Peter Obi meriri mpaghara ndida n'ihi agbụrụ na okpukperechi - Ifeanyi Okowa
Onye zọrọ osote onyeisiala Naịjirịa na PDP bụ Ifeanyi Okowa ekwuola uche ya maka ntuliaka emere na Febụwarị.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo
Etu ndị mmadụ siri kwado maka ntuliaka 2023 n’Anambra
Aha onyonyo, Etu ndị mmadụ siri kwado maka ntuliaka 2023 n’Anambra
N’ụbọchị
Fraịde abalị 24 nke ọnwa Febụwarị, ya bụ abalị foro chi ụbọchị ntuliaka 2023, Awka
bụ isi obodo Anambra steeti kpọtụrụ akpọtụ dịka ndị mmadụ pụtara n’igwe n’ahịa
nakwa n’ụlọakụ azụkọ ihe ndị ha dị ha mkpa iji dị nikere ntuliaka.
Akụkọ ihe dị
etu a sikwa akụkụ Naịjirịa dị ọzọ dapụta dịka ndị mmadụ kọwara na ha gbara mbọ
zụkọọ ihe ndị ga-enyere ha aka ibi ndụ tupu ebulie mmachị ndị mmadụ ịghagharị.
Gọọmentị Naịjirịa
kwuru na malite n’elekere 12 nke isi ụtụtụ Satọdee ruo elekere isii nke mgbeda
na a ga-amachi ngagharị ndị mmadụ nakwa azụmahịa ọbụla iji hụ na ndị mmadụ sonyere
na ntuliaka.
Ehighi ụra abalị niile n'ihi na a chọrọ m ịtụ vootu - Ibrahim Uba dị afọ 72
Nkọwa foto, Ibrahim Uba dị afọ 72 mara ụzọ ịtụ vootu
Ndị mmadụ
amalitela ịgbakọta maka atụmatụ ịtụ vootu n’akụkụ Shagari Quarters Early nke
Kano Steeti.
Ibrahim Uba
dị afọ 72 pụtara n'ebe elekere isii nke isi ụtụtụ dịka ọ gwara onye ntaakụkọ
BBC na ọ heghị ụra abalị niile n'ihi na ọ chọrọ ịtụ vootu.
Otu nwaanyị
ọzọ aha ya bụ Hadiza Sani bụkwa otu n'ime ụmụnwaanyị mbụ pụtara ma kwuo na ọ chọrọ
ka ọ tụọ vootu dịka o kwuru na nke ‘ga-enweta mgbanwe na Naịjirịa’.
Ọ fọrọ ihe
dịka otu awa tupu ntuliaka amalite dịka Inec hibere ya bụ ihe imalite n’elekere
asatọ na Ọkara.
Nkọwa foto, Hadiza Sani mara ụzọ ịtụ vootu
Ụbọchị ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ndị ụlọomeiwu ebirila ọkụ
Ebe foto si, Getty Images
Anya mbaụwa
niile dị n’ebe Naịjirịa nọ dịka mba Afrịka a kachasị n’ọnụọgụgụ na-eme ntuliaka
ịhọpụta onyeisiala na ndị ụlọomeiwu.
Ọtụtụ ndị
mmadụ na-ekwu na ntuliaka a bụ nke kachasị ekpo ọkụ kamgbe Naịjirịa gbasoro ọchịchị
onye kwuo uche ya n’afọ 1999.
Ntuliaka
nke taa ga-abụ iji họpụta otu onyeisiala, mmadụ otu narị na itoolu (109) n’ọkwa
sịnetọ na mmadụ narị atọ na iri atọ na ise (360) maka ọkwa ndị ụlọomeiwu nta.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka a bụ Independent National Electoral Commission (Inec) sị na ntuliaka a ga-amalite ma o jiri ọkara gafee elekere asatọ nke ụtụtụ (08:30am) ma kwụsị ma o jiri ọkara gafee elekere abụọ nke ehihie (02:30pm).
Inec kwuru na onye ọbụla kwụụ n’ahịrị ịtụ vootu tupu oge mpịachi ntuliaka a eruo ga-enwe ohere ịtụ vootu.
BBC Igbo kwụụ chịm iwetere ka ntuliaka si aga na mpaghara Naịjirịa dị iche ic
Igbo ndị ọma ndewo nụ ooo!
Igbo tụrụ ilu sị na "ụka a kpara akpa na ọ bụ isi ka e ji ekwe ya."
Taa ka ndị Naịjirịa ga-eme ntuliaka ịhọpụta onye ga-abụ onyeisiala nakwa ndị ụlọomeiwu.
Sonyere anyị n'ọbaozi BBC Igbo niile maka akụkọ banyere ntuliaka a.
Ihe ụlọọrụ Inec kwuru maka PVC a hụrụ na Nnewi, Anambra Steeti
Fake News & Misinformation: Etu ị ga-esi chọpụta nke bụ akụkọ ụgha n'oge ntuliaka a
Aha onyonyo, Fake News & Misinformation: Etu ị ga-esi chọpụta nke bụ akụkọ ụgha na oke ntuliaka a
Dịka Naịjirịa na-eme ntuliaka n’oge a, ọtụtụ ihe na-esokarị ntuliaka bụ mbịpụta na nkesa akụkọ ụgha maọbụ akụkọ ga-ebughe ọha n’ụzọ agụghọ.
Marakwa na ịma ụma maọbụ amaghị ama kesa akụkọ ụgha nwereike inyere ndị ọjọọ aka kesa emumnobi ọjọọ ha.
Ihe mbụ ị kwesịrị ịme tupu ikesa akụkọ ọbụla bụ ihie asaa na anya nnyocha ma tulee akụkọ niile ruru aka tupu ikesa ya.
Ịchọpụta na akụkọ ọbụla bụ akụkọ ụgha, tipu mkpu maka ya ma kpesara ụlọọrụ mgbasaozi nke soshal midia ebe ekere ya bụ akụkọ na ya bụ ihe bụ akụkọ ụgha, etu a ị ga-agbapụta ndị ọzọ n’aka ajọ akụkọ.
Ndị na-ebipụta akụkọ ụgha nwere uru ọjọọ ha na-erite n’ime ya, ekwela ka ha rabanye gị
Kedụ ka ịga esi mara ma akụkọ ịhụrụ n’ịntanetị, soshal media maọbụ n’ọba ozi ọbụla ọ bụ eziokwu ka ọ bụ ugha?
Ngalaba BBC na-enyocha akụkọ bụ ‘BBC disinformation team’, ewepụtala nkọwa zuruoke banyere okwu a.
Kirie ihe onyonyo nọ n'elu akụkọ a ka ị mụta ihe ndị ga-abara gị uru.
Ihe gbara ọkpụrụkpụ Gọvanọ Umahi kwuru maka ntụliaka onyeisiala a ga-eme echi
Dịka Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi Steeti na ndị ntaakụkọ nwere mkparịta ụka, lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ pụtara na ya bụ mkparịtaụka:
- Ka a nwuchie onye ọbụla butere ọgbaaghara oge ntụliaka a ga-eme n'ụbọchị satọde.
- Achọghị ịhụta onye ọrụ nchekwa ọbụla ebe o du onye ndọrọndọrọ ọchịchị bịara ịtụ vootu.
- Na ndị ncheka dị njikere ịrụ ọrụ ha oge ntụliaka a
- O kwukwara na ha achọpụtala ndị na-enyocha etu ntụliaka sị aga nke adịgboroja ma sị na agaghị enye ha ohere ime ihe ọbụla.
Egwu atụla unu cha cha, pụtanụ tụọ vootu – Ndị uweojii Anambra, Kọmịshọna ntuliaka
Nkọwa foto, Ndị uweojii n'Anambra ekwuola na ha apụtala ihu ọrụ maka ntuliaka 2023.
Dịka ọ fọrọ
naanị awa ole m ole ka e mee ntuliaka ọkwa onyeisiala nakwa ndị ụlọomeiwu Naịjirịa,
kọmịshọna ntuliaka n’Anambra bụ Dr Queen-Elizabeth Agwu nakwa ndị uweojii na
steeti ahụ agwaala ọha ndị mmadụ ka ha pụta tụọ vootu ha ma ghara ịtụ ụjọ ma
ncha.
Ndị uweojii
kwuru nke a ma gwaa ọha na ha apụtala n’uju ma nọrọ n’ọrụ ịchekwa ndụ ndị mmadụ
n’oge ntuliaka a.
Agwu kwuru
nke a n’ọgbakọ mkpọku ha kpọrọ ndị ntaakụkọ n’isi ụlọọrụ Inec n’Awka, Anambra
steeti.
O kwuru na
ntuliaka a ga-aga n’ihu n’akụkụ Anambra niile ma bụrụ ihe okwu enweghi nchekwa
agaghi egbochi.
Inec kwuru
na ha adịla njikere ma nọrọ n’ihu ọrụ dịka Agwu kwuru na akụrụngwa niileaga eji mee ya bụ ntuliaka eruola ha aka.
N’okwu akwụkwọ
ikike ịtụ vootu a sị a hụrụ n’otu akụkụ steeti ahụ, Agwu kwuru na ha na ndị
uweojii amalite nnyocha n’okwu a ma kọwa na ọ bụ ihe ịtụ n’anya na akwụkwọ
ikike itu vootu a sị a hụrụ bịara karịa nchịkọta akwụkwọ ikike itu vootu ebipụtara
n’Anambra steeti niile.
N’otu aka
ahụ , osote onye isi ndị uweojii n’akụkụ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa bụ John Amadi dọrọ
ọha aka na ntị ọkachasị ndị omekome maọbụ ndị ọbụla ga-achọ ikpalite ọgbaghara
n’akụkụ steeti ahụ ọbụla n’oge ntuliaka a dịka o kwuru na ndị uweojii agaghị
anabata agwa dị etu.
Amadi kwuru
nke a n’isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Amawbia dịka ya na ndị ntaakụkọ zutere.
Ọ gara n’ihu
dọọ ndị uweojii aka na ntị ma kwuo na onye otu ha ọbụla a hụrụ na-eri meperi n’ọrụ
ga-anata ntaramahụhụ dịịrị ha.
EFCC anapụtala nde N32.4 achọrọ iji mee nrụrụaka ntụliaka na Legọs Steeti.zụta vootu
Ebe foto si, EFCC
Ngalaba na-aluso mpụ ọgụ na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission bụ EFCC n'ịchafụ ekwuola na ha anapụtala nde naịra iri atọ na ụma anọ ha kwuru ha na-eche na ndị omekome chọrọ iji zụta vootu na ntụliaka a ga-eme echi na Legọs Steeti.
Ọ bụ ndị ngalaba a nke Legọs Steeti kwuru nke a ma sị na ha ebidola nyocha na ịgba ndị ha jidere ego a n'aka ha ajụjụ ọnụ.
Ha ji ohere a gwa ndị ọha na ha dị njikere ịhụ na ha kwụsịrị nrụrụaka ọbụla oge ntụliaka a ma sị ka onye ọbụla hụrụ ihe ọbụla gwa ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
2023 Election: Ụlọikpe enyela iwu nke kwụsịrị INEC iji MC Oluomo rụọ ọrụ oge ntụliaka
Ebe foto si, Musiliu Akinsanya Ayinde/Facebook
Ụlọikpe ukwu nke Legọs steeti n'ụbọchị Frịde enyela iwu nke gbochiri ngalaba na-ahụ maka ntụliaka bụ Independent National Electoral Commission(INEC) iji Musiliu Akinsanya e ji MC Oluomo mara maọbụ ndị otu ya maọbụ ndị ọkwọọ ụgbọala ya kesaa akụrụngwa eji eme ntụliaka na Legọs Steeti.
Iwu a gbochikwara onye ọrụ Inec ọbụla na onye otu Oluomo ọbụla ịrụkọ ọrụ election.
Ọ bụ dịka ọkaikpe Chukwujekwu Aneke kpebiri n'ụbọchị Frịde akwụkwọ Gbadebo Rhodes-Vivour bụ onye jị ọkọlọtọ Labour Party azọ ọkwa gọvanọ Legọs steeti na mmadụ anọ ndị ọzọ gbara maka ngalaba Inec iji Oluomo rụọ ọrụ.
Ndị ọzọ soro gbaa akwụkwo a bụ ndị ji ọkọlọtọ African Demcratic Congress bụ Funsho Doherty na Wale Oluwo onye nke Boot Party.
Inec etinyeghị akwụkwọ maka mkpebị ma enweghị kwa onye ọkaiwu nọchịtere anya ha.
Inec akagbuola ntuliaka ọkwa Sịnetọ n’Enugwu East
Ebe foto si, Inec and Oyibo
Ụlọorụ
na-ahụ maka ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission akagbuola
ntuliaka ọkwa Sịnetọ na mpaghara Enugwu East.
Onyeisi ụlọọrụ
a bụ Mahmood Yakubu gwara ndị ntaakụkọ nke a n’Abuja n’ụbọchị Fraịde.
Ọ kwuru na ntuliaka
a kwesịrị ịbụ n’ụbọchị 25 Febụwarị 2023 ka a ga-emezi n’ụbọchị 11 nke ọnwa
Maachị 2023.
Yakubu mbugharịa
dị mkpa maka ogbugbu e gburu onye ji aha Labour Party azọ ọkwa Sịnetọ na
mpaghara ahụ bụ Oyibo Chukwu.
Ọ sị ha
mere nke a site na mkpesa Labour Pati nyere sị na ha chọrọ ka e nye ha ohere idonye
anya onye otu a.
Yakubu sị
na ha e meela ka ụlọorụ ha nke ngalaba Enugwu steeti maara maka mkpebi a.
Cheta na ndị
ojiegbe gburu Chukwu na onye enyemaka ya n’ụbọchị Wenezde ma gbaa ụgbọala ha ọkụ
n’obodo Eke-Otu Amechi-Awkunanaw dị n’Enugwu.
Lee ka ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ sị akwado maka ntụliaka
Dịka Gọvanọ Abia Steeti bụ Okezie Ikpeazu hiwere ụbọchị taa bụ ụbọchị 24 nke ọnwa Febụwarị dịka ụbọchị ezumike ka ndị mmadụ nwee ike gaa n'ime obodo ebe ha debanyere aha ha tụọ vootu.
Nke a dị n'akwụkwọ ozi ode akwụkwọ gọọmentị Abia Steeti bụ Chris Ezem depụtara n'ụbọchị 23 nke ọnwa Febụwarị a, ebe a ka ọ nọrọ rịọ ndị Abia Steeti ka ha pụta n'igwe tụọ vootu ha.
N'aka nke ọzọ ka obi esighị ndị mmadụ ike na mpaghara ọwụwa anyanwụ dịka ụfọdụ otu na-ama ọkwa sị ndị mmadụ apụtala tụọ ya bụ ntụliaka.
Dịka o siri dị ụgbụa, ahịa na-ekwo ekwo dịka ndị mmadụ gara ahịa ịzụta nri ha ga-eri oge ntụliaka a.
Ndị Ọka nke Anamabra Steeti a na-akwado
Ọka bụ isi obodo Anambra adịla njikere maka ntuliaka echi .
Ọka bụ isi obodo Anambra steeti na ekwo ekwo taata dịka ndị mmadụ na-ego ihe n'ahịa ma na eme njem ịga tụọ votu ha.
Ahịa Eke Ọka na-ekwo ekwo taata dịka ntuliaka bụ echi. N'ahịa Eke Ọka, ọtụtụ mmadụ ji ọsọ egota ihe oriri nakwa ihe ndị ọzọ ha ga-eri dịka echi machibidoro ngagharị maọbụ ire ihe tutu na atụchaa votu. Lee ka ya bụ ahịa Eke Ọka si dị taata.
Ihe anyị ma maka akụkọ na NYSC akpọpula ndị 'corper' 100 e zigara Imo
Ngalaba na-ahụ maka ndị ji otu afọ efe ala nna ha bụ 'National Youth Service Corps' ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ha kpọpụrụ ndị mmadụ 100 kwesịrị iso n'ọrụ ntuliaka n'Imo steeti.
N'ozi ha wepụtara n'ụbọchị Fraide n'akara Instagram ha, NYSC kwuru si, "Ndị na-achịkọta atụmatụ a(NYSC) na-ekwu kpọmkwem na a kpọpụtaghị ndị ji afọ efe ala nna ha na-esonye na ntuliaka n'ụfọdụ okpuru ọchịchị dị n'Imo steeti, kama anyị anabataghị iziga ha ebe ụfọdụ "n'ihi ọnọdụ nchekwa n'ebe ụfọdụ."
"Tupu oge a, e nwere ebe ndị a ma dịka ebe mkpamkpa na-akpa,NYSC agaghị ekwe n ka ndị ji otu afọ efe ala nna ha gaa ebe ndị a."
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of Instagram post
Kemgbe ọnwa Jenụwarị afọ 2021, tigbuo-zogbuo na-arị ibe ya elu n'ọtụtụ ebe n' Ọwụwa Anyanwụ bụ ebe e gbuola ọtụtụ ndị uweojii, ndị agha, nakwa ụfọdụ ụmụ Naijiria nwere agba.
Gọọmenti Etiti na ndị ọrụ nchekwara na-ebo otu nnwereonwe Biafra bụ Ipob na alaka ọgụ ha bụ ESN mkpamkpa ndị a.
Mana otu Ipob agọola ugborogboro na aka ha adịghị ya.
Ọ bụ eziokwu na a nwuchiela Onyeomeiwu Chinyere Igwe maka ibu $500,000?
Ndị uweojii Rivas steeti ekwuola na ha nwuchiri onye omeiwu maka ebubo ibu akatamkpo ego.
Ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Rivas steeti bụ Grace Iringe -Koko kwuru na
" Ndị uweojii e si na ngalaba ndị uweojii Rivas Steeti siga isiụlọọrụ Inec dị n'okporoụzọ Aba Road taa bụ 24/2/2023 ebe ha nọ ọrụ ịkwụsị ma nyochaa ụgbọala nwuchiri Hon Chinyere Igwe, onye ụlọnnochite anya Naijiria na-anọchite Pọtakọt ka o ji ego dị 498,100 dọla dị n'ime akpa."
" E nwetakwara akwụkwọ etu a ga-esi eke ya bụ ego."Ndị uweojii Rivas steeti ekwuola na ha nwuchiri onye omeiwu maka ebubo ibu akatamkpo ego.
Nke a na-abịa dịka akụkọ na-efegharị na soshal midia na a nwụchiri omeiwu na-anọchite Pọtakọt n'Ụlọomeiwu Nta bụ Hon Chinyere Igwe dịka o bụ ego dị dọla N500,000 nke e kwuru na ọ ga-eji zụtara otu onye so na-azo azọ ọkwa onyeisiala vootu na Rivas steeti.
Naijiria ga-eme ntuliaka onyeisiala echi bụ abalị 235 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023.
Ndị kachasị chawapụ na ntuliaka ahụ gụnyere Bola Ahmed Tinubu nke APC, Atiku Abubakar nke PDP , Peter Obi nke labour Party nakwa Rabiu Kwankwaso nke NNPP.
Etu ndị omekome ruru 30 si wakpo ụlọorụ ndị uweojii n'Abia steeti
A gbachiela agbata Naijiria na mba ndị ọzọ n'elu ala
Gọọmentị Naijiria ekwuola na ha ga-agbachi okeala Naijiria na mba ndị ọzọ gbara ha gburugburu otu abalị dịka a na-akwado ntuliaka onyeisiala echi bụ abalị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023.
N'ozi nke ngalaba Gọọmentị Etiti na-ahụ maka ọpụpụ na mbata bụ "Nigeria Immigration Service wepụtara ụbọchị Tọịọzde n'akara Twitter ha, ụlọọrụ ahụ kwuru na nke a bụ iji hụ na ntulaiaka 2023 gara nke ọma na-enweghị nsogbu ọbụla.
AHa kwuru na a gakpochi ebe ndị a malite n'etiti abali ga-efo ụbọchị Satode(25/2/2023) Febụwari, rue abali ga-efo ụbọchịụka (26/2/2023)
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Naijiria na mba Benin, Niger, Chad na Cameroon nwere okeala n'elu ala.
Mana n'elu mmiri, Naijiria namba Equatorial Guinea,Ghana nakwa Sa Tome nwere agbata.
Lee ihe ndị ị maghị maka ụmụnwaanyị nwere ike ịbụ isi nwaanyị Naijiria
Peter Obi: Ihe ndị ị maghị maka Obi, Tinubu, Peter Obi, Kwankwaso na Atiku