Peter Obi meriri mpaghara ndida n'ihi agbụrụ na okpukperechi - Ifeanyi Okowa

Onye zọrọ osote onyeisiala Naịjirịa na PDP bụ Ifeanyi Okowa ekwuola uche ya maka ntuliaka emere na Febụwarị.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. Lee ọnụọgụgụ ndị tozuruoke ịtụ vootu dịka Inec si kwuo

    Ọnụọgụgụ ndị nwere ikike ịtụ vootu

    Ebe foto si, Inec

    Dịka ọ fọrọ naanị ụbọchị abụọ ka e mee ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị omeiwu Naịjirịa, ụloọrụ na-ahazi ntuliaka a bụ Inec ewepụtala ọnụọgụgụ ndị tozuruoke ịtụ vootu.

    Ọnụọgụgụ ndị nwetere akwụkwọ ikike ịtụ vootu (PVC) - 87,209,007

    Ndị enweteghi akwụkwọ ikike ịtụ vootu - 6,259,229

    Cheta na ọnụọgụgụ ndị dabanyere aha maka iso tụọ vootu dị 93,469,008)

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  2. Etu ndị ọrụ nchekwa si eke nkwụcha maka ntuliaka Naịjirịa

    Ndị uweojii

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ọrụ nchekwa dị iche iche na Naịjirịa na ha akwado maka ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa na nke ndị omeiwu ga-adị na Satọde 25 Febụwarị 2023.

    Ndị a gụnyere ndịagha, ndị uweojii, ndị uweojii nzuzo a kpọrọ DSS n’ịchafụ, ndị nchekwa civil defence nakwa ndị ọzọ.

    Ọrụ ndị a bụ ịhụ na udo dị n’oge ntuliaka, ibuagha megide ndị ohi ikpe ntuliaka nakwa ndị na-ebute ọgbaghara n’ebe a na-atụ vootu.

    Onyeisi ndị uweojii nyere iwu na njem ụgbọala, ụgbọmmiri na ndị ọzọ agaghị adị n’ụbọchị ntuliaka malite n’elekere isii nke ụtụtu ruo elekere isii nke mgbede.

    Nzukọ ndị ọrụ nchekwa n'Akwa Ibom

    Mana nke a agaghị emetụta ndị ọrụ Inec, ndị na-ele ka ntuliaka a si aga, ụgbọala ndị ọrụ ahụike nakwa ndị ọrụ mgbanyụọkụ.

    Ha sị na nke a bụ iji hụụ na e nwere udo n’oge ntuliaka a.

    Ọ dọkwara ndị nchekwa aka na ntị ka ha esola ndị ha na-arụrụ ọrụ gaa n’ọgbọ ebe a na-atụ vootu.

    Na onye ọbụla a hụrụ dara iwu a ga-ata ahụhụ dị na ya.

  3. Etu ụlọọrụ Inec si akwado maka ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị omeiwu

    Nkesa akụrụngwa ntuliaka

    Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission amalitela ikesa akụrụngwa ndị a ga-eji eme ntuliaka.

    Nke a malitere kamgbe ụbọchị Wenezde 21 Febụwarị 2023 na steetị ndị dịka Legọs, Kwara, Ondo dgz.

    Ebe steetị ndị dị n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa dịka Abia, Ebonyi, Anambra, Imo malitere ikesa akụrụngwa a kpọrọ 'sensitive materials' dịka BIVAS na akwụkwọ itụ vootu na ndị ọzo taa bụ 23 Febụwarị 2023.

    E buuru ihe ndị a gawa n'okpuruọchịchị ndị dị na steeti dị iche iche na Naịjirịa.

    Ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii, ndịagha, ndị DSS na ndị ọzọ tinyere ndị ntaakụkọ nọ n'ebe ndị a ịchọpụta ka e si ekesa akụrụngwa ndị a.

    Nkesa ntuliaka
    Nkesa akụrụngwa ntuliaka
    Nkesa akụrụngwa ntuliaka
    Nkesa akụrụngwa ntuliaka
  4. Simon Ekpa: Ihe ndị Igbo nwere agba na-ekwu maka ihe Ekpa na-agabiga na Finland

  5. Ihe i kwesịrị ịma banyere ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa nke afọ 2023.

    Ndị kachasị gbapụta ihe na ndị na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa

    Ndị Naịjirịa ga-awụchi n’ọgbọ ebe a na-atụ vootu n’ụbọchị 25 Febụwarị 2023 ịhọpụta onyeisiala ọhụrụ ga-anọchị anya Onyeisiala Muhammadu Buhari nakwa ndị nnọchịteanya n’ụlọomeiwu.

    Esoghi usoro ntuliaka ndị ọzọ a na-emebu, e nwere mmadụ atọ kachasị gbapụta ihe n’ịzọ ọkwa a, ha gụnyere; Bola Ahmed Tinubu nke All Progressive Congress (APC) na-achị ugbua, Atiku Abubakar nke Peoples Democratic Party (PDP) na Peter Obi nke Labour Party (LP).

    Iji merie na ntuliaka a, onye ahụ ga-enwete vootu kachasị n’ọnụọgụgụ ma nwetekwa vootu ruru pasentị 25 n’opekatampe steeti 24 n’ime steeti 36 sị na Naịjirịa.

    Ntuliaka Naịjirịa 2023

    Ụlọorụ na-ahazi ntuliaka a bụ Independent National Electoral Commission (Inec) sị na mmadụ karịrị nde 93 (93,469,008) debanyere aha iso tụọ vootu.

    E nwere otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị 18 so na-azọ ọkwa a, ebe ọgbọ ebe a ga-atụ vootu (polling unit) dị 176,606.

    Nke a bụ mbụ a ga-eji igwe tekịnụzụ a kpọrọ Bimodal Voter Accreditation System (BIVAS) eme ntuliaka ọkwa onyeisiala. A ga-eji igwe a chọpụta onye tozuruoke ịtụ vootu site na akara mkpịsị aka maọbụ ihu onye ahụ.

    Inec sị na ngwa ngwa e nyochara mmadụ na igwe a ga-ezipụ ozi ọnụọgụgụ mmadụ ole e nyocharala nke mere na ọ ga-arụ ka aghụghọ dị na ya.

  6. Mmalite akụkọ banyere ọsọ ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na ndị ụlọomeiwu

    Igbo ndị ọma nnọọọ! Anyị na-abata unu n’ọgbakọ anyi bụ ebe anyị ga-ewetere unu akụkọ niile banyere ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa na nke ndị omeiwu.

    Sọnyere n’ọgbakọ a malite taa ruo ụbọchị a ga-akpọpụta onye meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala nakwa ndị ụlọomeiwu.

  7. Peter Obi meriri mpaghara ndida n'ihi agbụrụ na okpukperechi - Ifeanyi Okowa

  8. New Naira Scarcity: Ihe ndị mmadụ na-agabiga n'ihi ụkọ ego naịra

  9. Matakwuo maka ndị a na-azọ ọkwa Onyeisiala na nkwa ha na-ekwe

  10. Fact-check: Akụkọ ahụ ị na-achọ ike, ọ bụ akụkọ ụgha ka ọ bụ nke ezie?

  11. #NextLevel: Nkwa ọhụrụ iri Buhari kwere