Ndị isi agha mba Nijie ekwuola na ha ga-eweghara ụlọọrụ uranium dị na mba ahụ
Ndịagha na-achị mba Nijie ekwuola na ha ga-eweghara ọtụtụ n’ime ụlọọrụ uranium mba Fransị nwe na mba ahụ.
Ọnọdụ a na-abịa dịka mba abụọ ahụ gara n’ihu na-enwe esemokwu.
Somaïr bụ nke ụlọọrụ mba Fransị bụ Orano na-elekọta mana Nijie eboola ha ebubo ịkpa ọtụtụ akparamaagwa na-ezighị ezi.
Kemgbe ha kpachiri ọchịchị n’afọ 2023, ndị isi agha mba Nijie ekwuola na ọ ga-amasị ha ilekọta ọtụtụ akụrụngwa ndị si na chi juru eju na mba ahụ.
Ha wezugakwara onwe ha n’ebe mba Fransị nọ ma na-achọ ịgakwuru Rọshịa maka mmekọrịta.
Nijie bụ mba nke asaa kachasị emepụta akụrụngwa uranium n’ụwa dum ma nweekwa akụrụngwa e ji emepụta igwe ndị nke bụ ọkacha mma n’Afrịka.