You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Amerịka ga-ewepụrịrị mwakpo tupu a malite mkparịtaụka ọhụrụ - Minista Ịran gwara BBC

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Juun 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Ihe dị na mkparịtaụka Tinubu na Onyeisiala mba Gabon nwere

    Onyeisiala Naịjiría bụ Bola Tinubu nabatara Onyeisiala mba Gabon bụ Brice Oligui Nguema n'obi ọchịchị gọọmentị Naịjirịa dị n'Abuja.

    Ndịisi mba abụọ a nwere mkparịtaụka ime ụlọ iji kwalite mmekọrịta dị n'etiti mba ha nke gunyere nchekwa na akụnaụba.

    Nguema kwuru na nzukọ a bụ iji kelee Onyeisiala Tinubu maka nkwado o nyere ya n’oge mgbanwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

    O jikwa ohere njem nleta a rịọ Tinubu arịrịọ ka ọ kwadoo ka ụlọọrụ ndị dị na Naịjirịa bị na mba Gabon ma tinye ego n'ebe ịrụpụta mmanụ agbidi nakwa ngalaba ndị ọzọ.

  2. A nwuchiela onyeisi otu ngalaba ndị uweojii na Saụt Afrịka maka ebubo mpụ

    A nwuchiela onyeisi ngala uweojii pụrụiche a kpọrọ 'intelligence unit' nke mba Saụt Afrịka bụ Dumisani Khumalo ma kpụpụ ya n'ụlọikpe maka ebubo mpụ na nrụrụaka.

    Ndị otu ngalaba mgbochi nrụrụaka jidere ya na mgbede Tozde mgbe o wuchiri n’ọdọụbọelu dị na Johannesburg.

    Khumal na mmadụ isii ndi ọzo e boro ebubo bụ ndịisi uweojii pụtara n’ụlọikpe nke mbu n'isiobodo ha bụ Pretoria n'ụbọchị Fraịde Juun 27.

    Onwebeghị onye ma nkọwa nke ebubo ndị e boro ya, mana ndị mgbasaozi na Saụt Afrịka na-ekwu na Gen Khumalo na ndịisii ndị ọzọ nwere njikọta nke a na-enyocha gbasara ebubo izu ego nke a zọpụta ndị ọrụ pụrụiche nakwa nke e ji ewe ndị mmadụ n'ọrụ uweojii nke iwu na-akwadoghi.

  3. Ịran anwụchiela ọtụtụ mmadụ ma gbuo ụfọdụ n’esemokwu ha na mba Izrel

    Ndị ọchịchị mba Ịran anwụchiela ọtụtụ mmadụ ebe ha gburu ụfọdụ ndị ọzọ e kwuru na ha na mba Izrel na-enwe mmekọ.

    Nke a na-abịa dịka mba abụọ ahụ malitere ilụso onwe agha n’izuụka gara aga.

    Ịran kwuru na ha na-eme nke maka na ha chọpụtara na e nwere ndị Izrel batara n’ọrụ nchekwa ha.

    Ha kwuru na ọ bụ ndị ahụ na-agwa Izrel atụmatụ ha niile nke nyere ha aka gbuo ọtụtụ mmadụ n’agha ahụ nke gụnyere onyeisi ndịagha otu Islamic Revolutionary Guard Corps (IRGC) nakwa onye ọrụ sayensi nuklịa.

    Ọ bụ nke a mere Ịran ji malite ime nnyocha iji chọpụta ndị nọ n’ime ọrụ nchekwa na-agba ha mgba okpuru.

  4. Ọ bụghị anyị kwaturu ụlọ nwanne Peter Obi – Gọọmenti Legọs steeti

    Gọọmenti Legọs steeti ekwuola na aka ha adịghị na nkwatu a kwaturu ụlọ nwanne aka chịburu Anambra steeti bụ Peter Obi.

    Kọmịshọna mgbasaozi na Legọs steeti bụ Gbenga Omotosho kwupụtara nke a oge Peter Obi tiri mkpu na ụfọdụ mmadụ wakporo ụlọọrụ nwanne ya nwoke dị n’Ikeja ma kwatuo ya.

    N’otu ozi nwaamadị ahụ jiri aha Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa wepụtara n’akara X ya n’ụbọchị Wenezde, o tiri mkpu gbasara etu e siri kwatuo ụlọ nwanne ya nwoke na-ebughị ụzọ nata nkwado maọbụ iwu ụlọikpe.

    Ọ bụ eziokwu na o kwughị na ọ bụ gọọmenti Legos steeti kwatụrụ ụlọ ahụ mana ụfọdụ mmadụ kwuru na nke ahụ bụ akaọrụ gọọmenti.

    Nke a bụ n’ihi na gọọmenti Legọs steeti malitere na nso nso a na-akwatu ụfọdụ ụlọ ndị ha kwuru iwu na-akwadoghị.

    Ha kwuru na ihe mere ha jiri bido ihe omume ahụ bụ n’ihi ọnọdụ nchekwa na nnupụisi n’iwu nhazi obodo.

    Ka o sina dị, iji gọpụ onwe ha n’ebubo a, gọọmenti wepụtara ozi kwuo na ọ bụghị ụlọọrụ Lagos State Building Control Agency (LASBCA) maọbụ ngalaba gọọmenti ọzọ kwaturu ụlọ ahụ.

  5. Ịran ekwetela ịkwụsị mmekọ ha na otu International Atomic Energy Agency

    Ụlọ omeiwu mba Ịran akwadoola mkpebi na-akpọ oku ka mba ahụ kwụsị mmekọ dị n’etiti ha na otu na-ahụ maka ngwaagha nuklịa bụ International Atomic Energy Agency (IAEA).

    Iwu ahụ machiri ndị nnyocha otu IAEA ịbanye n’akụrụngwa nuklịa mba Ịran ruo mgbe e mezuru ụfọdụ ọnọdụ.

    Ndị omeiwu mba Ịran akwadoola mkpebi ahụ, nke pụtara na otu na-achị mba ahụ nke ihe mejupụtara ya bụ naanị ndị Ụkọchukwu na ndị Ọkaiwu na-eche ka a kwadoo mkpebi ahụ tupu ọ bụrụ iwu.

    Ugbua, otu Supreme Council of the Islamic Revolution nke Ayatollah Ali Khamenei nọ n’isi ya ga-ekpebi oge nakwa etu a ga-esi tinye iwu ahụ n’ọrụ.

  6. Trump akpọọla oku ka a kwụsịtụ ikpe a na-ekpe Netanyahu maka ebubo nrụrụaka

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump akpọọla oku “obi ebere” maọbụ ka a kwụsị ikpe a na-ekpe Praịm Minista mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu maka ebubo nrụrụaka.

    N’ozi o bipụtara n’akara X ya, Trump kwuru na mba Amerịka anapụtala Izrel n’agha dị n’etiti ha na Ịran, mana nke ugbua ga-abụ “ịnapụta” Netanyahu.

    Netanyahu agọpụla onwe ya n’ebubo iri ngarị, nrụrụaka na ịgba mba ya mgba okpuru, nke bụ ebubo e boro ya n’afọ 2020.

    Onye ndu otu a ma ama na-agba gọọmenti mba Izrel ụkwụ bụ Yair Lapid katọrọ okwu ahụ Trump kwuru, ma kwuo na o kwesịghị itinye ọnụ n’okwu metụtara mba kwụurụ onwe ya.

    Okwu ahụ Trump kwuru bịara n’ime mkpụrụ ụbọchị ole na ole ọ katọrọ Izrel maka ịwakpo Ịran oge ha kwupụtachara nkwụsị ịkwa mgbọ.

  7. Ụgbọala akwọpịala ụmụakwụkwọ na-ele ule

    Ụmụakwụkwọ iri abụọ na itoolu anwụọla oge ha na-ele ule na mba Central African Republic.

    Nnukwu Onyeisi otu ụlọọgwụ dị na mba ahụ kwuru na ụgbọala kwọpịara ụmụakwụkwọ ahụ dịka ha jiri ụjọ gbapụ oge ihe tiwara n’akụkụ ụlọakwụkwọ ha.

    Abel Assaye si n’ụlọọgwụ ọbọdọ Bangui kwuru na igwe ọkụ ‘transformer’ tiwara n’ụbọchị nke abụọ ụmụakwụkwọ ahụ malitere ụle ọpụpụ sekọndịrị ha, ya bụ n’ụbọchị Wenezde 25 Juun 2025.

    “Mkpọtụ na anwụrụ si n’igwe ọkụ ahụ pụta” butere ọgbaaghara n’etiti ụmụakwụkwọ ahụ ruru puku isii, ka ụlọmgbasaozi Ndeke Luka kwuru.

    Onyeisiala Central African Republic bụ Faustin-Archange Touadéra ekwupụtala oge iru uju na mba ahụ.

  8. Mmadụ asatọ anwụọla dịka ndị na-eme ngagharịiwe na ndị uweojii kwatụrụ na Kenya

    Ihe ruru mmadụ asatọ anwụọla ebe mmadụ 400 nwrụrụ ahụ dịka ọtụtụ puku mmadụ mere ngagahrịiwe na Kenya maka ọchịchị Onyeisiala William Ruto.

    Ndị uweojii na ndị ngagharịiwe ahụ kwatụrụ n’isi obodo Nairobi nakwa ebe ndị ọzọ na mba ahụ dịka ndị na-eme ngaharịiwe ahụ na-eme ncheta otu afọ ngagharịiwe e mere n’afọ 2024 na Kenya.

    Ọtụtụ ndị ngagharịiwe ahụ na-eti ‘Ruto ga-ala’ dịka ha ji ngalaba osisi nke gosiri ngagharịiwe udo.

    Gọọmenti machiri ụlọmgbasaozi TV nakwa redio ka ha ghara igosi ngagharịiwe ahụ mana ụlọikpe ukwu dị na Nairobi, kagburu nke a.

    Onyeisiala Tuto gwara ndị ngagharịiwe ahụ ka ha ghara imetọ udo dị n’obodo dịka ha na-aga na be ya tupu ndị uweojii egbochie ha.

    Ndị uweojii ji ihe nchekwa machie ụzọ ụfọdụ ọkachasị nke na-aga n’ụlọomeiwu nakwa obi ọchịchị onyeisiala.

    Ndị ọchịchị ekwughị mmadụ ole nwụrụ mana ozi ụlọọrụ Kenya Medical Association, Law Society of Kenya na Police Reforms Working Group wepụtara kwuru na mmadụ asatọ nwụrụ na ngagharịiwe ahụ.

    N’ime mmadụ 40 ahụ merụrụ ahụ, mmadụ 83 chọrọ nleta pụrụiche ebe mgbọ egbe tụrụ mmadụ asatọ ndị ọzọ. Ndị ahụ merụrụ ahụ gụnyere ndị uweojii atọ.

  9. Aka ndị uweojii akparaala otu nwaokoroọbịa maka ebubo igbu nne ụmụ ya n’Aba

    Aka ndị uweojii akparaala otu nwaokoroọbịa aha ya bụ Kelechi Ugorie maka ebubo ịkụgbu nne ụmụ ya bụ Comfort Ogbuagu, n'Adindu Road, dị nso n'Omuma Road, n'Aba, Abịa steeti.

    Kelechi Ugorie nwereike ịdị n’agbata afọ iri abụọ na ise na afọ iri atọ na ise, ma bụrụ onye Mbanọ, Imo steeti bi n'Aba, ebe Comfort bụkwanụ onye Edda dị n’Ebonyi steeti.

    E kwuru na Kelechi chechiri Comfort Ogbuagu dị afọ iri abụọ na anọ n'okporoụzọ n'abalị Mọnde mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere itoolu nke abalị ma malite iti ya ihe, bụ nke kpatara ọnwụ nwaagbọghọ ahụ.

    Otu onye agbataobi kọọrọ onye ntaakụkọ BBC News Igbo na ha nọ n'ụlọ ha mgbe mmadụ malitere ịkụ aka n'ụzọ ha, n'ihe dịka elekere iri nke abalị, gwa ha ka ha gaa buru Comfort n'okporoụzọ ebe ọ tọgbọ.

    O kwuru na mgbe ha ruru ebe ahụ, ha hụrụ ka Comfort dina n'ala, ha e buru ya ozugbo gawa n'ụlọọgwụ nọ nso, mana ndị ụlọọgwụ ahụ jụrụ inye ya ọgwụ, nakwa na nke abụọ ha gara anabataghị ha.

    Onye agbataobi ahụ kwuru na ọ bụzi na General Hospital Aba ka ha buuru ya gaa, a gwa ha na ọ nwụọla, ha e buruzie ozu ya lọta n'ụlọ.

    Ka chi bọrọ, ha gara n'ụlọ Kelechi chọọ ya, otu nwaokoroọbịa ha hụrụ a tụọrọ ha asị na Kelechi ehighị ụra n'ụlọ ya, mana ka e mesịrị ha bịara jide Kelechi ma nyefee ya n'aka ndị Uweojii.

    Nne Comfort kwuru na nwa ya nwaanyị na Kelechi Ugorie nọbu na-ebi oge ha na-eme ọyị, dịka ọ mụtaara ya ụmụ abụọ ma kwuo na nwa ya si n'ụlọ ya pụọ ihe dịka afọ asaa gara aga.

    Ọ kọrọ na Kelechi alụghị nwa ya alụ nakwa na ọ bụ ọyị ka ha abụọ na-eme n'oge ahụ. O kwuru na ihe kpatara nkewa ha bụ na Kelechi na-emesi nwa ya bụ Comfort ike.

    Oge onye ntaakụkọ BBC News Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abịa steeti bụ Maureen Chinaka n'ekwentị maka okwu ahụ, o kwuru na ya ka si ebe ya gara njem maka ọzụzụ pụrụiche lọta n'ụbọchị gara aga, nakwa na ya enwetabeghị nkọwa gbasara etu ihe si kwụrụ, ma rịọ ka e nyetụ ya oge iji nweeike nye ọsịsa.

    Nchọpụta e mere gosiri na Kelechi Ugorie na-aṅụ ma na-erekwa ọgwụike, ebe ndị agbataobi kwuru na ọ dịchabeghị anya e si n'ụlọmkpọrọ tọhapụ ya.

  10. Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na e gburu ndị otu ha na Niger steeti

    Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala ọnwụ ụfọdụ ndị otu ha, bụ nke sochiri mwakpo ndị ojiegbe mere n’ogige ndịagha dị na Naịja steeti nakwa Kadụna steeti n’otu n’otu.

    Ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa mere ka a mata nke a n’otu ozi ha bipụtara n’akara X ha.

    Dịka ozi ahụ siri kwuo, ọ bụ n’ụbọchị Mọnde 23 Juun 2025 ka e mere mwakpo ndị ahụ n’ogige ndịagha dị na Kwanar Dutse Mairiga na Boka dị na Naịja steeti nakwa Aungwan Turai dị n’okpuru ọchịchị Chikun na Kadụna steeti.

    Akụkọ kwuru na ndị ojiegbe ahụ wakporo ogige ndịagha atọ ahụ n’otu oge nke mere ka ndịagha zasoo ha ngwangwa.

    Oge ha na-akwarịta onwe ha mgbọ, ndịagha buru agha n’elu nakwa n’ala iji chụsaa ndị ahụ mere mwakpo, ka ozi ahụ kwuru.

    Ndịagha kwuru na ha gburu ụfọdụ ndị ojiegbe ahụ oge ha kwarịtara onwe ha mgbọ ọtụtụ oge.

    Ka o sịna dị, ozi ahụ kwuru na e gburu ụfọdụ ndịagha oge ha na ndị omekome ahụ na-akwarịta mgbọ.

    Ha gakwara n’ihu gbakwunye na ndịagha anọ ndị ọzọ merụrụ ahụ oge ahụ e mere ha mwakpo mana ha na-anara ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ ugbua.

  11. PDP akpọghachịla 'Sam Daddy' n'ọkwa dịka odeakwụkwọ ha

    Otu ndọrọ ndọrọ Peoples Democratic Party (PDP) akpọghachịla Samuel Anyanwụ n’ọkwa dịka odeakwụkwọ Pati ahụ site na mkparịtaụka ha na Inec nwere n’ụbọchị Tuzde.

    Onye na-arụ ọrụ dịka onyeisioche pati ahụ bụ Umar Damagun kwupụtara nke a na mgbasaozi o mere n’Abuja.

    Ndị bịara ọgbakọ ebe e mere mkpebi gụnyere onyeisi ndụ gọvanọ PDP bụ Bala Mohammed na Bukola Saraki bụbu onyeisi ụlọomeiwu.

    “Anyanwu ga-amalitekwa ọrụ ya dịka odeakwụkwọ anyị,” ka Damagun kwuru.

    Onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu kwuru na ụlọọrụ agaghị anabata ọgbakọ ndị ndu PDP chọrọ ime maka nsogbu onye ga-abụ odeakwụkwọ ha nke na-aga n’ihu.

    N’ihi nke a mere PDP jiri kpebie iweghachịte Anyanwụ n’ọkwa dịka odeakwụkwọ ha.

  12. Pati ndị chọrọ ka INEC debanye aha ha maka ntuliaka 2027

    Dịka ntuliaka afọ 2027 na-abịaru nso, ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (INEC) ekwuola na ha enwetala akwụkwọ leta karịrị 100 site n’otu dị iche iche ndị chọrọ idebanye aha ha dịka otu ndọrọndọrọ ọchịchị.

    N’ụbọchị Wenezde ka Onyeisioche INEC bụ Ọkankụzi Mahmood Yakubu kwuru na ha na-eleba anya n’arịrịọ ndị ahụ dịka ọ dị n’iwu na usoro ụlọọrụ ahụ.

    Yakubu kwuru na ha anabatala arịrịọ niile ha nwetara ewezuga isii ndị ha natara na nso nso a, bụkwanụ ndị nke ha ga-anabata tupu ngwụcha izuụka a.

    Ọ gwara ndị Naịjirịa, ọkachasị ndị nwere mmasị idebanye aha pati ha, ka ha lee anya n’iwu na usoro ụlọọrụ INEC wepụtara maka otu ndọrọndọrọ ọchịchị n’afọ 2022.

    INEC wepụtakwara aha otu 110 ahụ, aha mkpirisi ha, isi ụlọorụ ha nakwa aha Ndị isioche na Odeakwụkwọ ha.

    Aha otu ndị ahụ gụnyere:

    1. Key of Freedom Party (KFP)

    2. Absolute Congress (ABC)

    3. All Grassroots Party (AGP)

    4. Congress Action Party (CAP)

    5. United Social Democrats (USDP)

    6. National Action Congress Party (NACP)

    7. Great Alliance Party (GAP)

    8. New Nigeria Congress (NNC)

    9. United Peoples Victory Party (UPVP)

    10. Allied Conservative Congress (ACC)

    11. Peoples Freedom Party (PFP)

    12. All Nigerians' Party (AND)

    13. Abundant Social Party (ASP)

    14. Citizens Party of Nigeria (CPN)

    15. National Freedom Party (NFP)

    16. Patriots Party (PP)

    17. Movement of the People (MOP)

    18. Peoples National Congress (PNC)

    19. African Union Congress (AUC)

    20. Alliance of Patriots (AOP)

    21. Socialist Equality Party (SEP)

    22. About Nigeria Party (ABNP)

    23. African Reformation Party (ARP)

    24. Accelerated African Development Association (AADA)

    25. Obidient Peoples Party (OPP)

    26. Zonal Rescue Movement (ZRM)

    27. Zuma Reform (ZR)

    28. Party for Socialist Transformation (PST)

    29. Liberation People's Party (LPP)

    30. Progressive Obedients Party (POP)

    31. Great Nigeria Party (GNP)

    32. National Youth Alliance (NYA)

    33. National Reform Party (NRP)

    34. Patriotic Congress Party (PCP)

    35. Community Alliance Party (CAP)

    36. Grassroot Alliance Party (GAP)

    37. Advance Nigeria Congress (ANC)

    38. All Nigerians Alliance (ANA)

    39. Team New Nigeria (TNN)

    40. All Labour's Party (ALP)

    41. New Green Generation Coalition Party (NGOCP)

    42. New Green Congress (NGC)

    43. New Green Coalition Party (NGCP)

    44. About All (Nigerian)

    45. Nigerian Liberty Movement

    46. National Democratic Party

    47. Citizen United Congress

    48. All Gender Party

    49. Polling Unit Ambassadors of Nigeria

    50. Village Intelligence Party

    51. Great Transformation Party

    52. Alliance Social Party

    53. Nigeria Democratic Alliance

    54. New National Democratic Party

    55. Obedients Peoples Party (Not Provided)

    56. Nourish Democratic People's Congress

    57. All Youth Reclaim Party

    58. LA RIBA Multipurpose Cooperative Society

    59. Alliance Youth Party of Nigeria

    60. The True Democrats

    61. Democratic Peoples Congress

    62. National Democratic Movement

    63. Economic Liberation Party

    64. Grassroot Ambassador's Party

    65. All For All Congress

    66. People Democratic Alliance

    67. United National Youths Party of Nigeria

    68. Peoples Liberation Party

    69. Democratic Union for Progress

    70. Citizen Democratic Alliance

    71. African Action Group

    72. Patriots Alliance Network

    73. Democratic Leadership Party

    74. Pink Political Party

    75. Young Motivation & Awareness for Development Forum

    76. Access Party

    77. Youth Progressive Empowerment Initiative

    78. Grassroot Ambassadors' Party

    79. Republican Party of Nigeria

    80. Sceptre Influence Party

    81. Young Democratic Congress

    82. Patriotic Nigerians Party

    83. Far-Right Party

    84. Democratic People's Party

    85. United Citizens Congress

    86. Reset Nigeria

    87. New Nigeria Democratic Party

    88. Save Nigeria People Party

    89. Above All

    90. Alliance for Youth and Women Party

    91. Rebuild Nigeria Group

    92. Citizen Progressive Party

    93. Good Guardian Party

    94. Abiding Greatness Party

    95. Patriotic Peoples' Party

    96. Development & Freedom Party

    97. Peace, Unity & Prosperity Culture

    98. The Populist Party

    99. New Nigeria Leadership Party

    100. All Allies Alliance

    101. National Action Network

    102. Coalition for Nigerian Democrats

    103. Republican Party of Nigeria

    104. Abundance Africa Alliance

    105. Freewill Humanitarian Party

    106. Peoples Emancipation Party

    107. Peoples Liberation Congress Party

    108. Peoples Democratic Congress

    109. All Democratic Alliance

    110. Advanced Democratic Alliance (ADA)

  13. Ndị uweojii na-agba mbọ ikposa ndị na-eme ngagharịiwe na Kenya

    Ndị uweojii agbaala puku kwuru puku ndị Kenya na-eme ngagharịiwe na Naịrobi nakwa obodo ndị ọzọ anwụrụ anyammiri.

    Ngagharịiwe ahụ bụ iji cheta ndị e gburu oge e mere ngagharịiwe megide ụtụisi na mba ahụ n’afọ gara aga.

    E zipụla ọtụtụ ndị uweojii na Naịrobi nakwa obodo ndị ọzọ a ma ama.

    Gọọmenti Kenya enyela iwu ka ụlọmgbasaozi redio na ndị nke onyonyoo kwụsị ịgbasa ka ngagharịiwe ahụ si aga.

    E mechiela ụlọakwụkwọ na ụlọazụmahịa dị iche iche n’ihi ụjọ na ọgbaaghara nwereike itiwapụ.

    Ndị uweojii na-adọ aka na ntị megide mbọ ọbụla a ga-agba ịzọrọ njem ngagharịiwe ahụ gaa n’obi ọchịchị onyeisiala maọbụ n’ụlọ omeiwu.

    Onyeisiala Kenya bụ William Ruto enyela iwu ka ndị uweojii chekwaa mba ahụ ma kpuchite ndụ onye niile.

  14. NDLEA ejidela ihe karịrị otu nde kilo ọgwụ ọjọọ n'Abịa steeti na ndị a na-enyo enyo mmadụ 222

    Ụlọọrụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) ekwuola na ha jidere ihe karịrị otu nde kilo ọgwụ ọjọọ ma jidekwa narị mmadụ abụọ na iri abụọ na abụọ (222) ndị a na-enyo enyo n’Abịa steeti n’ime otu afọ.

    Ụlọọrụ ahụ kwupụtara nke a n’obodo Aba mgbe ha na-agwa ndị ntaakụkọ okwu dịka a na-eme emume ụbọchị ncheta maka ọgwụ ike nke afọ 2025.

    Onyeisi ndị NDLEA na steeti ahụ Chigbu Odoemelam Chilee kwuru na n'agbanyeghị njide ndị ahụ niile, na ụlọọrụ ahụ na-agbasi mbọ ike iji gbochie ire na ṅụọ ọgwụ ọjọọ na steeti ahụ.

    O kwukwara na ọgwụ ike dị iche iche e jidere na steeti ahụ gụnyere kannabis, sativa, heroin, ntụ, mkpụrụmmiri, diazepam, kodeine na ndị ọzọ.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ọnụọgụgụ ndị ụlọọrụ ahụ jidere maka ire na ịṅụ ọgwọ ọjọọ ya na ndị mmadụ na-abịa maka ndozigharị ndụ ahụ, gosiri na Abịa steeti nwere nnukwu ihe ịma aka ihu banyere ịzụ ahịa na ịṅụ ọgwụ ike.

    Chilee kwuru na ọ bụ obodo Aba na isi obodo Ụmụahịa bụ karịrị ebe ndị a na-ahụ karị ọgwụ ike ndị ahụ.

    Chilee kwuru na e nwere naanị otu ebe ndozigharị ndụ ndị ọgwụ ike riri ahụ na steeti ahụ dịka ọ gbakwunyere na aka na-achị steeti ahụ bụ Alex Otti akwadola iguzobe ebe ọzọ na steeti ahụ.

  15. Ụlọomeiwu Naịjirịa agbatịala mmefu ego afọ 2024 ruo Disemba 2025

    Ụlọomeiwu Naịjirịa akwadola ịgbatị mmefu ego nke afọ 2024 ruo 31 Disemba 2025.

    Osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu sinetị bụ Sinetọ Barau Jibrin, onye nọ n’isi oche na nzukọ ndị omeiwu malitere n’ụbọchị Tuzde 24 Juun 2025, kwupụtara ndọtị nke iwu ntinye ego ahụ dịka agụchara ya nke mbụ, nke abụọ na nke atọ.

    Onyeisioche nke kọmitii Sinetị na-ahụ maka mmefu ego bụ Sinatọ Adeola Olamilekan, kwuru na nsogbu mmefu ego nke Naịjirịa na ọnụ ọgụgụ nke ọrụ arọzubeghị arọzu chọkwuru oge ọzọ.

    O kwuru na ọ bụrụ na a gbatịghị oge ọrụ ndị ahụ, na a ga-enwe ọtụtụ akụrụngwa arụchaghị arụcha na Naịjirịa niile.

    Ọ gara n’ihu kwuo na Naịjirịa enweghị ego iji mezuo ọrụ ndị o wepụtara ọ ga-eme n’afọ 2024.

  16. Trump na-ekwusị ike na ndịagha Amerịka gbariri akụrụngwa nuklịa Ịran n'agbanyeghi ozi kwuru na emebeghị ya

    Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump na-ekwusị ike na ndịagha Amerịka gbariri akụrụngwa nuklịa nke Ịran n’agbanyeghị na ozi ọhụrụ na-ekwu na emebighị akụrụngwa ahụ.

    Ozi ahụ na-eme ka ụwa nwee obi abụọ banyere mpụtara ọrụ ndịagha mba Amerịka mere n’akụrụngwa Ịran.

    Ntụle ọnọdụ mmebi akụrụngwa nuklịa Ịran ahụ nke ozi ahụ sitere n’ụlọọrụ nchekwa Pentagon's Defence Intelligence Agency na-ekwu na mwakpo ahụ nke mba Amerịka mere n’akụrụngwa nuklịa Ịran ga-eme ka mba Ịran nwee nlaghachi azụ "ọnwa ole na ole".

    Ka ọ dị ugbua, nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ dị n’etiti Izrel na Ịran nwereike ịkwụdo dịka mba abụọ ahụ kwetara na ọ malitela.

  17. Ụtụtụ ọma dị be anyị

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde 25 Juun 2025. Ekpere anyị bụ ka onye ọ bụla zute ihe ọma n’ụbọchị taa.

    Biko, sonyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo dịka anyị na-ewetara gị akụkọ ihe na-eme n’ala Igbo, Naịjirịa nakwa ụwa niile. Ndewo!

  18. E gbuola ọtụtụ ụmụaka na mwakpo e mere n’ụlọọgwụ Sudan – Onyeisi WHO

    E meela ajọ mwakpo jọgburu onwe n’ụlọọgwụ Sudan nke gburu mmadụ ruru 40 nke ọtụtụ n’ime ha bụ ụmụaka na ndị ọrụ ahụike.

    Onyeisi otu World Health Organization Tedro Adhanom Ghebreyesus kwupụtara nke a n’akara X ya ma kpọọ oku ka a kwụsị ịwakpo ogige ahụike n’ụwa niile.

    Mwakpo ahụ mere n’ụlọọgwụ Al-Mujlad Hospital dị n’obobdo Muglad ụbọchị Satọde 21 Juun, 2025.

    Otu Rapid Support Forces (RSF) na otu abụọ ndị ọzọ na-ahụ nchekwa ikike ndị obodo, kwuru na ọ bụ ndịagha Sudan mere mwakpo ahụ, mana ndịagha ekwubeghị ihe ọbụla banyere ebubo a.

    Kemgbe agha Sudan malitere n’ọnwa Eprel 2023, ọtụtụ mmadụ nọ na’ahụhụ ebe otu UN kwuru na ọ bụ ọnọdụ gbata gbata kachasị njọ n’ụwa niile.

    Otu Sudan Doctors Network kwuru na ụlọọgwụ Al-Mujlad Hospital dị na Muglad bụ naanị ụlọọgwụ na-arụ ọrụ na mpaghara ahụ niile.

    Ụlọọrụ WHO kwuru na n’ime mmadụ 40 ahụ nwụrụ, isii bụ ụmụaka ebe ise n’ime ha bụ ndị ọrụ ahụike. Ha kwuru na ọtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ site na mwakpo ahụ.

  19. Onyeisiala Trump adọọla Izrel na Ịran aka ma bo ha ebubo imetọ nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ

    Onyeisiala Donald Trump na-achị Amerịka adọọla Izrel na Ịran na ntị ma boo ha ebubo imetọ nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ.

    Izrel kwuru na ha tụrụ ogbunigwe n’Ịran ma kwuo na ha akwụsịtụla mwakpo ọbụla dịka Praịm Minista bụ Benjamin Netanyahu na Onyeisiala Trump nwere mkparịtaụka.

    Ndị bi n’Ịran gwara ndị ntaakụkọ BBC Persian na ha nụrụ nnukwu ụda.

    Izrel kwuru na Tehran tụrụ ha ogbunigwe dịka e nwere nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ ahụ mana Ịran gọnarịrị ebubo ahụ.

  20. ‘Atụla bọmbụ ndị ahụ’ - Onyeisiala Trump adọọla Izrel aka na ntị

    Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump agwala mba Izrel ka ha ghara ịtụ bọmbụ n’Ịran dịka Izrel nyere iwu ka a tụọ ogbunigwe n’Ịran maka ebubo imebi nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ.

    Onyeisiala Trump ji okwu mkparị were katọọ Izrel na Ịran mgbe mba abụọ ahụ boro ibe ha ebubo imebi ihe dị na nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ.

    Nke a na-abịa dịka Izrel kwuru na ha gbaturu ogbunigwe mba Ịran tụrụ n’Izrel dịka o ruru awa ole na ole e nwere nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ.