2023 Nigeria Elections: E nyela ndị meriri ọkwa gọvanọ Abia, Ebonyi na Enugwu Steeti asambodo mmeri

N'ụbọchị 29 na 30 ka e nyere ndị meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ Abia, Ebonyi nakwa Enugwu Steeti asambodo mmeri ha dịka iwu Inec siri dị

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chigozie Ohaka, Chukwunaeme Obiejesi and Uche Akolisa

  1. Gọvanọ Ikpeazụ ekeleela Alex Otti maka mmeri ya dịka gọvanọ Abia Steeti

    Okezie Ikpeazu na Alex Otti

    Ebe foto si, Abia state government/Alex Otti/Facebook

    Gọvanọ Abia Steeti bụ Okezie Ikpeazu ekeela Alex Otti dịka ngalaba Inec kpọpụtara ya dịka onye meriri na ntuliaka gọvanọ Abia Steeti.

    Nke a siterre n'akwụkwọ ozi onyeisi ntaakụkọ steetu ahụ bụ Onyebuchi Ememanka depụtara o kwuru sị, " Dịka anyị bịara n'isi njedebe nghọpụta a, a na m ekele Dr Alex Otti maka mmeri ya, site n'obi ị dị n'otu na ihụnayna ebe Abia steeti nọ, a na m agwa Otti na mmeri ya bụ oku ndị Abia Steeti kpọrọ ya maka ọdịmma steeti a".

    Gbasara ị ga ụlọikpe maka ndị mpụtara ntuliaka a ejughị afọ, Ikpeazu kwuru sị, " mụ onwe m n'ime afọ atọ maara ihe m ghabigara n'ụlọikpe, a na m agwa ndị niile soro zọọ ọkwa a ka ha hapụ ime ka gọọmentị steeti a hapụ ọrụ ha kwesịrị ịrụ gaghariwa ụlọikpe. Ka anyị kwụsị nke a ma nye ha ohere ka ha rụọ ọrụ dị mkpa cheere ha n'ihu".

    Ikpeazu ji ohere a keele ndị Abia steeti ma kwa ha ka ha nye gọọmentị ọhụrụ a nkwado niile ha kwesịrị iji hụ na ha rụrụ ọrụ ha nke ọma.

  2. A kpọpụtala Peter Ndubuisi Mbah nke otu PDP dịka onye meriri gọvanọ Enugwu Steeti

    Peter Ndubuisi Mbah

    Ebe foto si, Peter Ndubuisi Mbah/Facebook

    Inec akpọpụtala Peter Ndubuisi Mbah nke otu PDP dịka onye meiri ntuliaka gọvanọ Enugwu steeti.

    Bar. Peter Ndubisi Mba bụ onye ọkaiwu ma bụrụ onye Owoh dị n'okpuru ọchịchị Nkanu East n'Enugwu Steeti.

    Dịka o siri dị, ndị otu APC na LP ekweghị itinye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta ntuliaka a.

    A kwụsịtụrụ ngụkọ mpụtara ntuliaka n'Enugwu steeti n'ihi nghọtahie dapụtara na mpụtara ntuliaka si n'okpuru ọchịchị Nsukka na nke Nkanu East.

    Nghọtahie a mere ka ndịnkwado PDP na Labour Party malite ngagharịiwe, ndị ọbụla n'ime ha na-ekwu na ọ bụ onye nke ha meriri.

    Ka o dị ugbua, a ka na-eche ịmata onye ga-enwe mmeri n'ime Peter Mba nke PDP na Chijioke Edeoga nke Labour Party.

    Na nchịkọta

    Reg voters : 2112793

    Accredited : 381971

    AA - 330

    AAC - 146

    ADC - 1160

    ADP - 382

    APC - 14575

    APGA - 17983

    APM - 358

    APP - 158

    BP - 319

    LP - 157552

    NNPP - 2107

    NRM - 854

    PDP - 160895

    PRP - 850

    SDP - 65

    YPP - 397

    ZLP - 332

    Vootu ndị dị ire - 358463

    Vootu ndị agụpụrụ - 9088

    Vootu niile a tụrụ - 367551

    Lee ka o si aga ebe a:

    https://www.facebook.com/BBCnewsIgbo/videos/922340935759171/

    Lee ka si kwụrụ site n'okpuruọchịchị

    Ndị niile debanyere aha ha ịtụ vootu: 150254

    Ndị niile kwesịrị ịtụ vootu: 28719

    AA 46

    AAC 7

    ADC 64

    ADp 18

    APC 1648

    Apga 1724

    Apm 31

    App 08

    BP 15

    LP 10109

    NNPP 172

    Nrm 47

    PDP 13633

    Prp 292

    Sdp 15

    YPP 97

    Zlp 27

    Vootu niile agụrụ: 27954

    Vootu niile akagburu: 759

    Ndị niile tụrụ vootu: 28713

    Okpuruọchịchị Igboeze noọtụ Enugwu steeti

    Ndị niile debanyere aha ha ịtụ vootu: 134230

    Ndị niile nwerikikere ịtụ vootu: 20633

    AA 04

    AAC 08

    ADC 16

    ADP 26

    APC 541

    ApGA 250

    Apm 23

    App 14

    BP 29

    Lp 9955

    Nnpp 167

    Nrm 43

    PDP 8738

    Prp 17

    Sdp 07

    YPP 38

    Zlp 54

    Vootu niile agụrụ:19930

    Vootu niile akagburu: 699

    Ndị niile tụrụ vootu: 20629

    Okpuruọchịchị Ezeagu Enugwu steeti

    Ndị niile debanyere aha ha ịtụ vootu: 88877

    Ndị niile nwerikikere ịtụ vootu: 15559

    AA 5

    AAC 10

    ADC 30

    ADp 14

    APC 963

    ApGA 300

    Apm 29

    App 11

    BP 18

    LP 5949

    Nnpp 81

    Nrm 20

    PDP 7576

    PRP 9

    SDP 3

    YPP 11

    Zlp 12

    Vootu niile agụrụ:15041

    Vootu niile akagburu: 496

    Ndị niile tụrụ vootu: 15537

    Okpuruọchịchị Aninri Enugwu steeti

    Ndị niile debanyere aha ha ịtụ vootu: 83416

    Ndị niile nwerikikere ịtụ vootu: 17340

    AA 0

    AAC 04

    ADC 29

    ADP 18

    APC 1060

    APGA246

    APM 22

    APP10

    BP 11

    LP 7747

    NNPP 121

    NRM 22

    PDP 7365

    PRP 13

    SDP 01

    YPP 18

    ZlP 20

    Vootu niile agụrụ: 16707

    Vootu niile akagburu: 625

    Ndị niile tụrụ vootu: 17332

    Okpuruọchịchị Igboetiti Enugwu steeti

    Ndị niile debanyere aha ha ịtụ vootu: 89636

    Ndị niile nwerikikere ịtụ vootu: 24303

    AA 4

    AAC 9

    ADC 24

    ADP 21

    APC 939

    APGA 1259

    APM 22

    APP 13

    BP 20

    LP 11941

    NNPP 137

    NRM 266

    PDP 8959

    PRP 23

    SDP 4

    YPP 12

    ZIP 17

    Vootu niile agụrụ: 23670

    Vootu niile akagburu: 592

    Ndị niile tụrụ vootu: 24262

    Okpuruọchịchị Udenu Enugwu steeti

    Ndị niile debanyere aha ha ịtụ vootu 133061

    Ndị niile nwerikikere ịtụ vootu: 23679

    AA 03

    AAC 11

    ADC 15

    ADp 27 Apc513

    ApGA 412

    Apm 45

    ADp 15

    BP 27

    Lp 11315

    Nnpp 174

    Nrm 165

    PDP 10148

    Prp19

    Sdp 05

    YPP 27

    Zlp 33

    Vootu niile agụrụ: 22954

    Vootu niile akagburu: 680

    Ndị niile tụrụ vootu: 23634

    Okpuruọchịchị Enugu north Enugwu steeti

    Ndị niile debanyere aha ha ịtụ vootu 208762

    Ndị niile nwerikikere ịtụ vootu: 23603

    AA 52

    AAC 7

    ADC 36

    ADP 34

    APC 563

    APGA 3108

    APM 9

    APP 2

    BP 12

    LP 9610

    NNPP 68

    NRM 36

    PDP 9333

    PRP 256

    SDP 2

    YPP 16

    ZIP18

    Vootu niile agụrụ: 23162

    Vootu niile akagburu: 422

    Ndị niile tụrụ vootu: 23584

    Okpuruọchịchị Enugu East Enugwu steeti

    Ndị niile debanyere aha ha ịtụ vootu 216477

    Ndị niile nwerikikere ịtụ vootu: 29843

    AA 66

    AAC 15

    ADC 30

    ADP 25

    APC 622

    APGA 2779

    APM 12

    APP 9

    BP 17

    LP 12405

    NNPP 92

    NRM 15

    PDP 12803

    PRP 30

    SDP 28

    YPP 28

    ZIP 23

    Vootu niile agụrụ: 28974

    Vootu niile akagburu: 657

    Ndị niile tụrụ vootu: 29631

    Nkanu East LGA Enugu state.

    Ndị niile debanyere aha ha ịtụ vootu 82959

    Ndị niile nwerikikere ịtụ vootu: 33156

    AA 08

    AAC 00

    ADC 05

    ADP 07

    APC 215

    APGA 117

    APM 07

    App 02

    BP 03

    LP 1864

    NNPP 14

    NRM 10

    PDP 16956

    PRP 04

    SDP 00

    YPP 37

    ZLP 0

    Vootu niile agụrụ: 19246

    Vootu niile akagburu: 27

    Ndị niile tụrụ vootu: 19273

    Nsukka LGA Enugu state.

    Ndị niile debanyere aha ha ịtụ vootu 204177

    Ndị niile nwerikikere ịtụ vootu: 45476

    AA 14

    AAC 15

    ADC 36

    ADP 45

    APC 1017

    APGA 1309

    Apm 45

    App 28

    BP 43

    LP 30294

    NNPP 460

    NRM 53

    PDP 10886

    PRP 82

    SDP 4

    YPP 42

    ZIP 44

    Vootu niile agụrụ 44417

    Vootu niile akagburu: 1017

    Ndị niile tụrụ vootu: 45434

    Mpụtara ntuliaka gọvanọ Enugwu Steeti
    Mpụtara ntuliaka gọvanọ Enugwu Steeti
  3. Lee ka ndị otu Labour Party sị aṅụrị n'Abia Steeti

    Ndi Labour pati

    Tupu Inec akpọpụta mpụtara ntuliaka nke ọkwa gọvanọ Abia Steeti, ndị otu Labour pati gbakọrọ n'ogige ha nke dị na Bank road in Umuahia.

    Na mpaghara ndị ọzọ n'Umuahia, ndị mmadụ na-aṅụrị kwa.

    Ndi Labour pati
    Ndi Labour pati
    Ndi Labour pati
    Ndi Labour pati
    Ndi Labour pati
    Ndi Labour pati
    Ndi Labour pati
    Ndi Labour pati
  4. Inec akpọpụtala Alex Chioma Otti nke Labour Party dịka onye meriri ntuliaka gọvanọ Abia Steeti.

    Alex Otti

    Ebe foto si, Alec Otti/ Facebook

    Ọkammụta Nnenna Oti onyeisi oche ngalaba Inec nke Abia Steeti nke lekọtara mkpọpụta ntuliaka akpọpụtala Alex Otti dịka onye meiri ntuliaka nke gọvanọ Abia Steeti.

    Ha ji ohere mgbe ya bụ mkpọpụta chọrọ ibido kwuo na enweghị mgbe Bvas jiri hapụ Obingwa ma sị na ha kporọ ndị ọkaibe gbasara ya bụ igwe Bvas ka ha bịa nyochaa ya.

    Cheta na eyiharịrị ya bụ mkpọpụta mpụtara dịka ndị Inec kwuru na ndị omekome wakporo ụlọọrụ nke nọ ebe ahụ, ọzọ abụrụkwa ebubo na kepukepu nke na-ekwu na e nwere nrụrụka ana enyo ya bụ ntụliaka.

    LEE KA HA SI KWỤRỤ

    Okpuruọchịchị Obingwa n'Abia steeti

    Ọnụọgụgụ aha dị n'akwụkwọ ntuliaka: 27664

    Ọnụọgụgụ ndị e nyochara maka ịtụ vootu: 157,390

    A - 187

    AA - 12

    AAC -22

    ADC -37

    ADP - 19

    APC - 721

    APGA - 1445

    APM - 18

    APP - 383

    BP - 113

    LP - 3776

    NNPP - 49

    NRM - 47

    PDP - 9962

    PRP - 12

    SDP - 55

    YPP - 3101

    ZLP - 11

    Vootu niile a gụrụ - 20000

    Vootu niile a kagburu - 510

    Vootu niile a tụrụ - 20510

    Okpuruọchịchị Isikwuatọ n'Abia steeti

    Ọnụọgụgụ aha dị n'akwụkwọ ntuliaka: 17229

    Ọnụọgụgụ ndị e nyochara maka ịtụ vootu: 77747

    A-21

    AA-243

    AAC-26

    ADC-136

    ADP-18

    APC-872

    APGA -3662

    APM-14

    APP-523

    BP-15

    LP-8228

    NNPP-111

    NRM-08

    PDP-2204

    PRP-07

    SDP-38

    YPP-269

    ZLP-415

    Vootu niile a gụrụ - 16810

    Vootu niile a kagburu - 419

    Vootu niile a tụrụ - 17229

    OkpuruọchịchịIsialaNgwa NọọtAbia Steeti

    Ọnụọgụgụ aha dị n'akwụkwọ ntuliaka - 102878

    Ọnụọgụgụ ndị e nyochara maka ịtụ vootu: 32548

    A-394

    AA-08

    AAC-12

    ADC-77

    ADP-20

    APC-838

    APGA-225

    APM-29

    APP-78

    BP-09

    LP - 7323

    NNPP - 68

    NRM - 26

    PDP - 21741

    PRP-14

    SDP-36

    YPP-1094

    ZLP-18

    Vootu niile a gụrụ - 32010

    Vootu niile a kagburu - 517

    Vootu niile a tụrụ - 32527

    E nwere ọgbaaghara na 'ward' 9, Unit 12

    OkpuruọchịchịIkwuanọ,Abia Steeti

    Ọnụọgụgụ aha dị n'akwụkwọ ntuliaka - 79687

    Ọnụọgụgụ ndị e nyochara maka ịtụ vootu: 13447

    A-61

    AA-37

    AAC-15

    ADC-261

    ADP-21

    APC-1198

    APGA-499

    APM-17

    APP-515

    BP-06

    LP - 7054

    NNPP-119

    NRM-09

    PDP-2427

    PRP-01

    SDP-332

    YPP-276

    ZLP-20

    Vootu niile a gụrụ - 12868

    Vootu niile a kagburu - 449

    Vootu niile a tụrụ - 13317

    OkpuruọchịchịArọchukwu,Abia Steeti

    Ọnụọgụgụ aha dị n'akwụkwọ ntuliaka - 89614

    Ọnụọgụgụ ndị e nyochara maka ịtụ vootu: 17771

    A-247

    AA-28

    AAC-35

    ADC-38

    ADP-24

    APC-1082

    APGA-460

    APM-17

    APP-893

    BP-22

    LP - 12689

    NNPP-100

    NRM-06

    PDP-1280

    PRP-19

    SDP-18

    YPP-410

    ZLP-17

    Vootu niile a gụrụ - 17385

    Vootu niile a kagburu - 350

    Vootu niile a tụrụ - 17735

    Ọgbaaghara mere ka a kagbuo ntuliaka na mpaghara Ututu nakwa Arochukwu 2

    Ntụfe vootu mere ka a kagbuo ntuliaka n'Amuvi

    OkpuruọchịchịIsialaNgwa SautAbia Steeti

    Ọnụọgụgụ aha dị n'akwụkwọ ntuliaka - 85388

    Ọnụọgụgụ ndị e nyochara maka ịtụ vootu: 21678

    A-136

    AA-4

    AAC-14

    ADC-39

    ADP-22

    APC-1580

    APGA-366

    APM-22

    APP-124

    BP-12

    LP-7589

    NNPP-105

    NRM-40

    PDP - 9093

    PRP-13

    SDP-20

    YPP-1691

    ZLP-42

    Vootu niile a gụrụ - 20912

    Vootu niile a kagburu - 692

    Vootu niile a tụrụ - 21604

    Okpuruọchịchị Bende Abia Steeti

    Ọnụọgụgụ aha dị n'akwụkwọ ntuliaka - 105182

    Ọnụọgụgụ ndị e nyochara maka ịtụ vootu: 22492

    A-48

    AA-23

    AAC-32

    ADC-459

    ADP-124

    APC-2143

    APGA -947

    APM-44

    APP-2733

    BP-17

    LP - 9886

    NNPP-110

    NRM-33

    PDP-3410

    PRP-11

    SDP-34

    YPP-1667

    ZLP-45

    Vootu niile a gụrụ - 21766

    Vootu niile a kagburu - 675

    Vootu niile a tụrụ - 22441

    E nwere ọgbaaghara na mpaghara Bende na Uzuakoli nke mere ka a kagbuo ntuliaka na polling unit olemole ebe ahụ.

    Okpuruọchịchị Ukwa West Abịa Steeti

    Ọnụọgụgụ aha dị n'akwụkwọ ntuliaka - 67990

    Ọnụọgụgụ ndị e nyochara maka ịtụ vootu: 11670

    A-29

    AA-01

    AAC-05

    ADC-130

    ADP-14

    APC-1209

    APGA -830

    APM-24

    APP-699

    BP-04

    LP-2833

    NNPP-24

    NRM-13

    PDP - 4622

    PRP-04

    SDP-18

    YPP-890

    ZLP-22

    Vootu niile a gụrụ - 11371

    Vootu niile a kagburu - 289

    Vootu niile a tụrụ - 11660

    Okpuruọchịchị Umunneochi Abịa Steeti

    Ọnụọgụgụ aha dị n'akwụkwọ ntuliaka - 76813

    Ọnụọgụgụ ndị e nyochara maka ịtụ vootu: 13702

    A-156

    AA-06

    AAC-25

    ADC-71

    ADP-28

    APC-2034

    APGA-581

    APM-16

    APP-679

    BP-04

    LP - 5940

    NNPP-76

    NRM-07

    PDP-3198

    PRP-08

    SDP-09

    YPP-314

    ZLP-12

    Vootu niile a gụrụ - 13164

    Vootu niile a kagburu - 340

    Vootu niile a tụrụ - 13504

    Okpuruọchịchị Ukwa East

    A- 16

    AA-06

    AAC-11

    ADC-13

    ADP-08

    APC-560

    APGA-646

    APM-05

    APP-890

    BP-05

    LP-2273

    NNPP-28

    NRM-07

    PDP - 2329

    PRP-08

    SDP-24

    YPP-759

    ZLP-17

    Vootu niile a gụrụ - 7595

    Vootu niile a kagburu - 166

    Vootu niile a tụrụ - 7761

  5. ‘Ntuliaka abụghị agha’ – Okwu Gbadebo Rhodes-Vivour ka ọ gara zute ezinụlọ ndị nwụrụ na ntuliaka

    Gbadebo Rhodes-Vivour

    Ebe foto si, Gbadebo Rhodes-Vivour

    Onye zọọrọ Labour Party ọkwa gọvanọ na Legọs steeti bụ Gbadebo Rhodes-Vivour ezipụtala ozi dịka o kwuru na kemgbe e mechara ntuliaka ahụ na ọ na-agagharị ụlọọgwụ dị iche iche ma na-enye ndị mwakpo so ntuliaka ọkwa gọvanọ Legọs metụtara ego enyemaka.

    Ozi ya na Twitter katọrọ mwakpo ndị a ma kwuo “Ọchịchị kwesịrị ichekwa ndị mmadụ, ọ kwesịghị ịkpata nkwafu ọbara ndị ị kwesịrị ịgbara odibo.”

    O boro ebubo na ọ bụ pati nọ n’ọchịchị bụ ihe zitere ndị wakporo ndị mmadụ pụtara ịtụ vootu dịka o kwuru:

    “E jirila m abalị olemole na-aga eeleta ezinaụlọ ndị tufuru ndụ ha maka ịpụta tụọ vootu na Satọdee bụ ndị pati nọ n’ọchịchị tinyere tigbuo zọgbuo gburu ha.”

    Tigbuo-zogbuo, iyi egwu na mkpagbu bụ ihe so ntuliaka ọkwa Gọvanọ na ụlọomeiwu steeti n'ọtụtụ steeti e mere ntuliaka n’ụbọchị 18 nke ọnwa Maachị, 2023.

    Akụkọ mmajia na mwakpo ndị pụtara ịtụ vootu dapụtara nke ukwuu n’akụkụ dị iche iche na Legọs ụbọchị ahụ.

    Ụfọdụ ihe onyonyo ndị gbara na soshal midia gosiri ndị a na-eche bụ ndị na-akwado otu APC ka ha nọ na-agwa ndị mmadụ ndị achọghị ịtụrụ pati ha vootu ka ha 'lawa be ha'.

    BBC nyochara ụfọdụ ihe onyonyo ndị ahụ, were chọpụta na otu n'ime ha mere n'akụkụ Mafoluku, dị na mpaghara Oshodi, Legọs.

    BBC nyochakwara ihe onyonyo gosiri ebe ọgbaghara dapụtara n’etiti ndị chọrọ itụ vootu na ndị agboro bịara ikposa atụmvootu na Star Times Estate dị na Legọs zụkọrọ.

    Ụlọọrụ mba Amerịka na Naịjirịa katọrọ ihe ndị a ma kwuo na ha ga-enye ndị a hụrụ na aka nọ n'ime okwu ntaramahụhụ nke gụnyere mmachi ha ịbata mba ha.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  6. Ndị na-achọ ịkụchapụ mmeri Bola Tinubu na ntuliaka na-arọ nrọ ọcha – Ayo Fayose

    Fayose

    Ebe foto si, GovayoFayose

    Aka chịburu Ekiti steeti bụ Ayodele Fayose ekwuola na ndị na-achọ ka a kagbuo nhọpụta Bola Tinubu dịka onye ga-achị Naịjirịa na-arọ nrọ ọcha.

    O kwuru nke a n’ụbọchị Tuzde na mkparịtaụka ya ụlọ ntaakụkọ Channels TV.

    N’okwu ya, ọ sị:

    “Onye ọbụla na-ekwu na ọ ga-anapụ Ahmed Bola Tinubu ọchịchị a na-arọ nrọ ọcha, onye ahụ na-etinye onwe n’ime ajọ nrọ; ntuliaka abịala, laa ma chịsa ọwa ya”

    “Ị na-ekwu okwu ibupụ okwu a ụlọikpe, ọ dị gị ka ndị ọzọ ga na-ele gị anya ka ịkụpụ ha n’ụlọikpe?”

    O kwuru na ọ naghị echela uche azụ n’okwu nkwado o nyere Bola Tinubu agbanyeghi na ọ bụ onye PDP.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ihe o mere so mkpebi ụfọdụ n’ime ndị pati ha zụkọrọ mee iji hụ n’ọchịchị ruru ndị ndịda Naịjirịa aka.

    Okwu Fayose kwuru rụrụ aka na mkpesa Peter Obi nke Labour Party na Atiku Abubukar nke PDP buuru gaa ụlọikpe maka ịgbagha mmeri Bola Tinubu nwetere na ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa 2023.

  7. A ga-amalite ngụkọ mpụtara ntuliaka Abia steeti n'elekere anọ nke mgbede taa

    Alex Otti na Okey Ahiwe

    Ebe foto si, Alex Otti/Okey Ahiwe

    Ngụkọ mpụtara ntuliaka n'Abia Steeti ga-amalite ọzọ n'elekere anọ nke mgbede taa, dịka ọnụ na-ekwuru Inec na steeti ahụ bụ Bamidele Oyetunji si kwuo.

    Inec kwụsịburu ngụkọ mpụtara ntuliaka n'Abia steeti n'ihi ebubo nrụrụaka na ntuliaka e mere n'okpuru ọchịchị Obingwa.

    Naanị mpụtara ntuliaka nke okpuruọchịchị Obingwa bụ nke ọ fọdụrụ tupu a kpụta onye meriri ntuliaka ọkwa gọvano Abia steeti.

    Ka ọ dị ugbua, a kpọọla mpụtara ntuliaka si n'okpuru ọchịchị 16, Alex Otti nke Labour Party emeriela n'okpuru ọchịchị 10, PDP meriri n'okpuru ọchịchị ise, ebe YPP meriri n'otu okpuru ọchịchị.

  8. Ngụkọ mpụtara ntuliaka n'Enugwu Steeti ga-amalite ọzọ n'elekere ise

    Peter Mba na Chijioke Edeoga

    Ebe foto si, Peter Mba/Chijioke Edeoga

    Inec ekwuola na ngụkọ mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ n'Enugwu steeti ga-amalite ọzọ n'elekere ise nke mgbede taa bụ Wenezde, Maachị 22, 2023.

    Ọnụ na-ekwuru Inec n'Enugwu bụ Victor Okafor gwara BBC nke a ma kwuo na a ga-akapị mpụtara ntuliaka niile ahụ ọnụ ma kpọpụta onye meriri.

    Cheta na Inec kwụsịtụrụ ngụkọ mpụtara ntuliaka n'Enugwu n'ihi nghọtahie dapụtara na mpụtara ntuliaka si n'okpuru ọchịchị Nsukka na nke Nkanu East.

    Nghọtahie a mere ka ndịnkwado PDP na Labour Party malite ngagharịiwe, ndị ọbụla n'ime ha na-ekwu na ọ bụ onye nke ha meriri.

    Ka o dị ugbua, a ka na-eche ịmata onye ga-enwe mmeri n'ime Peter Mba nke PDP na Chijioke Edeoga nke Labour Party.

  9. "Wepụnụ onye isi ngụkọ ntuliaka Abia Steeti" - Ihe gọọmentị Abia gwara Inec

    Okezie Ikpeazu/Nnenna Oti

    Ebe foto si, Okezie Ikpeazu/Nnenna Oti

    Gọọmentị Abịa Steeti akpọkuola isi ụlọọrụ Inec dị n'Abuja ka ha wepụ onyeisi ngụkọ mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere n'Abia Steeti, bụ Ọkammụta Nnenna Nnannaya-Oti.

    Kọmishọna mgbasaozi Abia Steeti bụ Eze Chikamnayo kwuru na o doro anya na ndị Labour Party nakwa onye zọrọ ọkwa gọvanọ na pati ahụ bụ Alex Otti na-agwa ọkammụta Nnenna Oti ihe ọ na-eme.

    "Akụkọ ekwuola na onyeisi ngụkọ mpụtara Ntuliaka bụ Oriaku Nnenna Otti na Alex Otti bụ ụmụnne. Ya mere e kwesịrị iwepụ ya n'ọkwa ahụ ugbua maka na ọ gaghị abụ onye isi ọkaikpe n'okwu metụtara ya," Chikamnayo dere n'akwụkwọ ozi o zipụrụ n'ụbọchị Tuzde.

    "Site n'akparamagwa ya, O (Nnenna Oti) gosila na ọ bụghị onye chọrọ inye ikpe ziri ezi kama ọ bụ onye kwụnyeere otu ndị."

    Chikamnayo gara n'ihu bo Alex Otti na Labour Party ebubo ime ọtụtụ nrụrụaka na iwepụta mpụtara ntuliaka na-abụghị etu ndị mmadụ si tụọ vootu.

    "Inec kwesịrị iji igwe BVAS nyochaa mpụtara ntuliaka niile e debanyere n'akwwụkwọ 'form EC8A' nke okpuru ọchịchị niile. Ha mee nke a, ha ga-achọpụta na mpụtara ntuliaka niile nke Alex Otti na ndị otu ya bupụtara bụ adigboroja, ma kagbukwaa ha niile," ka Chikamnayo dere.

    Chetakwa na ụfọdụ ndị nke gụnyere ndị otu PDP boro ebubo na Nnennaya Oti na Alex Otti bụ ụmụnne mana nnyocha BBC Igbo gosiri na akụkọ a bụ akụkọ ụgha.

  10. Ekele ụtụtụ

    Igbo mụrụ nze mụọ ọzọ, ụnụ asaala chi.

    Anyị na-ekele gị dịka ị na-esonyere anyị na mgbasaozi nke taa.

    Ya gaziere gị.

  11. Ihe isi ụlọọrụ mba Amerịka na Naịjirịa kwuru maka ntulika 2023

    Ụlọọrụ Amerịka na Naịjirịa

    Ebe foto si, USinNigeria/Twitter/BBC

    Ụlọọrụ mba Amerịka na Naịjirịa bụ ‘US mission in Nigeria’ ezipụta ozi ihe ndị ha ji anya ha hụ n’oge ntuliaka ọkwa gọvanọ nakwa nke ndị ụlọomeiwu steeti Naịjirịa.

    Ozi nke pụtara n’ụbọchị Tuzde kwuru

    “Mba Amerịka nọ n’ụjọ etu mwakpo, mmaja na mkpagbu ndị chọrọ ịtụ vootu, siri soro ntuliaka ndị e mere na Legọs, Kano nakwa steeti ndị ọzọ”

    “Ọ bụ ihe e kwesịrị ilebaranya etu ozi ịkpaoke agbụrụ siri rie elu tupu nakwa n’oge ntuliaka ọkwa gọvanọ na Legọs steeti”

    ‘Anyị na-akatọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa,. Ndị isiụka, ndị isi obodo, ndị ntorobịa na ndịnkịtị gbara nkiti ma ghara ịkwụtọ mwakpo nakwa okwu ikpaoke ndị a”.

    “Anyị na-akpoku gọọmentị Naịjirịa ka ha nwudo ndị mere ihe ndị a ma kpee ikpe ziri n’isi ha ma ahụ n’aka dị n’atụmatụ mmaja na tigbuo zọgbuo dapụtara n’oge ntuliaka a”

    Ụlọọrụ gara n’ihu kwuo ihe dị ha n’obi ime ndị okwu a metụtara dịka ha kwuru:

    “Anyị ga-atule inye ndị a ntaramahụhụ dịịrị ha nke gụnyere mmachị inye ndị aka nọ n’ime ndị a akwụkwọ ikike ibata mba Amerịka.”

    Ha gara n’ihu kwuo na ha na ndị ọrụ nlebanya n’usoro ntuliaka ndị ọzọ na-adụ Inec ndụmọdụ ka ha hazie usoro ntuliaka ha nakwa ngwa teknụzụ ha.

    Ha gbakwara ndị nwere mkpesa banyere etu ntuliaka ahụ siri gaa ka ha buru ya gaa ụlọikpe.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  12. Tọhapụrụ anyị Nnamdi Kanu - Soludo na-arịọ onyeisiala ọhụrụ, Tinubu

    Chukwuma Soludo na Bola Ahmed Tinubu

    Ebe foto si, Chukwuma Soludo/Bola Ahmed Tinubu/Facebook

    Aka na-achị Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo ekeleela onye meriri ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu, ma werekwa ohere ahụ kpọkuo ya ka ọ tọhapụ Mazi Nnamdi Kanu ma ọ banye n'ọchịchị.

    Nke a dị n'akwụkwọ ozi nke Soludo wepụtara n'ụbọchị Tuzde gbasara ntuliaka Naịjirịa nke bịarala n'isi njedebe.

    Soludo kwuru na ihe dị mkpa ugbua bụ ka ọgwụgwọ mwugharị malite na Naịjirịa ọ kachasị dịka o si metụta ọnọdụ nchekwa, na ọnọdụ akụnụba.

    "Ana m ekele Onyeisiala ahọpụtara ọhụrụ bụ Asiwaju Bola Ahmed Tinubu maka mmeri ya na ntuliaka, na-ekelekwa ndị so ya zọọ ya bụ ọkwa maka ike ha kpara na ya bụ ndọrọndọrọ," Soludo dere.

    "Anyị na-ekwe nkwa ịkwado ma nyere ọchịchị gọọmentị etiti aka iji weta mmepe n'Anambra Steeti nakwa Naịjirịa.

    "Otu ihe anyị ga-arụtụrụ gị (bụ onyeisiala ọhụrụ) aka bụ ihe gbasara mwulite ọnọdụ nchekwa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nke bụ ihe dị nnukwu mkpa ma kwesịkwa ime ya ngwa ngwa.

    "Ọ bụ eziokwu na atụmatụ dị icheiche anyị na-etinye maka mwulite ọnọdụ nchekwa na-amịta mkpụrụ, anyị kwenyere na a ga-enwe ezi nchekwa ga-anọte aka site n'atụmatụ na-abụghị nke aka ike kama nke ịkpọkọta ndị niile okwu ahụ metụtara ka e nwee mkparịtaụka.

    "N'ihi nke a, ana m arịọkwa Onyeisiala ọhụrụ arịrịọ ọzọ, dịka m meburu n'oge mbụ, ka ọ tọhapụ Mazi Nnamdi Kanu na mkpọrọ ngwangwa o malitere ọchịchị (ma ọ bụrụ na a tọhapụbeghị ya ruo oge ahụ).

    "Ọ bụ onye dị mkpa kwesịrị isonye n'ọgbakọ ahụ a ga-enwe iji weta ọgwụgwọ nakwa udo zuru oke na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ."

    Soludo kwuru na onye ọbụla nwere mkpesa maka mpụtara ntuliaka nwere ikike iwega mkpesa ya n'ụlọikpe.

    "Party nke mụ onwe m bụ 'All Progressives Grand Alliance' (Apga) nwereike ịga ụlọikpe ịga wetaghachi mmeri anyị nwetara nke a napụrụ anyị," ka o kwuru.

    Soludo kwuru na ya na-ekwe ndị niile nwetara mmeri n'ụlọ omeiwu Anambra state nkwa nkwado ya, ma na-akpọku ha ka ya na ha jikọọ aka ọnụ maka ọdịmma Anambra Steeti.

  13. Etu Peter Obi siri katọọ nnwụchi nwaamadị a na-akpọ Chude na Soshal Midia

    Peter Obi na Chude

    Ebe foto si, Peter Obi/Twitter

    Onye zọọrọ Labour Party ọkwa na ntuliaka onyeisiala 2023 bụ Peter Obi etinyela ọnụ n’okwu ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n’ọnụ kemgbe abali olenaole.

    Ozi Obi katọrọ nnwụchie nwaamadi ọtụtụ ji aha ‘Chude’ mara na soshal midia Twitter.

    Obi kwuru na nwụchị ya maka ihe ọ chị bụ ozi ndị ọ kesara na Twitter gosiri na “isoro usoro iwu, ndị mmadụ inweike nye ndị ọchịchị ntuziaka nakwa usoro ọchịchị ziri ezi na Naịjirịa na-adatusiike”

    Obi kwuru na nchọpụta o mere site n’ọtụtụ ịjụ ajụjụ gbara n’anwụ na ndị uweojii nwụchiri Chude maka nkatọ onyere ụfọdụ ndị nọ n’ọchịchị.

    Ọ gara n’ihu kwuo:

    “Ọtụtụ na-eso ịnọ n’ọchị nke otu n’ime ya bụ ndị mmadụ inwe echichi dị iche iche banyere ndị ọchịchị.”

    “Anyị nwereikike isa ihe mmadụ na-ekwu, mana iji ikike ọchịchị emegbu ndị mmadụ agaghi abụ ihe dịrị anyị mma dịka ndị mmadụ nakwa ndị nọ n’’ọchịchị”

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Cheta na akụkọ pụtara n’abalị Satọdee na a nwụchiri Chude.

    Ụfọdụ kwukwara na ọ bụ ntọrọ ka a tọọrọ ya.

    Gọvanọ Chukwma Soludo mechara zipụtara ozi n’ehihe Sọnde ma gbaa ama na ndị uweojii Anambra nwụchiri nwaamadị ahụ n’ezie.

    Soludo kwuru na ọ bụ ngalaba ndị uweojii ụị̀a na-ahụ maka iji ịntanetị mee mpụ nwụchiri ya ma kpọga ụlọọrụ ha nọ n’Abuja.

    O kwukwara na ndị uweojii Anambra amaghị maka ebubo nọ n’isi ya maọbụ ihe mere e jiri nwụchie ya kpọm kwem.

    Chude so na ndị nkwado otu Labour Party a ma ama nke uweojii dịka o ji ọbaozi soshal midia gbasoo atụmatụ ịchụrụ pati ahụ nta vootu kemgbe ọnwa ole m ole gara aga.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  14. Ihe Tinubu gwara Buhari na ndị Naịjirịa maka ntuliaka 2023

    Bola Tinubu

    Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu/Facebook

    Bola Ahmed Tinubu bụ onye Inec kwuru nwtere mmeri na ntuliaka onyeisiala 2023 ezipụtala banyere ntuliaka ọkwa onyeisiala, nke gọvanọ na nke ndị omeiwu emechapụrụ na Naịjirịa.

    Ozi a o zipụtara na Tuzde toro onyeisiala Muhammadu Buhari maka etu o siri hibe ntọala nakwa ụkpụrụ ndị mere ka ntuliaka bụrụ ihe bịara na mmezu.

    Ọ gara n’ihu kwuo banyere akụkọ mwakpo na ọgbaghara ndị dapụtara n’oge ntuliaka ndị a.

    Ozi ya dere:

    “Ọ bụ ihe nwute na e nwere akụkọ ọgbaghara dapụtara n’oge ntuliaka a n’ụfọdụ steeti. Ana m akatọ ihe ndị a. Akụkọ maka ebe ndị a sị agbara ọkụ dịka e mechapụrụ ntuliaka ọkwa gọvanọ n’otu steeti egosighi ụkpụrụ anyị dịka ndị udo na ịhụnaya na-amasị.”

    “Ntuliaka kwesịrị ịbụ ohere ngosi ntozuoke ọchịchị onye kwuo uche ya nakwa nnwereonwe ndị mmadụ n’atụmatụ ịhọrọ ndị ha chọrọ, okweghi ịbụ oge iru uju. Nke kacha wute m bụ etu okwu ịkpaoke agbụrụ siri jụpụta ebe niile bụ ihe nwereike ịkpata ọgbaghara n’akụkụ dị iche iche.”

    “Dịka aka chịbụrụ Legọs steeti, ama ike dị n’ime ndị mmadụ ịjịkọaka ọnụ ma nabata onwe ha. Dịka onye a họpụtara ga-achi Naịjirịa, ụdịrị mmụọ a anyị hibere na Legọs bụ ihe m chọrọ ibubata n’ọchịchị Naịjirịa.”

    Ọ gara n’ihu kwuo na ọ ga-agba mbị chekwa ndụ ndị mmadụ na ikiek dịrị ha ime ha dị ha mkpa dịka iwu siri nye ohere ya.

    Ọ kwekwara nkwa ikwalite ikpe siri ezi, ịdanotu nakwa igbachiri mmadụ niile na Naịjirịa.

    Na nchịkọta, o kwuru na ọ dịịla njikere ịchị Naịjirịa dịka onyeisiala.

    Inec kpọpụtara Tinubu dịka onyeisiala agbanyeghi na ụfọdụ ndị zọrọ ọkwa ahụ ekweteghiri usoro ntuliaka nyere ya ọchịchị nke mere ha jiri buru okwu ahụ gawa ụlọikpe.

    Peter Obi zọrọ Labour Party ọkwa ebughala mkpesa ụlọikpe n’uju dịka a ga-amalite ya bụ ikpe n’oge adịghị anya.

    Ọ bụrụ na ụlọikpe kwuo na mmeri Tinubu ziri ezi, a ga-edu ya iyi ọrụ n’ụbọchị 29 nke ọnwa Mee, 2023 dịka ọ ga-aga n’ihu chịa Naịjirịa n’afọ anọ na-abịa abịa.

  15. "Ọ bụ mụ ka ọkwa Senate President ruuru" - Orji Uzor Kalu

    Orji Uzor Kalu

    Ebe foto si, Orji Uzor Kalu

    Aka chịburu Abia Steeti bụ Orji Uzor Kalu ekwupụtala mmasị ya ịzọ ọkwa onyeisi ụlọ omeiwu ukwu nke Naịjirịa, ma kwuo na ọ bụ ya ka ọkwa ahụ ruuru.

    Kalu kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ n'ihe onyonyo nke ụlọ ntaakụkọ Daily Trust wepụtara n'ụbọchị Tuzde.

    O kwuru na ọ bụrụ na ya merie ọkwa ahụ na ọ ga-etinye Naịjirịa n'ọnọdụ mbụ n'ihi ọbụla ọ na-eme.

    "Ọ bụrụ na m nweta mmeri, aha mbụ ọchịchị m ga-abụ 'team Nigeria', aha nke abụọ ga-abụ 'team Nigeria', aha nke atọ ga-abụ 'team Nigeria'," Kalu kwuru.

    "Ụnụ ga-echeta na agbanwebeghị m akara ekwentị m kamgbe afọ 24 m ji bụrụ gọvanọ ruo ugbua. Oru akara ekwentị ahụ ka m nwere nke onye ọbụla na Naịjirịa nwere ike iji nweta m.

    "Agaghị m agbanwekwanụ akara ekwentị ahụ ma ọ bụrụ na m merie ọkwa onyeisi sinet. Ya mere m ji nwee nchekwube na ụmụ Naịjirịa niile ga-ekpere m ekpere ka m bụrụ onyeisi sineti, maka na ọ bụ mụ ka o ruuru."

  16. Gregory Ibe ekeleela Alex Otti na ntuliaka Abia Steeti

    Gregory Ibe na Alex Otti

    Ebe foto si, Gregory Ibe/Alex Otti

    Onye zọrọ ọkwa Gọvanọ Abia steeti na pati 'All Progressives Grand Alliance' (APGA) bụ Gregory Ibe, ekeleela Alex Otti nke Labour Pati dịka a na-eche ka Inec kpọpụta mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere na steeti ahụ n'ụbọchị Satọde, Maachị 18.

    Ibe kwuru na ọ bụ eziokwu na Inec akwụsịla ngụkọ mpụtara ntuliaka n'Abia Steeti, "mana na ndị nke a kpọpụtarala, o doro anya na Alex Otti nke Labour Party nwetara vootu ga-ezu iji kpọpụta aha ya dịka onye meriri ntuliaka ahụ."

    "Ya mere, dịka a na-eche ka Inec kpọpụta kpọmkwem onye meriri ntuliaka a, achọrọ m ikele Dr Alex Otti maka nkwụdosi ike ya ịhụ na Abia Steeti pụtara n'ọnọdụ ọchịchị ọjọọ ọ nọ n'ime ya kamgbe ọtụtụ afọ."

    Ibe rịọkwara Inec ka ha gbado anya ma hụ na ha mere ihe kwesịrị ekwesị na ngụkọ nakwa mkpọpụta mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ Abia Steeti dịka iwu 'Electoral Act' si kwuo.

    Cheta na Inec akpọpụtala mpụtara ntuliaka n'okpuru ọchịchị 16 n'Abịa Steeti, ọ fọdụ naanị otu nke bụ Obingwa.

    N'ime ndị ahụ akpọpụtarala, Alex Otti nke Labour Party meriri n'okpuru ọchịchị iri, Okey Ahiwe nke PDP meriri n'okpuru ọchịchị ise, ebe Enyinnaya Nwafor nke YPP meriri n'otu okpuru ọchịchị.

  17. Siminialayi Fubara nke PDP emeriela ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Rivers Steeti

    Siminalayi Fubara/

    Ebe foto si, Sir Siminalayi Fubara/Facebook

    Onye zọrọ ọkwa gọvanọ Rivers Steeti n'otu 'Peoples Democratic Party' (PDP) bụ Siminialayi Fubara, emeriela ya bụ ntuliaka dịka Inec si kpọpụta.

    Onyeisi ngụkọ mpụtara ntuliaka na Rivers Steeti bụ ọkammụta Akpofure Rim-Rukeh kpọpụtara nke a n'abalị ụbọchị Mọnde n'isi ụlọọrụ ndị Inec dị na Pọt Hakọt.

    Fubara nwetara vootu 302,614 iji turu ugo, ebe onye nke abụọ bụ Tonye Cole nke 'All Progressives Congress' (APC) nwetara vootu 95,274.

    Onye gbara onye nke atọ bụ Magnus Abe nọ n'otu 'Social Democratic Party' (SDP) dịka o nwetara vootu 41,698, ebe onye nke Labour Party, Beatrice Itubo, nwetara vootu 22,224 iji bụrụ onye nke anọ.

    Ọkammụta Akpofure kwuru na vootu a tụrụ na ntuliaka a dị 494,604, mana a kagburu vootu 10,670.

  18. Ụtụtụ ọma nụ

    Igbo bụ Igbo ndewo nụ.

    Ụnụ asaala chi.

    Ngwa ka anyị malite mgbasaozi nke ụbọchị taa. Ya gazie.

  19. Nchịkọta ihe ndị mere n'Abịa steeti n'oge ngụkọ vootu n'ụbọchị Mọnde

    Aha onyonyo, Ihe ndị nọ n’Abịa na-ekwu maka ngụkọ a na-eme n’Abia steeti

    Onye ntaakụkọ BBC n’Abịa steeti mere ngagharị n’isiobodo Abia steeti bụ Umuahia jụọ ọtụtụ ndị mmadụ etu obi dị ha banyere ngụkọ vootu Inec na-eme na steeti ahụ.

    Nke a na-abịa dịka ozi n’aka ụlọọrụ Inec n’ehihe Mọnde kwuru na ha ekpebiela ịkwụsịtu ngụkọ vootu n’akụkụ okpuruọchịchị ụfọdụ na steeti abụọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

    Steeti abụọ a bụ Abịa steeti ebe ozi ha kwuru na ndị agboro wakporo isi ụlọọrụ ha n’Obingwa ma jichie ndị ọrụ ha.

    N’Enugu, ụfọdụ mere ngagharịiwe dịka ndị nkwado pati abụọ bụ PDP na LP na-ekwu na ha chọrọ ka agụgharị vootu ndị agụrụ si okpuruọchịchị Nsukka na Nkanu West.

    Ya bụ ihe mere Inec ji kpebia ịkwụsịtu ngụkọ ka ha nweeike tinye anya ngwa ngwa n’okwu ndị a tupu amalite ọzọ ma chịkọta ngụkọ vootu.

    Inec kwuru na ngụkọ ga-amalite ọzọ n'ụbọchị Tuzde abalị 21, 2023.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  20. Inconclusive: Inec ekwuola na ntuliaka n'Adamawa akapịghị ọnụ

    Ahmadu Fintiri/Aishatu Dahir

    Ebe foto si, Aishatu Dahiru/Ahmadu Fintiri/Facebook

    Dịka anya ọha na-ele Adamawa steeti kemgbe, Inec ekwuola na Mọnde a na ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere na steeti ahụ na Satọdee akapịghị ọnụ.

    Otu n’ihe mere anya ndị mmadụ jiri chadoo na steeti ahụ bụ na a na-ele anya ịhụ ma a ga-akpọpụta aha Sịnetọ Aishatu Dahiru dịka onye mmeri.

    Nke a ga-eme Dahiru nwaanyị mbụ ga-achị steeti ọbụla dịka gọvanọ site n’usoro ntuliaka.

    Ka ọ dị ugbua, Dahiru na-azọrọ All Progressives Congress (APC) ọkwa na steeti ahụ enwetela vootu 390, 275 ebe ogbo ya nke onye PDP bụ gọvanọ Ahmadu Fintiri nweterela vootu 421,524.

    Onyeisi ngụkọ vootu n’ụlọọrụ Inec steeti ahụ bụ Muhammadu Mele kwuru “Emeghi ntuliaka na Wọọdụ 47 nke metụtara ọgbọ ntuliaka 69.”

    O kwuru na nke a metụtara mpụtara ntuliaka si ebe ahụ pụta ma kọwa na iwu ntuliaka Inec kwuru na ihe dị etu a mee na a ga-akpọpụta ntuliaka ebe ahụ dịka ntuliaka akapịghị ọnụ (inconclusive).

    Ka iwu Inec dị, nke a pụtara na a ga-eme ntuliaka ọzọ n'akụkụ ụfọdụ ya bụ ihe metụtara na steeti ahụ.