpeba, Kanu Nwankwo, Daniel Amokachi , Jay-Jay Okocha, Celestine Babayaro, Garba Lawal na ndị ọzọ
Lee ihe ị kwesịrị ịma maka Tijani Babangida A mụrụ ya na Kaduna n'abalị 25 ọnwa Septemba afọ 1973. Mgbe ọ gbara afọ 17, Tijani binyere aka maa gbarụ otu egwuregwu bọọlụ Roda JC nke dị na obodo Netherlands.
Ọ gara n'ihu gbara otu egwuregwu bọọlụ Ajax bọọlụ bido n'afọ 1996. O nyere ọtụtụ goolu dị mkpa ma nyere aka kwalite otu egwuregwu Ajax n'asọmpi Champions League.
Otu egwuregwu Tijani Babangida gbara bọọlụ gụnyere Gençlerbirligi dị na Turkey, Vitesse dị na Netherlands, Al-Ittihad nke Saudi Arabia, Tianjin Teda na kwa Changchun Yatai dị na China gụnyere FC Barcelona dị na Spain. Ọ gbara otu egwuregwu Super Eagles Naịjirịa bọọlụ ma soro n'otu Super Eagles mmeri n'asọmpi Olympic afọ 1996.
Ọ gbara Naịjirịa bọọlụ n'asọmpi mba ụwa nke afọ 1998 na kwa nkwado n'asọmpi mba ụwa afọ 2002. Tijani Babangida gbara Super Eagles bọọlụ ugboro 36 ma nye goolu ise.
Daniel Ojukwu: Ndi ntaakụko emeela ngaghariiwe maka nnwụchi ogbo ha, Ndị ọrụ
Ndị ntaakụkọ wụchiri n'isiụlọọrụ ndị uweojii Naijiria taa bụ Tọzde, mee ngagharịiwe maka nnwụchi onye otu ha.
A nwụchiri Daniel Ojukwu na-arụrụ ụlọọrụ 'Foundation for Investigative Journalism' na Legos n'abalị mbụ nke nwa Mee afo 2024 maka ebubo imegide iwu metutara mpụ intanet nke afọ 2015 a kpọrọ '2015 Cybercrime Act" na Bekee ma buga ya Abuja.
Dịka na-agwa ndị ntaakụkọ ahụ na-eme ngagharịiwe okwu, Komishọna ndi uweojii Abuja bụ Bennett Igwe, kwuru na ga-elebara okwu ahụ anya ma hụ na e mere ihe kwesiri
Anyị agaghị enyezi Israel ngwagha ma ha gaa n’ịrụ wakpoo Rafah – Biden, Ọ dị na mkpa, anyị ga-eji mbọ aka anyị lụọ ọgụ - Netanyahu
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Benjamin Netanyahu
Joe Biden adọọla Israel aka na ntị maka ịwakpọ Rafah.
Onyeisiala mba Amerịka, Joe Biden, adọọla ndị Izrel aka na ntị maka ịwakpọ Rafah dị na Gaza.
Biden kwuru nke a na oge ọ na-asa ndị ntaakụkọ ajụjụ.
N' okwu ya, “Ọ bụrụ na ha gaa n’ịrụ wakpọọ Rafah, aga m akwụsị ịzịgara ha ogbunigwe na ngwaagha ndị ọzọ”.
Joe Biden gara n’ịiu kwuosị, “Anyị ga na-agba mbọ ime ka ezi nchekwa dị na Izrel.”
Na-agbanyeghị ihe Amerịka na ekwu, ndị Izrel na-aga n’ihu na-atụ ogbunigwe na Rafah.
Ihe ndị Israel kwuru maka ya
Onyennochite-anya ndị Izrel n'otu United nations bụ Gilad Erdan kwuru na ihe Joe Biden kwuru bụ ihe mgbawa obi dịalụ ndị Israel.
“Ọ bụrụ na ịkwụsị ndị Izrel ịbanye ebe dị mkpa dịka Rafah bụ ịsị ebe ndị ịsị Hamas, ndị na enyi ọha egwu na ndị ntọrị jị mere ọnọdụ, keduzi ka Israel ga esi mezuo ebumnaobi ha”.
Ihe Praịm Minister Israel Netanyahu kwuru
Praịm Mịnịsta Israel bụ Benjamin Netanyahu kwuru na ọ bụrụ na ụwa nile ga agbahapụ Israel, ha naanị ga akwụdọsị-ike ma merie ndị ịrọ ha.
Netanyahu kwuru nke a na ozi ọ zịpụrụ na sọshal mịdịa X, ebe ọ nọ hetere ndị Israel ọnọdụ ha nọ na afọ ịrị asaa na ịsịi garaaga.
N'okwu ya nke ọ deputara na Hebrew “Taa bụ ncheta nwere onwe anyị na afọ ịrị asaa na ịsịi gaara aga, anyị ndị mpụrụ mmadụ ole ma ole na oge ahụ nwere na ebuso ọtụtụ ndị mmadụ agha”.
“Anyị enweghi ngwa agha, amachiri ibunye ndị Izrel ngwa agha, mana anyị jị akọnauche anyị, na mmụọ iwe mmeri nwere nweta mmeri”
“Taa anyị sịrị ike. Anyi nwere mkpebi ma jịkọ aka ọnụ kwadọo imeri ndị ịrọ anyị na ndị chọrọ ịmekpa anyị ahu”.
“Ọ bụrụ na ọ pụtara na ụgbụa na ọ bụ naanị anyị ga akwụrụ, anyị ga akwụsị ike”.
“E kwuola m ya na mbụ, ọ dị na mkpa, anyị ga eji mbọ aka anyị nọọ agha”.
“Mana anyị nwere ihe karịrị mbọ aka, akọ tọrọatọ na enyemaka Chukwu. Anyị ga ejiko aka ọnụ ma nweta mmeri”
Cheta etu ọgụ Israel Gaza sị bịdọ
Na ụbọchị nke asaa na ọnwa ọktọba 2023 ka ndị Israel bịdọro agha na Gaza.
Agha ahụ bịdọrọ ka ndị Hamas nwakpochara Israel nwere gbuo mmadụ rụrụ 1200 ma tọorọ mmadụ rụrụ 252.
Dịka ụlọ ọrụ na ahụ maka ahụike ndị Hamas sị kwụọ, mmadụ rurụ 34,780 bụ ndi Palestine anwụọla kengbe Israel bịdọrọ ịwakpọ Gaza ma bụsọ ndị Hamas agha.
Ụlọomeiwu Naịjirịa akwadoola ikpe ọnwụ maka ndị na-ere ọgwụike
Ebe foto si, Nigerian Senate/Facebook
Ụlọomeiwu
Naịjirịa akwadoola ikpe ọnwụ maka ndị na-ebugharị ọgwụ ike.
Ọnọdụ a
na-abịa dịka atụmatụ iwu e ji emegharị iwu ụlọorụ National Drug Law Enforcement
Agency bụ ‘2024 NDLEA Act (Amendment) Bill’
gafere ngụpụta nke ugboro atọ ya n’ụlọomeiwu ahụ.
A nabatara
atụmatụ ahụ n’ụbọchị Tọzde n’oge ụlọomeiwu tụlechara mpaghara niile nke ihe
ndekọ sitere n’aka onyeisioche ụlọomeiwu na-ahụ maka ikpe nkwụmọọtọ, ugwu nke
mmadụ, okwu ikpe na ọgwụike bụ Sịnetọ Tahir Munguno.
Dịka a
na-atụlegharị mpaghara dị iche iche nke mejupụtara atụmatụ iwu ahụ iji mee ka ọrụ
NDLEA sikwuo ike, onye na-ahụ maka ime ihe n’ezi usoro n’ụlọomeiwu ahụ bụ Sịnetọ
Peter Nwebonyi tụrụ aro ka agbanwee ntaramaahụhụ ndị na-ebugharị ọgwụike site
na mkpọrọ ọka banye n’ikpe ọnwụ.
N’oge e
tinyere ya na ‘ndị kwe na ndị ekweghị’, osote onyeisioche ụlọomeiwu gbulaara ndị
kwere dịka nke ahụ butere mkpọtụ site n’aka ndị omeiwu nke ahụ na-amasịghị.
Ụlọikpe ukwu gọọmenti etiti dị n'Abuja enyela onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka ụgbọelu Hadi Sirika, nwa ya nwaanyị na mmadụ abụọ ọzọ ohere isi n'ulo na-abịa ike ma kwụọ nde narị (₦100m) iche iche.
A na-ekpe ha ikpe maka ebubo nrụrụaka n'ego ruru ijeri ₦2.7bn.
Dịka ụlọikpe siri kwuo, ha ga-ewepụtakwa mmadụ abụọ ga-akwụdoro ha ga-abụ ndị nwere ala n'Abuja bụrụkwa ndfị ọrụ na-eru n'okwu.
Ndị akaebe ga-etinye akwụkwọ nkwupụta ego.
Ụlọikpe a machibidokwara ndị a na-ebo ebubo ịga mba ọzọ na-enwetaghị ikike ụlọikpe ahụ.
Ọkaikpe nọ n'isi okwu ahụ bụ Orji nyere iwu ka a kpọchie ndị a na-ebo ebubo n'ulomkpọrọ ma ọ bụrụ na ha enwetaghị ndị akaebe ahụ.
Ọ gara n'ihu hinye ikpe \ahụ ka ọ malite n'abalị 10, 12 na 20 nke ọnwa Juun afọ 2024.
Etu e si zọpụta nwoke tọrọ n'okpuru ụlọ dara ada
Ebe foto si, Safers' family
Ezinaụlọ nwoke a zọpụtara n'okpuru ụlọ dara na South Africa nwere ihe ońu
Otu dị na nwunye ekwupụtala ihe onụ́ ha nye BBC dịka a zọpụtara nwa ha nwoke n'okpuru ụlọ ahụ dara na mpaghara George dị na South Afrịka.
Delvin Safers so ná mmadụ 29 azọpụtara dịka ndị ọrụ na-agba mbọ ịzọpụta mmadụ 39 a na-achọ achọ.
E buputala ozu mmadụ asaa nwụrụ anwụ.
Ihe Delvin gbara afọ 29 gabigara bụ nke kpaliri mmụọ ndị South Afrịka dịka ọ zigara nne ya, nna ya na enyi ya nwaanyị ozi iji kwa ha ya nwere ọ ma apụta.
Nna ya bụ Dion Safers gwara BBC na egwu tụrụ ya ru mgbe akpọrọ ya gwa ya na ahụla Delvin
Nne ya kwuru na mgbe Delvin nọ na okpuru ụlọ ahụ dara ada, ha zigara ya foto nwaanyị nwoke gbara afọ abụọ iji nye ya olileanya.
N'otu ozi Delvin zigara enyi ya nwaanyị bụ Nicole, o kwuru, 'Ịhụnanya m, batri ekwentị m nọ pasentị ise, o nwere ike igbanyụ, ọ bụ ya mere m ji e zitere gị ozi a"
Ụlọ ahụ dị stori ise dara mgbe ndị ọrụ ka na-arụ ya na mpaghara amara dịka ebe ndị nnegharị anya dị n'ogige Garden Route dị na ọdịda anyanwụ Cape province.
N'ime mmadụ 29 ahụ a zọpụtara, mmadụ isii nwere ihe mmerụ ahụ nnukwu ebe mmadụ 16 ndị ọzọ nọ n'ụlọ ọgwụ.
Delvin merụrụ ahụ n'ihu ya.
Ndị ọrụ nnapụta ruru 200, gụnyere nkịta na-akpọ isi, na ọtụtụ akụrụngwa ndị ọzọ, kwuru na ọrụ nnapụta ahụ gbagojuruanya.
Ha kwuru na ha na-enwe ihe isi ike ibuli ọtụtụ urukpuru ụlọ ahụ.
E bidola ime nnyocha ihe kpatara ọdịda ụlọ ahụ.
Dion Safers kwuru na ya aghọtaghị ka ụlọ ọhụrụ ga-esi daa.
O gwa BBC na ndị aka dị na ya kwesịrị ntaramahụhụ.
Hadi Sirika: A kpụpụla onye bụbu Minista njem ụgbọelu ụlọikpe maka ebubo imefu N2.7Bn
Hadi Sirika bụbu Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu wụchiri n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja n'ụtụtụ taa bụ Tọzde maka ịzara ọnụ ya n'ebubo mefu ego ruru ijeri naira abụọ na ụma asaa(N2.7Billion)
Nke na-bịa dịka ụlọọrụ 'Economic and Financial Crimes Commission'(EFCC) wepụrụ okwu ahụ nke a naebo ya, nwa ya nwaanyị bụ Fatima na mmadụ abụọ ndị ọzọ ụlọikpe.
Sirika rụrụ ọrụ dịka Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu malite n'afọ 2019- rue afọ 2023. n'okpuru ọchịchị Onyeisial Muhammdu Buhari.
EFCC na-arụ Sirika aka inye nwa ya nwaanyị, ọgọ ya nwoke na ndịọzọ ọrụ ngo oge ọ nọ n'ọkwa.
Kenya ekwupụtala ụbọchị ezumiike iji cheta ndị idemmiri gburu
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ihe karịrị mmadụ narị abụọ anwụọla n’ihi oke idemmiri a na-ahụta gburugburu Kenya
Kenya ekwupụtala ụbọchị Fraịde 10 Mee 2024 dịka
ụbọchị ezumiike iji cheta ndị nwụrụ n’oke idemmiri mba ahụ na-agabiga ugbua ma
chetakwara ndị obodo ahụ mkpa ọ dị ịkụ osisi.
Ihe karịrị mmadụ narị abụọ anwụọla n’ihi oke
idemmiri a na-ahụta gburugburu Kenya dịka ọnọdụ ahụ metụtara ihe karịrị nde mmadụ
250.
Onyeisiala Kenya bụ William Ruto kwuru n’ụbọchị
Wenezde 8 Mee 2024 na ụbọchị ezumiike ahụ ga-enye ụmụafọ Kenya ohere ịkụ osisi
iji gbochie mmetụta ọjọọ nke mgbanwe ihu eluigwe bụ nke kpatara oke idemmiri ahụ.
Na mgbe gara aga, ọnụ na-ekwuru gọọmenti mba ahụ
bụ Isaac Mwaura kwuru na a ga-ama ọkwa pụrụ iche iji kwupụta Fraịde dịka ụbọchị
ịkụ osisi na mba Kenya ma kwuo na mịnịsta na-ahụ maka ogbe obibi ga-enye ntụziaka
banyere nke ahụ.
N’afọ gara aga, gọọmenti nyere ụmụafọ Kenya ụbọchị
ezumiike pụrụ iche nke mbụ ya iji kụọ osisi nde 100 dịka akụkụ atụmatụ ịkụ
osisi ijeri 15 n’ime afọ iri.
A chọrọ m ka anwụchie ndị gburu nwanne m
Ebe foto si, Supplied
Nwanne otu
n’ime ndị uweojii abụọ nwụrụ mgbe a wakporo ha n’ime ọhịa dị n’Uzo Uwani etipula
mkpu.
Anthony Ikowa
sonyere ndị uweojii n’afọ 2022 so na ndị nwụrụ mgbe ndi ekperima amabehi
wakporo ha n’Enugwu steeti n’ụbọchị Fraịde gara aga.
Jay Chudee
Jay bụ aha nwoke ahụ depụtara n’akara X ya sị “Naanị ụzọ anyị ga-enweta onwe
anyị bụ ma anwụchie ndị kpara mkpa mkpa a”.
Chudee
gwara BBC na nwanne ya na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ nwụrụ mgbe ha duru ndị ji ego
achụ ego banye n’ọhịa dị na obodo Igga ịleta ala dị ebe ahụ.
Ọ sịkwa na o
cheere na ọ bụ nsogbu oke ala bụ ihe butere ya bụ mwakpo.
Ọ sịkwa “ndị
uweojii na ezianụlọ anyị ka na-akpa maka ihe mere, ha sị anyị chere izuụka abụọ
tupu anyị abịa buru ozu Ikowa ma kwado akwamozu ya”.
Ihe ndị uweojii kwuru
Ndị uweojii ekwuola okwu banyere mwakpo ndị ekperima mere ndị uweojii na ndị nche n’Igga dị n’okpuruọchịchị Uzo Uwani nke Enugwu steeti.
Ha kwupụtara nke a n’ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe tinyere aka na ya n’ụbọchị Sọnde 5 Mee 2024.
Dịka ozi ahụ siri kwuo, ndị ekperima wakporo ndị uweojii atọ na ndị nche anọ dịka ha na-echekwa ndị ndị si Legọs bịa ịrụnye ụlọọrụ ha n’Igga ma gbuo ndị uweojii abụọ na ndị nche atọ.
Ka osiladị, ndị uweojii wụchiri n’ogbe ahụ ma napụta otu onye uweojii, otu onye nche na mmadụ atọ ndị ahụ bịara ịrụnye ụlọọrụ ha.
Ozi ahụ gara n’ihu kwuo na ndị uweojii malitere nnyocha na-egbughị oge bụ nke mere e ji nwuchie ụmụnwoke atọ a na-enyo enyo aka ha dị na mwakpo ahụ.
Site na nkwupụta ha mere, a chọtara ozu ndị uweojii na ndị nche ahụ e gburu egbu ma bugaa ha n’ụlọnchekwaozu maka ime nnyocha.
Lee etu ị ga-esi mara onye bara otu nzuzo
Ndị uweojiiAnambra steeti na otu
ha hiwereịjị gbasaaọzị megịde ịbanye otu nzuzo a kpọrọ POCACOV depụtara ihe dị icheiche ị nwere ike ịjị mara oge nwatakịrị banyere n’otu nzuzo.
·Ilee
anya ka nwatakịrị si akpa agwa: ọ bụrụ na nwatakịrị bụ onye na-ekwuokwu ọfụma bịdọ na-emechi ọnụ, kwụsị ikwu okwumaọbụ onye na-akpa aghara bido na-anọ nwayọọ nke a bụ
otu njirimara ma bụ ihe na-arụtụ aka na nsogbụ dị.
·Nwata
na-ajụ ajụjụ gbasara otu nzuzo: ọ
bụrụ na nwatakịrị bido na-ajụ ajụjụ gbasara otu nzuzo, maọbụ na-akpa nkata gbasara otu dị icheiche, nke a na-arụ aka na nsọgbụ dị.
·Ka
nwatakịrị sị eme na ọ hụ ngwaagha: ọ bụrụ na nwatakịrị na-atụ nnukwu ụjụ ma ọ bụ nwee nnukwu mmasị iweta ngwaagha nke ya, nke a bụ ịhe nrụtụaka.
·Ka
nwata si eme ndị mejọrọ ya: ọ bụrụ na nwata bịdo na-an̄ụ iyi na ya ga-emegwara ndị mejọrọ ya, mara na nke a nwereike iduba ya n’otu nzuzo.
·Mmaya
na ọgwụike: nwata nọkata malịta n’ike bịdọ na-anụ ọgwụike na oke mmanya mara na ọ bụ otu
ihe na-egosiputa agwa ndị otu nzuzo.
·Ịgbapụ
n’ụlọ: Ọ bụrụ na nwata bịdọ na-agbapụ n’ụlọ ma nọọ ebe nne na nna ya amaghị abalị ole ma ole, mara na nke a sọ n’ihe njirimara ndị otu nzuzo.
·Akwa ọ na-ahụ n’anya: lee anya mara na oge o bịdọrọ na-ahụ otu akwa n’anya sịte n’akwa ọ na enyị, ịhe ngbanaaka na ịhe ndị ọzọ, mara na nke a sọ.
·Ka ya
na ndị enyi ya sị ekwe n’aka: ndị otu nzuzu niile nwere etu ha sị ekwe n’aka. Tinye anya mara oge nwa gị bịdọrọ na-ekwe n’aka n’ụzọ na-edoghị gị anya.
·Ihe ọ
na achọ na ịntanet: Ọ bụrụ na nwatakịrị bịdọ na-achọ etu esi emerụ mmadụ ahụ na ịntanet nakwa soshal midịa mara na nsọgbụ dị.
Ihe ọnụ na ekwuru
ndi Uweoji n’Anambra steeti kwuru
Ọnụ na ekwuru ndị
uweoji bụ Tochukwu Ikenga bụ onye zịpụrụ ụsọrọ e jị amara ndị nọ otu nzuzo dịka
POCACOV sịrị deputa kwuru na ọ dị mma ka ezinaụlọ gbadọ anya ma hara ilepu anya ka ụmụ ha sị akpa agwa, ọkachasị ihe
mgbanwe na ndụ ụmụ ha.
Tochukwu kwụpụtara
ihe mere ndị mmadụ jị abanye otu nzuzo dịka oke ịchụ ego, ndị enyi na eduhie enyi ha ụzọ na ịhe
ndị ọzọ.
N’ọkwụ ya “ụmụaka ike ụwa gwụgọrọ na ndị ịwe na-ewe maka na ezinaụlọ ha eletaghị ha anya ma meere ha ihe ha chọrọ nwereike ịba otu nzuzo ka ha were ya bọọọbọ ma mekpaa ndị obodo ahụ”.
Ọ gara n’ịhụ kwụọ
na ka nne na nna mmadụ sị akpa agwa nwereike ịme ka nwatakịrị banye n’otu nzuzo na ọ bụrụ na onwere onye nọ n’ụdụrị ajọ otu ahụ n’ezinaụlọ ya.
Ndịagha egbuola ọchịagha IPOB/ESN n’Imo steeti
Ebe foto si, Nigerian Army/X
Ndịagha Naịjirịa
nọ n’ọrụ a kpọrọ ‘Udo Ka’ ekposaala ndị omekoome na mpaghara Udda, Ihitteukwa
na Orsumoghu dị n’okpuruọchịchị Orsu nke Imo steeti.
Isi ụlọorụ
ndịagha Naịjirịa kwupụtara nke a n’ụbọchị Tuzde 7 Mee 2024 n’ozi ha wepụtaara ọhanaeze
n’akara ọbaozi X ha.
Ozi ahụ
kwuru na ndị omekoome tụrụ ndịagha ogbuniigwe iji chụghachi ha azụ mana ndịagha
guzosiri ike ma gbuo anọ n’ime ha ebe ndị nke ọzọ buuru apa mgbọ gbafuo.
Dịka ozi ahụ
siri kwuo, e gburu otu n’ime ndị ọchịagha IPOB/ESN na-elekọta mpaghara
Ihitteukwa bụ Tochukwu e ji ‘Ojoto’ mara, na-agbanyeghị ọtụmọkpọ niile o
tinyere n’ahụ.
Ebe foto si, Nigerian Army/X
Ndịagha sịrị
na ngwongwo ebupụtara n’ogbe ndị omekoome ahụ gụnyere otu egbe AK-47 nwere
eriri mgbọ abụọ, egbe pump action abụọ, igwe redio atọ, otu igwe kọmputa laptop,
otu ekwentị, igodo ụgbọala, otu ihe dịka ọgwụike Marijuana, akwụkwọ ego Biafra,
mgbọ ogbuniigwe ise, ngwa ndị e ji emepụta mgbọ ogbuniigwe, ọtụmọọkpọ dị iche
iche na ihe ndị ọzọ.
Ọchịagha
na-ahụ maka Udo Ka bụ Maj. Gen. Hassan Dada gwara ọhanaeze na ndị otu ya
na-agbasi mbọ ike iji hụ na ekpochapụrụ ndị omekoome ma weghachi udo na
mpaghara ahụ.
Ebe foto si, Nigerian Army/X
CBN agwala ndị nwere POS ka ha debanye aha ụlọahịa ha n'aka CAC tupu July 7
Ebe foto si, Getty Images
Ụlọakụ
etiti Naịjirịa bụ Central bank of Nigeria (CBN) agwala ndị nwere igwe ndọrọego ‘Point
of Sales’ a maara nke ọma dịka POS ka ha debanye aha ụlọahịa ha n’aka ụlọọrụ Corporate
Affairs Commission (CAC) tupu abalị 7 nke ọnwa Julaị 2024.
E kpuhere
nke a n’ụbọchị Tuzde 7 Mee 2024 n’oge ndị ọkachamara na ngalaba nchekwa ego na
nnukwu onyeisi ụlọọrụ Corporate Affairs Commission bụ Hussaini Magaji nwere
nzukọ n’Abuja.
Magaji
kwuru na ọnwa abụọ e nyere ndị nwere igwe POS iji debanye aha ụlọahịa ha n’aka ụlọọrụ
CAC bụ nke dabara na ntụziaka ụlọakụ CBN nyere.
Dịka o siri
kwuo, atụmatụ ahụ bụ iji hụ na e chekwara azụmaahịa ndị mmadụ ma mee ka ọnọdụ
akụnaụba Naịjirịa gbasikwuo ike.
Ụlọ dara ada egbuola ihe ruru mmadụ ise
Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọrụ gbatagbata na Saụt Afrịka ebidola ịchọ ndị dị ndụ n'ụlọelu a ka na-arụ ọhụrụ dakwasịrị mmadụ 50.
Ndị Gọmentị na mpaghara George, na ọdịda anyanwụ nke Cape Town kwuru na a zọpụtara mmadụ 24 bụ ndị ụlọelu ahụ dakwasịrị ma buga ha ụlọọgwụ.
Mmadụ 75 bụ ndị nọ na ọrụ oge ụlọelu ahụ dara n’ehihe, ụbọchị Monde.
A na enyocha ịhe kpatara ụlọ ahụ jịrị daa.
Mmadụ 25 bụ ndị a vọpụtara ozu ha nwuru maka mmeru ahụ ha nwetere.
Mana ndị gọmentị kwuru na ha na ndị ka tọrọ n’okpuru bụ ndị ụlọ ahụ dakwasịrị na enwe mkpakọrịta
Onyeisi Oọchịchị na Gorge bu Ald Van Wyk tịrị ezinaụlọ bụ ọ metutara.
Theresa Jeyi gwara ndị Reuters “A hụrụ m ndị na arụ ọrụ, ihe ọzọ m nụrụ bụ bọọm; ejim anya m abụọ nwere hụ ụlọ ahụ ọ daa”
Dịka ihe si kwụrụ ugbua, ndị ọrụ gbatagbata nọ ebe ahụ ji aka ewepu nkume dị cha ebe ahụ iji chọta ndị nọ n'okpuru.
Nke mere ugbua: Hamas ekwetala ka e nwee nkwụsịtụ agha
Ebe foto si, Getty Images
Ndị ndu otu agha nnupuisi Hamas ekwetala ọnọdụ e nyere ha maka nkwụsị agha Izrel na-ebu na Gaza.
N'ozi nke otu ahụ wepụtara, ha kwuru na ha enyela ndị Qatar and Egypt nso ekpe ikpe udo.
E kwubeghị kpọmkwem etu ya bụ ihe ga-esi gaa gụnyere oge ọ ga ewe nakwa ihe a ga-eme maka ndị e ji eji na Gaza.
A wakpoola ma gbuo eze ọdinala n'Ebonyi steeti
Ndị uweojii n'Ebonyi steeti ekwụola na ndị omekome a na-amabeghị gburu otu Eze obodo na ngwụcha izu ụka.
Ndị a na-enyo enyo wakporo obodo Umuihe, Akaeze nke dị n'Okpuru Ọchịchị Ivo n' Ebonyi steeti, gbuo Igwe obodo ahụ bụ Eze Umazi Ibo Ubani.
Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze ndị uweojii na steeti ahụ bụ Joshua Ukandu kwuru na e gburu Igwe ahụ na ngwụcha izu ụka gara aga.
O mere ka a mata na e bidola ime nnyocha iji chọpụta ndị kpara arụ ahụ.
Dika ozi si kwuo,
Onye nhazi ụlọọrụ 'Akaeze Development Centre', Chinasa Okorie, katọrọ ogbugbu e gburu Igwe ahụ ọ kọwara dịka ezigbo Igwe hụrụ onye ọbụla n'anya.
Ndị keke emeela ngagharịiwe n'Abia steeti
Ndị na-akwọ 'keke' emee ngagharịiwe n'ogige 'Isi Gate' dị n'Umuahia isi obodo Abia Steeti ụbọchị Monde.
Ndị na-akwọ ụgbọ anyịnya Keke ahụ mere ngaghar iwe ahụ gbochiri okporo ụzọ ahụ, gbochie ụgbọ Keke ọbụla ịgba na steeti ahụ belụsọ na gọvanọ, Alex Otti bịara gwa ha okwu.
Nke a mere ka ndị mmadụ jiri ụkwụ gaa ebe ha na-aga.
Mpaghara Isi Gate, bụ ebe Keke na-ejupụta mana ka ọ dị ugbu a, ebe ahụ tọgbọrọ chakoo.
Ndị a gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ha na-eme ngagharị iwe a maka mbụgo ebugoro ego tiketi ha na-akwụ kwa ụbọchị bụbu 350 naịra nke bụzi 1,950 naịra kwa izu.
O kwuru na ha achọghị iwu ọhụrụ a, na ọ kara ha mma ị na-akwụ ụgwọ tiketi kwa ụbọchị karịa ịnakọta ya kwa izu.
Dịka otu onye ọzọ a gbara ajụjụ ọnụ bụ Nwaada Ihuoma Chika sịrị kwu, "Iwu ọhụrụ a bụ nke ga-emetuta ndị ọkwọụgbọ anyịnya Keke n'obodo a n'ụzọ na-adịghị mma, n'ihi na ụfọdụ ndị otu ha anaghị arụ ọrụ ụbọchị asa n'izu.
O kwuru na ha na ahụju anya n'aka ndị agboro n'ihi na enweghị ebe nkwụsị ụgbọ anyịnya Keke na steeti ahụ.
Onyeisi oche ndị otu ụgbọala Keke na n'ogige Isi Gate bụ Ifeanyi Okereke katoro ego ọhụrụ ahụ nke ọ kọwara dịka mmegide nye ndị ọkpọ ụgbọala Keke.
Ha kpọrọ oku ka gọọmenti steeti ahụ gee ha ntị ma megharịa iwu ahụ.
Ndị uweojii Anambra steeti anwụchiela ụmụ ntorọbịa asaa maka iso n'otu nzuzo
Ebe foto si, Supplied
Ndị uweojii Anambra anwụchiela ụmụ ntorọbịa asaa maka ebubo isonye n'otu nzuzo nakwa ịbụ egbe ezu ohi.
Ha kwuru na ha natara ndị ahụ otu egbe, ọtụ ọgba tumtum keke, nakwa ụfọdụ ọgwụ ike.
Ndị ahụ ha nwụchiri gụnyere: Chukwuemka Ozoekwe dị afọ 18, Chidozie Anagor dị afọ18, Chukwuemeka Oyeoka dị afọ 18, Ebuka Okoye dị afọ 17, Olisa Obi dị afọ 19, Chidubem Nwakwu dị afọ 20 nakwa Nwankwo Kosisochukwu.
"Mgbe a gbara ndị ntorọbịa ahụ ajụjụ ha kwetara na ha so n'otu nzuzo akpọrrọ Vipers cult ma bụrụkwa otu n'ime ndị na-akpa mkpamkpa n'Awka nakwa gburgburu ya." ka ndị uweojii kwuru n'ozi ha.
Ha sịkwa na ndị ahụ nọ n'ụzọ ebe ha na-aga izu ohi tupu e jide ha.
Ndị uweojii sị na ọ bụ mgbe a nwụchiri otu n'ime ndị ahụ ka ọ kpọọrọ ha gaa ebe ndị ọzọ na-ezo.
Onye nọchitere anya Kọmịshọna ndị uweojii bụ Fidelis Ogaragbe gwara ndị uweojii ha jisike n'ọrụ ma gwaa ndị Anambra na nkwenye ha tinyere n'aka ndị ọrụ nchekwa agaghị a bụ n'efu.
O kwukwara ka akpụpụ ndị anwụchiri ụlọikpe.
Kenneth Gbagi bụbu Minista agụmakwụkwọ anwụọla
Ebe foto si, Kenneth Gbagi/Instagram
Ezinụlọ Kenneth Gbagi ekwupụtala maka ọnwụ ya.
N'ozi nwa ya nwoke bụ Emuoboh Gbagi binyere aka na ya si kwuo, Kenneth Gbagi, onye bụbu minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ nwụrụ ụbọchị Satọde 4 Mee.
Ọ gbara afọ 62.
Gbagi bụbu minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ n'okpuru ọchịchị Goodluck Jonathan.
Ọ zoro ọkwa gọvanọ Delta steeti n'otu Social Democratic Party (SDP) na ntuliaka afọ 2023.
Ihe ndị ịkwesiri ịma maka Kenneth Gbagi
Ebe foto si, Kenneth Gbagi/Instagram
Kenneth
Gbagi bụ onye a mụrụ na Septemba 1961 n’obodo Sapele dị na Delta steeti.
Ọ tara ahụhụ
zụọ onwe ya n’ụlọakwụkwọ Pramarị nakwa Sekọndrị.
Ọ rụrụ
obere oge tupu ọ gawa mba ofesi ịgụ Mahadum.
Ọ gụrụ
Political Science na Mahadum Sans Thomas nakwa Phillipine College of Criminology.
Gbagi
laghachiri Naịjitịa ebe ọ rụrụ ọrụ na Police College dịka onye nkuzi
Criminology.
Ọ
laghachiri gụọ ‘Law’ na Mahadum Legọs.
Ọ zọrọ ọkwa
Gọvanọ Delta steeti n’okpuru otu SDP.
Ndị uweoji
na-achọ ya n’afọ 2022 ịbịa zara ọnụ ya na ọ gbara ndị ọrụ ya anọ ọtọ ma gosiputa
ihe ebe niile maka akụkọ na ha zuru ohi.
Ọ gwara BBC
Pidgin mgbe ahụ na ụdịrị ihe ahụ emeghi kama na ọ bụ ọrụ ndị ilo ya iji metọ aha
ya.
Ụfọdụ ndị nọ UK ga-enweta onwe ha na Rwanda - Gọọmenti UK
Ebe foto si, ukhomeoffice/X
Mba United
Kingdom ebidola ịnwụchi ndị mmadụ ha ga-achụpụ na mba ha ma zigaa mba Rwanda.
Ndị a na-anwụchi
na UK bụ ndị batara na mba ahụ n’ụzọ na-ezighị ezi.
Ụlọọrụ na-ahụ
maka ndị batara na UK a kpọrọ UK Home Office gosiri etu ha siri gaa nwụchie ndị
mmadụ n’ọbaozi X ha bụ @ukhomeoffice.
Ha kwuru na
a ga na-awụchi ndị mmadụ malite ugbua ruo izuụka iri na otu na-abịa.
N’okwu Mịnịsta
na-ahụ maka mba UK bụ James Cleverly, “anyị na-agba mbọ ịnwụchi ndị niile
batara na UK n’ụzọ na-ezighị ezi ma tinye ha n’ụgbọelu ga-ebupụ ha ngwangwa.”
Ihe dị ka ọnwa
gara aga ka ndị omeiwu UK wepụtara iwu mere ka a chụlaa ndị na-achọ mgbapu siri
mba Rwanda bata UK n’ụzọ na-adịghị n’iwu.
Gọọmenti UK
n’ozi ha wepụtara n’ụbọchị nke mbụ n’ọnwa Mee, James Cleverly sịrị “ihe a bụ ụzọ
anyị si chọọ ịkwụsị ndị na-eji ụgbọmmiri abata na UK ma kwụsị ndị omekome bụ ndị
na na-akpọbata ndị mmadụ n’ụzọ na-ezighị ezi”.