You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Amerịka ga-ewepụrịrị mwakpo tupu a malite mkparịtaụka ọhụrụ - Minista Ịran gwara BBC

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Juun 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Gọọmenti Naịjirịa agwala mba Amerịka na e nweghị ihe iyi egwu dị n’Abuja

    Gọọmenti Naịjirịa ekwuola na e nweghị ihe iyi egwu ọbụla dị gburugburu isi obodo mba ahụ bụ Abuja.

    Gọọmenti Naịjirịa kwupụtara nke a n’ụbọchị Mọnde 23 Juun 2025 oge ha na-azaghachi ndụmọdụ Ụlọnnọchiteanya mba Amerịka dị na Naịjirịa nyere ụmụafọ ha ka ha zeghara akụrụngwa ndịagha na ụlọọrụ gọọmenti niile dị n’Abụja.

    Na nzaghachi, Gọọmenti Naịjirịa gara n’ihu kwuo na Abuja nwere ezi nchekwa maka ụmụafọ Naịjirịa na ndị ọbịa niile.

    Ozi Minista na-ahụ maka mgbasaozi bụ Mohammed Idris wepụtara kwuru na Gọọmenti Naịjirịa anụla maka ndụmọdụ Ụlọnnọchiteanya mba Amerịka nyere ndị ọrụ ha nakwa ezinaụlọ ha ka ha zeghara ogige ndịagha nakwa akụrụngwa gọọmenti niile dị n’Abuja.

    O kwuru na dịka Gọọmenti Naịjirịa nabatara ikike Ụlọnnọchiteanya mba ndị ọzọ nwere inye ụmụafọ ha ndụmọdụ, na ọ dịkwa mkpa ime ka o doo anya na Abuja nwere ezi nchekwa maka ụmụafọ, ndị bi ebi nakwa ndị ọbịa.

  2. Ụlọikpe enyeela Onyeisiala Trump ohere ịmaliteghachi mbula na mba ọzọ

    Ụlọikpe kacha elu n’Amerịka akwadola ọchịchị Onyeisiala Donald Trump n’atụmatụ ịmaliteghachi mbula ụmụafọ mba ọzọ kwagara n’Amerịka, na mba ndị abụghị nke ha.

    Onye ọkaikpe kagburu iwu ụlọikpe obere wepụtara nke kwuru na gọọmentị ga-enye ndị kwagara mba Amerịka ohere ịgwa ndị ọchịhị ihe egwu nwere ike i chere ha ma e buga ha n'obodo nke atọ.

    Ndị ọkaikpe atọ nke ụlọikpe ahụ ekwenyeghị na mkpebi nke ọtụtụ ahụ, na-ekwu na ọ bụ "ịkwụ mebi iwu ụgwọ”.

    Cheta na ikpe ahụ gbasaara ndị si mba ndị gụnyere Myanmar, Saụt Sudan, Cuba, Meziko, Laos na Vietnam kwagaa mba Amerịka bụ ndị ebulara n’ọnwa Mee n’ụgbọelu e kwuru na ọ na-aga Saụt Sudan.

    Mana ọchịchị Onyeisiala Trump kwuru na ndị ahụ bụ “ndị kasị njọ n’ime ndị kachasị njọ".

  3. Izrel eboola Ịran ebubo imebi nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ ma nye iwu ime 'mwakpo siri ike' na Tehran

    Minista na-ahụ maka nchekwa n’Izrel bụ Israel Katz eboola Ịran ebubo imebi nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ ha nwere, ihe dịka awa abụọ e jiri malite atụmatụ ahụ nke Onyeisiala Donald Trump na mba Qatar wetara.

    N’aka nke ọzọ, mba Ịran gọrọ agọ na ha atụbeghị ogbunigwe ọbụla n’Izrel kemgbe nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ ahụ malitere, dịka ụlọmgbasa ozi steeti siri kwuo.

    Katz ṅụrụ iyi iji ike megwara site ma nye iwu ime 'mwakpo siri ike' na mpaghara Tehran.

    Ụlọọrụ nchekwa n’Ịran dọrọ aka na ntị na "Izrel ga-enweta nzaghachi siri ike, nke siri ike na n’oge" ma ọ bụrụ na ha hụta mwakpo ọzọ.

    Cheta na ndị ọchịchị Ịran na mbụ kwuru na ọ ga-asọpụrụ nkwụsị ịkwa mgbọ ma ọ bụrụ na Izrel kweta ime otu ihe ahụ.

  4. Izrel na Ịran kwekọrịtara ịkwụsị ịkwa onwe ha mgbọ

    Mba Izrel na Ịran ekwekọrịtala ịkwụsị ịkwa onwe ha mgbọ dịka Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump kwuru na nkwekọrịta ahụ amalitela.

    Onyeisiala Trump gara n’ihu gwa mba abụọ ahụ ka ha ghara imebi ihe dị na nkwekọrịta ahụ.

    Ọtụtụ awa Onyeisiala Trump kwupụtachara maka nkwekọrịta ahụ, gọọmentị mba Izrel kwukwara na ha kwetara inwe nkwekọrịta ahụ ma dọọ aka na ntị na ha ga-azaghachi mmebi iwu ọ bụla n'ike.

    Cheta na mba Ịran ekwubuola na ha ga-akwụsị mwakpo ha ma ọ bụrụ na Izrel kwụsị mwakpo nke ha.

    Ka ọ dị ugbu a, Izrel kwuru na egburu mmadụ anọ na mwakpo Ịran mere n’abalị; ụlọọrụ mgbasa ozi steeti na Tehran na-akọ na "a tụrụ ogbunigwe ikpeazụ "tupu nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ ahụ amalite.

    Akụkọ kwuru na a tụrụ ọtụtụ ogbunigwe na Tehran n’abalị dịka Ịran tụrụ ogbunigwe n’ogige ndịagha dị na Qatar.

  5. Ndị be anyị, ụtụtụ ọma

    Anyị na-asị gị nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa Tuzde 24 Juun 2025.

    Ekpere anyị bụ ka ụbọchị taa mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Biko bịa nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ihe na-eme n’ala Igbo, Naịjirịa na ụwa niile ụwa.

    Udo dịrị gị!

  6. Ịran atụọla ogbunigwe n’ogige ndịagha mba Amerịka dị na Qatar

    Na nzaghachi mwakpo Amerịka wakporo akụrụngwa nuklịa ha ụbọchị Satọde 21 Juun, 2025, mba Ịran atụọla ogbunigwe ogige ndịagha mba Amerịka dịka na Katar.

    Katar kwuru na Ịran wakporo ogige ndịagha Amerịka dị n’Al Udeid ma kọwaa ya dịka ihe jogburu onwe ya.

    Akụkọ kwuru na a gbaturu ogbunigwe ahụ Ịran tụrụ ma kwuo enweghị onye merụrụ ahụ na mwakpo ahụ.

    Ka ọ dị ugbua, mba Katar amachiela ụgbọelu ọbụla ifebata n’ogige ikuku ha ebe a gwara ndị mba Amerịka na UK bi na Katar ka ha chekwaa onwe ha.

    Onyeisiala Trump na ndị isi ndịagha Amerịka na-enwe ọgbakọ na Washington banyere ogbunigwe ahụ.

  7. A kpọpụla ndị uweojii atọ ụlọikpe maka ọnwụ onye Kenya na-ede blọgụ

    Ndị uweojii atọ mba Kenya nọ n’ụlọikpe azara ọnụ maka ọnwụ Albert Ojwang onye na-ede blọgụ e kwuru nwụrụ n’ụlọ ndị uweojii nwụchiri na mbido ọnwa Juun, 2025.

    Ọnwụ Albert Ojwang akpalitela ngagharịiwe na Kenya ndị na-akpọ oku ka e nwee ikpe ziri ezi n’ọnwụ nwaamadi ahụ.

    A nwụchiri Ojwang dịka osote onyeisi ndị uweojii bụ Eliud Lagat nwetara akwụkwọ mkpesa ebubo na Ojwang metọrọ aha ya na soshal media.

    Ka ọ dị ugbua, Lagat arịtuola n’ọkwa ya dịka osote onyeisi ndị uweojii ebe o kwuru nay a emeghị ihe ọjọọ ọbụla.

    Ndị uweojii atọ ahụ a kpụpụrụ ụlọikpe gụnyere Samson Kiprotich, Talaam James Mukhwana na Peter Kimani nakwa mmadụ nkiti atọ ndị ọzọ.

  8. Izrel awakpola ogige akụrụngwa nuklịa Fordo mba Ịran dịka Amerịka wakpochara ha

    Izrel emeela mwakpo ọhụrụ n’okporoụzọ gawara ogige akụrụngwa nuklịa Fordo mba Ịran, nke a na-abịa n’out ụbọchị mba Amerịka wakporo ogige ahụ.

    Minista mba Izrel na-ahụ maka nchekwa mba kwuru na ndịagha Izrel ga-eme mwakpo siri ike na Tehran dịka Ịran kwuru na mwakpo ahụ metụtara ụlọmkpọrọ Evin prison.

    Onyeisiala Trump na-achị Amerịka kwuru na e nwereike inwe mgbanwe n’ọkwa ọchịchị Ịran.

    Cheta n Onyeisiala Trump kọwara mwakpo ahụ Amerịka wakporo Ịran ụbọchị Sọnde, 22 Juun, 2025 dịka nke nwere nnukwu mmetụta ebe Ịran kwuru na ha ga-azaghachi mwakpo ahụ.

  9. Ndị ahịa ebuliela ọnụahịa mmanụ ụgbọala n'ọdọmmanụ n'ihi ọgbaaghara Middle-East

    Ndị ahịa ebuliela ọnụahịa a na-ere mmanụ ụgbọala n'ọdọmmanụ nakwa n'ọdụmmanụ ụgbọala dịka nsogbu dị n’etiti Ịran na Izrel na-aga n’ihu na mpaghara Middle East.

    Ka ọ dị ugbua, ọnụahịa mmanụ Brent bụ $77.88 ebe WTI bụ $74.67 dịka ọdọmmanụ ndị nọ na Naịjirịa malitere ịgbanwe ọnụahịa ha.

    Akụkọ Petroleumprice wepụtara na-egosi na ndị nwere ọdọmmanụ ebuliela ọnụahịa mmanụ ụgbọala na mmanụ dizel ma kwuo na ọnụahịa ihe abụọ a nwereike ịgbagokwu elu ma ọ bụrụ na ọgbaaghara dị n’etiti Izrel na Ịran akwụsịghị.

    Ọnụahịa ọdọmmanụ e wepụtara n'ụbọchị 20 Juun 2025 kwuru na a na-ere mmanụ ụgbọala n'ọdọmmanụ ndị nọ na Legọs nakwa nke ụlọọrụ Dangote n'ọnụego ₦880 na ₦1,055.

  10. Amerịka arịọla Chaịna ka ọ kwụsị Ịran imechi ụzọ ụgbọmmiri "Strait Hormuz"

    Odeakwụkwọ nke gọọmentị Amerịka Marco Rubio akpọkụọla mba Chaịna ka ha kwụsị mba Ịran igbochi ụzọ ụgbọmmiri “Strait nke Hormuz”, bụ otu n’ime ụzọ ụgbọmmiri dị oke mkpa n’ụwa niile.

    O kwuru nke a dịka ụlọmgbasaozi obodo Press TV kọwara na ndị omeiwu akwadola atụmatụ imechi ụzọ ụgbọmmiri a, mana ọ bụ kọmitii nchebe mba kasị elu “Supreme National Security Council” ga-eme mkpebi ikpeazụ.

    O kwuru na nkwụsị ọ bụla nke a ga-enye mmanụ ụgbọala ga-enwe nnukwu mpụtara maka akụnaụba.

    Cheta na Chaịna bụ mba kachasị azụ mba Ịran mmanụ ụgbọala n’ụwa niile nke pụtara na mba abụọ ahụ nwere mmekọ pụrụ iche.

    Ọzọ, ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala amalitela ịla elu karịa ka ọ dị kemgbe ọnwa ise gara aga, dịka mba Amerịka wakporo ebe mmepụta akụrụngwa nuklịa nke mba Ịran.

  11. Mmadụ asatọ anwụọla na Yukren na mwakpo ọhụrụ nke Rọshịa

    Ihe dịka mmadụ asatọ anwụọla ebe ọtụtụ merụrụ ahụ n’abalị oge Rọshịa jiri ogbunigwe na duronu wakpoo mpaghara isi obodo Kyiv, minista na-ahụ maka ime ụlọ nke mba Yukren kwuru.

    N’ozi o wepụtara na soshal midịa, Ihor Klymenko kwuru na a gbariri ebe obibi, ụlọọgwụ na nkụrụngwa eji agba bọọlụ.

    Ihe dịka mmadụ isii ndị nwụrụ anwụ nọ n'ụlọ elu dị elu n'isi obodo Kyiv, onyeisi obodo Kyiv Vitaliy Klitschko kwuru ma gbankwunye na mmadụ iri abụọ na abụọ ndị ọzọ merụrụ ahụ.

    N’izu ndị adịbeghị anya, Rọshịa na-esi n’elu eme mwakpo siri ike n’obodo ndị dị na mba Yukren.

    Mana Onyeisiala Yukren Volodymyr Zelensky na-aga njem na London inwe mkparịtaụka banyere ọgbaghara ahụ n’ụbọchị Mọnde.

  12. Mmadụ atọ anwụọla dịka ha dapụrụ n’ọgbọ egwuruegwu Algeria

    Mmadụ atọ anwụọla ka ha si n’elu ọgbọ egwuruegwu mba Ọljirịa dapụ oge e gbuchiri asọmpi bọọlụ.

    Ọ bụ Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na mba ahụ kwupụtara nke a.

    Ọtụtụ ndị ọzọ merụkwara ahụ oge ihe mgbochi dị n’ọgbọ egwuruegwu ahụ dara dịka ndị nkwado na-aṅụrị ọṅụ.

    Ụlọmgbasaozi dị na mba Ọljirịa mere ka anyị mata na ọ bụ n’ọgbọ egwuruegwu 5 July ka ọdachi ahụ mere.

    Mịnịstrị ahụike gara n’ihu kwuo na mmadụ karịrị 70 na-anara ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ dịka a tọhapụkwara ụfọdụ n’ime ha ka ha laa.

    Ụlọmgbasaozi Reuters kwuru na ndị ọgbaabọọlụ na ndị ọrụ otu egwu bọọlụ MC Alger agaala n’ụlọọgwụ inye ndị merụrụ ahụ ọbara.

  13. Trump chere na a ga-enwe mgbanwe ọchịchị n'Ịran dịka Tehran ṅụrụ iyi ịzaghachi mwakpo Amerika

    Onyeisiala Donald Trump ekwuola na e nwereike inwe mgbanwe ọchịchị n’Ịran dịka mba Amerịka gbariri ụlọọrụ akụrụngwa nuklịa ndị Ịran.

    N'agbanyeghị nke a ụlọọrụ UN kwuru na ha achọpụtabeghị ọnọdụ mgbari ahụ nwere n’ebe mmepụta nuklịa nke Ịran.

    Onyeisiala Trump gara n’ihu kwuo: "Ọ bụrụ na ọchịchị Ịran dị ugbua enweghị ike ime Ịran ka ọ dị mma ọzọ, gịnị kpatara na a gaghị enwe mgbanwe ọchịchị?

    Minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofesi n’Ịran nọ ugbua na Rọshịa ka ya na Onyeisiala Putin nwee nzụkọ banyere ihe ịma aka na ihe iyi egwu ahụ.

    N’aka nke ọzọ, e kwuru na odeakwụkwọ mba ofesi nke UK na-agba mbọ ịhụ n’Ịran emeghị ka ọgbaghara bawanye na mpaghara ahụ site na nzaghachi ya.

    N’abalị, Izrel tụrụ nnukwu ogbunigwe na mwakpo akụrụngwa ndịagha Ịran dịka ndị Ịran gbara naanị otu ogbunigwe n’Izrel.

    Ka ọ dị ugbua, Amerịka na-arịọ Chaịna ka ọ gbaa mbọ ịhụ n’Ịran emechighị Strait Hormuz, nke bụ ụzọ ụgbọmmiri dị oke mkpa na mpaghara ahụ.

  14. Praịm Minista UK akpọọla oku mkparịtaụka udo dịka Amerịka gbariri akụrụngwa nuklịa Ịran

    Praịm Minista UK Keir Starmer adọọla aka na ntị n’agha nwereike ịmụbawanye na mpaghara etiti ọwụwa anyanwụ nke ụwa “Middle East” na ebe ndị ọzọ, dịka ọ kpọrọ oku mmalite mkparịtaụka udo mgbe Amerịka gbaririchara akụrụngwa nuklịa Ịran n’abalị Satọde 21 Juun 2025.

    Praịm Minista Keir kwuru na UK etinyeghị aka n’ihe mba Amerịka mere mana a gwara ya maka ya tupu oge ahụ e ruo.

    N’aka nke ọzọ, gọọmentị UK na-akwado iji ụgbọelu ebulata ụmụafọ Briten niile nọ n'Izrel n’izu na-abịa abịa.

    Ha ngwara ụmụafọ Briten ka ha debanye mmasị ha iso ụgbọelu ahụ lọta na fọm dị n’ịntanetị mana a gwara ha ka ha ghara ịga ọdụ ụgbọelu karịa ma a gwara ha.

    Praịm Minista gwara ụmụafọ Briten na gọọmentị ya na-eme ihe ọbụla iji weta udo na mpaghara ahụ.

    Ọ gbakwụnyere na gọọmentị ya na-eme ihe niile dị mkpa iji chebe ọdịmma UK na mpaghara ahụ.

    O kwuru na ya ga-emecha bụrụ onyeisi oche na nzukọ nzaghachi Cobra nke mberede.

  15. Ndị Izrel enwetala ozu mmadụ atọ eji eji na Gaza

    E nwetala ozu mmadụ atọ ndị Izrel eji eji na Gaza, Praịm Minista Izrel Benjamin Netanyahu kwuru.

    O kwuru na e nwetara ozu Yonatan Samrano, Ofra Kedar na Shai Levinson n’ụbọchị Satọde 21 Juun 2025 oge ndịagha Izrel nọ n’ọrụ.

    "Ana m ekele ndị ọchịagha na ndịagha anyị maka ịrụ ọrụ nke ọma, maka mkpebi siri ike na obi ike ha," Netanyahu kwuru na nkwupụta.

    Cheta na ndịagha nchekwa Izrel enwetala ozu mmadụ asatọ ndị eji eji na Gaza kemgbe ọnwa a.

    Netanyahu kwuru, "Mbuso agha ịweghachi ndị a tọọrọ na-aga n'ihu ma na-eme n'otu aka ahụ site na mbuso agha megide Ịran."

    "Anyị agaghị ezu ike ruo mgbe anyị kpọlatachara ndị niile a tọọrọ n'ụlọ - ma ndị dị ndụ ma ndị nwụrụ anwụ."

  16. Mmadụ asatọ anwụọla n’ihe mberede ụgbọelu “ikuku ọkụ balloon” na Brazil

    Ihe ruru mmadụ asatọ anwụọla n’ihe mberede ụgbọelu “ikuku ọkụ balloon” na mpaghara ndịda Brazil, dịka Gọvanọ nke Santa Catarina steeti kwuru.

    Ọ bụ mmadụ iri abụọ na otu banyere n’ime ụgbọelu “ikuku ọkụ balloon” ahụ n’obodo Praia Grande n’ọtụtụ Satọde, dịka Jorginho Mello kwupụtara n’akara mgbasa ozi X.

    Mmadụ iri na atọ gụnyere onye ọkwọ ụgbọelu ahụ ji ndụ ha pụta mana onweghị onye n’efu efu, ụlọọrụ mgbasa ozi nke gọọmentị steeti kwuru.

    Ụlọọrụ ụgbọelu mba Brazil National Civil Aviation Agency (Anac) kwuru na ọ na-eme ihe niile dị mkpa ịchọpụta ọnọdụ ụgbọelu na ndị ọrụ ụgbọelu ahụ.

  17. Trump achụọla ọtụtụ ndị ntaakụkọ Voice of America

    Ọchịchị Donald Trump achụọla ọtụtụ ndị ntaakụkọ fọdụrụ n’ụlọmgbasaozi Voice of America (VOA).

    Dabere n’ọnọdụ a, Onyeisiala Amerịka emechiela ụlọmgbasaozi ahụ gọọmenti Amerịka na-akwado n’ụzọ ego.

    Ọchịchị Amerịka kwuru na a chụrụ ndị ntaakụkọ ahụ n’ihi na ụlọmgbasaozi VOA bụ “nke juputara na mmefu, amaghị ọrụ na enweghị eziokwu”.

    Nnukwu onye ntaakụkọ VOA bụ Steve Herman kọwara mmechi ụlọmgbasaozi ahụ e hibere n’oge Agha Ụwa nke Abụọ iji buo agha megide okwu ụgha nke Nazi, dịka “mmadụ ịgba onwe ya mgba okpuru nke ahụtụbeghị ụdị ya mbụ”.

    N’ime ndị a chụrụ n’ọrụ gụnyere ndị ntaakụkọ Persia gara ezumike ma laghachi izuụka gara aga, oge Izrel wakpochara mba Ịran.

  18. Amerịka agbariela ebe atọ Ịran kachasị nwee ngwaagha nuklia

    Mba Amerịka etinyela onwe ya n’agha dị n’etiti Ịran na Izrel dịka ha agbariela ebe atọ Ịran kachasị nwee ngwaagha nuklia.

    Mana Ịran gara n’ihu dọọ Amerịka aka na ntị na mpụtara mwakpo ahụ ga-adịgịde.

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump kwuru na mwakpo ahụ "e kpochapụla kpamkpam" ụlọọrụ mmepụta ngwaagha nuklia nke Ịran.

    Ọ gakwara n’ihu gwa mba Ịran ka ha mee udo maọbụ mwakpo nke ga-abịa n’ihu ga-akawanye njọ.

    Na nzaghachi, minista na-ahụ maka mba ofesi n’Ịran katọrọ mwakpo Amerịka ma dọọ aka na ntị na mpụtara ya ga-dịgịde.

    Ka ọ dị ugbua, a chọpụtabeghị mmụba nke radieshon, dịka ndị na-ahụ maka nuklia nke ụlọọrụ UN si kwuo.

    N’aka nke ọzọ, a nụkwara ọtụtụ ntiwa na mpaghara Jerụsalem ọtụtụ awa mgbe mwakpo ahụ gachara, dịka ndịagha Izrel kwuru na ha gbaturu ogbunigwe ndị Ịran.

  19. Ndị be anyị, ụtụtụ ọma nụ.

    Anyị na-asị nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa Sọnde 22 Juun 2025.

    Dịka ụnụ na-anọnyere anyị, ekpere anyị bụ ka ụbọchị taa mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Anyị ga-aga n’ihu na-ewetara ụnụ akụkọ ihe n’ala igbo, Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Udo dịrị ụnụ!

  20. Izrel kwuru na ha egbuola onye nchịkọta ndịagha Ịran na Hamas

    Izrel kwuru na ha egbuola nnukwu ọchịagha mba Ịran, bụ onye nyeere Hamas aka kpaa nkata maka mwakpo ha mere na ndịda Izrel n’ụbọchị 7 Ọktoba 2023.

    Dịka Izrel siri kwuo, e gburu nnukwu ọchịagha ahụ oge ha tụrụ ogbunigwe n’obodo Qom n’ụbọchị Satọde 21 Juun 2025.

    Otu nchekwa Izrel bụ Israel Defense Forces (IDF) kwuru na ogbugbu ha gburu Saeed Izadi gosipụtara ihe gbara ọkpụrụkpụ n’agha ahụ na-aga n’ihu ugbua.

    Onyeisi otu IDF bụ Eyal Zamir kwuru na Izadi bụ “otu n’ime ndị mere atụmatụ” maka mwakpo ahụ, bụ nke e jiri gbuo mmadụ ruru 1,200, tọrọ ọtụtụ ndị ọzọ ma jichie ha na Gaza.

    Zamir kwuru n’ụbọchị Satọde sị: “Ọbara puku kwuru puku ndị Izrel dị Izadi n’aka.”

    Ka o sina dị, Ịran ekwupụtabeghị ma ọ bụ eziokwu na e gburu Izadi mana ha anọrọla n’oge gara aga kwuo na aka ha adịghị na mwakpo Hamas mere n’Izrel.