You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Off Cycle elections 2023: Diri ekelela ndị Bayelsa maka mmeri ya
Ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Kogi, Bayelsa na Imo steeti ka o si aga.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Chimezie UcheAgbo, Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo
Alex Otti akwụsịla ndị gọvanọ pụrụ apụ ịnara 'pension' n'Abịa Steeti
Aka na-achị Abịa Steeti bụ Alex Otti abịanyela aka n’iwu iji machie ịkwụ ndị gọvanọ Steeti ahụ pụrụ apụ na ndị osote ha ụgwọ ndị lara ezumiike nka ọrụ bụ pension.
Ọ bụ n’ụbọchị Tọzde 21 Maachị 2024 ka Gọvanọ Otti bịanyere aka n’iwu ahụ bụ nke a maara ugbua dịka ‘Abia State Governors and Deputy Governors Pensions (Repeal) Law 2024’.
N’oge ọ na-abịanye aka n’iwu ahụ, Gọvanọ Otti kwuru na gọọmenti abụghị maka mmasị nke onwe n’ihi na mmasị nke onwe na-ebibi gọọmenti.
Dịka o siri kwuo “tupu iwu ọhụrụ a apụta, ọtụtụ mmadụ ndị na-eso ihe anyị na-eme ghọtara na anyị agaghị agakwa n’ihu na-akwụ ndị ọchịchị pụrụ apụ ụgwọ ndị lara ezumiike nka ọrụ na ego mmachi akpa ndị ọzọ.”
Cheta na ọ bụ n’ụbọchị Tuzde 19 Maachị 2024 ka ụlọomeiwu Abịa Steeti nọọrọ bufee atụmatụ iwu nke kachapụrụ iwu nke dị adị na Steeti ahụ bụ nke nyere ndị gọvanọ Steeti ahụ pụrụ apụ na ndị osote ha ikikere ịnara ụgwọ ndị lara ezumiike nka ọrụ.
Etu ụmụaka atọ si mie ala n'Imo Steeti ma bụrụ ndị a na-achọ achọ kamgbe otu izuụka
Ọ naghị ewute m na m kagburu ntuliaka mba Senegal - Macky Sall
Lee otu agha nnupuisi dị iche iche na-achọ iwere ọchịchị na mba Haiti
Gọọmenti Enugwu ewerela katapila kwọgbuo ọkụkọ karịrị 30,000 na Nchatancha Nike
Igbo Culture: Gịnị bụ Ikoro na uru ọ bara n’omenala Igbo?
Onitsha building collaspe: "Amaghị m na ụlọ anyị nọ n'ime ya na-ada ada ruo mgbe m hụrụ onwe m n'ime ụvụrụ aja"
Ọ bụghị ndị Hausa maọbụ Fulani wakporo ụmụakwụkwọ FUTO - Ndị uweojii
Rotimi Akeredolu: Etu ụka olili ya na njem ikpeazụ ya si aga
"Onye Igbo ọbụla esonyekwala na ngagharị iwe ọbụla" - Ohaneze
Cost of living: Lee ụfọdụ ụzọ ndị mmadụ si ebighari ndụ ugbua maka ihe isi ike na Naịjirịa
Electoral Fraud: Kedụ ụdị wuruwuru dị iche iche a na-eme na ntuliaka? Kedụ ka a ga-esi kwụsị ha?
Ahụhụ Naịjirịa na-ata ugbua sitere n'iwu ọjọọ ndị e mere n'oge gara aga - Benjamin Kalu
Hage Geingob bụ onyeisiala mba Namibia anwụọla ka ọ gbachara afọ 82
Igwe Neni's suspension: Ihe mere Soludo ji kpọghachi Igwe Damian Ezeani
Insecurity: Ntọrị ụmụaka isii, ogbugbu ndị Eze na ihe ndị na-egosi na nchekwa gba ọtọ na Naịjirịa
Etu ndị ojiegbe si zuo ndị POS ohi aghara aghara ma gbuo ufọdụ n’Imo Steeti
Nnamdi Kanu a chụrụ Mike Ozekhome, Ifeanyi Ejiofor na ndị Okaiwu ya ndị ọzọ? - Lee ihe anyị ma
'Aga m enweta nnwereonwe m' - Nnamdi Kanu