You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Off Cycle elections 2023: Diri ekelela ndị Bayelsa maka mmeri ya

Ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Kogi, Bayelsa na Imo steeti ka o si aga.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chimezie UcheAgbo, Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. Inec amalitela nyocha banyere nrụrụaka na ntuliaka Kogi steeti

    Ngalaba na-elekọta ntuliaka na Naịjirịa bụ INEC n'ịchafụ ekwuola na ndị isi ọrụ ha amalitela ịnyocha akụkọ na-efegharị maka nruruaka n'ebe akpọrọ Ogoro/Magogo dị na Kogi steeti.

    Inec kwuru nke a dịka ozi kwuru ozi na-ebo ebubo na ndị ọrụ ngalaba ahụ wepụtara akwụkwọ mpụtara nke ederela ihe na ya.

    “Anyị anụla ozi nke na-efegharị na achọpụtara akwụkwọ mpụtara nke ederela ihe na ya kpuchiri ụfọdụ ọgbọ ntuliaka dị na Kogi steeti" ka Inec kwuru.

    Cheta na onye na-azọ ọkwa Gọvanọ n'aha otu PDP na steeti ahụ bụ Dino Melaye etibuola mkpu na ntuliaka ahụ na-aga ihu n'okpuruọchịchị Ogori Magogo emebiela dịka ndị ọrụ Inec na-eme nrụrụaka.

    Nke a na-abịa dịka otu otu na-ahụ amaka ọdimma ndị mmadụ gwara Inec ha lebanye anya n'akụkọ nrụrụaka na-eme n'ụfọdụ ọgbọ ntuliaka dị na Kogi steeti.

    Yiaga bụ otu ahụ kwuru na ha nwetara ozi na o nwere ụfọdụ akwụkwọ mpụtara nke edere na otu otu ndọrọndọrọ emeriela n'agbanyeghi na emechabeghi ntuliaka.

    Nke a na-eme n'ọgbọ ntuliaka dị na Eni nọ n'okpuruọchịchị Ogori/Magogo.

  2. Gọvanọ Bayelsa steeti bụ Duoye Diri atụola vootu ya

    Aka na-achị Bayelsa steeti bụ Duoye Diri atụọla vootu nke ya n'ọgbọ ntuliaka dị na Kalama-Owei wari dị n'okpuruọchịchị Kolokuma/Opokuma na steeti ahụ.

    Duoye Diri banyere ọkwa ọchịchị dịka o ụlọikpe kpebiri na ọ bụ ya meriri ntuliaka e mere n'ọnwa Nọvemba afọ 2019 ma chụpụ David Lyon nke onye APC n'oche.

    Ọ na-azọ ọkwa a nke abụọ ya n'aha otu PDP.

  3. Ị ma ndị nọ n'isi ọgụ mkpi taa?, Lee aha ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo, Bayelsa na Kogi taata

    N'Imo steeti

    Hope Uzodinma nke All Progressives Congress (APC)

    Athan Achonu nke Labour Party (LP)

    Samuel Anyanwu nke Peoples Democratic Party (PDP)

    Anthony Ejiogu nke All Progressives Grand Alliance (APGA)

    Ben Uche Odunze nke New Nigeria People's Party (NNPP)

    Obinna Bright Ekwebelem nke Social Democratic Party (SDP)

    Jack Ogunewe nke Action Alliance (AA)

    Na Kogi steeti

    Dino Melaye PDP

    Ahmed Usman-Ododo APC

    Murtala Ajaka SDP

    Na Bayelsa steeti ndị na-azọ bụ

    ADC - Kalango Stanley Davies

    ADP - Oguara Nengimonyo

    APC - Timipre Sylva

    APGA - Subiri Waribodei Joseph

    APM - Oshariken Saturday

    APP - Ogege Kemelayefa Mercy

    BP - Ben Victor Magbodo

    LP - Eradiri Udengmobofa

    NNPP - Azebi Bestman Ayabeke

    NRM - Micah Akeems

    PDP - Diri Douye

    PRP - Ozato Erepadei Erepadei

    SDP - Osuluku Binalayefa

    Zenith Labour Party (ZLP) - Simeon Imomotimi Karioku

  4. Ndị agha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ nọsi ike na Kogi

    Ndị agha nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ kwụ chịm na Lokoja bụ isiobodo Kogi steeti dịka mmachi ngagharị maka ntuliaka na-aga n'ihu.

    BBC chọpụtara na n'agbanyeghị na ebe niile dara jụụ, o nwerekwere ka ihe si kwụrụ.

    Gbado anya ebe a maka akụkọ ndị ọzọ si ebe ahụ apụta.

  5. Ntuliaka amalitela n'uju n'Imo, Kogi na Bayelsa

    Ndị mbụ pụtara ime ntuliaka atụola vootu ha n'Ikenegbu dị n'Imo steeti na Kogi nakwa Bayelsa steeti.

    Lee ka o si aga

  6. Ụtụtụ ọma nu o!!!!, Udo diri unu niile!

    Taata bụ ụbọchị ntuliaka Imo, Kogi na Bayelsa soro anyị ka anyị na-enye unu akụkọ gbasara ihe niile na-akpọtụ ebe ndị a

  7. Etu ụmụafọ Imo Steeti si ata ahụhụ n'ihi enweghi ọkụ latrik kamgbe NLC gbara abụbụọrụ

  8. Onye ọbụla chọrọ ibute ọgbaaghara na ntuliaka Imo steeti, ga-ahụ ihe o mere onwe ya - Ndị uweojii

    Onyeisi ndị uweojii na-ahụ maka nchekwa na ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo steeti bụ Frank Mbah, ekwela nkwa nchekwa zuru oke n'oge ntuliaka ahụ.

    Mbah kwere nkwa a dịka ọ na-agwa ndị uweojii okwu n'isi ụlọọrụ ha dị n'Owere n'ụbọchị Fraịde.

    Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha rube isi n'iwu na-achịkọta ntuliaka ahụ ma zeere imenyere onye ọbụla maọbụ imegide onye ọbụla.

    Cheta na onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Kayode Egbetokun kwuru na ha ga-eziga ndị uweojii ọnụọgụgụ ha dị 25,565 maka iweta nchekwa na ntuliaka Imo steeti.

    Nke a gunyere ndị Kọmishọna 15, na Deputy Kọmishọna 29, na ndị Assistant Kọmishọna 40 iji hazie ntuliaka ahụ.

  9. O nweghi mgbe m ji rituru Uzodimma - Samuel "Samdaddy" Anyanwu

    Onye na-azọ ọkwa Gọvanọ n'Imo steeti n'aha otu PDP bụ Samuel Nnaemeka Anyanwu ekwuola na o nweghi mgbe o ji riruru Hope Uzodimma bụ Gọvanọ n'ịzọ ọkwa ahụ.

    O kwuru na ihe onyonyo na-efegharị na-ekwu na o mere nke a bụ adigboroja.

    N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Ikenna Onuoha wepụtara, ọ sị "anyị anụla ma hụ otu ihe onyonyo na-efegharị na soshal midi na-ekwu na Samuel Anyanwu a ma dịka Samdaddy akwụsịla ọsọ ịnweta oche Gọvanọ. Ihe onyonyo a bụ adigboroja bu okwu asị na-achọkwa ịkwahie uche ndị mmadụ ma bụrụkwa ihe enweghi isi ."

    Ha tụkwara Gọvanọ Hope Uzodimma aka na ọ ma anya onyonyo ahụ na-efegharị ma na-ekwu na o si ya n'aka.

    "I lee onyonyo ahụ anya ọfụma, ị ga ahụ na ọ bụ aghụghọ rụrụ ya arụ iji mee uche Hope Uzodimma" bụkwa ihe ọzọ ha kwuru.

    O kwuru na Anyanwu kwụsị ike maka ntuliaka ahụ ga-eme n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba ma kwuo na o nweghi mgbe echiche ịwepu onwe ya n'ọsọ oche Gọvanọ ji bata ya uche.

    Anyị na-agba mbọ ịnụrụ olu Hope Uzodimma nakwa otu ya bụ APC gbasara akụkọ a.

  10. Imo Election 2023: Samdaddy, Uzodimma, Athan, Ejiogu na ndị ọzọ na-azọ ọkwa Gọvanọ

  11. Ọ bụghị naanị onye nọbụrụ n’ọchịchị maara ka e si achị obodo – Obinna Ekwebelem

    Onye ji aha Social Democratic Party (SDP) azọ ọkwa Gọvanọ Imo steeti bụ Obinna Bright Ekwebelem akọwaala ebumnuche ya n’ebe ndị Imo steeti nọ.

    Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Ekwebelem kwuru na ihe mbụ ọ ga-eme ma o merie ma banye n’ọkwa gọvanọ Imo steeti bụ ihiwe kọmitii ga-ahụ maka ọzụzụ ndị nchekwa n’okpuruọchịchị niile nke steeti ahụ.

    O kwuru na ọ ga-ehiwe ihe a kpọrọ ‘youth hub’ ga-elekọta ndị ntoroọbịa, nye ndị gụrụ akwụkwọ ọrụ ma zụọ ndị agụghị akwụkwọ n’ọrụ aka.

    Ekwebelem bụ nwafọ Okwele nke dị n’okpuruọchịchị Onuimo nke Imo steeti.

    Kirie ihe ndị o kwuru n’uju;

  12. Inec ebidola ikesa akurungwa dị mkpa maka ntuliaka Imo steeti

    Ndị ọrụ Inec n'okpuru ọchịchị dị icheiche n'Imo steeti gbakọrọ n'ụlọọrụ ụlọaku etiti nke Naijiria dị n'Owere iji buru akụrụngwa dị mkpa maka ntuliaka ọkwa gọvanọ a ga-eme n'abalị abụọ na-abia bụ ụbọchị iri na otu nke ọnwa Nọvemba 202

    Ndị ntaakụkọ, ndị otu pati dị icheiche, na ndị na-elekọta etu ntuliaka si aga, a na-akpọ election observers nọcha ebe ahụ iji hụ etu ihe si aga.

    N'okwu ya, onyeisi Inec na-elekọta mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijiria bụ Kenneth Ukeagu, nakwa onyeisi Inec Imo steeti bụ Sylvia Agu kwekwara nkwa na Inec adịla nnọọ njikere maka ntuliaka nke ụbọchị Satọde, ma kpokuo ndị Pati dị icheiche ka ha rube isi n'usoro niile iji nwee udo na ntuliaka ahụ.

  13. Aga m akwụ ezinaụlọ ndị ojiegbe gburu ụmụ ha n’Imo Steeti ego iti aka n’obi – Ben Uche Odunze

    Ben Uche Odunze ji aha New Nigeria Peoples Party NNPP azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti na ntuliaka a ga-eme n’ụbọchị Satọde 11 Nọvemba ekwuola ihe ọ ga-emere ndị Imo Steeti ma ọ banye n’ọchịchị ahụ.

    Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Odunze kwuru na ọ ga-akwụ ezinaụlọ ọbụla ndị ojiegbe gburu ụmụ ha na ụmụnne ha n’Imo Steeti ego iti aka n’obi.

    O kwuru na ihe kpalitere mmụọ ya ịbanye n’ịzọ ọchịchị bụ maka etu ọnọdụ akaụnaụba, ọnọdụ nchekwa nakwa ihe ndị ọzo dị na steeti ahụ.

    Na e kwesịrị inwe onye ntoroọbịa maara ihe ekwe na-akwụ ma maara uche ndị ntoroọbịa, na ọ bụ ya mere o jiri pụta.

  14. Wepụnụ onyeisi Inec Imo steeti- Ndị pati anọghị n'ọchịchị

    Otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị ịche iche abụghị nke nọ n'ọchịchị n’Imo steetị akpọọla oku ka e wepụ onyeisi ọrụ Inec bụ Sylvia Agu.

    Ha boro Agu ebubo inwe pati ọ kwụnyere na ntụlịaka na-abịa n'abalị 11 nke ọnwa Novemba, afọ 2023.

    Osote onye na-azọ ọkwa gọvano n’okpuru 'Labour Party' bụ Tony Nwulu gwara ndi ntaakụkọ na ebe onyeisi ndi uweojii Naijịrịa wepụrụ komịshọna ndi uweojii n’Imo steeti maka mkpu ndi otu ndọrọndọrọ ọchịchị tiri, na Inec kwesịrị ị wepụ onye nke ha n’Imo steetị dịka ha siri gwa ha.

    O kwuru na INEC nwere ebu m n’obi ị nyere APC aka merịe a ntụlịaka nke ana-akwado ime.

    Osote onye na-azọ ọkwa govano nke PDP bụ Onyereri, kwuru na pati ha ejirila akọ n -uche ha mara na INEC dị njikere i nyere APC aka merie na ntụlịaka nke a na-akwado.

    O kwuru na ihe mere n’Imo steeti n’oge ntụlịaka ọkwa ụlọnnochiteanya agaghị eme-ọzọ.

    Onye na-azọ ọchịchị govano n’okpuru ADP bụ Nwoga kwuru na INEC ejighị eziokwu kwado ntụlịaka ha-na akwado.

    O kwuru sị wepụ REC n’Imo steeti tụpụ ebido ntụlịaka,

    O kwukwara sị Inec wepụta akara igwe BVAS ha chọro iji mee ntụlịaka.

    Nwoga kwuru na ya nwetara ozị na Inec e tinyela akara adigboroja n’ịgwe ha chọro iji mee ntụlịaka iji nyere APC aka merie n’Imo steeti.

    Mana onyeisi APC n’Imo steeti bu Ebere Macdonald gwara ndi ntaakụkọ na ihe nile ahu ndi otu ndọrọndọroọchịchị ndi ọzọ na-ekwu abụghị eziokwu.

  15. Uzodimma, Achonu, ndị ọzọ abịaghị ọgbakọ ibinye aka na nkwekọrịta udo na ntuliaka

    Aka na-achị Imo steeti mabụru onye na-efere otu PC ọkọlọtọ na Ntuliaka ga-eme ụbọchị Satode, bụ Hope Uzodimma na ogbo ya nke Labour Party bụ Athan Achonu abịaghị ọgbakọ nkwekọrịta udo a kpọrọ na steeti ahụ taa bụ Wenezde.

    Ndị ọzọ abịaghị ọgbakọ ahụ nke otu 'National Peace Committee' hiwere gụnyereonye na-efere otu 'All Progressives Grand Alliance(APGA) bụ, Tony Ejiogu, na ogbo ya nke otu 'New Nigeria Peoples Party(NNPP), bụ Ben Odunze.

    Onye na-efere otu 'Peoples Democratic Party'(PDP) ọkọlọtọ bụ Samuel Anyanwu bịara ọgbakọ ahụ, laa, ikekwe n'ihi na ọ hụghị ndị ogbo ya si pati ndị nwere agba na steeti ahụ.

    Uzodimma, Achonu na Anyanwu zigara ndị osote ha, ha na ha so azọ ọkwa gọvanọ mana e nyeghị ha ohere ibinye aka n'akwụkwọ n'aha ndị zitere ha.

  16. Anyị dị njikere maka ntuliaka Imo steeti - Ndị uweojii

    Onyeisi ndi uweojii bụ Kayode Egbetokun ekwuola na ha bụ ndị uweojii adịla njikere maka ntuliaka Imo steeti.

    Nke a na-abịa dịka o zigara Kọmịshona ndị uweojii ruru 15, ndị enyemaka kọmịshọna ruru 40 nakwa ndị osote kọmishọna ruru 29 na nkwado ntuliaka steeti ahụ.

    Henry Okoye bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii kwuru na nke a bụ iji gosi na ndị uweojii kere nkwụcha maka ihe na-eme eme.

    Okoye kwuru na ọ bụ osote onyeisi ndị uweojii ga-elebanye anya na ntuliaka nke onye enyemaka onyeisi ndị uweojii ga-enye nkwado n'ọrụ ahụ.

    O kwukwara na e wegaala Kọmịshọna nọbu na steeti ahụ bu Mohammed Barde n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Abuja.

    "Anyị na-eme nke a iji kwado aka nkwụmọtọ nakwa ọchịchị onyekwuo uche ya n'atụmatụ ntuliaka a" ka Okoye kwuru.

    Ihe ọzọ o kwuru bụ "ọrụ anyị na ntuliaka a bụ idebe udo, anyị agaghị ekwe ka onye ọbụla jiri ọgbaghara mebie ihe ka o si aga, anyị dị njikere".

  17. NLC na TUC ga-akwụsị ọrụ ha niile n'Imo steeti ozugbo ozugbo

    Ndị otu NLC na TUC bụ otu abụọ niile jikọrọ ndị ọrụ Naịjirịa ekwola na ha ga-akwụsi ọrụ n'ebe niile n'Imo steeti bido n'etiti abalị taa.

    Emma Ugboaja bụ onye odeeakwụkwọ kachasị n'otu ahụ gwara BBC Igbo n'ekwentị na nke a bụ iji gosi iwe ha maka ahụhụ nke onyeisi ha bụ Joe Ajero gabigara n'izu gara aga.

    Ugboaja kwuru na ọ bụ ihe mwute na gọọmentị etiti ajubeghi ha ase rue ugbua maka ihe mere.

    "Ndị mba ọzọ akọọla anyị jụọ ase mana ihe dị onyeisiala mma bụ inye ya (Hope Uzodimma) ọkọlọtọ

    "Anyị chọrọ ka e nwee nyocha juru afọ banyere ọnọdụ ndị otu anyị bụ ndị ọrụ n'Imo steeti

    Anyị chọrọ nyocha zuru oke si mba ofesi n'ahụike onyeisi anyị bụ Joe Ajero" bụkwa ihe ọzọ ọ na-ekwu

    Ihe ọzọ o kwuru bụ na ha chọrọ ka akwuzuo ndị ọrụ Imo steeti niile ego ruru ha aka kama ịkpọ ha ndị ọrụ mmụọ ebe ha ka dị ndụ.

    Ndị isi otu jikọrọ ndị ọrụ Naịjirịa bụ NLC na TUC amanyela abụbụ ọrụ zuru ala Naịjirịa niile bido n'ụbọchị 14 nke ọnwa Novemba.

    Otu abụọ a ruru mkpebi a dịka ha mechara nzụkọ pụrụiche n'ụbọchị Tusde n'Abuja.

    Ha kwuru na ndị otu ha niile adịla nkwadobe maka ya bụ abụbụ ọrụ ozugbo ozugbo.

    Ha mere nke a n'ihi mmegbu nke onyeisi ha bụ Joe Ajero gabigara n'izu gara aga n'Imo steeti.

    Ha gbarụrụ ihu maka mmegbu ahụ ma bo Kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Mohammed Barde ebubo iso kpa nkata nwụchi na mmegbu Ajero nke mere n'Owere.

    Cheta na otu ahụ nyere gọọmentị abalị ise ịwepu ma gbanwee Kọmịshọna ndị uweojii ahụ dịka ha na-atụ Gọvanọ Hope Uzodimma aka na o so na nwụchi ahụ nke Uzodimma gọkwara n'onwe ya.

    Ha dọkwara aka na ntị na ha ga-amanye abụbụọrụ n'ala Naịjirịa niile maọbụrụ na anwụchighi ma kpụpụ ụfọdụ ndị ọrụ gọvanọ ha sị na aka ha dị na nwụchi ahụ ụlọikpe.

    Onyeisi ndị uweojii bụ Kayode Egbetokun ebugaala Barde n'ọkwa ọzọ ka ihe si kwụrụ ugbua.

  18. Ọgbaaghara adapụtala n'ọgbakọ Inec na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị n'Imo steeti", Ọgbaghara adaala dịka onyeisi Inec bụ mahmood Yakubu gwara ndị ntaakụkọ gbanyụọ igwe onyonyo ha.

    Onye ntaakụkọ BBC nọ n'ọgbakọ ahụ kọwara na onyeisi otu Independent National Electoral Commission bụ Mahmood Yakubu kwesiri ịnọ n'ọgbakọ ahụ mana ọ bịaghị kama o zitere onye nnọchiteanya bụ Kenneth Ukagu bụ kọmịshọna ndị Inec na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

    Dịka Yakubu bụ onye Ukagu na-anọchite kwuchara okwu, o nyere iwu ka ndị ntaakụkọ gbanyụọ igwe onyonyo ha ma kwụsị ise ihe na-eme.

    Mana ndị pati dị icheiche nọ ebe ahụ anabatachaghị atụmatụ a, nke mere na onye na-azọ ọkwa osote gọvanọ na pati People's Democratic Party PDP bụ Jones Onyeriri jụrụ ihe kpatara ụdịrị iwu a ma jụọ ka ọ bụ ihe nzuzo ka a na-eme.

    Onye na-azọkwa ọkwa osote gọvanọ na pati Labour nabatara okwu Onyriri, ndị ọzọ nọkwa na pati dị icheiche sokwara jụọ otu ajụjụ ahụ.

    Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ọgbakọ nke ngalaba na-ahzi ntuliaka bụ Inec biri n'ike n'Owere, isiobodo Imo state n'etiti Inec, APC na ndị pati ndị ọzọ.

    Onye ntaakụkọ anyị nọ ebe ihe mere kwuru na ọ bụ dịka onye nọchitere onyeisi Inec bụ Uchenna Sylva kwuru ka a gbanyụọ igwe onyonyọ (camera) na-edekọ ihe a na-eme ka ya bụ ọgbaghara dapụtara dịka Osote onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'aha otu Labour Party' bụ Tony Nwulu jụrụ, sị na e kwesịghị ikpuchi ihe ọbụla a na-eme ekwusi.

    Mgbagha ụka ahụ butere ịdụ aka na ọnụ na mkpọtụ dịka ndị pati PDP na LP kwuru na ha enweghị ntukwasiobi n'ebe onyeisi Inec Imo steeti bụ Sylvia Agu nọ.

    Ha kpọrọ oku ka Inec nke etiti wepụ ya n'ihi na ọ kwụbaghị aka ya ọtọ

  19. Ọgbaaghara adapụtala n'ọgbakọ Inec na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị n'Imo steeti

    Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ọgbakọ nke ngalaba na-ahzi ntuliaka bụ Inec biri n'ike n'Owere, isiobodo Imo state n'etiti Inec, APC na ndị pati ndị ọzọ.

    Onye ntaakụkọ anyị nọ ebe ihe mere kwuru na ọ bụ dịka onye nọchitere onyeisi Inec bụ Uchenna Sylva kwuru ka a gbanyụọ igwe onyonyọ (camera) na-edekọ ihe a na-eme ka ya bụ ọgbaghara dapụtara dịka Osote onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'aha otu Labour Party' bụ Tony Nwulu jụrụ, sị na e kwesịghị ikpuchi ihe ọbụla a na-eme ekwusi.

    Mgbagha ụka ahụ butere ịdụ aka na ọnụ na mkpọtụ dịka ndị pati PDP na LP kwuru na ha enweghị ntukwasiobi n'ebe onyeisi Inec Imo steeti bụ Sylvia Agu nọ.

    Ha kpọrọ oku ka Inec nke etiti wepụ ya n'ihi na ọ kwụbaghị aka ya ọtọ

  20. Bola Tinubu: Agụ ‘Bourdillon’ adọriela Osinbajo, Amaechi, Rochas Okorocha na ndị ọzọ