E mechiela ogige enyemaka dị na Gaza ruo otu ụbọchị
Emechiela ogige ebe a na-enyere ndị mmadụ aka dị na Gaza n’ime otu ụbọchị dịka ndịagha mba Izrel dọrọ aka na ntị okporoụzọ e si aga ebe ahụ bụ “ebe a na-akwa mgbọ”.
Ngalaba enyemaka a kpọrọ Gaza Humanitarian Foundation, nke Amerịka na Izrel na-akwado kwuru na a ga-emechi ebe ahụ iji maara ka ihe si aga ka ha nwee ike ịrụ ọrụ ọfụma.
N’aka nke ọzọ, ndịagha Izrel kwuru na a ga-egbochi ndị mmadụ ịbanye n’ogige enyemaka ahụ maọbụ ime njem n’okporoụzọ e si aga ebe ahụ.
Nke a na-abịa dịka e gbuchara mmadụ iri abụọ na asaa mgbe ndịagha Izrel gbara egbe n’akụkụ ogige enyemaka ahụ n’ụbọchị Tuzde dịka ndị out Hamas si kwuo. Mana Izrel kwuru na ndịagha ya gbara egbe mgbe ha hụrụ ndị ọjọọ a na-enyo enyo.
Nke ahụ bụ mwakpo ugboro atọ kachasị daa ụda n’okporoụzọ ahụ e si aga n’ogige enyemaka ahụ.
Otu United Nation adọọla aka na ntị na mmadụ karịrị nde abụọ nwereike ịnwụ site n’agụụ na Gaza dịka mba Izrel machiri nri na enyamaka ịbata ruo izuụka iri na otu.