Peter Obi meriri mpaghara ndida n'ihi agbụrụ na okpukperechi - Ifeanyi Okowa
Onye zọrọ osote onyeisiala Naịjirịa na PDP bụ Ifeanyi Okowa ekwuola uche ya maka ntuliaka emere na Febụwarị.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo
A na-eche ka amalite ngụkọ n’Imo steeti ugbua.
Nkọwa foto, Isi ụlọọrụ Inec n'Imo steeti
Ndị ọrụ nsochi
ozi so mpụtara ntuliaka metụtara agbakọọla n’isi ụlọọrụ Inec n’Imo dịka a
na-eche ka ngụkọ mpụtara ntuliaka malite.
Ndị ntaakụkọ,
ndị ọrụ nlebanya n’usoro ntuliaka, ndị na-alụ ọgụ ikike dịịrị onye nakwa ndị ọzọ
okwu ntuliaka Naịjirịa ruuru nọ n’ime ya bụ ụlọọrụ ugbua.
A na-eche
ndị ọrụ Inec ka amalite ngụkọ mpụtara ntuliaka si na steeti ahụ ugbua.
EFCC anwụchiela mmadụ atọ na Benin a hụrụ ‘PVC’ 20 n’aka
Ebe foto si, EFCC
Nkọwa foto, Nwaada anwudoro ji akwụkwọ ikike ịtụ vootu ndị gbara ama mere a nwụchịe mmadụ abụọ ndị ọzọ.
Ụlọọrụ
na-ahụ maka mgbochi mpụ na nrụrụaka bụ ‘Economic and Financial Crimes Commission’ (EFCC) anwụchiela mmadụ atọ na Benin nke
Edo steeti dịka a hụrụ akwụkwọ ikike ịtụ vootu (PVC) 20 n’aka ha.
Ọ bụ ndị ụlọọrụ
ha na steeti ahụ bụ ndị wudoro ndị a.
Ha nwụchiri
otu nwaada a na-enyo dịka a hụrụ PVC 20 bụ nke ndị mmadụ n’aka ya.
Ha nwụchiri
nke wọọdụ mbụ nọ n’ime ụlọụka St.
Patrick's Catholic Church dị n’Ikpoba Okha, Benin.
Ya bụ nwaada kwuru na ọ
bụ otu nwaanyị dị afo 73 na otu nwoke ọzọ nyere akwụkwọ ikike ịtụ vootu 20 ndị
ahụ.
EFCC kwuru na ọ bụ
nwaada ahụ gbaara ha ama nke mere ha jiri nwụchie mmadụ abụọ ndị ahụ.
Ha kwukwara na nnyocha
na-aga n’ihu n’isi ndị a ugbua.
Amalitela ngụkọ mpụtara ntuliaka n’Ebonyi steeti
Dịka e
mechara ntuliaka n’akụkụ dị iche iche n’Ebonyi steeti n’ụbọchị Satọdee, vootu ndị
si ọgbọ ntuliaka na steeti ahụ abịaruwela Inec aka.
Ngụkọ amalitela
n’isi ụlọọrụ Inec na steeti nke dị n’Abakaliki bụ isiobodo ya bụ steeti.
Kọmịshịna
ntuliaka steeti ahụ bụ Onyeka Paulin Ugochi, Onyeisi nhazi ntuliaka steeti ahụ bụ
Charles Igwe, Kọmịshọna ndị uweojii, ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ, ndị ntaakụkọ na
ndị ọrụ ikike dịịrị onye metụta ntuliaka awụchiela ebe ahụ ugbua dịka ya bụ ihe
na-aga n’ihu.
Ntuliaka 2023: E ji akụrụngwa ‘server’ Inec mee nrụrụaka na ngụkọ mpụtara ntuliaka a?
Anyị ga-ebido ngụkọ vootu n'elekere 6:00 nke abalị taa
Ebe foto si, INEC/Twitter
Ụlọọrụ Inec ebidola emume ngụkọ vootu a tụrụ na Naịjirịa maka ọkwa Onyeisiala na nke ndị ụlọọmeiwu ukwu na nke steeti.
Kama onyeisi ngalaba Inec bụ Mahmood Yakubu kwuru na ha ga-ebido mkpọpụta na ngụkọ vootu n'elekere isii nke abalị taa.
Yakubu ji ohere a dọọ ndị mmadụ ọkachasị ndị ụlọ ntaakụkọ aka na ntị si ha ewepụtala ọnụọgụgụ ọbụla belụsọ maọbụ nke ndị Inec wepụtara.
Nwaanyị ku nwa ọ mụrụ naanị ọnwa abụọ gara aga apụtala ịtụ vootu na Bayelsa
Nkọwa foto, Harrison pụtara n'ọgbọ ntuliaka ya ụnyahụ mana ndị Inec abịaghị, ọ pụtakwala ọzọ taa.
Oriakụ Harrison
Rosaline ku nwa ya ọ ka mụrụ naanị ọnwa abụọ gara aga n’aka wụpụta ọgbọ
ntuliaka nke Unit 1 dị na Yenegoa, Bayelsa steeti n’ụtụtụ taa maka atụmatụ ịtụ
vootu ya.
Oge onye ntaakụkọ BBC jụrụ ya ihe mere o jiri kụrụ nwa o ku n'aka pụta, o kwuru:
“Mmuọ nụrụ oke ọkụ n’ebe ntuliaka
nọ n’ihi na a họrọ m ka Naịjiirịa dị mma. Achọrọ m ka obodo a dị mma maka onye ọ
bụla gụnyere nwa m. Ya mere m ji maa ụzọ pụta taa. A pụtara m ụnyahụ n’ebe elekere
iri nke ụtụtụ.”
Harrison
kwuru na ọ ndị Inec abịa ruo mgbe ọ mechara lawazie be ya.
“A nọrọ m ruo
nkeji ole na ole tupu elekere atọ nke ehihe... E mechara m lawa n'ihi na agụụ malitere
ịgụ.”
Nke a na-abịa
dịka Inec yigharịrị ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị ụlọomeiwu Naịjirịa n’akụkụ ụfọdụ
na steeti ahụ n’ihi ọgbaghara dapụtara n’ebe ndị ahụ.
Ntuliaka
amalitela ugbua na steeti ahụ.
Ihe mere amalitebeghị ngụkọ na Legọs - Inec
Nkọwa foto, A na-eche ka Inec malite ịgụkọ mpụtara ntuliaka na Legọs
Otu onye ụlọọrụ
Inec na Legọs na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara onye ntaakụkọ BBC n’ụtụtụ Sọnde
a na ihe mere ha amalitebe ngụkọ mpụtara ntuliaka bụ na ha amatebeghị ịnata ozi
ngụkọ vootu si n’akụkụ ọgbọ ntuliaka si okpuruọchịchị dị iche iche na steeti ahụ.
Ọ gara n’ihu
kwuo na ha malite ịnata ozi ngụkọ vootu si n’ụfọdụ ebe na ha ga-amalite ngụkọ
mpụtara ntuliaka.
Ọtụtụ ndị ntaakụkọ, ndị ọrụ nchekwa, ndị ọrụ ikike dịịrị onye na ndị otu nlebanya n'usoro ntuliaka agbakọọla na-eche ka ya bụ ihe malite.
Ụfọdụ
steeti ndị ọzọ amalitela ịgụkọ mpụtara ntuliaka nke ha ugbua.
Amalitela ịtụ vootu n’akụkụ Bayelsa Steeti dị iche iche
Nkọwa foto, Ndị mmadụ apụtala ịtụ vootu na Bayelsa steeti.
Dịka Inec
siri kwuo n’ụbọchị Satọdee, ntuliaka amalitela n’akụkụ Bayelsa dị iche iche taa
bụ Sọnde.
Cheta na e
yigharịrị ntuliaka n’akụkụ ọgbọ ntuliaka nke mbụ na nke abụọ na wọọdụ Epie dị
na steeti ahụ.
Amalitela ịgụkọ vootu ndị a tụrụ n’akụkụ Naịjirịa dị iche
iche n’ụbọchị Satọdee taa bụ Sọnde.
Agbanyeghị na n'akụkọ pụtara ndị ọrụ inec abịaghị n’oge n'ụfọdụ ebe dịka ụfọdụ ndị ọrụ ejighi akụrụngwa ọrụ ha zuruoke nwere bịa. Ihe ndị a metụtara ntuliaka nke afọ
2023. Nke a mere onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahmood Yakubu jiri
zipụta ozi ma kwee nkwa n’ehihe Satọdee na enweghi onye maọbụ ndị a ga-agụpụ na
ntuliaka a.
Inec pụtakwara
n’abalị Satọdee kwuo na n’ihi etu ihe ndị siri metụta ụfọdụ ebe, na a
ga-emeghari ntuliaka na Steeti ụfọdụ nakwa ọgbọ ntuliaka ụfọdụ.
Nke a gụnyere Cross Rivers na Bayelsa steeti. Lee nkọwa ihe mere e ji emegharị ntuliaka n’ebe ndị a.
Cross River Steeti
E yigharịrị ntuliaka ọkwa onyeisiala na nke ndị ụlọ omeiwu na steeti a gaa ụbọchị Sọnde 26 nke ọnwa Febụwarị. A malitere ịtụ vootu n’ọgbọ ntuliaka ebe ndị e meghị ntuliaka na steeti ahụ dịka okpuruọchịchị Bakassi, Dayspring 1&2 na Qua island.
Bayelsa
Eyigharịrị ntuliaka n’ọgbọ ntuliaka 141 na steeti a n’ihi ọgbaghara ndị dapụtara ebe ahụ.
Ihe a metụtara ọgbọ ntuliaka nke ndị wọọd 4, 6, 8, na 14, ma gụnyekwuoro 40 n’ime 141 ngwa ntuliaka ka zuruoke.
Yakubu kwuru na aga amalite ntuliaka n’elekere10 nke ụtụtụ ruo elekere anọ nke mgbede.
O kwukwara na ha ahaziela nchekwa zuruoke nye ebe ndị a ugbua.
Ndị ọrụ Inec amalitekwala ngụkọ vootu n'ụlọọrụ ha dị n'isi ụlọọrụ okpuru ọchịchị Awka South dị n'Amawbia, Anambra Steeti.
Nke a na-abịa dịka a na-atụ anya mpụtara ntuliaka na steeti dị icheiche.
Nchịkọta ihe ndị mere na ntuliaka Naịjirịa 2023
Nkọwa foto, Ndị Naịjirịa pụtara tụọ vootu n'akụkụ dị iche iche n'ụbọchị Satọdee.
Dịka Inec
siri kwee na nkwa, ha ahaziri ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa nakwa nke ụlọomeiwu
n’ụbọchị Satọde.
Lee nchịkọta
ihe ndị mere na ya bụ ntuliaka ebe a:
A malitere
ntuliaka n’ebe elekere asatọ na ọkara nke ụtụtụ dịka Inec siri kwuo
A nụrụ ozi
na ntuliaka amaliteghi n’oge n’ọtụtụ ọgbọ ntuliaka n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche.
E nwere ebe
ndị ntuliaka amaliteghi cha cha ruo oge Inec wepụtara maka nkwụsị ya bụ ntuliaka
(nke bụ elekere abụọ n’ọkara nke ehihe).
Akụkọ
mwakpo, ọgbaghara na nkụsa igbe ntuliaka n’ọgbọ ntuliaka ụfọdụ dapụtara dịka e
zurukwara ụfọdụ ngwa ntuliaka n’akụkụ ebe ndị dị iche iche dịka Legọs, Edo na Rịvas
steeti.
Onyeisi ụlọọrụ
Inec bụ Mahood Yakubu kwupụtara na a wakporo ụfọdụ ebe na Delta na Kastina.
Inec yigharịrị
ntuliaka n’ọgbọ ntuliaka 141 na Bayelsa steeti n’ihi ọgbaghara ndị dapụtara ebe
ahụ.
Yakubu
kwuru na ndịagha nnupuisi nke alakụba bụ Boko Haram kwasara ndị ọrụ Inec mgbọ n’elu
ugwu nke Gwoza dị na Borno steeti ma merụọ ndị ọrụ ha ahụ.
Ntuliaka
ga-aga n’ihu n’akụkụ ụfọdụ na Naịjirịa taa.
Na-esochi anya n'ike n'ike maka akụkọ ntuliaka ndị ga-adapụta taa.
BVAS anabataghị mpụtara ntuliaka e mere n' ọgbọ atụmvootu anyị - Omoni Oboli
Ebe foto si, Omoni Oboli/ Instagram
Onye
ihe ejije Nollywood,a ma ama bụ Omoni Oboli atụọla arrịrị naha enweghị ike tinye mpụtara ntuliaka e mere
n’ọgbọ atụmvootu ya n’na ọbaozi Inec.
N’ihe onyonyo o mere n’ụzọ
ụtụtụ Ụbọchịụka, o kwuru na ọ gbara ya gharịị ihe mere n’igwe ndị ọrụ Inec kwesịrị iji mee
nke a anaghị arụ ọrụ dịka ndị pụtara ịtụ vootu n’ebe ahụ tụụrụ vootu rue chi ofufo.
E bidoghị atụmvootu n'oge n'ebe ahụ nke mere ka a tụọ vootu n'ebe ahụ rue ime ndeli foro Ụbọchịụka.
Ebe foto si, Omoni Oboli Instagram
'Ihe mere na ebidoghị ntuliaka n'oge n'ebe ụfọdụ - Inec
Onyeisi ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka Naijiria a kpọrọ Inec n'ịchafụ bụ Mahmood Yakubu ekwuola na ọ bụ nsogbu ibugharịị ndị ọrụ ha nakwa akọrọngwa ha ji arụ ọrụ nakwa nsogbu nchekwa mere ka a ghara ibido ntuliaka n'ụfọdụ ebe ụbọchị Satode.
Yakubu kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja.
A malitere atụmvootu ka ọ gachara ogologo oge ka Elekere asatọ na ọkara bụ oge Inec kwuburu ntuliaka ga-amalite kụchara n'ọtụtụ ebe na Naijiria 'Ihe mere na ebidoghị ntuliaka n'oge n'ebe ụfọdụ - Inec
Ebe foto si, Inec
Ndeewonụ
Igbo mma mma!
Ụnụ asaala chi? Sonyere anyị ebe maka akụkọ ka o si aga dịka o siri metụta ntuliaka Naijiria e mere ụnyaahụ!
Onye na-azọ Osote Onyeisiala n'aha otu Labour Party bụ Yusuf Datti Baba-Ahmed, tụrụ vootu ya n'ọgbọ atụmvootu ya na Kaduna n'ebe Elekere 10:10 nke ụtụtụ na-enweghị nsogbu ọbụla.
A ka na-atụ vootu n'ebe ụfọdụ Amuwo Odofin,Legọs
A tụmvootu ka na-aga n'ọgbọ atụmvootu Amuwo Odofin Polling Unit 53 na 54,Legọs ka ọ gachara awa anọ e kwesịrị ka e mechie ntuliaka.
Ndị ọrụ Inec na akọrọngwa ntuliaka bịara ebe ndị a n'ehihie taa.
Cheta na Inec kwuburu na ntuliaka ga-amalite n'Elekere Asatọ nke ụtụtụ.
Ugbua ka ndị Inec bịara na Dowen College, Legọs
Ebe foto si, Screengrab
Ndị ọrụ Inec bịara n'ọgbọ atụmvootu na Dowen College, Lekki dị na Legọs ka ọ fọọ nkeji abụọ ka ọ kụọ Elekere ise(5:58pm.)