Uzodimma enwetala vootu kachasị n 'okpuru ọchíchị 20 n'ime 27 dị n'Imo steeti
Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma bụ onye vootu ya kachasí ugbua n'ime Okpuru ọchịchị iri abụọ n'ime 27nke ụlọọrụ Inec kpọpụtarala mpụtara ha.
Uzodimma bụ onye feere otu APC ọkọlọtọ nwetara vootu 429, 518 n'Okpuru Ọchịchị 20 dịka si kwuo.
Ọkpuru ọchịchị Uzodimma meriela gụnyere Oru West, Owerri North, Obowo, Nwangele, Orsu, Owerri Municipal, Okigwe, Ideato South , Onuimo, Ngor Okpala, Oru East, Isu, Nkwere, Ahiazu Mbaise, Owerri West, Isiala Mbano, Ezinihitte Mbaise, Oguta, Aboh Mbaise na Njaba.
A na-ele mpụtara si okpuru ọchịhcị asaa fọrọ afọ.
Onyye nchịkọta ntuliaka Imo steeti (returning Officer) ma bụrụkwa onyeisi Mahadum 'University of Oye', Ado Ekiti in Ekiti bụ onye kpọpụtara mpụtara ndị ahụ kuwru ka e gaa ezu,ike ọkara awa ma laghachị.