Onyeisiala Naịjiria bụ Bola Tinubu enyela ndi nchekwa iwu ka a kwusi ogbugbu a na-egbu ndị mmadụ na Benue steeti.
Tinubu nyere ntụziaka a na Sọnde 15 Junn 2025, dịka ndi na-eyi ndụ egwu gburu ihe kariri mmadụ 100 na mpaghara Yelwata n’ime ọchịchị
obodo Guma dị na steeti ahụ.
N'otu ụbọchị ahụ, ndị ntoroọbịa gara n'okporoụzọ ime ngharịiwe
dịka ha na-ekwu na gọọmenti gbara nkiti na-ele anya ka ndị obodo ha si anwu.
Cheta n’ụbọchi Fraịde 12 Junn ndị a na-enyo enyo bụ ndị
na-achị ehi mere mkpa mkpa n'obodo oke n’etiti Benue na Nasarawa steeti ma
gbuo ọtụtu mmadụ dịka ndị uweojii si kọwaa.
Gọvano steeti ahụ bụ Hyacinth katọrọ ogbugbu a ma kwuo na gọọmentị ya na-eso ndị ụlọọrụ nchekwa gọọmentị etiti, ndị eze ọdịnala, ndịisi obodo, na ndị ọ dị mkpa na-akpa nkata iji mee ka nchekwa sie ike ma mee ka nchekwa na udo ga-adịgide ikwụsi ogbugbu ndị a.
Onye bụbu Osote Onyeisiala na Naịjiria na onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'aha pati PDP n'afọ 2023 bụ Atiku Abubakar kwuru na ogbugbu a na-egosi na nsogbu nchekwa na-akawanye njọ nke cheere Naịjirịa n’ihu ma gwa gọọmenti etiti na ndị ọchịchị Benue steeti ka ha malite nnyocha ngwa ngwa banyere mwakpo ahụ ma chọpụta ndị na-akpa arụ a.
Onyeisi ụka Katọlik n'ụwa bụ Pope Leo tupu ọ malite ikpe ekpere Angelus n'ụbọchị Sọnde kpere ekpere maka "nchekwa, ikpe ziri ezi, na udo" maka ogbugbu mere na Benue steeti, ma kwuo na echiche maka "Obodo ndị Kraịst nọ n'ime obodo Benue steeti."
Ụlọọru gbata gbata na Naịjirịa bụ NEMA kwuru na ihe karịrị mmadụ puku atọ (3000) gụnyere ọtụtụ ụmụnwaanyị na ụmụaka agbapụla n’ụlọ ha ma nwee mkpa nri na ihe ndị ọzọ.
Ọnụọgụgụ ndị mwakpo a chụpụrụ n'ezinaụlọ ha dị 1069, gụnyere mmadụ 6527. N'ime ha bụ ụmụnwaanyị 1768, ụmụnwoke 759, ụmụaka 657 na-erubeghị afọ 18, ndị okenye 1870 ndị gafere afọ 18, ndị nne na-enye nwa ara 252, ụmụnwaanyị dị ime 82, na ndị agadi 91.
Bashir Ahmad, onye bụbu onye enyemaka Onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị ọzọ tinyekwara ọnụ na mkpa mkpa a.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu ka Onyeisiala Tinubu Kwupụta ọnọdụ mberede a kpọọ 'State of emergency' na Benue Steeti dịka o mere na Rịvas steeti.