Peter Obi meriri mpaghara ndida n'ihi agbụrụ na okpukperechi - Ifeanyi Okowa
Onye zọrọ osote onyeisiala Naịjirịa na PDP bụ Ifeanyi Okowa ekwuola uche ya maka ntuliaka emere na Febụwarị.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo
A na-eche ndị ọrụ Inec n’akụkụ Ojodu, Legọs steeti
Nkọwa foto, Ndị na-eche ndị ọrụ Inec
Ndị mmadụ
apụtala na-echezi ndị ọrụ Inec n’ime ụlọakwụkwọ Ojodu Grammar School nke Legọs
steeti.
Onye ntaakụkọ
BBC na Legọs gara ebe ahụ kwuru na ndị Inec abịarubeghi n’ebe ihe ji nkeji atọ
fọ ka elekere 10 kụọ.
Lee ka ndị
na-eche ndị Inec siri nọrọ na-eche.
Nkọwa foto, Ndị na-eche ndị ọrụ Inec
Nkọwa foto, Ndị na-eche ndị ọrụ Inec
Nkọwa foto, Ndị na-eche ndị ọrụ Inec
Lee ka ihe si aga n’akụkụ Ebonyi steeti dị iche iche.
Nkọwa foto, Ndị nọ n'akụkụ Azumnini Azugwu, Assembly of God.
N’ebe elekere
asatọ nke n’ọkara, onye ntaakụkụ BBC n’Ebonyi mere njem gaa akụkụ steeti ahgụ dị
iche iche. Dịka o siri hụ, ndị ọrụ Inec apụtabeghị n’oge ahụ n’akụkụ ụfọdụ dịka
ụlọakwụkwọ Ebsu primary school ebe ha ndị ọrụ ha pụtakwara n’akụkụ ụka Azumnini
Azugwu, Assembly of God.
Inec kwuru
na ntulaika ga-amalite n’ebe elekere asatọ na ọkara nke ụtụtụ nke mere ndị mmadụ
jiri pụta na-echezi ha.
Ndị ọrụ Inec ka na-ahazi onwe ha maka ịtụ vootu n'Ikoyi, Legos
Ndị ọrụ Inec na ndị chọrọ ịtụ vootu awụchiela n'ụfọdụ polling unit dị n'Ikoyi Legọs steeti.
Ndị mmadụ malitere ile ma aha ha ọ dị n'akwụkwọ ndị ga-eso tụọ vootu ebe ahụ dịka ndị ọrụ Inec na-ahazi ụlọ ebe a ga-atụ vootu bụ 'cubicle'.
E nwere ụfọdụ ndị ọrụ Inec ka na-achọ ebe ha kwesịrị ịnọ kpọmkwem hazie ọrụ ntuliaka nke ha.
Aha onyonyo, Ndị mmadụ pụtara itu vootu n’akụkụ Abịa nakwa Imo na-eche ndị Inec
BBC Igbo emeela
njem gaa n’akụkụ Ugba nke Abịa steeti nakwa Owerre, Imo steeti mana ndị ọrụ
Inec abịabeghị.
Otu nwoke
onye okenya kwuru na obi adịghị ya mma n’ihi ha mara ụzọ pụta.
Lee ihe ndị
mmadụ nọ ebe na-ekwu n’ihe onyonyo a.
A na-eche ndị ọrụ Inec n’akụkụ Uyo dị iche iche
Nkọwa foto, Ndị pụtara n’akụkụ Etoi nke okpuruọchịchị Uyo
BBC emeela
njem gaa ọtụtụ akụkụ n’Uyo dịka a na-eche ndị ọrụ Inec ka ha pụta ọrụ ugbua.
Ndị pụtara
n’akụkụ Etoi nke okpuruọchịchị Uyo kwuru na obi adighị ha mma na ndị ọrụ Inec
abịbeghị n’ihi na ha mara ụzọ kemgbe ebe elekere isii nke ụtụtụ pụta maka ịtụ
vootu ha.
Inec kwuru
na a ga-amalite ntuliaka n’elekere asatọ, ndị mmadụ apụtala mana ndị ọrụ Inec
apụtabeghị ebe a.
Nkọwa foto, Ndị pụtara n’akụkụ Etoi nke okpuruọchịchị Uyo
Ndị ọrụ Inec erutebeghi n'ụfọdụ ebe a na-eme ntuliaka n'Enugwu
Ebe foto si, bbc
Aha onyonyo, Ndị ọrụ Inec erutebeghi n'ụfọdụ ebe a na-eme ntuliaka n'Enugwu
Na-agbanyeghi
na ntuliaka amalitela n’ụfọdụ ebe na Naịjirịa, ndị ọrụ Inec erutebeghi ụfọdụ
ebe dịka na polling units ndị dị na Nike Umunwene, Enugwu steeti n’ihe dịka elekere
itoolu nke ụtụtụ a (9:12am).
Mana ọtụtụ
ndị debanyerela aha ịtụ vootu nwere olileanya na ọnụnụ ọkụ n’obi ibinye aka n’akwụkwọ.
Nke a bụ dịka
onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ ebe ahụ si kọwaa.
Atiku Abubakar na-azọrọ PDP ọkwa apụtala tụọ vootu ya
Atiku Abubakar
na-azọrọ pati People’s Democratic Party (PDP) ọkwa onyeisiala Naijirịa 2023 awụchiela
ugbua n’ọgbo ntuliaka Ajiya 12 dị na Gwadabawa Wọọd, nke
Yola Nọt, Adamawa steeti.
E meela ya nnyocha dịka ọ na-atụ vootu nke ya ugbua.
Inec
amalitela ime ntuliaka ebe ahụ dịka ndị mmadụ
amalitela ịwuchi na ya bụ ọgbọ.
Ndị ọrụ nchekwa nọkwa nso n'ọrụ ha dịka ndị ntaakụkọ juru ebe niile ebe ahụ.
A malitere ịtụ
vootu n’akụụ ọgbọ ntuliaka 019, Wọọd nke abụọ n'Amantutu, nke Agulu Anambra
steeti. Ihe a bụ ebe a na-atụ anya na Peter Obi na-azọrọ Labour Party ọkwa
ga-atụ vootu ya taa.
Onye mbụ tụrụ vootu ya taa bụ nwoke okenya gbara afọ 81 dịka ọ mara ụzọ pụta ime ya bụ ihe.
Amalitebeghị ntuliaka n’ọgbọ ntuliaka a na-atụ anya na Bola Tinubu ga-atụ vootu ya
Nke a bụ
ogige ntuliaka nke Shoprite dị n'Ikeja, Legos steeti. A na-atu anya na Bola
Ahmed Tinubu ji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa onyeisiala Naijiria ga-atụ vootu ya.
Ntuliaka kwesịrị ibido n'elekere asatọ nke ụtụtụ. Kama dịka ọ sịrị dị ugbua,
ahubeghi ndị ọrụ Inec ebe a.
Ndị ntaakụkọ juru ebe niile dịka ndị mmadụ chọrọ ịtụ vootu na-agbakọta ugbua.
Oge Peter Obi pụtara zute ndị mmadụ gbakọrọ ikele ya
Ọha ndị mmadụ pụtara n'isi ụtụtụ taa bụ ụbọchị ntuliaka zute Peter Obi na-azọrọ Labour Party ọkwa onyeisiala.
N'obodo ya bụ Ama ntụtụ nke Agulu, ndị ntaakụkọ jupụtara dịka ọ kelere ha.
Lee ka ya bụ ihe siri gaa.
A malitela ikesa akụrụngwa ntuliaka n’Abor Mbaise, Imo steeti
Nkọwa foto, Akụrụngwa ntuliaka a na-ekesa n'Abor Mbaise, Imo steeti
Ndị ọrụ
Inec awụchiela n’akụkụ Abor Mbaise, Imo steeti dịka ha na-ekesa akụrụngwa ntuliaka.
Ndị ọrụ Inec ga-arụ n’ọgbọ ntuliaka dị iche iche awụchiela iburu ya bụ Akụrụngwa.
Ntuliaka
ga-amalite n’oge adịghị anya.
Inec awụchịela n’ọgbọ ntuliaka a na-atụ anya na Atiku Abubakar ga-atụ vootu
Nkọwa foto, Ọgbọ ntuliaka Ajiya 12 dị na Gwadabawa Wọọd, nke Yola Nọt, Adamawa steeti.
Ndị ụlọọrụ
Inec eburula nkụrụngwa ha wụchie n’ọgbo ntuliaka Ajiya 12 dị na Gwadabawa Wọọd,
nke Yola Nọt, Adamawa steeti.
Ihe a bụ
ebe a ana-atụ anya na Atiku Abubukar na-azọrọ People’s Democractic Party (PDP) ọkwa
onyeisiala ga-atụ vootu ya taa.
Onye bụbụ ụlọomeiwu
Naịjriịa bụ Awwal Tukur nọkwa ebe ahụ dịka o kwuru na kwa afọ, ọ na-anọ na ya bụ
ọgbọ atụ vootu.
O kwuru “Na
ntuliaka ndị ọzọ, ndị mmadụ ekwesila iju ebe a ugbua.” “Ahụghịkwa m ụmụnwaanyị ọbụla
ebe a”
Ọtụtụ ndị
ntaakụkọ juru ebe a dịka ndị obodo ahụ na-apụta ugbua isonye mee ntuliaka nke
taa.
Nkọwa foto, Onye bụbụ ụlọomeiwu Naịjriịa bụ Awwal Tukur
BBC Igbo nọ
ugbua n’ime ọgbọ ntuliaka nke Abayi Girls Secondary school.
Ọha ndị
mmadụ amalitela ịgbakọta maka atụmatụ ịtụ vootu ha ugbua.
A ga-amalite
ịtụ vootu n’elekere asatọ na ọkara nke ụtụtụ taa.
Ndị mmadụ amalitela ịpụta n’Ama ntụtụ, Agulu
Nkọwa foto, Ndị mmadụ apụtala ịtụ vootu
Ndị obodo ahụ amalitela ịpụta maka atụmatụ ịtụ vootu ha taa n'Ama ntụtụ, nke Agulu, Anambra steeti.
N’ọgbọ
ntuliaka ya bụ obodo, Peter Obi na-azọrọ Labour Party ọkwa awụchiela dịka ọtụtụ
ndị ntaakụkọ pụtara zute ya ma na-agba ya ajụjụ ọnụ.
Ọ fọrọ nkeji
30 ka amalite ntuliaka nke afọ a.
Nkọwa foto, Ndị ntaakụkụ apụtala ọrụ
A dịla njikere ikesa akụrụngwa ntuliaka n’isi ụlọọrụ Inec na Yaba
Ndị ọrụ nhazi
ntuliaka n’isi ụlọọrụ Inec na Yaba, Legọs steeti apụtala dịka ha kwuru na ha dị
njikere ikesa akụrụngwa.
Ndị ọrụ ngo
nakwa ndị na-efe ala nna ha otu afọ apụtakwala.
Nkọwa foto, Akụrụngwa ndị Inec
Ndị mmadụ apụtala n’ọgbọ ntuliaka ebe a na-atụ anya na Peter Obi ga-atụ vootu n’Agulu
Nkọwa foto, Nwoke pụtara ịtụ vootu ya n'Agulu
N’ọgbọ
ntuliaka nke Ama ntụtụ, Agulu, Anambra steeti bụ ebe a na-atụ anya na Peter Obi
na-azọrọ Labour Party ọkwa onyeisiala 2023 ga-atụ vootu ya taa, mmadụ abụọ awụchiela
ebe ahụ n’ebe elekere asaa nke ụtụtụ a dịka otu nwaamadị ebe ahụ kwuru na ụra
ekweghị tụọ ya n’ihi na echieche maka ntuliaka afọ a juru ya obi.
Otu n’ime mmadụ
abụọ a hụrụ ebe ahụ bụ nwoke okenya kwuru na ọ pụtara n’ihi ọ chọrọ ka ntuliaka
a gaa nke ọma ma mịtara Naịjriịa ezi mkpụrụ.