Peter Obi meriri mpaghara ndida n'ihi agbụrụ na okpukperechi - Ifeanyi Okowa
Onye zọrọ osote onyeisiala Naịjirịa na PDP bụ Ifeanyi Okowa ekwuola uche ya maka ntuliaka emere na Febụwarị.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo
A tụghị vootu na wọọdụ Amuzi/Ihenworie nke Ahiazu Mbaise n’ihi ndehịe ndị ọrụ Inec
Ndị pụtara n’igwe
ịtụ vootu n’akụkụ Obodo Ahiazu Mbaise n’Imo steeti ji iwe laa dịka ndị ọrụ Inec
ebe ahụ mere ọtụtụ mmehie aka.
Ndehie nke
mbụ bụ na onye ọrụ ha ji naanị akwụkwọ e ji a tụrụ ndị ụlọomeiwu vootu were bịa
ebe ahụ ebe ọ sị na o chefuru nke ọkwa onyeisiala.
Ndị nọ ebe
ahụ ji iwe chughachie ya azụ ma gwaa ya gaa weta akwụkwọ e ji atụrụ ndị na-azọ ọkwa
onyeisiala vootu.
Awa ole m
ole gachara tupu ya bụ nwaamadị alọghachite mana o jighikwa akwụkwọ e ji edebanya
mpụtara ntuliaka were pụta.
Ihe a mere
n’ebe elekere anọ bụ oge Inec kwuru na ntuliaka nke taa ga-akwụsị.
Ndahie ndị
a mere ka ọgbaghara dapụta ebe ahụ dịka ọgụ dara ebe ahụ.
Ndị uweojii
wujuru ebe ahụ ịdajuu iwe ndị mmadụ mana ya bụ ọgbaghara mere ka a ghara ịtụ
vootu ebe ahụ.
Na Kaduna, EFCC nwuchiri nwaanyị na-azụ vootu
Ebe foto si, EFCC
Ngalaba na-ebuagha megide nrụrụaka bụ Economic and Financial Crimes Commission, EFCC,ekwuola na ha nwuchiri otu nwaanyi ji akwụkwọ eji atụ vootu 18 n'ụn'ụtụtụ Satode.
A nwụchiri Maryam Mamman Alhaji, onye nkwado otu pati nwere agba nakwa akwụkwọ nwere ibe 17 e denyere aha ndị kwesịrị ịtụ vootu ọgbọ atụmvootu Badarwa/Malali Ward 01 and 08, n'okpuru Ọchịchị Kaduna-North , Kaduna Steeti.
Akwụkwọ ahụ e denyere aha ndị mmadụ nwere akara akpaego ha n'ụlọakụ nakwa nke ekwentị ha.
Ọ bụ ndị ọrụ EFCC eyighị uwe ha mere ka ha abụ ndị nkịtị chọrọ ịtụ vootu chọpụtaraya.
Nwaanyị ahụ kwuru na ọ na-anara PVC ndị ahụ na-akwụnyere ha ego site n'igwe POS.
BVas ekweghi rụọ ọrụ n’akụkụ World Bank Housing Estate, Umuahia
Nkọwa foto, Ndị na-eche ka ha tụọ vootu n'akụkụ World Bank Housing Estate, Umuahia
N’ọgbo
ntuliaka nke World Bank Housing Estate n’Umuahia, Abia steeti, onye ntaakụkọ
BBC hụrụ na akụrụngwa Bvas nke ndị ọrụ Inec ekweghi rụọ ọrụ ma ncha malite n’ụtụtụ
ma ruo n’ebe elekere atọ nke ehihe mgbe o wetere ozi.
Ndị mmadụ pụtara
ebe ha hụ n’igwe dịka ha ji obi iwe na-ekwu na agụpụla ha ịtụ vootu ha.
Ha kwukwara
na obi adịghị ha mma dịka ha cheere na ndị orụ Inec anataghị ọzụzụ zuruoke inwe
ike jiri akụrụngwa ha ruo ọrụ.
Ndị bi n' Iba Housing Estate, Iba, Legọs
kwuru na e kweghị ha tụọ vootu dịka a gbachiri ọnụama e si abanye n'ogige ha sị ndị agaghị atụnyere APC abatala.
Otu nwaanyị akpọghị aha ya n'ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia kwuru sị, " Anyị bịara n'ụtụtụ kemgbe Elekere asaa nke ụtụtụ, ha kpochiri ọnụama. Ha kwuru sị, 'Ọ bụrụ na ị gaghị atụnyere APC, ọ bụrụ na ị bụghị onye Yoroba maọbụ ị naghị asụ Yoroba , ha agaghị enye ohere banye tụọ vootu."
Ndị otu jikọrọ bi n'ogbe ahụ kpọrọ ndị agha bụ ndị gbatara ha ọsọ enyemaka, nwuchie ụfọdụ ndị agboro ndị ahụ ma kpọpee ọnụama ogige ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
A malitela ịgụkọ vootu n'ụfọdụ ebe a tụrụ vootu na Naịjirịa
Dịka a ka
na-atụ vootu n’ọtụtụ ebe na Naịjirịa ugbua, a malitela ịgụkọ vootu n’ụfọdụ ebe.
N’ebe ndị dị
ka Idumota na polling unit dị n’Enu Owa/Muhammed Azikiwe.
Ebe ọzọ bụ
na polling unit Atiku Abubakar nke PDP dị na Yola.
Agụkọchaala
vootu ndị a tụrụ na polling unit dị na Lugard/Barrow nke Ikoyi, Legọs.
Etu e siri wakpoo ọgbọ ntuliaka Chioma Akpotha pụtara ịtụ vootu na Legọs
Ebe foto si, Screengrab/Chioma Akpotha/Instagram
Nkọwa foto, Chioma Akpotha bụ onye tiri mkpu ma kpọkuo ọha mgbe ndị agboro wụbatra ogige ntuliaka ya
Onye ejije
Nollywood a ma ama bụ Chioma Akpotha ewepụtala ihe onyonyo na-egosi etu ọgbaghara
siri dapụta n’ọgbọ ntuliaka ya.
Ihe a mere
n’ okpuru ọchịchị Eti Osa dị na Legọs.
N’ihe
onyonyo ahụ, o gosiri ma na-ekwu na
ụfọdụ ụmụnwoke ndị agboro wụbatara n’ogige ọgbọ ntuliaka ha ma malite ịkụsa ihe.
O kwuru na ndị ahụ
kuriri ụfọdụ ime ebe a
na-eme ntuliaka.
Ihe onyonyo ahụ gosiri na ndị uweojii ruru ise nọ ebe ahụ mgbe ihe a malitere mana ha milara oge o suru .
Ọ bụ
ndị nkiti bụ ndị chekwara ya dịka ụfọdụ n'ime ndị ahụ nwara iwakpo ya.
Ndị ntorobịa nọ ebe gbara mbọ iwụchi ndị mere ihe a mana ha gbapụrụ ebe ahụ.
Ndị nọ ebe
ahụ buuru igba ntuliaka ogige ha ma bubaa ha n’ime otu ụlọ nọ nso ebe ahụ ma na-ekwu
na ha ga-echekwa ya ruo mgbe nchekwa lọghachitere ebe ahụ.
Ọ bụ nwaada
Akpotha bụ onye tipuru mkpu ma kpokuo ọha n’ihe na-eme ebe ahụ.
Ihe onyonyo
ahụ gosiri na ndị mmadụ gbara mbọ nweghachite udo ebe ahụ dịka ha kwuziri n’ahịrị
ọzọ ma na-ekwu - “Ọ bụrụ na ịtụbeghi vootu gị, apụkwala, nọrọ ebe ịnọ ma hụ na ị
tụrụ vootu gị ebe a taa.”
Akpotha kwuru:
“Anwụ chaa, mmiri zoo, anyị ga-anọ ebe a”
Onyonyo ahụ
gosikwara na ndị ọrụ Inec malitere ịrụ ọrụ ha ọzọ dịka udo lọghachitere ebe ahụ.
BBC Igbo kpọkuru nwaada Akpotha n’ekwentị ịjụ ya ihe mere ebe ahụ mana o kwuru ọgbaghara dapụtara ebe ahụ etinyela
ya n’ọnọdụ ịma jijiji.
Onyonyo ahụ
gosiri na ndị agha mechara wụchie n’ogige ebe ahụ ịpụta ichekwa ndị mmadụ ebe
ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of Instagram post
Gọvanọ David Umahi nke Ebonyi Steetị atụọla vootu
Gọvanọ Ebonyi Steetị bụ David Umahi atụọla vootu ya n'ọgbọ a na-atụ vootu dị n'Onuofukuru polling unit, Umunaga - Uburu.
Umahi sị na obi dị ya mma etu ndị mmadụ si pụta n'igwe bịa tụọ vootu n'igwe.
O kelekwara ndị ọrụ nchekwa maka ịhụ na ntuliaka na wọọdụ ya gara nke ọma.
Gọvanọ Hope Uzodinma atụọla vootu ya
Ebe foto si, Imo state new media
Nkọwa foto, Gọvanọ Hope Uzodinma na nwunye ya atụọla vootu nke ha
Gọvanọ Imo steeti
bụ Hope Uzodinma atụọla vootu nke ya n’akụkụ ọgbọ ntuliaka Omuma ward dị n’Oru East
nke steeti ahụ.
Ya na nwunye
ya bụ Chioma Uzodinma so pụta tụọ vootu ha.
Ebe foto si, Imo state new media
Nkọwa foto, Gọvanọ Hope Uzodinma na nwunye ya atụọla vootu nke ha
Ọgbaghara adapụtala n’akụkụ Igbokusu na Lekki, Legọs
Nkọwa foto, Ndị agboro achụsaala ndị pụtara ịtụ vootu n'Igbokusu dị na Lekki, Legọs
Dịka akụkụ ọgbaghara
na-adapụta n’akụkụ Legọs dị iche iche onye ntaakụkọ BBC na Legọs agaruola ọgbọ
ntuliaka Igbokusu dị na Lekki, Legọs steeti bụ ebe ndị nọ ebe ahụ kọwara na ndị
agboro bu mma nakwa karama wụbatara n’ogige ebe ahụ chụsasịa ndị mmadụ ma, zuru
ekwentị ụfọdụ ma zufuu ịgba ntuliaka ha.
BBC hụrụ ka
akụsairi igbe ụfọdụ ma dorie akwụkwọ ndị mmadụ jiri tụọ vootu ebe ahụ ma wụsa
ha n’ala.
Ụfọdụ ndị
mmadụ ebe ahụ merụrụ ahụ ebe na-agba ọsọ ndụ ha dịka a na-ebupụ ha iga nweta ọgwụgwọ
ugbua.
Ndị agha Naịjirịa
wụchiri ebe ahụ ma dajụọ ọgbaghara na-ada ebe ahụ dịka ha gwara ọha ndị mmadụ
na ha nọ n’ihu ọrụ ha.
Ebe ndị e nwegara ọgbaghara, mmaja ndị na-atụ vootu, Ikate,Ajah, Igbokusu, Surulere Orba Nsukka...
Nkọwa foto, Na Igbokusu, dị nso Lekki na Legọs,
Ndị agboro nyere ndị bịara ịtụ vootu na Ikate dị na Lekki, Ajah,Oba Elegushi, Igbokusu,Lekki nakwa Surulere dị na Legọs ọsọ, kụsaa igbe ntuliaka ma wụnyee akwụkwọ na akọrọngwa ụfọdụ e ji atụ vootu n'ime ọwa mmiri.
Ha majakwara ndị mmadụ n'ụfọdụ ebe sị onye agaghị atụụ otu APC vootu lawa.
N'Owerre Orba Nsukka,Enugwu steeti, ndị bu egbe wụrụ egbe n'ebe ndị pụtara ịtụ vootu, ndị mmadụ pụtara ịtụ vootu rie mbọmbọ ọsọ.
Nkọwa foto, Igbokusu,Lekki
Na Surulere, ndị agboro sịrị onye mara na ọ gaghị atụnyere APC ya lawa
N'otu aka ahụ, onye ntaakụkọ anyị nọ na
Surulere kwuru sị, "Ebe 11.30, ndị agboro bịara n'ọgbọ atụmvootu bururu
igbe voootu, tunye vootu ndị a tụkọtarala n'ime ọwa mmiri."
Surulere bụ ebe ndị
ntorobia nakwa ndị si Ọwụwawa Anyanwụ bikarịrị na Legọs.Surulere dị na Legọs,
N' Akinyele Street, Johnson Street, ndị agboro gara kụsaa igbe e ji atụ vootu.
Otu onye agboro e ji 'Fine Boy' mara nọ n'ọgbọ atụmvootu dị na Fehintola Giwa Street Aguda, Surulere, Legọs na-eti mkpu sị, "Ị mara na ị gaghị atụrụ APC, lawa, o nweghịkwa onye manyere gi pụta atụmvootu."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Ntuliaka
ebidola n’akụkụ Nnewi ka o wechara ndị ọrụ Inec ọtụtụ awa imalite ya bụ ihe. Onye ntaakụkọ
anyị agaala ama nzuko nke Umuenem na Nwofo n’Ọtolo Nnewi dịka ọ hụrụ ọtụtụ ndị mmadụ
ịtụ vootu na ịtụ vootu.
Etu ọsọ siri taa n’ọgbọ ntuliaka dị na Surulere, Legọs
Nkọwa foto, Ihe ndị mmadụ hapụrụ n'ala oge ha na-agba ọsọ ndụ ha n'akụkụ Surulere
Ndị agbaala
ọsọ n’akụkụ Surulere, Legọs dịka a nụrụ ụda egbe aghara aghara.
Ndị ọrụ Inec
mere ngwa ngwa bupụ nkụrụngwa Bvas ebe ahụ.
Ụfọdụ
na-ekwukwa na ndị gbara egbe ebe ahụ zupụrụ ụfọdụ akụrụngwa Bvas.
Ihe a mere
n’akụkụ ọgbọ ntuliaka nke Nuruoniwo Ward 081 na 082.
Nkọwa foto, Ihe ndị mmadụ hapụrụ n'ala oge ha na-agba ọsọ ndụ ha n'akụkụ Surulere
Nkọwa foto, Ihe ndị mmadụ hapụrụ n'ala oge ha na-agba ọsọ ndụ ha n'akụkụ Surulere
Ihe onyeisi ụlọọrụ Inec kwuru maka etu ha siri ghara ịmalite ntuliaka n’oge
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Mahmood Yakubu onyeisi ụlọọrụ Inec
Onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahmood Yakubu ekwuola na "Anyị kwetere
na anyị amaliteghi n’oge, anyị makwa na e nwere ụfọdụ ene ndị ọrụ anyị abịa ghị
n’oge mana akụrụngwa anyị nwere ikike ịgọghachi oge ọbụla furu efu."
O kwukwara "Anyị amaliteghị
n’elekere asatọ n’ọkara kpọm kwem anyị agaghị akwụsị n’elere abụọ na ọkara kpọm
kwem.
Ihe anyị
na-ekwu bụ na onye ọbụla nọ n’ahịrị tupu elekere abụọ na ọkara mgbe anyị malitere
ga-atụrịrị vootu ya agbanyeghi oge ya bụ ntuliaka jiri gwụụ."
Yakubu kwuru nke a n'ọgbakọ mkpọku a kpọrọ ndị ntaakụkọ taa.
Ọ gara n'ihu kwusieike
"Enweghị onye
a ga-agụpụ bụ onye kwụnyere n’ahịrị tupu elekere abụọ na ọkara nke taa."
Gọvanọ Okezie Ikpeazu atụọla vootu ya
Ebe foto si, Okezie Ikpeazu
Gọvanọ Abia
steeti bụ Okezie Ikepazụ atụọla vootu nke ya n’ọgbọ ntuliaka Umuebere ward 7 dị
n’okpuruọchịchị Obingwa nke steeti ahụ.
Ndị obodo
ahụ pụtakwara soro tụọ vootu nke ha dịka ndị Inec nọ n’ihu ọrụ.
Ebe foto si, Okezie Ikpeazu
Obi adịghị anyị mma na e gburu oge n'ikesa akọrọngwa ntuliaka-Archibishop Chukwuma
Nnukwu ụkọchukwu ụka Anglikan mpaghara nke Enugwu bụ Most Reverend Emmanuel Chukwuma agbarụọla ihu na ogbugbu oge ndị ọrụ Inec gburu n'ikesa akọrọngwa ntuliaka n'ọgbọ atụmvotu.
Chukwuma kwuru nke a oge ọ gara tụọ vootu ya n'OKpara Square dị n'Enugwu.
"Obi adịghị anyị mma na e gburu oge ibuga akọrọngwa ntuliaka n'ebe ụfọdụ."
"Inec kwesịrị ịhụ na ha bugarara ihe e ji eme ntuliaka ọsịsọ be a ga-eji ya rụọ ọrụ."
Chukwu gosiri obiụtọ ka ndị mmadụ si pụta n'igwe .
"Ụdị ihe emebeghị mbụ n'Ọkpara Square maọbụ ebe ọbụla n'Enugwu."
"Nke a bụ ozi nye ndị ndọrọndọọ tara nchara mkap Naijiria ọhụrụ dị."
Ndị bi n'Amuwo Odofin sị na ha ahụbeghi ndị ọrụ Inec kamgbe ụtụtụ
Ọtụtụ ndị bi na mpaghara Amuwo Odofin, Legọs na-ewe iwe maka ndị ọrụ Inec erutebeghi n'ebe n'ihe dịka elekere 12:48 nke ehihie.
Ha sị na kamgbe isi ụtụtụ ọtụtụ n'ime ha pụtara ịbịa tụọ vootu na ha ahụghị ndị ọrụ Inec ka ọ fọdụzie itụ vootu.
Ndị a siri ọnwụ na ha ga-atụrịrị vootu ma ndị Inec o kwere ma ha ekweghi.
Cheta na mpaghara Amuwo Odofin bụ ebe ọtụtụ ndị Igbo bi na Legọs.
Olusegun Obasanjo atụọla vootu nke ya
Ebe foto si, Olusegun Obasanjo Media
Aka chịbụrụ
Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo apụtala tụọ vootu nke ya n’ọgbọ ntuliaka nọ n’obodo
ya n’ime Abeokuta, Ogun steeti.
Obasanjo pụtara
n’oge dịka ndị Inec malitere inabata ndị mmadụ ka ha tụọ vootu ha ma soro tụchapụ
nke ya ngwa ngwa.
Ndị obodo
ahụ pụtakwara tụọ vootu nke ha.
Ebe foto si, Olusegun Obasanjo Media
Nkọwa foto, Olusegun Obasanjo atụọla vootu nke ya
Osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo atụọla vootu nke ya
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo sị na ọ tụọla vootu nke ya na polling unit dị n'Ikenne, Ogun Steeti.
Ọ gwara ndị Naịjirịa ka ha gbalịa ga tụọ vootu nke ha.