Ikuku anwụrụ si n’igwe na-enye ọkụ latrịk egbụọla ụmụakwụkwọ na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụakwụkwọ mahadum asaa anwụọla ka ha kuru ikuku sitere n’igwe na-enye ọkụ latrịk n'ụlọ egwu dị na Bayelsa steeti n’Naịjirịa.
Ekwuru na ụmụakwụkwọ ndị a mụrụ anya n’abalị Mọnde ebe ha na arụ ọrụ egwu wee daa n'ụra dịka igwe ọkụ latrịk ahụ ka na-arụ ọrụ.
A na-enyo enyo na ọbụ ikuku carbon monoxide ha kuru gburu ha mana ndị uweojii kwuru na nyocha ka na-aga n'ihu.
Ọtụtụ ụlọọrụ na ezinaụlọ na Naịjirịa na-adabere na igwe ọkụ latrịk n'ihi na ha anaghị enwe ọkụ.
Akụkọ kwuru na achọpụtara ozu isii n'ụtụtụ Tuzdee, ebe otu onye n'ime ha, nke ka na-eku ume ka e bugara ụlọọgwụ dị nso mana o mechara nwụọ.
Ndị bi na mpaghara ahụ tiri mkpu gbata gbata mgbe chọpụtara ozu ha n’ụlọ egwu ahụ.
Mgbe ndị uweojii bịara, ha bupuru ozu ụmụakwụkwọ ahụ maa gbochie ndị mmadụ ịbata ebe ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steetị ahụ bụ Musa Mohammed gwara BBC na-ebidola nnyocha iji chọpụta ma ọ bụ ikuku carbon monoxide sitere n’igwe ọkụ jeneratọ gburu ndị ahụ.
Ụmụakwụkwọ ahụ bụ ụmụakwụkwọ mahdum Niger Delta University (NDU) dị na Amassoma. Ha ji iti egwu wee na-akwado onwe ha.
Nke a abụghị oge mbụ ikuku anwụrụ sitere na igwe ọkụ latrịk na-egbu ndị mmadụ n’Naịjirịa, maba kachaa emepụta mmanụ ụgbọala n’Afrịka.
N’afọ 2009, ihe ruru mmadụ 13 sị n’otu ezịnaụlọ nke gunyere ụmụaka nwụrụ ka ha kuru uzu ọkụ sitere na igwe ọkụ latrịk mgbe ha na-arahụ ụra n’Imo steetị dị na mpaghara ọnwụwa anyanwụ Naịjirịa.
Nnyocha ụlọọrụ International Energy Agency mere kwuru na ndị Naịjirịa bụ igwe ọkụ latrịk ka ha ji egbo mkpa ọkụ ruru pasentị 40.
Ọkụ latrịk na anaghị adị bụkwa nsogbu ndi mmadụ na-enwe naagbegheghi na Naịjirịa so na mba kachaị emepụta mmanụ n’Afrịka.
Onyeisiala Bola Tinubu nyere iwu na nso nso a ka ụlọọrụ gọọmentị ọbụla zuta naanị ọgbọala na igwe jeneratọ nke na-anaghị eku uzu ọkụ iji chekwaba ndụ ndị mmadụ.

























