Ụlọikpe amaala Donald Trump ikpe n'ebubo 34 niile e boro ya maka ime mpụ
Akụkọ dị mkpa na Naijiria na mbaụwa n'ọnwa Mee, afọ 2024.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Uche Akolisa, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu
NLC na TUC ga-amalite ịgba abụbọ ọrụ ụbọchi Monde Jun 3
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ọkọlọtọ NLC
Otu jikọtara ndị ọrụ na
Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) na Trade Union Congress (TUC) ekwuola
na ha amalite abụbọọrụ ụbọchị Monde abali atọ ọnwa Jun afọ 2024 maka enweghị
ike ịnwe nkwekọrịta n’etiti ha na gọọmenti etiti banyere ụgwọ opekatampe ndị ọrụ.
Onyeisi
mgbasa ozi NLC bụ Benson Upah mere ka amata nke a mgbe BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ taa banyere nzukọ ha na kọmiti gọọmenti etiti nyibere maka ụgwọ ọnwa opekatampe ahụ ụbọchi Fraide Mee 31.
Upah kwuru
na “Nzukọ Ahụ amịtaghị mkpụrụ ọbụla n’ihi na gọọmenti adighị njikere ịme ihe ọbụla
banyere ụgwọ ọnwa opekatampe ahụ”
“Gọọmenti e
jighị anyị kpọrọ ihe, ọ bụ ya mere anyị ji si na nzukọ ahụ pụọ”
Upah gbara
ama na abụbọ ọrụ ga-amalite n'steeti niile ụbọchi Monde Jun 3 nwee ruo mgbe a na amaghị.
Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nruruaka ego bụ Economic
and Financial Crimes Commission, (EFCC) nke Enugwu steeti ekwuola na Okaikpe
H.I.O Oshomah nke ụlọikpe di elu n’Abakaliki isi obodo Ebonyi steeti, atụọla mmadụ
24 ji ịntanetị egwu chandum mkpọrọ.
Ndị ahụ a tụrụ mkpọrọ kwetara na ha mere chamdum ahụ.
Ọkaikpe Oshomah mara ha ikpe ma tụọ ha mkpọrọ afọ abuo
n’otu n’otu manye kwa oghere ikwọ nha puku 150.
Ọkaikpe ahụ nyere iwu ka ụlọọrụ EFCC machie ree
ekwenti niile e nwetara n’aka ndị ahụ a tụrụ mkpọrọ maa kwụnye ego ya n’akpa
ego gọọmenti etiti.
Oge eruola mgbe a ga-eji ụzọ ndọrọndọrọ ọchịchị gboo nsogbu Nnamdi Kanu - Atiku
Ebe foto si, ATIKU ABUBAKAR/INSTAGRAM
Onye zọrọ ọkwa
onyeisiala n’okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) na ntụliakaelu
2023 bụ Atiku Abubakar agwala Gọọmenti Naịjirịa ka ọ gbasoo usoro ndọrọndọrọ ọchịchị
iji gboo nsogbu onye ndu Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Nnamdi Kanu.
Atiku kwupụtara
nke a n’otu ozi o bipụtara n’akara ọbaozi X ya n’ụbọchị Fraịde 31 Mee 2024.
N’ozi ahụ,
Atiku katọrọ ụfọdụ ndịagha e gburu n’Aba dị n’Abịa steeti n’ụbọchị Tọzde 30 Mee
2024 n’oge a ndị otu IPOB tinyere ọnọdụ onye apụtakwala ezi n’ala Igbo iji
cheta ndịagha e gburu n’agha Biafra.
O dere n’ozi
ahụ sị “e chere m na oge eruola mgbe a ga-agbaso usoro ndọrọndọrọ ọchịchị iji
gboo nsogbu Nnamdi Kanu na okwu ndị ọzọ metụtara ya.”
“E kwenyere
m na nke a ga-akụnyụ okpomọkụ dị na mpaghara ahụ ugbua. Ọ ga-abụ mmeri maka
onye ọbụla,” ka o dere.
Ụmụafọ Kenya agbaala akaebe n'ọchụ ndịagha Briten gburu na mba
Ọtụtụ ndị
Kenya apụtala ịgba ama ma ma weta ihe akaebe n’ebubo e boro ndịagha mba Briten
gbasara imegide ikike dịrị mmadụ na mba ahụ.
Ndị Kenya wetara
ihe akaebe kwupụtara ọtụtụ ihe ndịagha mba Briten mere ha nke na-agba anya mmiri.
Ndịagha Briten
a na-ebo ebubo ahụ bụ ndị nọ n’ebe ndịagha na-anata ọzụzụ a kpọrọ ‘British Army
Training Unit Kenya (Batuk)’.
N’afọ 1964
ka e hiwere Batuk na mpaghara Nanyuki ka ndị Kenya nwechara onwe ha n’aka ọchịchị
mba Briten.
Ihe dị
Kenya gbara n’akaebe
Memusi
Lochede gwara ndị na-eme nyocha gbasara ebubo ahụ na n’afọ 2019 ndịagha UK weere
ụgbọala ha kutuo nwa ya nwaanyị ma gbaa ọsọ.
Lochede sị
na nwa ya dị afọ iri abụọ ụgbụa mana ọ naghị eji ụkwụ ya aga ije. “Ọkpụkpụ ya
gbajịrị. Ọbara jụrụ ebe niile”
“Ha gwara m
na ha achọghị ka m kpụpụ ha n’ụlọikpe ma kwee anyị nkwa na ha ga-eleta nwa m
nwaanyị anya”
“Ha kwuru
ego ụlọọgwụ afọ abụọ nwa m nwaanyị nọrọ n’ụlọọgwụ mana ha enyeghị anyị ego itiaka
n’obi”.
Ọtụtụ ihe dị
iche iche mere ndị mmadụ ji kpụpụ ndiagha Briten n’ụlọikpe ma na-arịọ maka
ikike dịrị ha.
Ihe ndị ọchịchị Kenya kwuru
Onyeisi kọmitii n’ụlọomeiwu na Kenya bụ Nelson Koech kwuru na ihe niile ha na-anụ mere ụmụafọ mba ha na-agbanwa obi ma bụrụ ihe ọhụrụ na ntị.
Koech kwere nkwa na “ha ga-ata ahụhụ mpụ niile ha mere n’ala anyị” .
“O metụtara m n’obi na ihe ndị a niile na-eme n’ala anyị, ha bụ eziokwu maọbụ asị; anyị ga-ahụ isi ya”
Ihe ndị nnọchiteanya UK na Kenya kwuru
Ọnụ na-ekwuru ndị nnọchiteanya mba Briten na Kenya kwuru na “ndị na-eme nyocha n’ọrụ nchekwa anyị nakwa ndịagha UK na-eme nyocha gbasara ihe mere na Batuk dị na Kenya”.
Ọ gara n’ihu sị na mba Briten ga-enyere ndị Kenya aka ịchọpụta nke bụ eziokwu.
“Ebumnobi anyị ji nwee nkwekọrịta ma hiwe Batuk bụ ka anyị chekwaa ndụ na akụnaụba ndị Briten.
Ụlọikpe amaala Donald Trump ikpe n'ebubo 34 e boro ya maka ime mpụ
Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu
ikpe n’ụlọikpe dị na Manhattan amaala Donald Trump bụbu Onyeisiala mba Amerịka
ikpe maka iji akwụkwọ azụmaahịa adịgboroja zoo ego kpuchie ọnụ ọkaiwu ya kwụrụ Stormy
Daniels, nwaanyị a ma ama na-eme ihe onyonyo aramara.
Ndị a kwuru
na Trump dara iwu n’ebubo iri atọ na anọ (34) e boro n’isi ya nke ga-eme ka ọ bụrụ
onye mbụ chịburu Amerịka a ga-ama ikpe maka mpụ.
A ga-ekwupụta
ntaramahụhụ ya n’ụbọchị 11 Julaị ebe a ga-enye iwu ka a dee akwụkwọ etu Trump ga-esi
anata ntaramahụhụ ahụ dịka ọkaikpe Juan Merchan bụ onyeisi ikpe ahụ si kwuo.
Otu n’ime
ebubo e boro ya nwe ntaramahụhụ ruru nga afọ anọ mana o dobeghi anya ma Trump ọ
ga-aga mkpọrọ ka ọ bụ ọrụ ime obodo ka ọ ga-arụ.
Ọkaikpe
Merchan ga-ekpebi ntaramahụhụ ọ ga-enye Trump.
Trump kwuru na aka enwe abaala n’ikpe ahụ
N’okwu mbụ ya banyere ikpe ahụ, Donald Trump kwuru na o nweghi ihe ọjọọ ọbụla o mere.
O boro ọkaikpe Merchan ebubo na ọ bụ onye nrụrụaka.
“Aka m dị ezigbo ọcha mana ọ dị mma – ana m alụrụ mba anyị ọgụ. Ana m alụrụ iwu anyị agha,” bụ ihe Trump kwuru dịka ọ na-apụ n’ụlọikpe.
“Ọ bụ ọchịchị Biden mere nke a iji metọọ aha onye na-ama ya na ndọrọndọrọ ọchịchị. Eche m na ọ bụ ihe ihere. Anyị ga-aga n’ihu na-ebu agha ruo na ngwụcha.”
Ụlọorụ achụnta vootu Onyeisiala Joe Biden kwuru na o nweghi onye karịrị iwu na-achị obodo.
“Donald Trump na-ekwenye kaarị na o nweghi ike ịnata ntaramahụhụ maka ịda iwu obodo n’ihi ihe nwete nke onwe ya,” nke a bụ ihe Michael Tyler, ọnụ na-ekwuru otu achụnta vootu Biden kwuru.
Ọ gara n’ihu gwa ndị mmadụ ka ha jiri ịtụ vootu sepu aka Donlad Trump kpam kpam n’ịzọ ndọrọ ndọrọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka.
Igbo ndị ọma e ji eme ọnụ daalụ nụ ooo!
Obi ọma sara mbara ka anyị ji anabata unu n'ọgbakọ BBC Igbo nke taa.
Bia gere akụkwọ ndị gbapụtara ihe na Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile gbaa gburu gburu.
Ụlọelu ogogo anọ adaala na Legọs
Ebe foto si, LASG
Otu onye atọọla n'okpuru ụlọelu ogogo anọ adaala n' Iga Iduganran, dị na mpaghara 'Lagos Island' na Legọs n'ụtụtụ Tọzde.
Ka ọ dị ugbua, n'aka nke ọzọ, ebugara ndị merụụ ahụ n'ụlọọgwụ Ndị ọrụ gbatagbata steeti ahụ bụ 'Lagos State Emergency Management Agency' (LASEMA) zọpụtara mmadụ itoolu ya bụ ọdachi metụtara.
Dịka Kọmịshọna steeti ahụ na-ahụ maka mgbasaozi siri kwuo, e bulagal ndị a gbapụtara n' ụlọọgwụ maka nleta.
Nsogbu ụlọ ọdịda bụ ihe na-eme kwa daa na Legọs.
Nwereonwe Ọchịchị ime obodo: Ụlọikpe kachasị enyela steeti 36 iwu banyere akwụkwọ gọọmenti etiti gbara ha
Nkọwa foto, Foto Ụlọikpe kachasị n'Naịjirịa
Ụlọikpe kachasị n’Naịjirịa enyela gọvanọ 36 nke steeti iwu ka ha manye akwụkwọ ịgbachitere onwe ha n'okwu gọọmentị etiti malitere
megide ha.
Cheta na gọọmenti etiti na-achọ nnwereonwe zuru
oke ọchịchị ime obodo dị ọnụọgụgụ 774.
Ụlọikpe ahụ nyekwara iwu ka ọkaiwu gọọmenti etiti
bụ Lateef Fagbemi depụta azịza ya n'ime ụbọchị abụọ.
Ọkaiwu Garba Lawal onye duru ndị ọkaiwu asaa ndị ọzọ, kwuru na mkpebi ụlọikpe ahụ dabere na mkpa
ikpe ahụ dị.
Ọ gara n’ihu kwuo na steeti asatọ ahụ na-abiaghị n’ụlọikpe
ụbọchị Tozde 30 Mee, 2024, ga-enweta akwụkwọ ikpe ọhụrụ.
Steeti ndị a gunyere Borno, Kano, Kogi, Niger,
Ogun, Osun, Oyo na Sokoto.
Ụlọikpe na-ekwu ka gọọmentị etiti na akwunyee ego ọchịchị ime obodo site n’ọbaego gọọmenti etiti.
Ha kwuru iwu megidere gọọmenti etiti ị kwụnye ego ọchịchị
ime obodo n’obaego steeti.
Ọkaiwu Garba Lawal kpọrọ ya “Usoro iwu na-akwadoghị”.
Ụlọikpe ahapụla onyeisi Miyetti Allah dịka gọọmenti wepụrụ ebubo ha boro ya.
Ebe foto si, Bello Bodejo/Facebook
Nkọwa foto, Foto Bello Bodejo
Ọkaiwu Inyang Ekwo nke ụlọikpe ukwu dị n’Abuja, ahapụla
onyeisi Miyetti Allah Kautal Kore aha ya bụ Bello Bodejo maka ebubo iyi ndụ
egwu nke ụlọọrụ ọkaiwu gọọmenti Naịjirịa boro ya.
N’ikpe ya, ọkaiwu Ekwo hapụrụ Bodejo mgbe ọkaipke ọkaiwu
gọọmenti Naịjirịa bụ Aderonke Imana rịorọ arirịọ ka akachapụ ebubo ahụ.
O kwuru na arịrịọ a bụ nke dabere na ike ọkaiwu
gọọmenti nwere na ngalaba 174 iwu Naịjirịa nke afọ 1999.
Ndi uweojii ahụla ozu nwagbọghọ a na amabeghi aha ya n’Imo steeti
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Foto njirimara ndị uweojii
Ndị uweojii n’Imo steetiekwuola na a hụrụ ozu nwagbọghọ a na amabeghi aha ya na n’ụzọ Amaraku-Umudim n’okpuruọchịchị Isiala-Mbano nke steeti ahụ.
Akụkụ kwuru na ngwa ngwa ndị obodo ahụ choputara ozu ahụ, ha kpọtụrụ ndị uweojii maka ya.
Mgbe BBC Igbo kpoturu onye na ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ bụ Henry Okoye, o kwuru na ndị uweojii wetere oku maka ozu ahụ.
Henry Okoye kwuru na “Anyị ruru ebe ozu ahụ nọ, wee chọpụta na obidola ire ere.”
Ọ gara n’ihu kwuo na ha kpoturu onyeisioche okpuruọchịchị ahụ iji nyere aka ịchopụta ezinaụlọ nwagbọghọ ahụ.
Henry Okoye gwara anyị na ebidola nnyocha iji chọpụta ndị gburu nwagbọghọ.
Onyeisiala
Bola Tinubu etinyela aka n’akwụkwụ iwu ịgbanwe abụ njirimaara Naịjirịa ka ọ bụrụzie
iwu ugbua.
Onyeisi ndịomeiwu
Naịjirịa bụ Godswill Akpabio kwupụtara nke a n’ọgbakọ ha na-eme n’ụbọchị Wenesde
ma kwuo na Onyeisiala Tinubu binyere aka n’akwụkwọ n’ụtụtụ a.
Nke a pụtara
na a ga-esi n’abụ njirimaara nke a na-agụ ugbua laghachị na nke ochie a kpọrọ ‘Nigeria
we hail thee’.
Onyeisiala
Tinubu mechara sonye ndị omeiwu n’ọgbakọ ahụ ma kwupụta n’ezie na abụ
njirimaara ochie ahụ abụrụla iwu.
Cheta na ndị
omeiwu Naịjirịa binyere aka n’akwụkwọ iwu sị ka a gbanwe abụ “Arise, O Compatriots”
ka ọ bụrụzie “Nigeria, We Hail Thee”.
Abụ njirimaara
ochie a bụ nke e dere mgbe Naịjirịa nweere onwe ya site n’aka ndị Briten n’ọnwa
Ọktoba, 1960.
Onye dere
abụọ a bụ Lillian Jean Williams. nwafọ mba Briten bi na Naịjirịa n’oge ahụ ebe
tiri egwu ya bụ Frances Berda.
Lee edemede
banyere abụ njirimaara ochie ahụ
Nigeria, we hail thee,Our
own dear native land,Though
tribe and tongue may differ,In
brotherhood, we stand,Nigerians
all, and proud to serveOur
sovereign Motherland.
Our flag shall be a symbolThat
truth and justice reign,In
peace or battle honour’d,And
this we count as gain,To
hand on to our childrenA
banner without stain.
South Africa Election: Ntuliaka ebirila ọkụ
Ebe foto si, Getty Images
Ntuliaka ebirila ọkụ dịka ndị mba Saụt Afrịka na-eme ntuliaka Vmaka Ụlọọmeiwu Etiti nke mba ahụ na ụlọomeiwu nke ntuliaka mpaghara
Ọgbọ atụmvootu mepere n'ụtụtụ n'ebe Elekere asatọ . A na-atụ anya na aga-emechi ya n'Elekere Itoolu nke abalị.
Nke a ga-abụ ntuliaka nke asaa kemgbe afọ 1994 bụ ntuliaka mbụ ha nwere kemgbe ọchịchị ịkpa oke agbụrụ nke ndị ọcha chịrị ha BEkee kpọrọ, 'apartheid' biri n'afọ 1990.
A na-atụ anya na a ga-akpọpụta mpụtara ntuliaka ahụ n'ime abali asaa.
Ebe foto si, Getty images
Otu afọ n'ọkwa: Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n'ozi Peter Mbah
Ebe foto si, Peter Mbah/Instagram
Peter Ndubuisi Mbah emeela mkparịta ụka ma gwa ọhaneze ihe ọchịchị ya na eme kemgbe ọtụ afọ.
Ta bụ ụbọchị 29 nke ọnwa Mee mere ọtụ afọ Gọvanọ Mbah bara nọ ọkwa.
Na mkparịta ụkọ ahụ ọ mere, Mbah kwụrụ ihe ọchịchị ya na eme na ngaraba dị icheiche site na nchekwa obodo, rụọ na ọnọdụ mmịrị ọnụnụ, ụzọ-ụgbọala, ọnọdu ndị ọrụ na ndị ọzọ.
Mana na akụkọ a, anyị na enwetara gị ụfọdụ n’ihe Gọvanọ Mba kwuru nke dọ oke dịmkpa.
Ihe m mere maka ọnọdụ nchekwa
Gọvanọ Mbah kwuru na enweghị ezi nchekwa na abụ ihe ịche akamgba dialụ mmepe na ọganịrụ obodo.
Ọ sị na ọ bụ nke ahụ mere ya gi machie Sit-at-home na ndị na enweta ọgbaaghara na steetị ya.
Ọ gara n’ịrụ kọwaa na ya tinyere ihe onyonyo CCTV na ebe dị icheiche n’Enugu maka ịhụ ihe na eme ebe ahụ.
Ihe m mere maka ọnọdụ mmịrị
Ụzọ ụgbọala, ngaraba njem na ọdụ ụgbọala
Mbah kwuru na ụzọ ụgbọala arụrụ na mbụ n’Enugu adịghịzị ezu ụgbọala n’igwe mmadụ bụ ndị bị na steetị ahụ ugbua.
Ọ gara n’ịhụ sị na ọ bụ ya mere ya gị arụ ọdụ ụgbọala na Ogbete/Holyghost Round about, Abakpa na Nsukka ka ọ nyere aka bereta agaaga na adị n’ụzọ ụgbọala.
Mbah kwụrụ na ya ga etinye ụgbọala njem 2000 na bọọsụ 150-CNG n’ụzọ.
Ndị ọrụ, ndị nara ezumuike nka
Gọvanọ Enugu kwuru na ya nwere atụmatụ ọchịchị ga enyere gọọmentị ya aka ime ihe dị icheiche na ịntanet nke ọ kpọrọ e-governance.
Ọ sị na nke ahụ ga ebido na ịzụ ụka atọ na-abia n’ịhụ na kwụkwa na nke ahụ ga eme ka gọọmentị na arụ ọrụ na ụsọrọ dị mma ma na enweta ihe ohanaeze na ekwu.
Ọ kwụkwara na ọ ga eme ka ndị nara ezumuike nka nwe ike ịnaanara ego ha na enweghị nsọgbụ.
Peter Mbah jị ohere ncheta otu afọ ọ nọgọrọ na ọkwa nwere kọwaa ihe niile ọ megoro na ngaraba ọchịchị ya.
Israel abamiela na Rafah, gbuo mmadụ 21
Ebe foto si, EPA
Mịnịstrị
na-ahụ maka ahụike nke Hamas na-elekọta kwuru na mmadụ 21 anwụọla ebe 64 ndị ọzọ
nwetara ihe mmerụahụ n’obodo dị na mpaghara ndịda ugwu Gaza.
Ọnụ
na-ekwuru obiọchịchị Palestine bụ Nabil Abu Rudeineh kwukwara okwu banyere ogbunigwe
a tụrụ taa na Rafah bụj nke ọ kọwara dịka “igbu mmadụ n’igwe.”
Mịnịsta mba
UK na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ bụ David Cameron kwuru na ogbuniigwe
ahụ a tụrụ na Rafah n’ụbọchị Sọnde bụ nke “na-amapụ obi.”
Cameron sịrị
na chọrọ ịhụ na-akwụsịrị agha ahụ, tọhapụ ndị e ji eji, zigaa ngwa enyemaka na
Gaza ma kwụsị ịkwa mgbọ.
E butuola onye uweojii n’ọkwa maka ịnapụ ndị mmadụ egọ n’Imo steeti
Ebe foto si, AFP
Kọmịshọna
ndị uweojii n’Imo steeti bụ Aboki Danjuma ebutuola Inspector Isong Osudueh n’ọkwa
maka ịnapụ ndị mmadụ ego n’ike.
Isong
Osudueh bụ onye na-arụbu ọrụ na ngalaba na-ebu agha megide iyi ndụ egwu bụ Counter
Terrorism Unit (CTU).
Ọnụ
na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye kwuru nke a n’otu ozi o zipụrụ
n’ụbọchị Tuzde 28 Mee 2024.
E buturu Osudueh
n’ọkwa n’oge ihe onyonyoo gosiri ebe ọ na-anapụ ndị ọkwọụgbọala ego n’okporoụzọ
sitere Owerri gawa Ọnịcha.
Dịka Okoye
siri kwuo, Danjuma katọrọ omume onye uweojii ahụ ma kwuo na ụlọọrụ ndị uweojii
Imo steeti agaghị anabata ụdị omume ọjọọ ọbụla n’ebe ndị uweojii nọ.
Reginald Ebere na-arụpụta ihe onyonyo na Nollywood anwụọla
Ebe foto si, Reginal Ebere/Instagram
Akụkọ kwụrụ na ọ bụ otu onye amaara ama n’ihe ejije bụ Segun Arinze deputara na ọgbakọ-Whatsapp bụ ebe ndị na eme ejije nọ.
Mana no oge BBC Igbo kpọrọ Segun Arize ọ sị “na ọbụghị ya ka ọ dịara ịza ajuju ndị nta akụkọ ma gwa onye nta akụkọ anyị ka ọ kpọtụrụ ndị isi Actors Guild of Nigeria (AGN).
Oge anyị kpọrọ onyeisi ndị AGN bụ Emeka Rollas, o kwuo “e zitara m ọzị na Raginald Ebere anwụọla, mana ụgbụa enwebeghi m ike ịchọpụta na ọ bụ eziokwu”.
Oge a maara Reginald Ebere dara na ọrịa
Na afọ 2018 ka Reginald Ebere dara na ala oge ọ na emeputa ejije, nke mere ọ gị daa n’ọrịa mpọnwụahụ.
Raginald Ebere rịala ọrịa mkpọnwụahụ ahụ ugboro abụọ.
Njem Reginald Ebere na nollywood
Reginald Ebere gụrụ akwụkwọ na Mahadụm Jos ebe ọ na gụọ maka ejije.
Ọ hapụrụ ebe ọ na arụ ọrụ bụ Hints Magazine, tụpụu ọ nweta ọrụ ide ihe onyonyo a kpọrọ “When the Sun Sets” ma bụrụ osetere onye nchịkọta ọrụ ahụ nke nyere ya aka ịbanye na ọrụ ejije.
Ejije Reginald Ebere meputara na Nollywood
Ejije Raginald Ebere meputara gunyere ‘Last Burial’, ‘One God, One Nation’, ‘The God to Serve’, ‘Message’, ‘Unwanted’, ‘Last Affair’, ‘Tom and Jerry’, and ‘Venom of Justice’.
Mana ejije so na ndị mbụ ọ meputara bụ “Venom Of Justice” na afọ 1990. Ejije a sọ na nke mbụ bụpụtara Omotola Jalade-Ekeinde na oge ahụ.
Ejije ọzọ bụ ihe onyonyo a kpọrọ Issakaba nke ọ meputara na afọ 1999.
Etu ọnọdụ sị dị ụgbụa
Ugbua, enwebeghi ọzị dọrọ anya gbasara oriri ozu ya, ebe nwunye ya na ụmụaka nọ ma ọ bụ ebe ọ nọ nwere nwụọ.
Ndị agha ekwela ka agbape Banex Plaza ozugbo ozugbo
Ebe foto si, Banex Plaza/Instagram
Ndị agha Naịjirịa ekwuola ka agbapee ọdọahịa a ma ama n'Abuja bụ Banex Plaza bụ nke agbachiri kemgbe abalị ole ma ole gara aga.
Nke a pụtara ihe n'ozi nke ọnụ na-ekwuru ndị agha bụ Onyema Nwachukwu wepụtara ebe ọ sị na emeela nzụkọ n'etiti ndị agha, onye ndụmọdụ gbasara nchekwa bụ Nuhu Ribadu nakwa ndị isi ahịa ahụ.
O kwukwara n'ime ozi ahụ na ọ bụ maka mwakpo emere ndị otu ha ejighi egbe n'ọdọahịa ahụ n'ụbọchị 18 nke ọnwa Mee butere nsogbu.
N'okwu ya, ihe ndị ekwenyere na ya bụ nzụkọ gụnyere:
- Mgbape ọdọahịa Banex Plaza ozugbo ozugbo
- Mgbachi ụlọahịa C93 - A gwara ndị isi ahịa ha gbachie ụlọahịa C93.
- Nwuchi ndị kpalitere mwakpo ndị agha ma inyefe ha n'aka ndị uweojii.
- Ndị isi ahịa ihi asaa n'anya n'ịchọpụta ndị ọzọ so kpa ya bụ arụ ma kpesa ha n'aka ndị uweojii.
Ndị agha kwukwara na ha ga-eme nyocha nke ha ịchọpụta ihe mere ndị otu ji nọrọ n'ahịa ahụ na mbụ.
Ha dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ha kwụsị iwere iwu n'ime aka ha kama ha jiri ụzọ dị icheiche ha wepụtara iji mee mkpesa maọbụrụ na omume ndị ọrụ ha ejughi ndị mmadụ ahịa.
A hapụrụ m nne m, nna m, nwunye m na ụmụ m gbaa ọsọ ndụ
Ebe foto si, BOKO HARAM
Otu onye bị na Kuchi kwuru “na oge ndị na-eyi ọha egwu bịara n’obodo anyị, a nụrụ m ọtụtụ egbe na ada, m nwere ọgbatụmtụm m giri abalị gbapụ na obodo, hapụ nwunye m, ụmụaka m, nne na nna m”.
Ọ chọrọ ịzọta ndụ ya na mbụ! Ọ hụrụ onwe ya na Mina n’ịsị obodo Niger Steeti. Mana ọnọdụ ezinaulo bụ ihe na-enye ya nsogbu.
“Ndị ahụ nwuchiri nwunye m na nwanne m nwaanyị mana nwunye m mechera gbapu na aka ndị ahụ. Nwunye m gwara m ya gbapuru n’oge ndị ntọ ahụ dụ ha na agafe ọshịmịrị Shiroro”.
Mana ndị ahụ ka gị nwanne ya nwanyi nwere na agwa ha nwete ego a ga eji gbapụta ya.
Ọ gara n’ịhụ kọwa sị “ ụmụaka m, nne na nna m gbabara n’ụlọ ewu ebe anyị na azụ anụmanụ ga zọọ.
Ndị ahụ achọpụtaghị. Na oge ha pụrụ, nne na nna kpọrọ ụmụaka m gbaba n’ime ọhịa nwere nwete onwe ha n’obodo ọzọ.”
Nwunye ya mechere kpọọ ya na ekwenti nwere kọwara ya etu ọ sị gbapụ n’aka ndị ahụ. “M na nwụnye m na ekwukọrịta , mana anyị anọghị otu ebe ugbua”.
Na abali ụbọchị Fride ka ndị ogi egbe nwakporo ime obodo Kuchi ma tọrọ mmadụ rụrụ 160.
Ndị ọnụ n’eru n’okwu na obodo ahụ kwụrụ na ndị nwakpọrọ ha gị ọtụtụ ngwa agha, ma na ahụ ndị ahụ dịka ndị Boko Haram.
Mana enwebeghị ndị ma nke bụ eziokwu ịma na ndị ntọrị ahụ nwere ihe jịkọrọ ha na ndị Boko Haram.
Onyeisi okpuruochi Munya kwuru na ndị ahụ nọrọ ọtụtụ awa na abodo ahụ na esi nrị, aṅụ mmanya, na aṅụ tea, ma na ezu ndị mmadụ ohi.
Aminu Abdul Hamid Na-jume kwuru na “Enweghị ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa bịara nyere anyị aka. Kuchi na obodo ndị ọzọ dị ha nsọ ka nọ aka ndị n’enyị ọha egwu nwakporo ha.”
Ọ kwụrụ na “ka ndị ahụ gbuchere mmadụ ịrị na oge ha kwachọrịtara ngbọ, ha bido na aga n’ụlọ n’ụlọ na akpọrọ ndị ha ga atọrọ”. Mmadụ atọ bụ ndị obodo ahụ meruru ahụ.
Ndị ojiegbe agbagbuola mmadụ 3 n’Ebonyi steeti
Ebe foto si, OTHER
Ndị ojiegbe
amaghị ndị ha bụ agbagbuola mmadụ atọ n’oge ha mere mwakpo n’Ebonyi steeti.
Nke a mere
n’abalị Satọde 25 Mee 2024 n’Akpoha dị n’okpuruọchịchị Afikpo nke Ebonyi
steeti.
Ozi anyi
nwetara kwuru na ndị ojiegbe ahụ jiri egbe na ọgbaatumtum abụọ wuchie n’obodo
ahụ, gbapụ mgbọ aghara aghara ma gbuo mmadụ atọ ebe ndị ọzọ nwetara ogogo mmerụahụ
dị iche iche.
N’oge a kpọtụụrụ
ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Ebonyi steeti bụ Joshua Ukandu, ọ sịrị na ndị
uweojii na-achọ ọhịa na ụzọ ugbua iji nwụchie ndị ekperima ahụ.
Ka osiladị,
adọnyela ozu mmadụ atọ ahụ nwụrụ anwụ n’ụlọnchekwaozu ebe nnyocha ka na-aga n’ihu
iji chọpụta ndị mere mwakpo ahụ.
Ihe anyị ma maka ụmụagbọghọ abụọ, otu onye Ghana na-efu efu n'Abia steeti
Ebe foto si, Facebook/Celina Ndudim/Afiba Tandoh
Ụmụ agbọghọ abụọ gara ihụ enyi Facebook ha ka n’efu efu kamgbe otu ọnwa.
Ndị enyi abụọ bụ Celine Ndudim na nwa ada nke mba Ghana bụ Afiba Tandoh si na Portharcourt malite njem gawa Aba ubọchị 27th Aprl 2024, ị ga hụ enyi ọhụrụ ha nwetara na igwe soshal midia bụ Facebook.
Akụkọ ọzọ kwukwara na ọ bụ ịgba nkwụ otu enyi ha ọzọ akpọrọ "Blessing" ka ha bụ Celina na Afiba gara.
Ha gwara ndị enyi ha na ọ bụ onye nwoke ka ha gara ihụ mana ha ga alaghachi oge na adịghị anya.
Mana ka mgbe ahụ bụ 27th April , a ka na-achọ ha achọ nke mere ndị mmadu jiri tie mkpu na agwọ nọ n’akịrịka.
Site na mkpu ndị enyi na ikwu n’ibe ụmụ aghọghọ ahụ na-eti, ya nakwa nke gọmentị ghana, onye na-ahụ maka ikike dịara mmadụ bụ Harrison Gwamnishu na otu ndị ọzọ nyere aka buga ya bụ mkpesa n’aka ndị uweojii.
Gịnị ka achọpụtarala n'okwu ahụ
Ebe foto si, Supplied
Ka ọ gachara otu ọnwa n’ụma ụmụ agbọghọ ahụ n’efu efu ka ndị uweojii nyochara ihe ha n’akpa n’ekwe ntị ha nakwa soshal midia wee chọpụta na Celine na Afibah na otu nwoke akpọrọ Andrew Amechi bi na Aba, Abia steeti na akpa nkata ka mgbe ọnwa ole ma ole.
Ya bụ nwoke a na enyo enyo bụ Andrew Amechi, onye Item dị na Abia Steeti ma bụụrụkwa onye nwere akwụkwọ ị bụ nwa afọ mba Briten.
Ndị uweojii chọpụtara na Andrew Amechi kpọọrọ ụmụ agbọghọ abụọ si n'ụlọoriri ha nọ n'Aba we pụọ.
Nyocha CCTV nke ya bụ hotelụ gosiri na ha na Amechi soro bata, nọchaa ma sorokwa pụọ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweoji n'Abia steeti bụ Maureen Chinaka gwara BBC n'ekwentị na ọ bụ eziokwu na anwụchiri Andrew Ashley Amechi gbasara ya bụ okwu n'ụbọchị 8 nke ọnwa Mee
"Anyị bụ ndị uweojii Abia steeti nwụchiri nwoke ahụ ị kpọrọ aha ya ugbua mana anyi enyefela ya bụ okwu n'aka ndị uweojii nọ n'isi ụlọorụ anyị" ka o kwuru.