Seun Osewa nwee ọbaozi a ma ama na Naịjirịa asịla ndị Igbo ha ndo

Ebe foto si, Seun Osewa
Dịka ọtụtụ ozi ịkpaoke agbụrụ dapụtara n’oge ntuliaka Naịjirịa 2023, ya bụ ihe taasuru ọkụ n’ụzọ pụrụiche na Legọs steeti.
Seun Osewa danyere na nkatọ n’aka ndị mmadụ dịka ndị mmadụ wepụtara ozi achụmnta vootu nke ọtụtụ hụrụ dị ka ịkpaoke agbụrụ n’ọbaozi ya bụ Nairaland.
N’ozi Osewa wepụtara na Mọnde a, ọ rịọrọ ndị Igbo ka ha gbaghara ya maka ikesa ya bụ ozi n’ụbọchị 15 nke ọnwa Maachị 2023.
Ozi ha kpatara nktaọ dere “Onye si Anambra agaghị achị Legọs steeti.”
“Ozi nkewa a ekwesghi iwere ọnọdụ ọbụla n\ime atụmatụ onye kwuo uche ya”
“Anyị kwesịrị iwepụ ya bụ ozi ngwa ngwa”
“Ọ bụghị ebumnobi anyị imejọọ onye ọbụla.”
O kwukwara na N16,000 ha nwetere site na nkesa ya bụ ozi ga-agara ndị mwakpo na tigbuo zọgbuo metụtara na Legọs steeti.
Agbanyeghi nke a, ọtụtụ na soshal midia na-akatọ ozi ya na-ekwu na ọ ma ụma ghara iwepụ ya bụ ozi ma chere ka emechee ntuliaka tupu ọpụta bịa ịrọ mgbaghara.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post




















