You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

2023 Nigeria Elections: E nyela ndị meriri ọkwa gọvanọ Abia, Ebonyi na Enugwu Steeti asambodo mmeri

N'ụbọchị 29 na 30 ka e nyere ndị meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ Abia, Ebonyi nakwa Enugwu Steeti asambodo mmeri ha dịka iwu Inec siri dị

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chigozie Ohaka, Chukwunaeme Obiejesi and Uche Akolisa

  1. Amalitela nkesa ihe e ji eme ntuliaka n’Umuahịa, Abia steeti

    N’ime ụlọakwụkwọ School Road Primary School dị okpuruọchịchị Umuahia North nke Abịa steeti, ndị mmadụ nke gụnyere ndị ọrụ ndị Inecamalitela ịgbakọta dịka ndị ọrụ Inec na-amalite nkesa ihe ndị aga eji tụọ vootu n’akụkụ Umuahia dị iche iche.

    Ndị ọrụ nchekwa dị iche iche nọ n’ọgbọ ahụ.

    Ntuliaka ga-amalite n’ebe elekere asatọ nke ụtụtụ taa dịka Inec siri kwuo.

  2. Ndị mmadụ apụtawala ịtụ vootu na Kano

    Dịka Inec kwuru na ntuliaka ga-amalite n'ebe elekere asatọ nke taa bụ Satọdee.

    Ndị mmadụ amalitela ịpụta ịtụ vootu ha na Kano steeti kemgbe ebe elekere asaa.

    Lee ka ihe si aga n'akụkụ Tukuntawa wọọdụ dị na Kano.

    Ntuliaka nke taa bụ maka ọkwa gọvanọ na steeti 28 nakwa ọkwa ndị omeiwu steeti n'akụkụ Naịjirịa niile.

    Maazị Ali Shehu gbara afọ 70 pụtakwara n'oge dịka o siri mee n'oge ntuliaka ọkwa onyeisiala gara aga.

    O kwuru na ọ pụtara ebe ahụ kemgbe elekere isii nke isi ụtụtụ ma kwukwa:

    "A mara m ụzọ pụta n'ihi a chọrọ m ị tụnyere ikpe ziri na ezi ọchịchị vootu".

  3. Onyeisiala Buhari awụchiela Kastina iji tụọ vootu ya

    Onyeisiala Muhammadu Buhari efebala obodo ya bụ Daura nke dị na Katisna Steeti iji gaa tụọ vootu nke ya na ntuliaka ọkwa gọvanọ na ndị ụlọomeiwu steeti ga-aga n’ihu taa bụ ụbọchị Satọdee, abalị 18 nke ọnwa Maachị.

    Onye enyemaka ya n’okwu mgbasa ozi bụ Bashir Ahmed kwuru nke a n'ụbọchị Fraịdee ma kesaaa foto ebe a na-abata onyeisiala na steeti ahụ n’akara soshal mida ya.

    Onyeisiala na nwunye ya bụ Aisha Buhari pụtara tụọ vootu nke ọkwa onyeisiala n’ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị.

    Buhair gbara n’anwụ patị ọ tụnyere vootu n’ụbọchị ahụ, agbanyeghi na nke a dara iwu Inec, Buhari kwuru na ọ mere nke a iji gosi nkwado ya nye pati ya bụ APC nke o akwụkwọ o jiri tụọ vootu gosiri na ọ bụ patị ahụ ka ọ tụnyere.

  4. Unu asaala chi?

    Nnọ n'ọbaozi anyị taa.

    Soro akụkọ niile gbasara ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị ụlọomeiwu steeti na-aga n'ihu taa ebe a.

  5. Tonto Dike arịtuola n'ịzọ ọkwa osote Gọvanọ Rivas steeti

    Onye na-azọ ọkwa Gọvanọ Rivas steeti n'aha African Democratic congress bụ Tonte Ibraye nakwa osote ya bụ Tonto Dike arịtuola n'ịzọ ya bụ ọkwa.

    Amabeghi ihe mere ha ji mee nke a maọbụ ma o nwere onye ha bu n'obi ịkwado na nrịtu ha mere.

    Nke a pụtara na ha agaghịzi eso zọ ọkwa Gọvanọ Rivas steeti na ntuliaka a ga-eme n'ụbọchị 18 nke ọnwa Maachị afọ.

  6. Onye ọbụla kpara ọgba aghara echi ga ahụshị anya _kọmishịọna Uweojii Enugwu

    Kọmishịòna Uweojii Enugwu bụ Ahmed Ammani adọọla aka na ntị sị, na onye ọbụla e jidere ka ọ na-akpa aghara ma ọ bụ na-enye nsogbu na gburu gburu polling Unit ọbụla n'Enugwu echi ga eji anya hụ ntị ya.

    Kọmishịọna Ammani wepụtara ozi ndịa nakwa ozi ndị ọzọ oge ozipuru ndị nta akụkọ ozi gbarara ntuliaka nke gọvanọ na ndị one iwu steeti ga-eme echi niile.

    Oji ohere ahụ kpọpụta ekwe ntị ndị mmadụ ga-akpọ ma nsogbu ọbụla dapụta n'ọgbọatụmvootu ha ma ọ bụ gburu gburu ha echi bụ Satọde.

    Lee ekwe ntị ị ga-akpọ ma nsogbu dapụta echị na ntuliaka dịka ndị uwe ojii Enugwu si wepụta ya JOINT ELECTION SECURITY SITUATION ROOM (JESSR) 08032003702 08075390883 08098880172 08086671202 Ziga ozi email gi na infoenugu@gmail.com Ihe ndị ọzọ Kọmishịọna Uweojii Enugwu Ahmed Ahmmani machibidoro echi gunyere 1: Onye ọbụla ejighị ikikere ịpụta n'okporo ụzọ ma ọ bụ ịkwọ ụgbọala, apụtakwala ezi. 2: Ọmachibidoro onyr ọbụla ịgbu sireen ọbụla echị. 3: onyere iwu ka onye ọbụla ghara imechị "number plate" akara ụgbọala ya echị ma ọ bụ jiri ụgbọala nwere " tinted glass" 4: kọmidhiona ahụ dọrọ ndị ọrụ nchekwa na-eso ndị one ozu ka ha ghar iso ha gaa ebe a na-atụ votu maka ibute ọgba aghara. Omechiri okwu site n’ịgwa ndị Enugwu ka ha ghara ịtụ egwu ọbụla, ha pụta n'igwe gas tụọ votu ha makana ndị uwe ojii kwụ chim chim ichekwa ndụ na akụ na ụba echi.

  7. Ndị ntorobia Abia emeela ngagharịiwe

    Dịka ndị Inec na-ekesa akọrọngwa ntuliaka, ndị ntorobia Abịa steeti pụtara n'igwe mee ngaghariiwe gaa n'isi ụlọọrụ Inec dị n'Ụmuahia, Abia .

    Ha ji egwu zọọ na-aga n'okporoụzọ, ebe ụfọdụ n'ime ha iji akwụkwọ nke na-ekwu ihe ha chọrọ.

    Ụfọdụ akwụkwọ ndị ahụ kwuru sị, " Inec anyị achọghị mago mago"; "Inec, ka ihe a tụrụ bụrụ ihe a tụrụ" na ozi ndị ọzọ.

  8. Nkesa akọrọngwa ntuliaka amalitela n'Ụmụahịa

    Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka bụ Inec amalitela nkesa akọrọngwa a ga-eji eme ntuliaka echi bụ abalị 18 nke ọnwa FMaachị afọ 2023, n'ụmụahịa, isiobodo Abia steeti.

    Odeakwụkwọ nhazi nke Inec Abia Steeti bụ Ọkaiwu Clement Oha bụ onye ga-anọchite Ọkammụta Uzochukwu Chijioke, onye akwụsịị ọrụ n'ike , gwara ndị Abia na Inec adịla njikere maka ntuliaka echi bụ Sat ọde, abalị 18 nke ọnwa Maachị afọ 2023.

    Onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ hụrụ ka e si n'Ụlọakụ Etiti(CBN),ngalaba nke Abịa were ekesa akọrọngwa ndị a dị oke mkpa( sensitive election materials) iziga ya mpaghara dị iche iche na steeti ahụ.

    Kọmishona ndị uweojii steeti ahụ bụ Mustapha Muhammed Bala gwara ndịntaakụkọ na ha kwụ chịm maka ichekwa ụmụamala Abịa n'oge ntuliaka.

    Ọ gwara ndị Abịa ha pụta bịa tụọ vootu na-atụghị egwu ọbụla ha na o nweghị ihe na-eme.

  9. Ndeewonụ o!

    Ndewoonụ , Igbo ndị Chukwu goziri!

    Sonye anyị ebe maka ka o si aga na n'Ọwụwa Anyanwụ na ntuliaka ọkwa gọvanọ na Ụlọomeiwu nke steeti.