Dịka Inec kwuru na a dị mmaọ̄ụ 800 na-azọ ọkwa ịbụ gọvanọ
na steeti 28 ndị nọ na Naịjirịa taa, anya ọha na-ele Legọs steeti bụ obodo ndị
mmadụ kacha biri na Naịjirịa.
Legọs bụkwa isi azụmahịa Naịjirịa bụ steeti onye a họpụtara
ga-achị Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu si.
Peter Obi nke Labour Party mere ihe tụrụ ọha n’anya dịka
ọ napụrụ Tinubu ara n’ọnụ na steeti ahụ n’oge ntuliaka onyeisiala mgbe ọ ka ya nweta
vootu na steeti ahụ.
Kano bụkwa steeti nke abụọ ebe ndị mmadụ kacha biri n’ime
ya nakwa Rịvas steeti bụ isi ebe a na-emepụta mmanụ ụgbọala sokwa na steeti ebe
anya ndị mmadụ nọ.
Ọnọdụ enweghị nchekwa nakwa mwakpo ndị agha nnupụisi
nke Boko Harm na-echekwa ndị mmadụ dịka ha wakporo ụfọdụ ndị ọrụ Inec n’oge
ntuliaka gara aga.
Na mpaghara Ọwụwa anyanwụ Naịjriịa, ụfọdụ otu ndị
na-achọ nwereonwe Biafra amaala ọkwa na-agwa ndị mmadụ esonyela na mee ntuliaka
na Naịjirịa.
Mwakpo n’aka ndị agbara nakwa ndị omekome kpalitekwara
ụjọ n’ime ndị mmadụ n’oge ntuliaka ọkwa onyeisiala.
Ndị ọrụ nchekwa nke gụnyere onyeisi ndị uweojii
agwaala ndị mmadụ pụta n’igwe tụọ vootu ha n’ihi na ha kwụ chim n’ichekwa ha.
A machiela ngagharị ndị malite n’elekere 12 nke isi ụtụtụ
ruo elekere isii nke mgbede taa.
Anya ndị mmadụ ga-anọkwa na ngwa ọrụ ndị Inec ọkachasị
nke teknụzụ Bvas nakwa ọba ozi ha pụrụiche bụ IreV – Nke a bụ dịka etu ndị mmadụ
si katọọ Inec n’oge ntuliaka onyeisiala ma na-ekwu na ha esoghi usoro ha dapụtara
maka ntuliaka ahụ.
Inec kwuru na aga eji Bvas sete foto mpụtara ntuliaka
ndị e mere n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche ma gbaa ya n’anwụ n’ọbaozi ha pụrụiche
bụ Irev.
Inec kwuru na ha adịla njikere dịka ha kwuru na ha ahaziela nsogbu ndị cheere ha aka mgba na ntuliaka onyeisiala.