You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Off Cycle elections 2023: Diri ekelela ndị Bayelsa maka mmeri ya
Ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Kogi, Bayelsa na Imo steeti ka o si aga.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Chimezie UcheAgbo, Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo
Nnamdi Kanu ahapụghị okwu nnwereonwe Biafra, ọ ga-agba ụtụ n’ụlọmkpọrọ - Primate Ayodele
Afọ 25 ọchịchị onyekwuoucheya: Kedụ ebe ndị ji ọgbọ n'afọ 1999 nọ ugbua?
Ahọpụtala Massoud Pezeshkian dịka onyeisiala Iran
Ahọpụtala Massoud Pezeshkian dịka onyeisiala ọhụrụ nke mba Ịran dịka o merichara Saeed Jalili nke otu Conservative.
Okwe ntụliaka ahụ gosiri na Pezeshkian nwetara pasenti vootu iri ise na atọ na ụma atọ (53.3%) iji merie Jalili nwetara pasenti vootu iri anọ na anọ na ụma atọ (44.3%) nke ọnụọgụ vootu karịrị nde iri atọ (30m) a tụrụ na Ịran.
A haziri ntụliaka ahụ dịka onye bụbu onyeisiala Iran bụ Ebrahim Raisi nwụrụ na mkpọka ụgbọelu helikọpta n’ime ọnwa Mee.
Pezeshkian gbara afọ iri asaa na otu (71) bụụrụ dọkịta na-awa obi nakwa onye omeiwu Ịran tupu ahọpụta ya dịka onyeisiala.
O kwere nkwa na ya ga-eweta udo na ịdịnootu ma hụkwa na Ịran kwụsịrị iwezuga onwe ya iche na mbaụwa.
Ihe mere ndị ndu Ọwụwa Anyanwụ ji akpọ oku ka a tọhapụ Nnamdi Kanu
Nsogbu nchekwa, Nnamdi Kanu na ihe ndị ọzọ Gọvanọ ọwụwa anyanwụ kpara na nzukọ ha
Ndịagha awakpoola ndị na-eyi ndụ egwu n’Imo steeti, napụta ha ngwaọgụ dị iche iche
Ndịagha e zipụrụ maka ibu agha megide iyi ndụ egwu n’Imo steeti anwụchiela ndị ndu otu dị iche iche na-eyi ndụ egwu ma napụta ha ngwaọgụ dị iche iche.
Ụlọorụ ndịagha Naịjirịa kwupụtara nke a n’ozi ha bipụtara n’akara ọbaozi X ha n’ụbọchị Mọnde 1 Julaị 2024.
Dịka ozi ahụ siri kwuo, ndịagha na otu ọrụ nchekwa ndị ọzọ jikọtara aka wakpoo ogige ndị otu Indigenous People of Biafra (IPOB) na ngalaba ndịagha ya bụ Eastern Security Network (ESN) dị n’okpuruọchịchị Orlu n’Imo steeti ma nwụchie ndị ndu ha bụ Izuchukwu Emejuru e ji ‘Kingkong’ mara tinyekwara Chibuzor Chikwe a maara nke ọma dịka ‘Onyema’.
N’otu aka ahụ, ndịagha wakpokwara ebe mgbazo onye a na-enyo enyo ị bụ onyendụ IPOB/ESN n’Ezeinyen Okwe Umucheke dị n’okpuruọchịchị Onuimo n’Imo steeti bụ Chinemerem, onye a na-etu ‘Bam Bam’.
Ozi ahụ kwuru na ndịagha gbagburu Chinemerem oge ọ gbara mbọ i buru ngwaọgụ ya ma nwụchie ọtụtụ ndị otu ya.
Ndịagha kwuru na ha na ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu IPOB/ESN kwakọrịtara mgbọ n’ebe mgbazo ha dị n’Amausa okpuruọchịchị Okigwe n’Imo steeti nke mere ka ha ghahapụ ngwaọgụ ha dị iche iche rie mbọmbọ.
Ihe anapụtara ndị ekperima ahụ gụnyere egbe dị iche iche, mgbọegbe, okpu na-acha ndụ ndụ, akpụkpọụkwụ ndịagha na ngwongwo ndị bara oke uru ha napụrụ Eze Ogberuru.
Agha mba Sudan: Anyị na-eri nri naanị otu mgbe kwa ụbọchị
Minimum wage: Ndị gọvanọ agaghị ekpebiri anyị ụgwọọnwa ha ga-akwụ - NLC
Otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) akatọọla okwu ahụ a sị ndị gọvanọ kwuru na steeti ọbụla kwesịrị ikpebi ego ole ha ga-akwụ dịka ụgwọọnwa opekatampe na steeti ha dị iche iche.
Ndị otu ahụ kwupụtara nke a n’ụbọchị Fraịde 28 Juun 2024 n’ozi sitere n’aka onyeisi na-ahụ maka mgbasaozi ha bụ Benson Upah.
Dịka Benson Upah siri kwuo, ụdị mkpebi dị etu ahụ bụ nke na-agba ụkwụ megide ebumnoobi e ji nabata ụgwọọnwa opekatampe na Naịjirịa.
O kwukwara na ọ bụ ihe na-agba anyammiri na mgbe ụfọdụ gọọmenti na-ahụta ụgwọọnwa ndị ọrụ dịka ihe ọma a na-emere ha karịa ụgwọọrụ maka nrụsi ọrụ ike.
NLC gbara onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ume ka ọ hara ikwe ka ụfọdụ ndị gọvanọ na-ebughị ọdịmma Naịjirịa n’obi mee ya ka o chefuo ihe gbasara ụgwọọnwa obibi ndụ o kwere ndị ọrụ na nkwa.
Cheta na otu e hiwere maka iwepụta ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ kwupụtara puku naịra iri isii na abụọ (N62,000) dịka ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ebe ndị ọrụ gbara isi akwara sị na ha chọrọ narị puku naịra abụọ na iri ise (N250,000).
Ndị ojiegbe agbagbuola mmadụ isii na mpaghara Garki dị n’Okigwe, Imo Steeti
Kedụ ihe mmeri Trump ga-emere mbaụwa?
A họpụtala onye ọkpaọchị dịka Osote Onyeisiala ọhụrụ nke mba Malawi
Ụlọikpe akagbuola nkpọghachị a kpọghachịrị Muhammadu Sanusi n'ọkwa Emir Kano
E duola Cyril Ramaphosa n’iyi ọrụ ugboro abụọ dịka Onyeisiala mba Saụt Afrịka
Fubara edochiela ndịisioche okpuruọchịchị Rivas steeti
Aka na-achị Rivas steeti ekwuola okwu gbasara ndịisioche okpuruọchịchị steeti ahụ dịka ndị mmadụ na-enwe ụjọ.
Gọvanọ steeti ahụ bụ Siminalayi Fubara nọọrọ n’ụtụtụ Tuzde 18 Juun 2024 nye iwu ka ndị isi ọrụ n’okpuruọchịchị niile e nwere na Rivas steeti malite ilekọta okpuruọchịchị ha n’otu n’otu.
Fubara nyere iwu ahụ n’ozi ọ gbasaara ndị Rivas steeti dịka oge ọchịchị ndịisioche okpuruọchịchị steeti ahụ kụụrụ ọnụ n’ụbọchị Monde 17 Juun 2024.
O mere mgbasaozi ahụ dịka ụfọdụ ndịisioche jụrụ ịhapụ ọkwa ha, bụ nke mere ka ụfọdụ ndị ntorobịa gaa nọchie n’ogige ụlọọrụ okpuruọchịchị dị iche iche.
Ihe kpatara nke a bụ na ụfọdụ ndịisioche siri ọnwụ na ha agaghị ahapụ ọkwa ha n’ihi na onyeisioche ụlọomeiwu steeti ahụ bụ Martin Amaewhule megharịrị iwu hiwere okpuruọchịchị ma were ọnwa isii gbatịa oge ọrụ ha.
Ka osiladị, ụlọikpe ukwu dị na Rivas steeti kachapụrụ iwu ahụ ma kwuo na iwu Naịjirịa akwadoghị ya.
Ọkaikpe Daketima Kio kwupụtara iwu ọhụrụ ahụ nyere ohere ka a gbatịa oge ọrụ ndịisioche a kpọrọ ‘Local Government Law No. 2 of 2024’ dịka nke iwu na-akwadoghị.
Atụmatụ ịzụtara Onyeisiala na osote ya ụgbọelu abụọ gosiri na gọọmenti enweghị mmetụta gbasara ndị ọ na-achị - Peter Obi
Onye jiri aha Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntụliaka 2023 bụ Peter Obi akatọọla atụmatụ ụlọomeiwu na-eme ịzụtara Onyeisiala Bola Tinubu na osote ya bụ Kashim Shettima ụgbọelu ọhụrụ abụọ ma kwuo na nke ahụ gosiri na gọọmenti enweghị mmetụta gbasara ndị ha na-achị.
Obi depụtara nke a n’akara ọbaozi X ya n’ụbọchị Mọnde 17 Juun 2024.
O kwuru na mkpebi ahụ bụ nke na-ekwesịghị ekwesị n’ihi ogogo ihe isiike ndị Naịjirịa na-agabiga ugbua tinyere enweghị nchekwa, agụụ, ụbịam ọnụntụ na ikikere naịra na-agba ọnyụpa.
Obi gara n’ihu kwuo na ihe gọọmenti kwesịrị ime ugbua bụ ịchọta ụzọ a ga-esi belata nhujuanya ụmụ mmadụ ma gboo nsogbu ha karịa ị dị na-ebi ndụ okomoko.
Peter Obi depụtara ozi ahụ dịka kọmitii ụlọomeiwu nnọchiteanya na-ahụ maka nchekwa obodo gwara Gọọmenti Etiti ka ọ zụta ụgbọelu ọhụrụ abụọ maka Onyeisiala Bola Tinubu na Osote ya bụ Kashim Shettima n’ihi na ndị nke ochie ha nwere etozughị oke ife n’elu.
Otu kọmitii ụlọomeiwu nta ekwuola ka a zụtara Tinubu na Shettima ụgbọelu ọhụrụ
Kọmitii ụlọomeiwu nnọchiteanya na-ahụ maka nchekwa obodo agwala Gọọmenti Etiti ka ọ zụta ụgbọelu ọhụrụ maka Onyeisiala bụ Bola Tinubu na Osote Onyeisiala bụ Kashim Shettima.
Nke a dị n’ozi kọmitii ahụ wepụtara n’oge ha mechara nnyocha gbasara ọnọdụ ụgbọelu onyeisiala na osote ya.
Dịka ha siri dee n’ozi ahụ, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ịzụta ụgbọelu abụọ maka onyeisiala na osote ya iji gbochie ihe ọghọm ọbụla nwere ike ịdapụta n’ihi nsogbu ụgbọelu ha nwere.
N’ime ọnwa Mee, ụlọomeiwu nnọchiteanya nyere kọmitii ahụ iwu ka ha mee nnyocha miri emi gbasara ọnọdụ ụgbọelu dị iche iche onyeisiala ji eme njem iji chọpụta ma ha ka tozuru oke ife n’elu.
Ụgwọ opekatampe: Ihe mere gọọmentị agaghị akwụnwu ndị ọrụ ego ole ha chọrọ - Onyejeocha
Etu ụlọelu ogogo ise si daa n'ụlọakwụkwọ DMGS dị n'Onitsha, Anambra Steeti
President Tinubu: "Adaghị m ada kama emere m ‘dobale’ iji kwanyere ọchịchị onye kwuo uche ya ugwu"