2023 Nigeria Elections: E nyela ndị meriri ọkwa gọvanọ Abia, Ebonyi na Enugwu Steeti asambodo mmeri

N'ụbọchị 29 na 30 ka e nyere ndị meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ Abia, Ebonyi nakwa Enugwu Steeti asambodo mmeri ha dịka iwu Inec siri dị

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chigozie Ohaka, Chukwunaeme Obiejesi and Uche Akolisa

  1. Babajide Sanwo-Olu atụọla vootu nke ya

    Mgbe ikpeazụ Sanwo-olu pụtara mee achụmnta vootu

    Ebe foto si, Babajide Sanwo-olu/Twitter

    Nkọwa foto, Mgbe ikpeazụ Sanwo-olu pụtara mee achụmnta vootu

    Aka na-achị Legọs steeti ugbua bụ Babajide Sanwo-Olu atụọla vootu nke ya.

    Nke a mere n'ọgbọ ntuliaka nke Adeniji Adele, wọọdụ 15.

    Sanwo-olu na-azọ ka ọ zọta ọkwa ịbụ gọvanọ Legọs steeti ọzọ na steeti ahụ dịka ọ malitere ịchị ebe ahụ kemgbe afọ anọ gara aga.

    Legọs steeti so na steeti ebe ikike ọchịchị APC gbara mgbọrọgwụ mana ndị pati ndị ọzọ jizi iwe pụta ịzọ ya bụ okwa na steeti ahụ ugbua.

  2. Gbadebo Rhodes-Vivour atụọla vootu ya

    GRV atụọla vootu ya

    Ebe foto si, GRV

    Nkọwa foto, GRV atụọla vootu ya

    Onye na-azọrọ otu Labour Party ọkwa onyeisiala na Legọs bụ Gbadebo Rhodes-Vivour atụọla vootu nke ya.

    Ọ tụrụ vootu ya n’ọgbọ ntuliaka Anifowoshe, Ikeja, Legọs steeti.

    Ya na aka na-achị steeti ahụ ugbua bụ Babajide Sanwo-Olu bụ onye chọrọ ịzọta ọkwa ahụ ọzọ na-ama aka.

    Lee ka ya bụ ihe siri gaa.

    GRV atụọla vootu ya

    Ebe foto si, GRV

    Nkọwa foto, GRV atụọla vootu ya
  3. Bola Tinubu atụọla vootu nke ya

    Tinubu

    Ebe foto si, Bola Tinubu/Twitter

    Onye a họpụtara ịchị Naịjirịa n’afọ anọ na-abịa abịa bụ Bola Tinubu atụọla vootu nke ya.

    Tinubu zọrọ ọkwa onyeisiala n'aha APC nwetere mmeri na ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị 2023.

    O zipụtara ozi nke a n’akara Twitter ya dịka o kwuru na ọ na-arịọ ndị ọzọ ka ha pụta tụọ vootu nke ha.

    Ọ gbara ọha ume ka ha ga n’ihu hụ na ntuliaka nke taa gara n’udo.

    Lee ihe o kwuru na Twitter ya ebe a.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  4. Ndị uweojii anwụchịela ndị omekome ise n’akụkụ Ihiala, Anambra

    Ndị uweojii

    Ebe foto si, Getty Images

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’akụkụ Ihiala nke Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga ekwuola na ha wụchiri ndị omekome ise ma napụ aha ebe ‘Pump action’ anọ.

    Nke a na-apụta dịka ntuliaka na-aga n'ihu na steeti ahụ ebe gọọmentị Naịjirịa machiri ngagharị ndị mmadụ n'akụkụ Naịjirịa niile malite n'elekere 12 nke isi ụtụtụ ruo elekere isii nke mgbede taa.

    Akụkọ kwuru na ndị a anwụchiri pụtara ịkụsa ntuliaka n'akụkụ ebe ahụ.

    Ihiala so n’akụkụ steeti ahụ ebe akụkọ mwakpo na-apụtakarị dịka n’oge ntuliaka enweghi ezi nchekwa ebe ahụ mere emeghi ntuliaka ebe ahụ n’ụbọchị mbụ.

    Inec mechara hazigharịa ntuliaka ebe ahụ.

    Ndị uweojii Anambra zipụtara ozi na ha agaghị ekwe onye maọbụ otu ọbụla majaa ndị pụtara ịtụ vootu dịka ha kwuru ha kwụụ chim ichekwa ndị mmadụ.

    Ikenga kwuru na ha na-eme nnyocha n'isi mmadụ ise a awụchiri ugbua.

  5. 'Inec achụgala anyị okporoụzọ maka ịtụ vootu' - Omoni Oboli

    Skip Instagram post
    Hapụ Instagram ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of Instagram post

    Onye ejije Nollywood a ma ama bụ Omoni Oboli na-ebo ebubo na ndị ọrụ Inec gbanwere ebe ọgbọ ntuliakka ya nọ n’ime mpaghara VGC estate Legọs ma tụnye ya n’ọgbọ ntuliaka nọ n’ihu okporoụzọ.

    N’ozi o zipụtara n’akara Twitter ya, o kwuru na kemgbe o malitere ịtụ vootu ebe ahụ na ọ bụ n’ama mmesapụ ahụ nke ndị VGC na-anọ atụ vootu ha mana ha gwara ha na ha ga-anọ n’akụkụ okporoụzọ tụọ vootu nke taa.

    Ndị ọrụ Inec awụchiela ebe ahụ dịka ndị ọrụ nchekwa sokwa ha pụta, ha kwuru na ọ bụ n'okoroụzọ ka ga-anọ mee nke taa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  6. Ntuliaka amalịtela n'ama Makoko nọ n'elu mmiri na Legọs steeti

    Makoko

    Ndị ọrụ Inec awụchiela ma malite ọrụ ha n'ama nọ n'elu oke osimiri na Legọs.

    Makoko bụ mpaghara ama ama na Legọs dịka ndị bi ebe ahụ na-eme ihe niile n'elu mmiri nke gụnyere ịtụ vootu ha.

    Ndị bi ebe ahụ mara ụzọ pụta dịka ndị Inec wụchikwara ebe ahụ n'oge.

    Ndị ọrụ nchekwa wụchiri ebe ahụ ịrụ ọrụ ha dịka ha na-enyereaka ahazị ahịrị nakwa akpọkọta ndị mmadụ.

    Lee ya bụ ihe si aga.

    Ndị Makoko
    Ọtụtụ ndị ntorobịa mara ụzọ pụta ebe a
    Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị ntorobịa mara ụzọ pụta ebe a
  7. Etu onye ọmaekwe siri na-akpọte ndị obodo Isiala Ngwa ka ha pụta tụọ vootu

    Aha onyonyo, Etu onye ọmaekwe siri na-akpọte ndị obodo Isiala Ngwa ka ha pụta tụọ vootu

    Anyị awụchiela n'akụkụ Ahia Afor Umuru nke Isiala Ngwa South, Abia steeti.

    Nke a bụ ebe a na-atụ anya na Alexi Otii na-azọ ọkwa gọvanọ n'aha Labour Party na steeti ahụ ga-atụ vootu nke ya.

    Ndị Inec, ndị nnọchiteanya pati nakwa ndị pụtara itu vootu agbakọtala.

    Otu ọmaekwe obodo ahụ pụtakwara n'amara ndị obodo ahụ ekwu ka ha pụta soro tụọ vootu nke ha taa.

    Onye ọmaekwe
    Ndị pụtara ịtụ vootu
  8. Ihe mere ndị ọrụ Inec amalitebeghị ntuliaka n'akụkụ ụlọakwụkwọ Ugwuncha Praịmarị, Umuahia

    Ndị ọrụ Inec

    Ndị Inec awụchiela n’akụkụ ụlọakwụkwọ Ugwuncha Prịmarị dịka ha jụrụ imalite ntuliaka ebe ahụ.

    Nke a bụ n’ihi na ha kwuru na enweghi tebulu nakwa oche e bupụtaara ha.

    Onye ọrụ nhazị vootu ebe ahụ kwuru na ha agaghị amalite ruo mgbe e nyere ha ihe ndị a.

    Ndị mmadụ mara ụzọ pụta ebe ahụ dịka ndị ọrụ Inec bịakwara n’oge.

    A na-agba mbọ ibutere ihe ndị ha ga-eji rụọ ọrụ ebe ahụ ugbua.

  9. Ntuliaka amalitela n'akụkụ ụfọdụ n'Ibadan

    Ndị mmadụ a pụtala ịtụ vootu n'Ibadan

    Ntuliaka na-aga n'ihu ugbua n'akụkụ okporoụzọ Iwo Road, nke Ibadan.

    Ihe a bụ ebe a na-atụ anya na Gọvanọ Seyi Makinde bụ Gọvanọ steeti ga-atụ vootu ya taa.

    Cheta na ọ pụtara ebe ahụ tụọ vootu nke ya n'oge ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

    Ntuliaka malitere n'elekere asatọ nke ụtụtụ ebe ahụ dịka Inec siri nye ntuziaka ya.

    Ndị mmadụ a pụtala ịtụ vootu n'Ibadan
  10. Ntuliaka amalitela n'akụkụ St Mary's Catholic church, Owo, Enugu

    Ntuliaka amalitela

    Ndị ọrụ Inec mara ụzọ dịka ndị mmadụ pụtakwara n'oge n'akụkụ ụka St Mary's nke Owo, Enugu steeti.

    Owo dị n'okpuruọchịchị Nkanu East n'Enugu.

    Ntuliaka amalitela ebe ahụ dịka ndị mmadụ na-akwụzi n'ahịrị.

    Inec nyere ntuziaka ka ntuliaka malite n'elekere asatọ nke ụtụtụ ya mere ndị a jiri maa ụzọ pụta.

    Mbinyeaka amalitela ugbua.

    Ntuliaka amalitela
  11. Naanị otu onye pụtarala ịtụ vootu n'akụkụ Babban Giji wọọdụ, Kano

    Hausawa

    N'ime ọgba ntuliaka PU 47 nke akụkụ Babban Giji wọọdụ, naanị Hausawa bụ onye pụtara ebe a.

    Ọ gwara BBC na o mara ụzọ mee njem ruru kilomịta anọ n'ihi na ndị ụgbọala anaghị agba taa.

    Ọgbọ ntuliaka a nọ na Kano steeti nke mpaghara ugwu Naịjirịa.

    Naanị mmadụ 22 pụtara ebe a n'oge ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere n'ọnwa gara aga.

  12. Ndị mmadụ ji oche na odo azọta ohere ịkwụ n'ahịrị n'Adamawa

    Ndị ji oche pụta

    Dịka ụfọdụ ndị ọrụ Inec abịarutebeghị, ndị pụtara ịtụ vootu n'akụkụ Girei town, Adamawa steeti jicha oche, okwute nakwa odo eji azụ nri pụta ma were zọta ohere ịkwụ n'ahịrị.

    Ndị a mara ụzọ ma kwuo na ịtụ vootu dị ha n'obi nke mere ha jiri maa ụzọ pụta.

    Adamawa
  13. Ntuliaka amalitela na Legọs

    Ndị pụtara ịtụ vootu

    N'ime ụlọakwụkwọ St. Agnes Primary School, Polling Unit 09, Alogomeji Ward 009, ntuliaka amalitela.

    Legọs bụ steeti ndị mmadụ kacha biri n'ime ya na Naịjirịa.

    Dịka Inec siri nye ntuziaka, ntuliaka nke taa bụ maka ọkwa gọvanọ nakwa ndị ụlọomeiwu steeti malitere n'elekere asatọ nke ụtụtụ a.

    Ntuliaka ọkwa gọvanọ
    Ntuliaka ọkwa gọvanọ
  14. Ụzọ tọgbọ chakoo n’ebe ụfọdụ n’Umuahia

    Umuahia

    N’ebe ụfọdụ n’Ụmụahia, ndị mmadụ apụtabeghị ama maka ntuliaka

    Otu nwata nwaanyị bịara ịtụ vootu gosiri mgbagwoju anya na ndị ọrụ Inec erutebeghị n’ọgbọ atụmvootu ha dị na ogige Health Centre,Umuahia.

    Nwa agbọghọ ahụ kpọrọ onwe ya Juliet gwara onye ntaakụkọ anyị sị, “Anyị pụtara n’ụtụtụ a ịtụ vootu mana o nweghị onye anyị hụrụ. Ụfọdụ ndị akwụkatala lawaa.”

  15. Ndị mmadụ apụtala ịtụ vootu n'akụkụ Alagomeji Legọs

    Ndị pụtara ịtụ vootu

    Ndị mmadụ nakwa ndị ọrụ Inec awụchiela n'akụkụ Alagomeji nke Legọs.

    Ndị ọrụ nchekwa awụchiela maka ichekwa ndị mmadụ dịka a nụrụ akụkọ mwakpo nakwa nkụsa ntuliaka n'akụkụ Legọs dị iche iche n'oge ntuliaka ọkwa onyeisiala.

    Ndị uweojii zipụtara ozi si ndị mmadụ pụta tụọ vootu ma atụla ụjọ dịka ha ga-akwụ chim chekwaa ha.

    Ndị pụtara ịtụ vootu
  16. Ndị mmadụ apụtawala ịtụ vootu n'Ikoyi, Legọs

    Ndị mmadụ apụtawala ịtụ vootu n'Ikoyi, Legọs

    Ndị ọrụ Inec awụchiela n'akụkụ Ikoyi nke Legọs steeti.

    Ndị mmadụ apụtawala ịtụ vootu ha dịka ntuliaka nke taa bụ maka ndị gọvanọ nakwa ndị ụlọomeiwu steeti.

    Inec kwuru na ntuliaka ga-amalite n'elekere asatọ nke ụtụtụ taa.

    Ndị ọrụ ha wụchiri n'oge n'ebe a dịka amalitela inyocha ndị nwere ikike ịtụ vootu ha ebe ahụ.

    Ebe a bụ wọọdụ 06 PU 43 Thompson, Ikoyi

  17. Ebe anya ndị mmadụ ga-anọ na ntuliaka nke taa

    Ntuliaka ọkwa gọvanọ

    Dịka Inec kwuru na a dị mmaọ̄ụ 800 na-azọ ọkwa ịbụ gọvanọ na steeti 28 ndị nọ na Naịjirịa taa, anya ọha na-ele Legọs steeti bụ obodo ndị mmadụ kacha biri na Naịjirịa.

    Legọs bụkwa isi azụmahịa Naịjirịa bụ steeti onye a họpụtara ga-achị Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu si.

    Peter Obi nke Labour Party mere ihe tụrụ ọha n’anya dịka ọ napụrụ Tinubu ara n’ọnụ na steeti ahụ n’oge ntuliaka onyeisiala mgbe ọ ka ya nweta vootu na steeti ahụ.

    Kano bụkwa steeti nke abụọ ebe ndị mmadụ kacha biri n’ime ya nakwa Rịvas steeti bụ isi ebe a na-emepụta mmanụ ụgbọala sokwa na steeti ebe anya ndị mmadụ nọ.

    Ọnọdụ enweghị nchekwa nakwa mwakpo ndị agha nnupụisi nke Boko Harm na-echekwa ndị mmadụ dịka ha wakporo ụfọdụ ndị ọrụ Inec n’oge ntuliaka gara aga.

    Na mpaghara Ọwụwa anyanwụ Naịjriịa, ụfọdụ otu ndị na-achọ nwereonwe Biafra amaala ọkwa na-agwa ndị mmadụ esonyela na mee ntuliaka na Naịjirịa.

    Mwakpo n’aka ndị agbara nakwa ndị omekome kpalitekwara ụjọ n’ime ndị mmadụ n’oge ntuliaka ọkwa onyeisiala.

    Ndị ọrụ nchekwa nke gụnyere onyeisi ndị uweojii agwaala ndị mmadụ pụta n’igwe tụọ vootu ha n’ihi na ha kwụ chim n’ichekwa ha.

    A machiela ngagharị ndị malite n’elekere 12 nke isi ụtụtụ ruo elekere isii nke mgbede taa.

    Anya ndị mmadụ ga-anọkwa na ngwa ọrụ ndị Inec ọkachasị nke teknụzụ Bvas nakwa ọba ozi ha pụrụiche bụ IreV – Nke a bụ dịka etu ndị mmadụ si katọọ Inec n’oge ntuliaka onyeisiala ma na-ekwu na ha esoghi usoro ha dapụtara maka ntuliaka ahụ.

    Inec kwuru na aga eji Bvas sete foto mpụtara ntuliaka ndị e mere n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche ma gbaa ya n’anwụ n’ọbaozi ha pụrụiche bụ Irev.

    Inec kwuru na ha adịla njikere dịka ha kwuru na ha ahaziela nsogbu ndị cheere ha aka mgba na ntuliaka onyeisiala.

  18. Nkesa akọrọngwa ntuliaka amalitela na Ụmụahịa

    Nkesa Akọrọngwa ntuliaka n'Ụmụahia
    Nkọwa foto, Nke a bụ ụlọagwụgwọ 'School Road Primary School', Umuahia North, Abia Steeti.

    Nkesa akọrọngwa a ga-eji eme ntuliaka na-aga n'ihu ugbua n'ọgbọ atụmvootu dị iche iche dị na wọọdụ Umuahia Urban Ward II.

    A na-atụbu anya na nkesa akọrọngwa malitere tupu Elekere Asatọ mana ka ihe si kwụrụ ugbua, ọ dịghị ka ha aga-emecha nke a n'oge.

    Cheta na ntuliaka kweịsrị ịmalite n'Elekere Asatọ na akara.

    Ndị ọrụ nchekwa dị iche iche nọkwa n'ọrụ ịhụ na udo chịrị.

    Nkesa ngwa ntuliaka n' Ụmuahia
  19. Ndị e derela jụọ maka ntuliaka ọkwa gọvanọ

    Etu Enugu dị taa

    Ụzọ niile tọgbọ chakoo n'Enugu dịka enweghị ụgbọala na-agagharị.

    Dịka gọọmentị Naịjirịa si emekari n'oge ntuliaka ọbụla, a machiri ngagharị ndị mmadụ n'akụkụ Naịjirịa gbaa gburu malite n'elekere 12 nke isi ụtụtụ taa ruo elekere isii nke mgbe taa. Ụlọakụ, ụlọakwụkwọ, ahịa nakwa ụlọọrụ ọbụla agaghị emepee taa.

    Nke a bụ iji hụ na ndị mmadụ tụrụ vootu ha ma nyekwa ohere ka ntuliaka gaa siriri werere.

    Cheta na ndị Enugu pụtara n'ìgwè tụọ vootu n'oge ntuliaka ọkwa onyeisiala, dịka foto nakwa ihe onyonyo si n'akụkọ ama egwuregwu Okpara Square nke gosiri mgbakọta ìgwè mmadụ pụtara ịtụ vootu tụrụ ọtụtụ n'anya. Enugu steeti so na steeti ga-eme ntuliaka ọkwa gọvanọ taa.

    Etu Enugu dị
  20. Osinbanjo awuchiela n'obodo ya maka ntuliaka

    Yemi Osinbajo na nwunye ya bụ Dolapo

    Ebe foto si, Yemi Osinbajo/Facebook

    Osote Onyeisiala Naijiria bụYemi Osinbajo awuchiela obodo ya bụ Ikenne ,Ogun steeti maka ntuliaka ọkwa gọvanọ na-eme taa bụ Satode.

    Osinbajo, onye gbara ama na mgbede Fraide kwupụtara nke a n’akara ya na Facebook sị, “Mụ na nwunye m bụ Dolapo Osinbajo erutela Ikenna maka ntuliaka Gọvanọna Ụlọmeiwu steeti.” echi nakwa ọgbakọ ndị otu APC na ndị ndu obodo.”

    Yemi Osinbajo na ụmụaka

    Ebe foto si, Yemi Osinbajo/Facebook