2023 Nigeria Elections: E nyela ndị meriri ọkwa gọvanọ Abia, Ebonyi na Enugwu Steeti asambodo mmeri
N'ụbọchị 29 na 30 ka e nyere ndị meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ Abia, Ebonyi nakwa Enugwu Steeti asambodo mmeri ha dịka iwu Inec siri dị
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Chigozie Ohaka, Chukwunaeme Obiejesi and Uche Akolisa
Lee etu ndị Ezza na Effium siri tụọ vootu n'Ebonyi Steeti
Dịka nsogbu nke butere ọgụ n'etiti ndị obodo Ezza na Effium mere ka ime ntụliaka na obodo ndị a sie ike, enyere ha ọdọ egwuregwu nke Ngele Oruta dị n'Abakiliki ka ndị obodo ndị a tụọ vootu ha.
A kpọrọ ogige a Nwigbeke Ward 2 nke nwere polling unit ruru ihe dịka anọ.
Lee foto etu o si aga
Ndị nwere nkwarụ nọ na-agbara onwe ha bọọlụ n'oge ntuliaka
Ụfọdụ ndị
nwere nkwarụ nọ na-agbara onwe ha bọọlụ n’akụkụ Mile 12 dị n’okporoụzọ Ikorodu Legọs
dịka a na-eme ntuliaka ọkwa gọvanọ na-aga n’ihu na steeti ahụ.
Lee etu asọmpị
ha si aga dịka ndị mmadụ pụtara na-elele ha.
Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja enyela ngalaba na-ahazi ntuliaka na Naijiria bụ 'Independent National Electoral Commission'(Inec) ka ha jiri igwe intanet zipụ mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ na ụlọomeiwu a na-eme taa dịka usoro ha tụpụtara si kwuo.
Ọkaikpe Obiora Egwuatu, kwuru nke a na mkpebi o nyere ụbọchị Fraide.
Jọstịs Egwuatu nyekwatra iwu ka Inec were igwe 'bimodal voter accreditation system'(BVAS) tinye akwụkwọ e ji edenye mpụtara a kpọrọ 'EC8A' n' ọgbọ atụmvootu ozigbo n' ọbaozi Inec a kpọrọ 'iReV n' Akwa Ibom.
Chris Akomas atụọla vootu nke ya n'Abịa steeti
Aha onyonyo, Chris Akomas nke Abịa steeti atụọla vootu ya
Chris Akomas bụbu osote gọvanọ Abịa steeti apụtala tụọ vootu nke ya n'akụkụ Obingwa nke Abịa steeti.
Ndị ọrụ Inec, ndị ntaakụkọ nakwa ndị ọrụ nchekwa nọcha ebe ahụ ugbua.
Gere ihe ọ gwara BBC Igbo ebe a.
Ndị omekome achụsala ndị bịara ịtụ vootu na mpaghara Agungi dị na Lekki, Legọs Steeti.
Otu ogige ebe a na-atụ vootu nke dị na mpghara Agungi nke dị na Lekki Legọs steeti nọzị na gbagharịa.
Nke a mere dịka ndị omekome bịara chụsa ndị pụtara ịtụ vootu na ndị ọrụ Inec nọ na mpaghara ahụ.
Ndị omekome a napụrụ ụfọdụ ndị bịara ịtụ vootu ekwentị ha.
Otu onye ntaakụkọ BBC nọ ebe ahụ kwuru na ndị mmadụ ka nọ na-eche ka ndị ọrụ Inec laghachị azụ bido atụmvootu.
Nke a na-eso kepukepu na ndị ọrụ Inec gbara ọsọ gbaga n'ụlọ otu Eze na mpaghara ahụ. Ọ bụ nke a gbara ndị mmadụ ume mere ha ji eche ka ha pụta bido atụmvootu.
Ọgbaghara dapụtara n'Ago, Legọs Steeti
Ebe foto si, Screen Grab
Ihe onyonyo na-efegharị na Soshal Midịa na-egosi ebe a na-eti otu onye ihe ebe otu onye ọzọ tọgbọ n'ala.
Ndị uweojii nọkwa ebe ahụ, a nụrụ ụda egbe na ya bụ ihe onyonyo.
Ndị tinyere ihe onyonyo a na soshal midịa na-ekwu na ọ bụ onye omekome bịara ịchụsa ndị bịara ịtụ vootu kama enweghị onye ma ihe mere n'ezie.
Kama otu onye tinyere ihe onyonyo a na Twitter na-ekwu na ọ bụ ndị uweojii gbara onye ahụ egbe.
Ebe foto si, Screen Grab
Gọvanọ Ifeanyi Okowa atụọla vootu nke ya
Ebe foto si, Charles kosipre
Gọvanọ Delta
steeti bụ Ifeanyi Okowa atụọla vootu nke ya n’ọgbọ ntulaka nọ n’ime ụlọakwụkwọ Eghoma Praịmarị nke okpuruọchịchị Ika North East.
Ọ pụtara n’oge mee nke a taa bụ Satọdee
abalị 18 nke ọnwa Maachị.
Ebe foto si, Charles kosipre
Ndị si Kano ekwuola na ndị mmadụ apụtaghị n'igwe ebe ahụ
Akụkọ si Kano
apụta na-ekwu na ndị Kano apụtaghị n’igwe etu ha siri pụta n’oge ntuliaka ọkwa
onyeisiala e mere n’ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị.
Onye ntaakụkọ
BBC mere ngagharị n’akụkụ steeti ahụ gbara ama nke a.
O kwuru na
ntuliaka malitere n’ebe elekere asatọ na ọkara dịka ndị Inec wụchiri ebe ahụ n’oge.
O kwukwara na
ndị mmadụ apụtaghị n’akụkụ dị iche iche etu ha siri pụta n’oge ntuliaka e mere
na Febrụwarị.
A hụghịkwa
ọtụtụ ụmụnwaanyị ebe ahụ.
Ndị agboro wakporo m n'ọgbọ ntuliaka m - Chioma Akpotha
Omeeihe ejije Nollywood a ma ama bụ Chioma Akpota ekwupụtala na ndị agboro ndọrọndọrọ Ọchịchị wakporo oge ọ gara ịtụ vootu.
Akpotha kwupụtara nke a n'ihe onyonyo o mere n'akara ya n'Instagram.
"Nke adịghị ka nke ntuliaka e meburu ebe ha kụsara igwe ntuliaka, nke a bụ na ha wakporo m."
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of Instagram post
Tonye Cole atụọla vootu nke ya na Rịvas
Ebe foto si, Tonye Cole
Onye
na-azọrọ APC ọkwa gọvanọ na Rịvas steeti bụ Tonye Cole atụọla vootu ya.
Ọ mere
nke a n’akụkụ ọgbọ ntuliaka Abonnema nọ n’ime okpuruọchịchị Akuku-Toru.
O kwuru na ya bụ
ntuliaka na-aga nike ọma ebe ahụ ma na-agakwa n’udo.
Rịvas steeti bụ isi ebe a na-emepụta mmanụ ụgbọala so na steeti ebe anya ndị mmadụ kacha anọ n'oge ntulaka.
Low voters turnout: Etu e si tụọ ntuliaka onyeisiala jụrụ obi ndị mmadụ obi oyi- Ohaneze
Otu Ohaneze Ndigbo ebola mpụta ndị mmadụ apụtaghị n’igwe maka ntuliaka ọkwa gọvanọ n’ Ọwụịwa Anyanwụ obi ịjụ oyii nke so "etu Inec si hazie ntuliaka Onyeisiala e mere n’abalị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023."
Osote
Onyeisi Ohaneze bụ Damian Ngene kwuru nke a ọge ọ gara tụọ vootu n’ọgbọatụmvootu ya bụ PU 004, dị n’Etti,Nanka dị n’Okpuru
Ọchịchị Orumba-North, Anambara steeti.
Ngene sịrị, ‘Etu ntuliaka ụsọrọ ntuliaka na-aga ọfụma mana
nke gara, etu e si tụọ ya na etu e si kpọọ mpụtara jụrụ ndị mmadụ oyi.”
”Nke gara
aga mara mgbọrọgwụ ọchịchị onyekwuoucheya na Naijiria jijiji.”
Ndị mmadụ apụtaghị maka atụmvootu n'ọtụtụ ebe n'Ọwụị̀a Anyanwụ taa dịka ha sị pụta n'igwe maka ntuliaka onyeisiala e mere n'abalị 25 nke ọnwa Febụwarị.
Kemgbe Inec ji kpọpụta mpụtara ntuliaka ahụ nke nyere onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'aha APC bụ Bola Tinubu mmeri,ọtụtụ ndị mmadụ akatọla usoro e ji mee ya, ebe otu Labour Party nakwa PDP bụ pati gbara onye nke atọ na onye nke abụọ gawara ụlọikpe ịga-gbagha ya.
Bishọp ụka Anglịkan n'Eha-Amufu, Enugu si na o ji egwu gbapụ ọsọ n'ọgbọ ntuliaka ya
Aha onyonyo, Bishọp ndị Anglịkan n'Eha-Amufu si na o ji egwu gbapụ ọsọ itu vootu
Bishọp Daniel Olinya bụ onyeisi ụka Anglịkan n'Eha-Amafu, Enugu steeti kwuru na ụfọdụ ndị nkwado otu patị ebe ahụ ekweghị ya tụọ vootu n'ihi ha nọ na-amanye ndị mmadụ ka ha tụọ vootu.
Eha-Amafu so n’akụkụ Enugu steeti ebe akụkọ mwakpo na-esikari apụta kemgbe ebe afọ 2022.
Olinye kwuru na ndị ọrụ nchekwe nọ ebe ahụ egosighi ya njikere iji chekwaa ya na ndị nọ ebe ahụ nke mere o jiri gbapụ ebe ahụ.
Gere ihe o kwuru n'uju n'ihe onyonyo a nọ n'elu akụkọ a.
Ndị mmadụ na-ekwu na e kweghị ha tụọ vootu Fadeyi maka agbụrụ ha
Dịka akụkọ ịkpaoke
agbụrụ dapụtara nke ukwuu n’akụkụ Legọs dị iche iche n’oge nkwadobe maka
ntuliaka ọkwa gọvanọ 2023, ụfọdụ ndị bi n’akụkụ Fadeyi Legọs bụ ndị Igbo
ekwuola na achụgharị ha azụ dịka ụfọdụ ndị nọ na-amanye ndị mmadụ pati ha ga-atụnyeriri
vootu.
Nnyocha BBC gosiri na ihe onyonyo maka mwakpo a na-efegharị si n'akụkụ Agbo-Ola Street nke Oshodi, Legọs pụta.
Otu nwaanyị
agbara afọ 68 ma buru onye isi gwara BBC Igbo na a chugharịrị ya na di du ya pụta
itu vootu ụlọ dịka a chọpụtara na ha bụ ndị Igbo.
E kwukwara
na a hụrụ ndị yi akwa njiri mara ụfọdụ pati kwụrụ n’ime ọgbọ ntuliaka ahụ na-enyocha
onye na pati ndị mmadụ ga-atụnyere vootu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Alex Otti nke Labour Party atụọla vootu ya
Onye na-azọrọ
otu Labour Party ọkwa gọvanọ n’Abịa steeti bụ Alex Otti atụọla vootu nke ya n’ọgbọ
ntuliaka. Ya na nwunye ya bụ Priscillia so pụta tụọ vootu a n’akụkụ Ahia Afor, Umuru
Ward 5 na Nvosi, Isiala Ngwa South, Abia steeti.
A wakpoola ndị mmadụ na Rogo, Kano steeti
Ndị omekome awakpoola ndị pụtara ịtụ vootu n'akụkụ okpuruọchịchị Rogo nke Kano steeti.
A chụsara ndị mmadụ dịka ndị a ji aka ike kurie ụfọdụ Igbe ntuliaka ndị ebe ahụ.
A dọrịkwara akwụkwọ ụfọdụ e ji atụ vootu ebe ahụ.
Ụfọdụ ndị ọrụ Inec gbara ọsọ ebe ahụ a loghachitela ịma etu ha ga-esi hazie ntuliaka ebe ahụ.
Kano esoghị na steeti ebe akụkọ mwakpo dapụtara n'oge ntuliaka ọkwa onyeisiala.
Peter Mba nke PDP atụọla vootu ya
Onye na-azọ ọkwa Gọvanọ Enugwu steeti n'aha PDP bụ Peter Ndubuisi Mbah atuola vootu n'ọgbọ atụmvootu ya dị n' ama ọgbakọ Owo, n'Okpuru Ọchịchị Nkanu East, Enugwu.
Osote onyeisiala na nwunye ya atụọla vootu nke ha
Ebe foto si, Yemi Osinbanjo
Osote
onyeisisla Naịjirịa bụ Yemi Osinbanjo na nwunye ya bụ Dolapo Osinbanjo atụọla
vootu nke ha n’obodo dị n’okpuruọchịchị Ikenna nke Ogun steeti.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.