You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

2023 Nigeria Elections: E nyela ndị meriri ọkwa gọvanọ Abia, Ebonyi na Enugwu Steeti asambodo mmeri

N'ụbọchị 29 na 30 ka e nyere ndị meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ Abia, Ebonyi nakwa Enugwu Steeti asambodo mmeri ha dịka iwu Inec siri dị

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chigozie Ohaka, Chukwunaeme Obiejesi and Uche Akolisa

  1. Ọgbaaghara ntuliaka na Legọs ebughi ibu dịka o si efesa na soshal midia - Ndị uweojii

    Onyeisi ndị uweojii na Legọs Steeti bụ Idowu Owohunwa ekwuola na ọgbaaghara mere n'ebe dị icheiche na steeti ahụ ebughị ibu dịka o si efesa na soshal midia.

    O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ Channels TV n'abalị ụbọchị Satọde.

    "Ana m enweta ozi si mpaghara Legọs niile. Ndị ọrụ m nọ n'ebe niile na-ewetara m ozi kwa nkeji kwa nkeji. Ya mere m ji ekwu na ọgbaaghara a, n'ezie o mere n'ụfọdụ ebe, mana o meghị ebe niile dịka akụkọ si efesa," Owohunwa kwuru.

    "Ebe ụfọdụ ọgbaaghara a chọrọ ime, ndị uweojii gbochiri ya. Ebe ndị o merela tupu ndị uweojii abịarute, anyị bịaruru n'oge ma weghachite udo ma mee ka ihe niile gawakwa n'anya ya."

    Owohunwa gokwara na o nweghị ndị uweojii ọbụla tinyere aka n'ọgbaghara dịka ndị mmadụ si ebo ha ebubo na soshal midia.

    Na mpaghara Ago dị n'Okota, ebe ndị bi ebe ahụ gbochiri ndị agboro bịara ikụsa ntuliaka, onyeisi ndị uweojii bụ owohunwa kwuru na o nweghị onye nwụrụ n'ọgbaghara ahụ dịka akụkọ si efesa.

    "Ndị mmadụ kụturu otu n'ime ndị agboro ahụ, mana ọ nwụghị. Ndị bịara bupu ya. Ọ na-anata ọgwụgwọ ugbua n'ụlọọgwụ," ka o kwuru.

  2. A malitela ntuliaka n'akụkụ VGC, Legọs

    Dịka Inec kagburu ntuliaka n'akụkụ mpaghara VGC na Legọs n'ihi ọgbaghara dapụtara ebe ahụ n'etiti ndị ọrụ ha na ndị bi ebe ahụ, a malitela n'ebe ahụ ugbua.

    Ndị bi ebe ahụ pụtara n'oge dịka a malitere ntuliaka n'ebe elekere itoolu nke ụtụtụ Sọnde a.

    Cheta na ndị na mpaghara jụrụ na ha agaghị ekwe ndị Inec duru ha gaa n'okporoụzọ tụọ vootu ha n'ihi na ha nwere ama sara mbara ha na-eji atụ vootu kemgbe ụwa.

    Ndị ọrụ Inec gboro ebubo na e jichiri n'ime ogige mpaghara ahụ maka okwu nsogbu ngwa BVas dapụtara n'oge ntuliaka ọkwa onyeisiala.

    Ndị Inec kwuru na ọ bụ nke a mere ha jiri yigharịa ebe ndị mpaghara ahụ ga-anọ tụọ vootu ha.

    Nrụrịtaụka dapụtara ebe malite n'ụtụtụ Satọdee ruo ehihe nke mere Inec jiri kagbuo ntuliaka ebe ahụ ma mechazie hibe ya taa bụ Sọnde.

    Ugbua, ndị ọrụ Inec nọzị n'ime ama ahụ sara mabara dịka ndị ọrụ nchekwa wekwara ọnọdụ ihazi ọrụ ebe ahụ.

  3. Unu asaala chi?

    Nnọọ n'ọbaozi anyị taa.

    Soro akụkọ niile gbasara ntuliaka ọkwa gọvanọ na ndị ụlọomeiwu steeti na Naịjirịa ebe a.

  4. Ndị mmadụ apụtachaghị n'ihi na ha na-atụ egwu - Onye tụrụ vootu n'Ebonyi Steeti

    Ụfọdụ ndị Ebonyi steeti pụtara ịtụ vootu gwara BBC Igbo na ndị mmadụ apụtachaghị tụọ vootu ha nke ọma n'ihi na egwu na-atụ ha.

    E nwere ụfọdụ ebe dịka Umezuọka ebe e nwere ọgbaaghara na steeti ahụ.

    Kirie ya n'uju ya ebe a.

  5. Ndị mmadụ enweghịzị ntụkwasị obi n'ebe INEC nọ - Bishop Emmanuel Chukwuma

    Bishop Emmanuel Chukwuma bụ Bishop ụka Anglịkan gwara BBC Igbo mgbe ọ bịara ịtụ vootu ya na ndị pụtara ịtụ vootu pere mpe n'ihi na obi esịghị ha ike ebe ụlọọrụ Inec nọ.

    O kwuru sị, "onye ọbụla pụtawa tụọ vootu n'ihi ihe mebie n'ọdịnịhụ ka onye ahụ hapụ ịta onye ọbụla ụta".

    Kirie ya n'uju ebe a.

  6. Etu e siri yie anyị egwu dịka anyị chọrọ ịtụ vootu anyị - Onye bi na Legọs Steeti

    Dịka akụkọ na-efegharị na awakporo maọbụ yie ndị chọrọ ịtụ vootu egwu, otu onye sị na eyiri ya egwu kọọrọ BBC Igbo ihe o si na ọ gabịgara mgbe ọ chọrọ ịtụ vootu ya na Fadeyi nke Legọs steeti.

  7. Ndị uweojii baara ha mba ma chụpụ ha - Onye tụrụ vootu n'Ụmụahịa

    Ihe onye tụrụ vootu n'Ụmụahia gwara BBC Igbo maka ọnọdụ ịtụ vootu taa n'Abia Steeti.

  8. Lee ka Desmond Elliot si aṅụrị dịka o meriri na Polling Unit ya

    Onye na-eme ihe ejije ma bụrụkwa onye nnọchite anya Surulere n'ụlọomeiwu nke Legọs steeti bụ Desmond Elliot na aṅụrị na o meriri polling Unit ebe ọ tụrụ vootu ya.

  9. Ogige a ga-eme mkpọpụta ntuliaka Ebonyi Steeti adịlla njikere

    Lee ka ogige ebe ụlọọrụ Inec ga-anọ kpọpụta mpụtara ntulaika nke Gọvanọ na ụlọomeiwu steeti emere na steeti ahụ taa.

  10. Ngụkọ vootu na-aga n’ihu n’ọgbọ ntuliaka Amuwo-odofin, Legọs

    Dịka e mechara ntuliaka n’ebe elekere anọ nke mgbe taa. Ndị ọrụ Inec na-agụkọzi vootu ndị a tụrụ n’ọgbọ ntuliaka dị iche iche.

    N’akụkụ Amuwo-odofin nke Legọs, a na-agụkọ vootu ugbua.

  11. Ndị anyị jidere chọrọ ịkwasa ntuliaka - Ndị uweojii Kano

    Ndị uweojii nke Kano steeti ewepụtala foto mmadụ atọ ha nwuchiri dịka ndị chọrọ ịkwasa ntụliaka na steeti ahụ.

    E nwere mkpesa na ọgbaaghara dapụtara n'ụfọdụ mpaghara ebe a mere ntuliaka na Naịjirịa taa.

  12. E mere ngagharịiwe n'Ebonyi dịka ndị omekome wakporo ogige atụmvootu

    E mere ngaghariiwe na Omege ward nke dị n'okpuruọchịchị Ezza Nọt nke Ebonyi steeti maka etu ndị omekome siri wakpoo ogige a na-atụ vootu ma gbaa akụrụngwa ndị Inec ji arụ ọrụ ọkụ.

    Otu onye akaebe kwuru na ndị omekome a bịara, gbalie egbe elu ma merụọ mmadụ atọ ahụ n'ebe ahụ.

    Onye a kwuru na ndị a gbara akụrụngwa Inec nke gụnyere igwe BVAS ọkụ.

    Otu onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọ na-ewute ya ma sị, " Anyị nọ ebe a kamgbe ụtụtụ maka ịtụ vootu anyị,ụmụnwaanyị niile nọ ebe a bịara ịtụ vootu ha, anyị chọrọ itụ vootu dịka ọ bụ ikike ruru anyị".

    N'aka nke ọzo ka ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii stetti ahụ bụ Onome Onopvewakpoyeya kwuru na ya bụ ihe mere ma sị, "Eee anyị nụrụ na ndị omekome bịara wakpoo ebe ahụ ma were Bvas na ihe ndị ọzọ gbaa ọsọ, kama ugbua anyị na-eme ngagharị na mpaghara obodo, anyị na-agba mbọ maka ya.

  13. Ngọkọ vootu na-aga n'ihu n'akụkụ Umuahia North Abịa Steeti.

    Ntuliaka ebiela n’akụkụ ụfọdụ n’Abịa steeti dịka ndị ọrụ Inec malitere ịgụkọ vootu ha ugbua.

    Lee etu ngụkọ si aga n’akụkụ ọgbọ ntuliaka dị n’akụkụ Amuzukwu Girls Secondary School, Umuahia North Abịa Steeti.

  14. Ndị mmadụ emeriela ndị omekome nara ha akpati ntuliaka ha zuuru

    Na mpaghara Agungi Idado, Lekki nke Legọs steeti ka ndị bi ebe ahụ nọgidere ndị omekome ndị bịara chụsaa ndị na-eme ntụliaka.

    Kama ndị bi na mpaghara ahụ chụrụ ha ọsọ ma napụ ihe akpati eji atụ vootu ha buuru n'ike.

    E nwere mkpesa ọgbaaghara n'ụfọdụ mpaghara na Legọs steeti.

  15. Ihe Alex Otii kwuru ka ọ tụchara vootu ya

    Alex Otti na-azọrọ otu Labour Party ọkwa gọvanọ n’Abia steeti gwara BBC Igbo okwu ka ọ tụchara vootu ya.

    Ọ kọwara etu obi dị ya n’usoro ahụ dịka o ji ohere ahụ rịọ ndị ọrụ nchekwa na ndị Inec ka ha kwụba aka ha ọtọ ma rụọ ọrụ ha n’uju.

    Ọ katọrọ akụkọ mwakpo ndị si n’akụkụ dị iche iche na Naịjirịa dapụta taa.

    Gere ihe ndị o kwuru n’uju ebe a.

  16. A wakpoola ọgbọ ntuliaka Phalga na Rịvas steeti

    Ndị omekome wepụtara akwụkwọ ndị e ji tụọ vootu bụ nke ndị akwadoghi ndị pati ha pụtara ikwado gbaa ya ọkụ.

    A majara ndị pụtara ịtụ vootu ebe ahụ. Ihe a mere n’akụkụ Phalga Ward nke akụkụ Aggrey Road nke Port Harcourt, Rịvas steeti.

    E kwuru na ndị omekome ahụ kụsara ntuliaka ebe ahụ nke mere ntuliaka jiri bie n’ike ebe ahụ.

  17. Etu ndị omekome siri wakpoo otu ọgbọ ntuliaka na Kaduna

    Lee ka ndị ọrụ Inec siri zoo onwe ha n’ime ụlọ dị n’akụkụ ọgbọ ntuliaka nke Jaoji Model na Kaduna oge ndị omekome wakporo ndị pụtara ịtụ vootu ha.

    Ndị omekome bụcha ngwa ọgụ pụtara ebe ahụ chusaa ndị mmadụ dịka ha tụchapụrụ vootu ha. Ndị ọrụ Inec nọ na-akwado ịgụkọ vootu ndị a tụrụ ebe ahụ mgbe ndị omekome ahụ wụchiri ebe ahụ.

    Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe gwara ama na ọ ji anya ya hụ ndị ahụ dịka ọ sokwa gbaa ọsọ zoo onwe ya n'ime otu ụlọakwụkwọ nọ n'ogige ahụ.

    Ọ kwuru na ha na-eche ka ndị omekome ahụ pụọ tupu amalite ngụkọ vootu ebe ahụ.

    O kwukwara na ndị ọrụ nchekwa apụtaghị ebe ahụ.

  18. Gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia Steeti atụọla vootu ya

    Gọvanọ Abia Steeti na nwunye ya bụ Nkechi Ikpeazụ atụọla vootu ha na Ward 7, Unit 032, Umuebere, Umuobiakwa, dị n'okpuruọchịchị Obingwa Abia Steeti.

    Ikpeazu kelere ndị ụlọorụ Independent National Electoral Commission ( INEC) maka etu ha siri hazie ma bido ya bụ ntụliaka n'oge.

    O kwukwara na obi dị ya ụtọ etu ihe niile siri gaa nke ọma ma gaa n'udo.

    Ikpeazu kwuru na aka ọrụ ya kacha dị ire bụ ịweta udo, nchekwa na ọdịmma n'Abia Steeti ma rịọ ndị Abia ka ha tụnyere vootu ha ebe ga-eweta udo na mmepe obodo.

  19. Ntuliaka ebiela n'akụkụ Oko, Anambra steeti

    E meechala ntuliaka n’ọgbọ ntuliaka ndị nọ n’ime ụlọakwụkwọ Centrial Primary School Oko, nke dị n’okpuruọchịchị Orumba North n’Anambra steeti.

    Dịka Inec siri nye ntuziaka, ntuliaka nke taa ga-amalite n’elekere asatọ na ọkara ma kwụsị n’elekere abụọ na ọkara nke ehihe taa.

    Ndị ọrụ Inec ebe ahụ na-akwadozi imalite gụkọwa vootu ha ebe ahụ.

  20. Soludo atụọla vootu ya

    Gọvanọ Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo atụọla vootu nke ya n’akụkụ obodo Ovuiyi Umueze, Isuofia, nke okpuruọchịchị Aguata, Anambra steeti.