You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Off Cycle elections 2023: Diri ekelela ndị Bayelsa maka mmeri ya

Ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Kogi, Bayelsa na Imo steeti ka o si aga.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chimezie UcheAgbo, Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. COP28: Gịnị mere okwu ọnụọgụgụ ndị nọchite anya Naijiria n'ọgbakọ mgbanwe ihu igwe ji akpọtụ?

  2. Etu ndị ojiegbe si gbuo mmadụ aghara aghara n’Imo steeti n’ime izuụka abụọ

  3. A kwụsịtụla ikutu ụlọ ndị mmadụ n'Abule Ado Legọs ma malite inyocha akwụkwọ ha

  4. Hope Uzodimma anatala asambodo mmeri ya

    Gọvanọ na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma anatala asambodo mmeri ya n'aka Inec taa bụ ụbọchị Fraịde n'Owere bụ isi obodo steeti ahụ.

    Uzodimma n'okwu nnabata ya kwuru na ihe Inec mere egosila ndị mmadụ na ha nwereike ịnwe ntụkwasiobi na vootu ha ga-enwe isi.

    O ji ohere ahụ kelee ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ Inec maka ịhazi ntuliaka ọ sị bụ nke kachasị "nwe udo ma nye ohere ma bụrụ nke ziri ezi"

    O kelekwara ndị ọrụ nchekwa maka nkwado ha nyere atụmatụ ntuliaka n'ụbọchị ahụ.

    Cheta na Inec kpọpụtara aha ya dịka onye meriri ntuliaka ọkwa Gọvanọ Imo steeti e mere n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba afọ 2023.

    Ọ ga-achị afọ anọ ọzọ dịka iwu Naịjirịa si nye.

  5. Ọ bụ eziokwu na a hụrụ ozu mmadụ 322 n’otu ili n’Anambra Steeti? Lee ihe anyị ma

  6. Off-cycle elections: Diri ekelela ndị Bayelsa maka mmeri ya

    Aka na-achị Bayelsa Steeti bụ Douye Diri ekelela Chineke na ndị Bayelsa maka mmeri ya na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Bayelsa Steeti e mere n'abalị 11 nke ọnwa Novemba afọ 2023.

    Diri Nke PDP ji vootu dị 175196 merie Timipre Sylva nke APC, onye nwetara vootu dị 110108, ebe Udengs Eradiri nke Labour Party nwetara vootu dị 905.

    N'ozi nke Diri o wepụtara n'akara ọbaọzi ya n'X, ọ sịrị,"Ndị Abịa, ekele m ụnụ."

    Ọ gara n'ihu kwuo sị, Mmeri a a bụ site n'ike nke Chukwu nakwa nkwado ụnụ nyere m iji gbara ụnụ odibo afọ anọ abụọ."

    " Aga m aga n'ihu n'ịbụ gọvanọ mmadụ nile."

  7. Diri emeriela na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Bayelsa steeti

    Aka na-achi Bayelsa steeti bụ Douye Diri nke PDP emeriela na ntuliaka ọkwa Gọvanọ afọ 2023 nke e mere ụbọchị Satode,abalị 11, nke ọnwa Novemba, afọ 2023, dịka ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka bụ Inec si kpọpụta ya taa bụ Monde.

    Gọvanọ Diri, onwe meriri n’Okpuru Ọchịchị isii n’ime asatọ dị na Bayelsa steeti nwetara vootu dị 175196, ebe Timipre Sylva nke APC nwetara vootu dị 110108, ebe Udengs Eradiri nke Labour Party nwetara vootu dị 905.

    Lee ihe ngụkọ na-ekwu

    Ndị debanyere aha: 1056862

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu: 372090

    Vootu a tụrụ dị mma: 287554

    Vootu ndị agbajọrọ: 3658

    Vootu nnile a tụrụ: 291212

  8. A malitela ngụkọ mpụtara ntuliaka Gọvanọ Bayelsa ọzọ

    Ngalaba na-ahazi ntuliaka na Naijiria bụ Inec n'ịchafụ amalitela mkpọpụta mpụtara ntuliaka e mere na Bayelsa steeti ụbọchị Satode.

    Inec kwụsiburu mkpọpụta mpụtara si okpuru ọchịchị dị na steeti ahụ Ụbọchịụka dịka ha hiwere nke fọrọ taa bụ Monde abalị 13, nke ọnwa Novemba afọ 2023.

  9. Ahmed Usman Ododo emeriela ntuliaka Kogi steeti

    Ngalaba Inec akpọpụtala aha Ahmed Usman Ododo dịka onye meriri ntuliaka ọkwa Gọvanọ Kogi steeti.

    Ododo ji vootu 446,237 were rite mmeri a ebe onye so ya n'azụ bụ Muratala Yakubu Ajaka nke SDP ritere vootu 259,052 ebe Dino Melaye nke PDP nwetara 46,362.

    Lee ihe ngụkọ na-ekwu

    Ndị debanyere aha: 1,932,474

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu: 794,500

    Vootu a tụrụ dị mma: 782,289

    Vootu ndị agbajọrọ: 9,601

    Vootu nnile a tụrụ: 791,890

  10. A ga-akpọpụga mpụtara ntuliaka Bayelsa n'ụbọchị Monde

    Ngalaba Inec ekwuola na ha ga-akpọchazi mpụtara ntuliaka ọkwa Gọvanọ Bayelsa steeti echi bụ ụbọchị Monde.

    Ọnụ na-ekwuru Inec na Bayelsa steeti kwuru nke a na mgbede ụbọchị ụka ma kwuo na ha ga-amalite ebe elekere iri na abụọ nke ehihie.

    Nke a mere n'ihi mpụtara ntuliaka nke ha ka na-edekọ n'okpuruọchịchị Brass nakwa ntuliaka emegharịrị n'ụfodụ ebe dị iicheiche na steeti ahụ.

    Ọ kọwakwara na ụfọdụ ebe emere ntuliaka bụ obodo ndị dị n'ikpere mmiri nke mere a ka ji atụ anya na ha ga-erute n'isiobodo Yenogoa n'ụbọchị Monde.

    Okpuruọchịchị ndị akpọpụtara bụ Kolokuma/Opokuma, Ogbia, Yenogoa, Sagbama, Nembe nakwa Ekrermor.

    N'ime ndị a niile, APC meriri n'otu ebe dịka PDP meriri n'ebe ise.

  11. ICPC anwụchiela mmadụ isii zụrụ vootu ndị mmadụ n'Imo steeti

    Ndị ọrụ Independent Corrupt Practices Commission bụ ICPC n'ịchafụ ekwuola na ha anwụchiela mmadụ isii zụrụ vootu mmadụ na ntuliaka e mere n'Imo steeti.

    Ngalaba ahụ depụtara n'akara X (bụbu Twitter) ha na ndị ọrụ ha nwụchiri ndị mmadụ n'ọgbọ ntuliaka asaa ma jichie nde naira anọ.

    Ha sị na otu onye n'ime ndị ha nwụchiri ji akwụkwọ ebe e dere aha nakwa akara ekwentị ndị na-atụ vootu.

    "Ndị niile anyị nwụchiri nọ n'aka anyị ugbua, anyị edetuola aha ha na okwu akaebe ha" ka ha dere.

    Ha sị kwa na ha atọhapụla ndị ahụ nwamgbenta dịka nyocha ka na-aga n'ihu.

  12. Ndị Imo, ụnụ emela- Uzodimma

    Aka na achị Imo steeti bụ Hope Ụzodimma ekelela ndị Imo maka ịkwado ya na ntuliaka ọkwa Gọvanọ steeti ahụ e mere ụbọchị Satode.

    Uzodimma nke APC ji vootu dị 540, 308 merie Sam Anyanwu nke PDP bụ onye nwetara vootu dị 71, 503, ebe Athan Achonu nke otu 'Labour Party' nwetara vootu 64, 081.

    N'ozi ya ụbọchịụka dịka a kpọpụtachara aha ya dịka onye meriri na ntuliaka ahụ nke nyere ya ohere agba nke abụọ, Uzodimma sịrị, " Nkwado pụrụ iche ụnụ nyere m na ntuliak ụnyahụ tụrụ m n'anya."

    "Ntụwasa obi ụnụ nwere n'm ịga n'ihu na edu steeti anyị bụ ihe mkpalite mmụọ.".

    Ọ gara n'ihu kwee nkwa imezu nkwa nile o kwere oge ọ na-achụ nta vootu ma rịọ ndị ya na ya zọkọrọ na ntuliaka ahụ ka ha sonyere ya n'ịkwalite steeti ahụ.

  13. Na Akpọtụ Ugbu A, Anyị ga-agbagha mmeri Uzodimma n'ụlọikpe - Ndị LP nke Imo steeti

    Otu Labour Party n'Imo steeti eforola ntutu taa na ha ga-agbagha mmeri Hope Uzodimma nke APC n'ụlọikpe.

    Onyeisioche otu ahụ n'Imo steeti bụ Callistus Iheagwa kwuru nke a mgbe ọ na-ezi ndị ntaakụkọ ozi dịka akpọpụtachara Hope Uzodimma dịka onye meriri ya bụ ntuliaka ọkwa Gọvanọ.

    Iheagwa kwuru na atụmatụ ntuliaka ahụ juputere na mpụ na nrụrụaka.

    O boro ndị ọrụ nchekwa ebubo na ha nyere ndị ọrụ Inec aka ihu na e mere wayo na ntuliaka ahụ iji mee ka Uzodimma merie.

    Ha sị na mpụtara ntuliaka ahụ nke ezigbo ya gosiri na ọ bụ onye nke ha bụ Athan Achonu meriri ntuliaka ahụ.

    Dịka ọ na gwa ndị ntaakụkọ okwu, Iheagwa sị na ntuliaka ahụ bụ "ohi e zuru n'ehihie nakwa mmetọ ọchịchị onyekwuoucheya"

    Ọ sị na ntuliaka emeghi n'ụfọdụ obodo gụnyere Orsu, Orlu, Ideato North, Okigwe, Oguta nakwa Owerri Munincipal mana Inec gara n'ihu deere ha mpụtara ntuliaka

    Ọ tara onye ọrụ Inec bụ Abayomi Fasina maka egeghị ntị n'okwu ndị a tupu ọ gaa ihu gụkọọ vootu ndị o ji ma kpọpụta Uzodimma dịka onye mmeri.

    Ihejiagwa sị "ihe mere n'Imo steeti bụ adigboroja. Ọ bụ ihe ihere etu ndị ọrụ nchekwa si nye ndị ọrụ Inec na ndị otu APC ohere na nchekwa ịrụrụaka na ntuliaka ahụ".

    Hope Uzodimma onwe ya na-akpọ oku ka ndị o meriri bịa ka ha jikọọ aka bulie Imo steeti.

  14. Lee ka mkpọpụta mpụtara ntuliaka Bayelsa steeti si aga

  15. Atọrọla ụfọdụ ndị ọrụ Inec na Brass dị na Bayelsa steeti

    Ngalaba INEC na-elekọta ntuliaka na Naijirịa etiela mkpu na atọrọla ụfọdụ ndị ọrụ ha gara ọrụ n'okpuruọchichị Brass dị na Bayelsa.

    Nke a na-abịa dịka a na-edekọ na agụkọ vootu ntuliaka ọkwa Gọvanọ emere na steeti ahụ.

    N'ozi ha depụtara n'akara Twitter ha, ha kpọrọ ndị ọrụ nchekwa oku ha gbaa mbọ hụ na azọpụtara ndị ahụ.

  16. Uzodimma emeriela na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Imo steeti

    Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma emeriela n'okpuru ọchịchị 27 dị n'Imo steeti, dịka Inec si kpọpụta.

    Uzodimma, ji vootu dị 540, 308 merie Sam Anyanwụ nke PDP bụ onye nwetara vootu dị 71, 503. ebe Athan Achonu nke ou 'Labour Party' nwetara vootu 64, 081.

    O nweghị pati n'ime 17 so APC zọọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka e mere n'abaị 11 nke ọnwa Novemba afọ 2023 meriri n' okpuru ọchịchị ọbụla na steeti ahụ.

  17. Imo State Governorship Election: Ndị Imo ekwuola na Uzodimma, a ga ya ugboro abụọ

  18. Etu mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo Steeti si kwụrụ

    Ideato North

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 86905

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 9609

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 9161

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 389

    Vootu niile a tụrụ: 9550

    APC: 5271

    LP: 1522

    PDP: 2062

    Ihitte Uboma

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 52108

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 17537

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 17358

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 179

    Vootu niile a tụrụ: 17537

    APC: 11099

    LP: 2766

    PDP: 3077

    Mbaitoli

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 153283

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 24186

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 23014

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 972

    Vootu niile a tụrụ: 23986

    APC: 12556

    LP: 4007

    PDP: 5343

    Ngor-Okpala

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 102048

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 22111

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 21492

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 511

    Vootu niile a tụrụ: 22003

    APC: 14143

    LP: 2716

    PDP: 3451

  19. E tiri onye nnọchiteanya Labour pati ihe na ngụkọ vootu Imo steeti

    Ndị 'agent' pati dị icheiche kụrụ onye nnọchiteanya pati Labour ihe na ngụkọ vootu Imo steeti maka na o kwuru na o nweghi ntuliaka e mere n'Ọsụ na ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere na steeti ahụ ụbọchị Satọde.Ihe a bụ nnukwute ihe ịtụ n'anya.

  20. Etu mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo si kwụrụ

    Ikeduru

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu:119987

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 33662

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 32183

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 529

    Vootu niile a tụrụ: 32712

    APC: 22356

    LP: 1377

    PDP: 7258

    Ehime Mbano

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 79212

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 13027

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 12484

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 298

    Vootu niile a tụrụ: 12782

    APC: 6632

    LP: 4958

    PDP: 861

    Orlu

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 103223

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 49229

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 48027

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 359

    Vootu niile a tụrụ: 48386

    APC: 37614

    LP: 2424

    PDP: 3690

    Ohaji/Egbema

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 107456

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 21366

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 20755

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 494

    Vootu niile a tụrụ: 21249

    APC: 5271

    LP: 1522

    PDP: 2062