Peter Obi meriri mpaghara ndida n'ihi agbụrụ na okpukperechi - Ifeanyi Okowa

Onye zọrọ osote onyeisiala Naịjirịa na PDP bụ Ifeanyi Okowa ekwuola uche ya maka ntuliaka emere na Febụwarị.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. Inec gbalịrị ruo 80% na ntuliaka onyeisiala - Yakubu Maikyau, onyeisi NBA

    Yakubu Maikyau

    Ebe foto si, YCMaikyauSAN/Twitter

    Yakubu Maikyau, bụ onyeisioche otu jikọrọ ndị ọkaiwu na Naịjirịa a kpọrọ 'Nigeria Bar Association' ekwuola na ụlọọrụ nhazi ntuliaka bụ Inec gbalịrị nke ọma na ntuliaka ọkwa onyeisiala nke e mere n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị 2023.

    Maikyau kwuru nke a na mkparịtaụka ya ndị ntaakụkọ Channels, ma kọwaa na ọ bụrụ na ntuliaka ahụ bụ ule, "Inec nwetara ebe 78% maọbụ 80% nke bụ A".

    "Ọ bụ eziokwu na e nwere ụfọdụ mperi ndị ọrụ Inec riri n'ụbọchị ntuliaka ahụ, ọ bụkwa eziokwu na enwere ọdachi dị icheiche, mana ị tulee ya nke ọma, ị ga-ahụ na ya bụ ntuliaka gara nke ọma," Maikyau kwuru.

    "Nke a mere anyị ji enye Inec ndụmọdụ ka ha lebaa anya na ntuliaka nke gara aga, chọpụta ọdachi niile ha nwere nakwa ebe ha emetechaghị nke ọma, ma gbaa mbọ iji hụ na ihe ndị ahụ na-agazighị nke ọma agaghị emekwa ọzọ na ntuliaka nke ọkwa gọvanọ na ndị omeiwu steeti bụ nke a ga-enwe na Maachị 11."

  2. BVAS, IReV ga-arụrịrị ọrụ na ntuliaka ọkwa gọvanọ na Maachị 11 - Inec

  3. Abdullahi Sani Abacha nwa Sani Abacha anwụlọla

    Abdullahi Sani Abacha

    Ebe foto si, CaptJamyl/Twitter

    Nwa Sani Abacha bụ aka chịburu Naịjiria dịka onye agha aha ya bụ Abdullahi Sani Abacha anwụọla.

    Nke a na-eso ozi nwanne ya nwaanyị bụ Fatimah Gumsu Abacha-Buni ma bụrụkwa nwunye gọvanọ Yope steeti zipụtara n'akara Twitter ya nke kwuru na Abdullahi nwụrụ n'ụra.

  4. Nwaanyị gburu ụmụ ya ise enyela ikike ka e gbuo ya

    Genevieve Lhermitte na onye nchekwa

    Ebe foto si, AFP

    Nwaanyị mba Beljịụm gburu ụmụ ya anwụọla dịka ọ nyere ikike ka egbuo ya dịka afọ 16 gachara o gburu ụmụ ya.

    Genevieve Lhermitte gbara afọ 56 gburu nwa ya nwoke na ụmụ ya nwanyị anọ n'afọ 2007 dịka nna ha gara ọrụ.

    Ọ chọrọ igbu onwe ya mgbe o gbuchara ụmụ ya kama onweghị ike ya, nke a mere ka ọ kpọọ ndị ọrụ gbata gbata maka enyemaka.

    A tụrụ Lhermitte nga mkpụrụ ọka n'afọ 2008 kama a kpọrọ ya gaa n'ụlọ ndị nwere nsogbu ụbụrụisi n'afọ 2019.

    Dịka iwu mba Beljịụm siri dị, mmadụ nwereike isi ka e gbuo ya ma ọ bụrụ na ntaramahụhụ ọ na-ata karịrị ya nke metụtara uche ya. Nsogbu anụ ahụ esoghị na nke a.

    N'afọ 2022, mmadụ 2,9566 nyere ikike ka e gbuo ha na mba Beljịụm nke gosiri na o ji passentị 10% rịa elu karịa ọnụ ọgụgụ nke afọ 2021.

  5. 2023 Presidential Election: A ga- akagbuli ntuliaka Naijiria?

  6. Presidential Election Result: Steeti asaa gbaburu Tinubu akwụkwọ ewepụla ikpe n'ụlọikpe

    Bola Tinubu

    Ebe foto si, Sanwo-Olu/Twitter

    Steeti asaa wegaburu okwu n'Ụlọikpe si ka a kagbuo mpụtara ntuliaka Onyeisiala e mere n'abalị 25 nke Ọnwa Febụwarị afọ 2023, ewepụtala okwu ahụ n'ụlọikpe

    Steeti ndị ahụ bụ ebe otu PDP na-achị gụnyere Adamawa, Akwa Ibom,, Bayelsa, Delta,Edo ,Taraba na Sokoto n'ụlọikpe site n'aka Ọkaiwu Ukwu steeti gbaburu akwụkwọ n'Ụlọikpe Kachasị ha na-arịọ ka ụlọikpe ahụ kagbuo mpụtara ntuliaka Onyeisiala e mere maka ebubo mago mago.

    N'ozi ịgbama nke ọkaiwu ha bụ Mike Ozekhome, degara ụlọikpe , ọ sịrị, “Mata na ndị wetara ikpe a sị na ha achọghịzị ịga n'ihu n'akwụkwọ ha gbara ndị ha chọọ ka ha zara ọnụ ha.

    N'akwụkwọ ha gbaburu, steeti ndị ahụ sịrị na mkpọpụta Tinubu dịka onye meriri na ntuliaka ahụ agbasoghị Iwu Ntuliaka nke Naijirian nakwa Usoro Ntuliaka nke Inec wepụtara, ọkachasị iji igwe iREV nakwa BVAS ziga mpụtara ntuliaka nọbaozi Inec.

    Ha kwupụtakwara atụmuche na ya bụ ihe ga-ebute ọgbaghara.

  7. Igbo mma mmanụ o!

    Igbo mma mmanụ o!

    Onye biri,ibe ya biri!

    Ndụ mmiri,ndụ azụ!

  8. O nweghị mgbe m rituuru onye ọbụla n'ịzọ Gọvanọ n'Enugwu steeti - Frank Nweke

  9. Ụlọikpe Kachasị agbatiala oge mgbanwe ego ochie rue Disemba 31

  10. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mpụtara ntụliaka onyeisiala Naịjirịa

  11. Atiku Abubakar: Peter Obi chọọ ka anyị na ya kpaa maka njịkọ, ụzọ anyị ghee oghe

  12. 2023 Presidential Election: Anyị nwere ihe akaebe na Peter Obi meriri Ntuliaka 2023- Ohaneze

  13. Amerika ekelela Tinubu na mmeri ya

    Gọọmentị mba Amerịka ezigarala Bola Tinubu ozi ekele maka mmeri o meriri na ntuliaka 2023.

    Inec kpọpụtara Tinubu dịka onye meriri na ntuliaka 2023.

    N'ozi nke ọnụ na-ekwuru mba ahụ bụ Ned Price kwuru sị na ndọrịta ahụ na-egosi "oge ọhụrụ na ndọrọndọrọ ọchịchị Naijiria nakwa ọchịchị onyekwueucheya."

    Ned Price 's US Dept of State

    Ebe foto si, US Dept State

  14. Praim Minista mba UK ekelela Tinubu

    Rishi Sunak

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Rishi Sunak

    Praim Minista mba Briten Ekelela Bola Ahmed Tinubu nke APC maka mmeri ya na ntuliaka 2023.

    Inec nọọ n'ụzọ ụtụ Tuzde kpọpụtara Tinubu dịka onye meriri na ntuliaka Onyeisiala e mere ụbọchị Satọde abalị 27 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023.

    Rishi Sunak kwuru n'ozi o wepụtara na Twitter ya ụbọchị Wenezde na ya na-atụ anya na mmekọrịta Naijiria na mba Briten n'azụmahịa nakwa nchekwa ga-esiwanye ike.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  15. 2023 General Elections: Lee ndị ikuku 'Labour Party' kubara n'ọkwa Ụlọomeiwu Naịjirịa

  16. Ozi ndị ntorobịa nwere maka Onyeisiala ọhụrụ nke Naịjirịa

  17. Ebe dị icheiche ndị mmadụ na-arụ Inec aka na ntuliaka 2023

  18. Emume e jiri nye Bola Ahmed Tinubu asambodo díka onye meriri ntụliaka onyeisiala Naíjiría

    BVola Ahmed Tinubu

    Ebe foto si, Screengrab

    Dịka Iwu ngalaba na-ahụ maka ntụliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission bụ Inec n'ịchafụ siri dị, a na-enye onye meriri ntụliaka asambodo nke a kpọrọ Certificate of Return.

    Nke a na-eso dịka Bola Ahmed Tinubu merụrụ ntụliaka nke onyeisiala Naịjirịa nke e mere n'ụbọchị satọde bụ ụbọchị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023.

    Na mgbasaozi o jiri nabata ya bụ asambodo ka Tinubu kwuru sị, "N'oge adịghị anya, mba ka ahụta onye ntọroọbịa ji asambodo a, Anyị ga ahụta kwa nwaanyị jị asambodo a . . .ọkachasị ndị nroroọbịa, a ga m arụsị ọrụ ike iji hụ na Naịjirịa dị mma"

    Ọ gara n'ihu kwuo, " A ma m na ọtụtụ atụnyeghị ma obi adịghị ha mma n'ihi na onye nke ha akwụghị ebe m kwụ ugbua. A ghọtatra na iwe na ewe ụnụ a na m ebi ụnụ ọma dịka nwaane...Maka ndị na-akwadoghị m ekwela ka mpụtara ntụliaka a gbochie ihe anyị ga-erite n'ime ka Naịjirịa gaa n'ihu".

    O kwukwara sị, "Obi m na ụzọ m yere gị oye, ka anyị bido ịrụzị ala anyị nwayọ nwayọ. Ebe e nwere ụbịam ka anyị weta akụnụba na ọrụ, Ebe e nwere agụrụ ka anyị nye ndị mmadụ nrị ma chụpụ agụrụ, Ebe e nwere ụkọ ka anyị chọtakwa ụba, ebe e nwere mmekpahụ ka anyị were obi nwanne, ebe e nwere ọgbaaghara ka anyị weta udo...a ga m ahụta taa dịka ụbọchị anyị bịakọrọ ọnụ ịhụ na Naịjirịa ruru ogogo Chineke gwadoro ya".

  19. Na Akpọtụ Ugbu A, Anyị ga-agarịrị ụlọikpe - Yusuf Datti Baba Ahmed

    Onye zọrọ ọkwa osote onyeisiala n'aha otu Labour Party bụ Yusuf Datti Ahmed ekwuola na otu ya ga-agarịrị ụlọikpe ịweghachite mmeri ha kwenyere ha meriri na ntuliaka 2023.

    Ahmed kwuru nke a mgbe ọ na-aza ndị ntaakụkọ ajụjụ n'Abuja.

  20. Anwụchiela omeiwu Kano Steeti, Ado Doguwa, maka ebubo igbu ọchụ

    Alhassan Ado Doguwa

    Ebe foto si, Alhassan Ado Doguwa/Facebook

    Ndị uweojii Kano steeti anwụchiela onye ji ọkwa 'majority leader' n'ụlọ omeiwu 'House of Representatives' bụ Alhassan Ado Doguwa maka ebubo igbu mmadụ atọ.

    Doguwa onye na-anọchite anya mpaghara Doguwa/Tudun Wada nke Kano Steeti bụ onye pati 'All Progressives Congress'.

    Ndị uweojii kwuru na ha nwuchiri Doguwa n'ọdọ ụgbọelu Malam Aminu Kano.

    Akụkọ na-ekwu na Doguwa na ndị nkwado ya wakporo ụlọọrụ ndị Inec na mpaghara ya nke butere ọnwụ mmadụ isii.

    A na-ebokwa ebubo na ọ bụ ụjọ ka onye ọrụ Inec ji kpọpụta aha Doguwa dịka onye meriri ntuliaka ahụ, dịka a tụdoro ya egbe n'ihu.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Kano Steeti bụ Abdullahi Naruna Kiyawa gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ ezie na ha jichiri Doguwa.

    "Ee, anyị ejichie Alhassan Ado Doguwa n'okwu gbasara igbu ọchụ. Ọ nọ n'aka anyị ugbua dịka nnyocha ka na-aga n'ihu," ka Kiyawa kwuru.