You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

2023 Nigeria Elections: E nyela ndị meriri ọkwa gọvanọ Abia, Ebonyi na Enugwu Steeti asambodo mmeri

N'ụbọchị 29 na 30 ka e nyere ndị meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ Abia, Ebonyi nakwa Enugwu Steeti asambodo mmeri ha dịka iwu Inec siri dị

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chigozie Ohaka, Chukwunaeme Obiejesi and Uche Akolisa

  1. Lee etu ndị Ezza na Effium siri tụọ vootu n'Ebonyi Steeti

    Dịka nsogbu nke butere ọgụ n'etiti ndị obodo Ezza na Effium mere ka ime ntụliaka na obodo ndị a sie ike, enyere ha ọdọ egwuregwu nke Ngele Oruta dị n'Abakiliki ka ndị obodo ndị a tụọ vootu ha.

    A kpọrọ ogige a Nwigbeke Ward 2 nke nwere polling unit ruru ihe dịka anọ.

    Lee foto etu o si aga

  2. Ndị nwere nkwarụ nọ na-agbara onwe ha bọọlụ n'oge ntuliaka

    Ụfọdụ ndị nwere nkwarụ nọ na-agbara onwe ha bọọlụ n’akụkụ Mile 12 dị n’okporoụzọ Ikorodu Legọs dịka a na-eme ntuliaka ọkwa gọvanọ na-aga n’ihu na steeti ahụ.

    Lee etu asọmpị ha si aga dịka ndị mmadụ pụtara na-elele ha.

  3. Inec, jiri igwe BVAS zịpụ mpụtara ntuliaka - Ụlọikpe

    Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja enyela ngalaba na-ahazi ntuliaka na Naijiria bụ 'Independent National Electoral Commission'(Inec) ka ha jiri igwe intanet zipụ mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ na ụlọomeiwu a na-eme taa dịka usoro ha tụpụtara si kwuo.

    Ọkaikpe Obiora Egwuatu, kwuru nke a na mkpebi o nyere ụbọchị Fraide.

    Jọstịs Egwuatu nyekwatra iwu ka Inec were igwe 'bimodal voter accreditation system'(BVAS) tinye akwụkwọ e ji edenye mpụtara a kpọrọ 'EC8A' n' ọgbọ atụmvootu ozigbo n' ọbaozi Inec a kpọrọ 'iReV n' Akwa Ibom.

  4. Chris Akomas atụọla vootu nke ya n'Abịa steeti

    Chris Akomas bụbu osote gọvanọ Abịa steeti apụtala tụọ vootu nke ya n'akụkụ Obingwa nke Abịa steeti. Ndị ọrụ Inec, ndị ntaakụkọ nakwa ndị ọrụ nchekwa nọcha ebe ahụ ugbua. Gere ihe ọ gwara BBC Igbo ebe a.

  5. Ndị omekome achụsala ndị bịara ịtụ vootu na mpaghara Agungi dị na Lekki, Legọs Steeti.

    Otu ogige ebe a na-atụ vootu nke dị na mpghara Agungi nke dị na Lekki Legọs steeti nọzị na gbagharịa.

    Nke a mere dịka ndị omekome bịara chụsa ndị pụtara ịtụ vootu na ndị ọrụ Inec nọ na mpaghara ahụ.

    Ndị omekome a napụrụ ụfọdụ ndị bịara ịtụ vootu ekwentị ha.

    Otu onye ntaakụkọ BBC nọ ebe ahụ kwuru na ndị mmadụ ka nọ na-eche ka ndị ọrụ Inec laghachị azụ bido atụmvootu.

    Nke a na-eso kepukepu na ndị ọrụ Inec gbara ọsọ gbaga n'ụlọ otu Eze na mpaghara ahụ. Ọ bụ nke a gbara ndị mmadụ ume mere ha ji eche ka ha pụta bido atụmvootu.

  6. Ọgbaghara dapụtara n'Ago, Legọs Steeti

    Ihe onyonyo na-efegharị na Soshal Midịa na-egosi ebe a na-eti otu onye ihe ebe otu onye ọzọ tọgbọ n'ala.

    Ndị uweojii nọkwa ebe ahụ, a nụrụ ụda egbe na ya bụ ihe onyonyo.

    Ndị tinyere ihe onyonyo a na soshal midịa na-ekwu na ọ bụ onye omekome bịara ịchụsa ndị bịara ịtụ vootu kama enweghị onye ma ihe mere n'ezie.

    Kama otu onye tinyere ihe onyonyo a na Twitter na-ekwu na ọ bụ ndị uweojii gbara onye ahụ egbe.

  7. Gọvanọ Ifeanyi Okowa atụọla vootu nke ya

    Gọvanọ Delta steeti bụ Ifeanyi Okowa atụọla vootu nke ya n’ọgbọ ntulaka nọ n’ime ụlọakwụkwọ Eghoma Praịmarị nke okpuruọchịchị Ika North East.

    Ọ pụtara n’oge mee nke a taa bụ Satọdee abalị 18 nke ọnwa Maachị.

  8. Ndị si Kano ekwuola na ndị mmadụ apụtaghị n'igwe ebe ahụ

    Akụkọ si Kano apụta na-ekwu na ndị Kano apụtaghị n’igwe etu ha siri pụta n’oge ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere n’ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị.

    Onye ntaakụkọ BBC mere ngagharị n’akụkụ steeti ahụ gbara ama nke a.

    O kwuru na ntuliaka malitere n’ebe elekere asatọ na ọkara dịka ndị Inec wụchiri ebe ahụ n’oge.

    O kwukwara na ndị mmadụ apụtaghị n’akụkụ dị iche iche etu ha siri pụta n’oge ntuliaka e mere na Febrụwarị.

    A hụghịkwa ọtụtụ ụmụnwaanyị ebe ahụ.

  9. Ndị agboro wakporo m n'ọgbọ ntuliaka m - Chioma Akpotha

    Omeeihe ejije Nollywood a ma ama bụ Chioma Akpota ekwupụtala na ndị agboro ndọrọndọrọ Ọchịchị wakporo oge ọ gara ịtụ vootu.

    Akpotha kwupụtara nke a n'ihe onyonyo o mere n'akara ya n'Instagram.

    "Nke adịghị ka nke ntuliaka e meburu ebe ha kụsara igwe ntuliaka, nke a bụ na ha wakporo m."

    "Ha kụrụ ụgbọala m, kụwasịa ugegbe ụgbọala m."

    "Ihe zọrọ m bụ na o nwere ndị mụ na ha yị."

  10. Tonye Cole atụọla vootu nke ya na Rịvas

    Onye na-azọrọ APC ọkwa gọvanọ na Rịvas steeti bụ Tonye Cole atụọla vootu ya.

    Ọ mere nke a n’akụkụ ọgbọ ntuliaka Abonnema nọ n’ime okpuruọchịchị Akuku-Toru.

    O kwuru na ya bụ ntuliaka na-aga nike ọma ebe ahụ ma na-agakwa n’udo.

    Rịvas steeti bụ isi ebe a na-emepụta mmanụ ụgbọala so na steeti ebe anya ndị mmadụ kacha anọ n'oge ntulaka.

  11. Low voters turnout: Etu e si tụọ ntuliaka onyeisiala jụrụ obi ndị mmadụ obi oyi- Ohaneze

    Otu Ohaneze Ndigbo ebola mpụta ndị mmadụ apụtaghị n’igwe maka ntuliaka ọkwa gọvanọ n’ Ọwụịwa Anyanwụ obi ịjụ oyii nke so "etu Inec si hazie ntuliaka Onyeisiala e mere n’abalị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023."

    Osote Onyeisi Ohaneze bụ Damian Ngene kwuru nke a ọge ọ gara tụọ vootu n’ọgbọatụmvootu ya bụ PU 004, dị n’Etti,Nanka dị n’Okpuru Ọchịchị Orumba-North, Anambara steeti.

    Ngene sịrị, ‘Etu ntuliaka ụsọrọ ntuliaka na-aga ọfụma mana nke gara, etu e si tụọ ya na etu e si kpọọ mpụtara jụrụ ndị mmadụ oyi.”

    ”Nke gara aga mara mgbọrọgwụ ọchịchị onyekwuoucheya na Naijiria jijiji.”

    Ndị mmadụ apụtaghị maka atụmvootu n'ọtụtụ ebe n'Ọwụị̀a Anyanwụ taa dịka ha sị pụta n'igwe maka ntuliaka onyeisiala e mere n'abalị 25 nke ọnwa Febụwarị.

    Kemgbe Inec ji kpọpụta mpụtara ntuliaka ahụ nke nyere onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'aha APC bụ Bola Tinubu mmeri,ọtụtụ ndị mmadụ akatọla usoro e ji mee ya, ebe otu Labour Party nakwa PDP bụ pati gbara onye nke atọ na onye nke abụọ gawara ụlọikpe ịga-gbagha ya.

  12. Bishọp ụka Anglịkan n'Eha-Amufu, Enugu si na o ji egwu gbapụ ọsọ n'ọgbọ ntuliaka ya

    Bishọp Daniel Olinya bụ onyeisi ụka Anglịkan n'Eha-Amafu, Enugu steeti kwuru na ụfọdụ ndị nkwado otu patị ebe ahụ ekweghị ya tụọ vootu n'ihi ha nọ na-amanye ndị mmadụ ka ha tụọ vootu.

    Eha-Amafu so n’akụkụ Enugu steeti ebe akụkọ mwakpo na-esikari apụta kemgbe ebe afọ 2022.

    Olinye kwuru na ndị ọrụ nchekwe nọ ebe ahụ egosighi ya njikere iji chekwaa ya na ndị nọ ebe ahụ nke mere o jiri gbapụ ebe ahụ.

    Gere ihe o kwuru n'uju n'ihe onyonyo a nọ n'elu akụkọ a.

  13. Ndị mmadụ na-ekwu na e kweghị ha tụọ vootu Fadeyi maka agbụrụ ha

    Dịka akụkọ ịkpaoke agbụrụ dapụtara nke ukwuu n’akụkụ Legọs dị iche iche n’oge nkwadobe maka ntuliaka ọkwa gọvanọ 2023, ụfọdụ ndị bi n’akụkụ Fadeyi Legọs bụ ndị Igbo ekwuola na achụgharị ha azụ dịka ụfọdụ ndị nọ na-amanye ndị mmadụ pati ha ga-atụnyeriri vootu.

    Nnyocha BBC gosiri na ihe onyonyo maka mwakpo a na-efegharị si n'akụkụ Agbo-Ola Street nke Oshodi, Legọs pụta.

    Otu nwaanyị agbara afọ 68 ma buru onye isi gwara BBC Igbo na a chugharịrị ya na di du ya pụta itu vootu ụlọ dịka a chọpụtara na ha bụ ndị Igbo.

    E kwukwara na a hụrụ ndị yi akwa njiri mara ụfọdụ pati kwụrụ n’ime ọgbọ ntuliaka ahụ na-enyocha onye na pati ndị mmadụ ga-atụnyere vootu.

  14. Alex Otti nke Labour Party atụọla vootu ya

    Onye na-azọrọ otu Labour Party ọkwa gọvanọ n’Abịa steeti bụ Alex Otti atụọla vootu nke ya n’ọgbọ ntuliaka. Ya na nwunye ya bụ Priscillia so pụta tụọ vootu a n’akụkụ Ahia Afor, Umuru Ward 5 na Nvosi, Isiala Ngwa South, Abia steeti.

  15. A wakpoola ndị mmadụ na Rogo, Kano steeti

    Ndị omekome awakpoola ndị pụtara ịtụ vootu n'akụkụ okpuruọchịchị Rogo nke Kano steeti. A chụsara ndị mmadụ dịka ndị a ji aka ike kurie ụfọdụ Igbe ntuliaka ndị ebe ahụ.

    A dọrịkwara akwụkwọ ụfọdụ e ji atụ vootu ebe ahụ. Ụfọdụ ndị ọrụ Inec gbara ọsọ ebe ahụ a loghachitela ịma etu ha ga-esi hazie ntuliaka ebe ahụ.

    Kano esoghị na steeti ebe akụkọ mwakpo dapụtara n'oge ntuliaka ọkwa onyeisiala.

  16. Peter Mba nke PDP atụọla vootu ya

    Onye na-azọ ọkwa Gọvanọ Enugwu steeti n'aha PDP bụ Peter Ndubuisi Mbah atuola vootu n'ọgbọ atụmvootu ya dị n' ama ọgbakọ Owo, n'Okpuru Ọchịchị Nkanu East, Enugwu.

  17. Osote onyeisiala na nwunye ya atụọla vootu nke ha

    Osote onyeisisla Naịjirịa bụ Yemi Osinbanjo na nwunye ya bụ Dolapo Osinbanjo atụọla vootu nke ha n’obodo dị n’okpuruọchịchị Ikenna nke Ogun steeti.

    Ntuliaka nke taa malitere n’oge ebe ahụ.

    Ndị mmadụ pụtara ịtụnyere ndị ga-abụ gọvanọ nakwa ndị ụlọomeiwu steeti na Naịjirịa.

  18. NDLEA anwụchịela mmadụ anọ ji kaadị a sị ha chọrọ iji zụọ vootu n'Ogun steeti

    Ndị ọrụ mgbochi ibu ọgwụike na Naịjirịa bụ NDLEA n’ịchafụ anwụchịela mmadụ anọ a snị bụ ndị nnọchiteanya ụfọdụ pati n’Ogun steeti.

    Ha kwuru na ha nwuchiri ndị a dịka ha nọ na-enyocha ndị na agagharị na steeti ahụ.

    E nwuru na ahụrụ narị kwuru narị Kaadị eji anata ego n’aka ndị a dịka ha kwuru na ndị a pụtara ịkwụ ndị mmadụ ụgwọ ka ha tụnyere ndị nke ha vootu.

    Ndị NDLEA kwuru na ndị a anwụchiri nwere ihe ruru N10,000 n’ime ọbaego so kaadị ndị ahụ ha jiri.

  19. Ndị agboro awakpoola ndị mmadụ n'akụkụ Agungi, Legọs

    Ndị agboro awakpoola ọgbọ ntuliaka nọ n’akụkụ Agungi, Legọs.

    Ha kụsara ma dọrie ihe ndị e ji eme ntuliaka dịka ndị ọrụ Inec gbara ọsọ.

    Onye ọrụ BBC nọ ebe ahụ kwuru na ndịagha Naịjirịa awụchiela ebe ahụ maka ya bụ mwakpo emetụtala ntuliaka ebe ahụ.

    Akụkọ mwakpo si n’akụkụ Legọs dị iche iche dapụta n’oge ntuliaka ọkwa onyeisiala dịka a kụrịrị ma burukwa ngwa ndị Inec n’akụkụ ụfọdụ na steeti ahụ.

  20. Gọvanọ Seyi Makinde atụọla vootu nke ya

    Gọvanọ Seyi Makinde nke Oyo steeti atụọla vootu nke ya.

    Ọ tụrụ vootu ya n’ọgbọ ntuliaka nke Wọọdụ 11 dị n’okporoụzọ, Iwo Ibadan.

    Ebe a ka ọ tụkwara vootu nke ya n’oge ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere n’ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị 2023.

    Ntuliaka nke taa bụ maka ọkwa gọvanọ na ndị ụlọomeiwu steeti.