Peter Obi meriri mpaghara ndida n'ihi agbụrụ na okpukperechi - Ifeanyi Okowa

Onye zọrọ osote onyeisiala Naịjirịa na PDP bụ Ifeanyi Okowa ekwuola uche ya maka ntuliaka emere na Febụwarị.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. Ihe Buhari kwere na nkwa, o mezuru ha?

  2. Bode George: Ndị na-agbasa ozi ịkpaoke agbụrụ gwa anyị ihe ha ga-eme ma ha banye ọchịchị Legọs

  3. Ụlọikpe enyela Inec ikike ịhazịgharị Bvas ha

    Ngwa Bvas ụlọọrụ Inec

    Ebe foto si, Imo new media/Facebook

    Ụlọikpe mkpegharị enyela ụlọọrụ nhazi ntuliaka Naịjirịa ndependent National Electoral Commission (Inec) ikike ihichapụ ozi na ihe ndị ọzọ nọ n’ime akụrụ Bvas ha jii mee ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị ụlọimeiwu Naịjirịa n’ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị 2023.

    Jọstịs James Abundaga mere mkpebia taa bụ Wenezde dịka Inec mere mkpesa ka ha nwee ike hịchapụ ozi nọ n’ime ngwa Bvas ha maka ntuliaka ọkwa gọvanọ na-abịa abịa n’ụbọchị Satọdee.

    Ụlọikpe kwuru na Inec ga-edebe ozi ndị niile nọ n'ime ngwa ha n'ọba ozi pụrụiche n'ịntanetị nke bụ 'server' ha tupu ha ehichaa ma hazigharị ngwa Bvas ha.

    Inec gara n'ihu kwee nkwa ịhụ na ozi ndị nọ n'ime ngwa Bvas ha agaghị efu maọbụ gbanwe ma ha mee ya bụ nhicha n'ihe ndị nọ n'ime ngwa Bvas ha dịka ha ga-echekwa ya n'ime 'Server' ha nke ọma.

    Ụlọikpe ahụ kụchapụrụ mkpesa Peter Obi nke Labour Party rịrịọ ka Inec ghara ime ya bụ nhicha dịka ha ya na ndị otu ya na-achọ inweta ikike imalite inyocha ihe ndị e ji mee ntulaika nke Satọdee ahụ.

    Cheta na Inec n'ụbọchị Wenezde nyekwara Peter Obi na Atiku Abubukar nke PDP ikike inyocha ihe ndị e ji mee ntuliaka dịka ha na-ekwu na usoro e ji mee ntuliaka ahụ ezighi ezi ebe ha na-ebokwa ebubo nrụrụaka n'ime ya.

    Ụlọikpe nyekwara Tinubu onye nwetere mmeri na ntuliaka ahụ ikike inyocha ihe ndị e ji mee ya bụ ntuliaka iji kwadobe onwe ya maka ikpe ndị nọ n'isi ya banyere mpụtara ntuliaka ahụ.

  4. Ụlọikpe mkpeghari enyela Tinubu ikike inyocha ihe ndị e ji mee ntuliaka 2023

    Bola Tinubu

    Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu/Facebook

    Ụlọikpe mkpeghari anabatala mkpesa Bola Ahmed Tinubu mere n’ụbọchị Tuzde ka enye ya ikike inyocha n’ime akwụkwọ nakwa ngwaọrụ ndị ọzọ e ji mee ntuliaka nke ụbọchị 25 n’ọnwa Febrụwarị, 2023.

    Ndị ọkaikpe mmadụ atọ nke Jọstịs Joseph Ikwegh nọ n’isi ikpe a nyere Tinubu onye nwetara mmeri na ntuliaka n’aha Pati APC ikike inyocha ma sete foto ihe ndị ji kwadobe onwe ha maka ikpe ndị ha na ya zọrọ ọkwa nwere megide nhọpụta ya na ntuliaka 2023 ịbụ onye ga-achị Naịjirịa.

    Cheta na Peter Obi nke LP na Atiku Abubakar nke PDP emekwala mkpesa nye ụlọikpe ka enye ha ohere inyocha ihe ndị e ji mee ntuliaka 2023, ya ikpe ka na-aga n’ihuugbua dịka Obi na ndị ọkaiwu ya nọ n’ụlọikpe mkpeghari nke Abuja.

    Ndị a buuru okwu a gaa ụlọikpe dịka ha na-ekwu na usoro Inec ji mee ntuliaka ahụ ezighi ezi ebe ha na-ebokwa ebubo nrụrụaka n'ihi etu ebubo Teknuzụ Inec siri ghara ịrụ ọrụ n'uju ụbọchị ntuliaka nakwa ihe ndị ọzọ.

    Ọkaiwu Inec kwuburu na ya bụ atụmatụ ga-emetụta ntuliaka ọkwa gọvanọ na-abịa na Satọdee mana ụlọikpe mkpegharị emebeghị mkpebi n'okwu a ugbua.

  5. Akere Market Fire: Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu enyela ndị ahịa Akere nde N100

  6. Ana m azọ ọkwa Gọvanọ ka m gbanwee ọnọdụ ndụ ndị Abia - Onyekwere A. Uche

  7. 'Aga m eso ndị ọkaiwu anyị gaa ụlọikpe taa' - Peter Obi

    Peter Obi

    Ebe foto si, Peter Obi/Twitter

    Onye zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'otu 'Labour Party' bụ Peter Obi ekwuola na ya ga-eso ndị ọkaiwu ya gaa ụlọikpe taa gbasara mkpesa ha na-eme ma nrụrụaka ha sị mere na ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'ụbọchị 25 nke Febrụwarị.

    Peter Obi kwuru nke a site n'akara Twitter ya dịka ọ kọwara ihe mere na ọ gaghị enweike ịga steeti dị icheiche ma kwadoo ndị otu Labour Party na-azọ ọkwa Gọvanọ na steeti ndị ahụ.

    "Taa ka m kwesịrị ịmalite njem nkwado maka ndị 'Labour Party' na-azọ ọkwa Gọvanọ na oche omeiwu na steeti dị icheiche. Njem a kwesịrị ibuga m Nasarawa, Legọs, Enugu, Abia, Delta, Edo, Rivers, Plateau, na Borno Steeti," Obi kwuru.

    "Mana dịka Inec jụrụ ikwe ka anyị nyochaa akụrụngwa ndị e ji mee ntuliaka onyeisiala n'ụbọchị 25 nke Febrụwarị (nke gụnyere BVAS), aga m eso ndị ọkaiwu anyị gaa ụlọikpe taa."

    Obi gwara ndị nkwado ya na steeti dị icheiche ka ha nyekwa ndị niile na-azọ ọkwa na Labour Party ụdị nkwado ha nyere ya na steeti dị icheiche.

    "Dịka m na-agba mbọ iweghachite mmeri anyị, ọ dị mkpa ka ndị ụnụ tụọrọ onye ọbụla ma ọrụ, nwee ezi agwa, dị ike ọrụ ma nwee obi ọmaiko vootu," Obi kwuru.

  8. Taa ka ụlọikpe mkpesa ga-ekpebi ikpe gbasara ihichapụ BVAS maka ntuliaka Maachị 11

    Onyeọrụ Inec ji igwe BVAS enyocha onye bịara ịtụ vootu

    Ụlọikpe mkpesa dị n'Abuja ga-anọ taa bụ Wenezde kpebie ma ha a ga-enye ụlọọrụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) ikike ịga n'ihu hichapụ ihe niile dị n'igwe Bimodal Voter Accreditation System, iji were ya rụọ ọrụ n'ụbọchị Satọde bụ ụbọchị 11 nke Maachị.

    Inec na-arịọ ka ụlọikpe nye ha ikike ime nke a ka ọ ghara igbochi ntuliaka nke ọkwa gọvanọ na ndị omeiwu steeti dị icheiche na Naịjirịa.

    N'ụbọchị Tuzde, Maachị 7, ka okwu ahụ pụtara n'ihu ndị ọkaikpe nke ụlọikpe mkpesa, dịka otu ndọrọndọrọ Peoples Democratic Party na Labour Party na-ekwu na Inec ekwesịghị ihichapụ BVAS ndị ahụ n'ihi na ọ bụ na ha ka ha ga-esi weta ihe akaebe ha ga-eji gosi na nrụrụaka dị na ntuliaka nke onyeisiala bụ nke e mere n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị.

    N'ikpe ahụ, ọkaiwu Onyechi Ikpeazu (SAN) nọchitere anya otu LP na onye zọọrọ ha ọkwa onyeisiala bụ Peter Obi, ebe Emeka Etiaba (SAN) nọchitere anya Abubakar Atiku na otu PDP.

    Mana Inec na-akọwa na ọ BVAS ndị ahụ ka ha kwesịrị iji mee ntuliaka ọkwa gọvanọ na ndị ụlọ omeiwu steeti dị icheiche n'ụbọchị Satọde na-abịanụ bụ Maachị 11.

    Tanimu Inuwa, bụ ọkaiwu Inec, gwara ụlọikpe ahụ sị: “Ọgbọ ntuliaka ọbụla nwere BVAS nke ya. BVAS Inec nwere dị 176,000. Anyị kwesịrị ihichapụ BVAS ndị a ma kwadebe ha maka ntuliaka ọzọ."

    "Anyị ekwela nkwa na onweghị ihe ọbụla dị na BVAS ugbua nke ga-efu efu n'ihi na anyị echekwaala ha na 'backend server' anyị."

    "Ọ bụrụ na e nye otu ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ a ohere inyocha BVAS ndị a ugbua, ọ ga-abụ ihe ndọghachi azụ na nkwado anyị na-eme maka ntuliaka nke na-abịanụ."

    Ndị ọkaikpe ụlọikpe mkpesa kwuru na ha ga-enye mkpebi ha n'okwu a taa bụ Wenezde, Maachị 8 2023.

  9. Ụtụtụ Ọma

    Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi.

    Daalụ maka isonyere anyị na mgbasaozi nke taa.

    N'ebe a ka ị ga-enweta akụkọ ọhụrụ niile ka na-apụta gbasara ntuliaka Naịjirịa nke afọ 2023.

  10. Tinubu na-achọ ka ụlọikpe nye ya ohere inyocha ihe ndị e ji mee ntuliaka ọkwa onyeisiala 2023

    Bola Tinubu

    Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu/Facebook

    Onye a họpụtara ịchị Naịjirịa bụ BolaTinubu amalitela ịchọ ka Ụlọikpe Mkpegharị nye iwu ha ọ nweta ikike ịhụ ngwaọrụ ndị Independent National Electoral Commission (Inec) ji mee ntuliaka nke ụbọchị 25 n’ọnwa Febrụwarị, 2023.

    Onye ọkaiwu ya bụ Akintola Makinde, kwuru na ọ ga-adị mkpa ka ọ nyochaa, ma nweeike sete foto ụfọdụ n'ime ihe ndị e ji mee ntuliaka ahụ ihe kwadobe onwe ya maka ikpe ụfọdụ na-adapụta bụ ndị chọrọ ka akagbuo mmeri Tinubu na ntuliaka ahụ.

    Makinde kwuru nke a n’ụbọchị Tuzde.

    Cheta na Inec kụchapụrụ ụfọdụ mkpesa ndị pati PDP na LP mere n’ụlọikpe pụrụiche nke Presidential Election Petition Court. Mkpesa ndị a gụnyere inye ha ohere ha ha nyocha ngwa ọrụ Bvas nke Inec nakwa arịọrịọ ka edobe ụfọdụ ngwaọrụ ndị ọzọ ma ghara ịkpa ya aka mana onye ọkaiwu Inec bụ , Tanimu Inuwa kwuru ka akụchapụ arịọrịọ ndị a dịka ọ kọwara na ime nke a ga-emetụta ntuliaka ọkwa gọvanọ na-abịa na Satọdee.

    Ọ gbakwụnyere na e nwere ọdọ ntuliaka ruru 176,000 e mere ntuliaka na Naịjirịa ma kwuo na ha niile nwere igwe BVAS nke ha pụrụiche nke bụ na ịtọkọta ma malite ihazi ha maka mkpesa ga-esiri ha ike ịhazi n'ime obere oge a.

  11. Ihe ọhụrụ dapụtara n'otu Labour Party na Rịvas steeti

    Ndị isi ọchịchị Labour Party na Rịvas steeti

    Ebe foto si, Allwell Ene

    Onyeisioche Labour party na Rivas bụ Julius Abure akụsaala otu ‘Labour Party State Executive Council’ maka ‘ịkpa agwaa megidere pati na nrụrụaka’.

    Ma gwaa ọha ka ha ghara ịge ozi si n’aka onye bụbụ onyeisioche pati ahụ Rịvas nti.

    Cheta na ozi pụtara na onye nọ n'isi otu ahụ na Rivas kwuru ka ndị Labour party gbakọta onye na-azọrọ pati ahụ ọkwa Gọvanọ na Rịvas bụ Beatrice Itubo azụ ma họrọ onye na-azọrọ Peoples Democratic Party (PDP) bụ Siminialayi Fubara dịka onye ga-azọrọ ha ya bụ ọkwa na steeti ahụ.

    Nke a na-abịa dịka a ga-eme ntuliaka ọkwa gọvanọ na Naịjirịa n’ụbọchị Satọde bụ ụbọchị 11 nke onwa Maachị 2023.

    Ozi Dienye Pepple kwuru nke a, dịka ọ kọwara na ya na ndị isi ọchịchị pati ahụ n’okpuruọchịchị dị iche iche ebe ahụ mere mkpebi ikwada ya bụ nwaada si akụkụ Rivers South-East Senatorial District. Ha gwakwara ndị nkwado a a na-akpọ ndị ‘ObIdents’ ka ha tụnyeee ndị na-azọrọ pati ahụ ọkwa ụlọomeiwu steeti vootu kwesịrị ha.

    Ha gara n’ihu kwuo na mkpebi ịkwado Sim Fubara dey so n’usoro nkwado etinyere ndị ebe a, e tinyere ndị ebe a, ime ihe ziri ezi nakwa ịkwado ikpe siri ezi bụ ihe mere ha jiri kwado onye zọọrọ patị ahụ ọkwa onyeisiala bụ Peter Obi.

  12. Ihe ndị dị mkpa merela kemgbe a họpụtara Bola Tinubu dịka onye ga-achị Naịjirịa

    Mgbe enyere Bola Tinubu asambodo ikike ọchịchị

    Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu/Facebook

    Nkọwa foto, Mgbe enyere Bola Tinubu asambodo ikike ọchịchị

    Dịka mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa e mere n’ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị 2023 ka na-akpata ọtụtụ okwu nke gụnyere ụfọdụ pati iburu mkpesa gawa ụlọikpe, ndị isi ọchịchị nakwa otu ndị nwere agba na mba ụwa dị iche iche etinyekwala ọnụ na ya bụ okwu.

    Independent National electoral Commission (Inec) kpọpụtara aha Bola Ahmed Tinubu nke APC dịka onye mmeri na ya bụ ntuliaka dịka o nwere vootu karịrị nde asatọ, enyela Tinubu asambodo ikike ọchịchị dịka a na-atụ anya na aga edu ya iyi ọrụ n’ụbọchị 29 nke ọnwa Mee, 2023.

    Nnara asambodo ikike ọchịchị (Certificate of return)

    Na okwu Tinubu kwuru dịka onye a họpụtara ịchị Naịjrịa, o kwere nkwa iwetere Naịjirịa udo, ịdịnaotu, na ọganịhu n’afọ ndị na-abịa abịa.

    O kwekwara nkwa ịbụ onye ndu ga na-ege ndị mmadụ ntị ma marakwa ihe ekwe na-akụ ma bụrụkwa onye ga-enyereaka kwalite akaraka na onyinye ọnatarachi dị n’ime ndị mba Naịjirịa.

    O zipụtakwara ozi nye ndị na-ekweghi nabata mmeri ya ma kwuo:

    “Ndị mụ na ha zọrọ okwa gụnyere Atiku bụbu osote onyeisiala Naịjirịa, Kwankwanso bụbu Gọvanọ, Obi bụbụkwa Gọvanọ, ana m enye unu aka dịka enyi na enyi. Anyị sọrọ mpị kporo ọkụ”

    “Ana m akwanyere unu ugwu ruru unun.”

    “Agbanyeghi na anyị sọrọ mpo n’oge ntuliakam unu abụghị ndị iro m. N’ime obi m, unu bu ụmụnne m.”

    Ndị isi ọchịchị mba ụwa zigaara Tinubu ozi ekele

    Ọtụtụ ndị isi ọchịchị si mba dị iche iche ezipụtala ozi ekele nye Bola Tinubu ma kwuo okwu ọma n’isi ya. Nke a gụnyere Ned Price bụ ọnụ na-ekwuru obi ọchịchị mba Amerịka dịka o kwuru na “asọmpị a kpụ ọkụ n’ọnụ gosiri oge ọhụrụ ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa”.

    Prince kwukwara na ọ ghọtara iwe ndị mmadụ nye ntuliaka ahụ ọkachasị n’okwu etu teknuzụ Inec si ghara ịrụ ọrụ nke ọma nakwa ihe ndị ọzọ mere ọtụtụ ji na-ekwu na nrụrụaka banyere n’usoro ntuliaka ahụ. O dọkwara Inec ọdụ ka ha hazịe nsogbu ndị a tupu ntuliaka ọkwa gọvanọ n’ụbọchị 11 ọnwa Maachị.

    Onyeisiala Ukraine bụ Voldymyr Zelensky, onyeisiala Ghana bụ Nana Akufo Addo nakwa ndị ala mba dị ọzọ dịka Niger Republic, Briten zipụtara ozi ekele nye Tinubu na mmeri ya.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Nkatọ nakwa ekweghi nabata mpụtara ntuliaka ahụ

    Atiku Abubakar zọrọ ọkwa onyeisiala n’aha PDP, zọrọ ọkwa ahụ n’aha Peter Obi, nakwa ndị ọchịchị ndị ọzọ jụrụ inabata mpụtara ntuliaka ahụ dịka ha boro ebubo nrụrụaka nakwa kwuo na usoro ya bụ ntuliaka ezighi ezi dịka Inec mere ihe na-abụghị ihe ha kwupụtara dịka usoro ha n’oge ngụkọ vootu.

    Atiku kwuru na ntuliaka ahụ bụ ‘nke kacha njọ kemgbe ndị agah nyefere ndị nkiti ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa”.

    Ndị pati ndị a ekwuola na ha ga-ebupụ okwu a ụlọikpe dịka iwu ntuliaka Naịjirịa si nye ohere. Ha kwukwara na ha ga-arụkọ ọrụ ọnụ n’ime nnyocha usoro ahụ.

    Atụmatụ ime ngagharịiwe

    Onyeisi oche PDP bụ yorchia Ayu na onye pati ahụ họpụtara dịka osote Atiku bụ Ifeanyi Okowa kwupụtrara atụmatụ ha ime ngaghariiwe na Mọnde, n’isi ụlọọrọ Inec n’Abuja iji gosi iwe ha maka etu ntuliaka ahụ siri gaa mana ọha ka na-atụ anya ima etu ya bu ihe siri gaa.

    Mgbe ndị otu EU wepụtara ozi mbụ ha banyere ntuliaka Naịjirịa 2023

    Ebe foto si, European Union in Nigeria/Facbeook

    Nkọwa foto, Mgbe ndị otu EU wepụtara ozi mbụ ha banyere ntuliaka Naịjirịa 2023

    Okwu otu ọchịchị ụwa kwuru

    Ndị ọrụ nlebanye n’usoro ntuliaka si mba Afrịka dịka otu Economic Community of West African States (Ecowas) nakwa Africa Union (AU) gwara ndị pati di iche iche ka ha kpezie okwu a n’udo.

    Ha rịọkwara ndị nkwado patị dị iche iche ka ha ghara igbasa ozi ndị nwereike ikpata ọgbaghara.

    Ozi agba mbụ nke otu European Union kwuru na usoro ntulaika ahụ ezighara ezi ma ghara igosi nkwụba aka ọtọ, dịka ha rụrụaka n’etu teknụzụ Inec si ghara ịrụ ọrụ.

    Ha kwukwara na ihe ndị dịka ụkọ mmanụ ụgbọala, ụka ego ọhụrụ narịa nakwa enweghi ezi nchekwa metụtara ya bụ ntuliaka.

  13. Etu Labour Party si nweta ndị omeiwu etiti karịrị 20 n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa

  14. "Aga m abụ onye odibo nye ndị Enugwu ma m bụrụ Gọvanọ" - Ụkọchukwu Obi-Ozoemena

  15. Efidi Jennifer gosiri ịka obi na nkwenye na Naijiria ọhụrụ- Peter Obi

    Peter Obi

    Ebe foto si, Peter Obi/Twitter

    Onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 n'aha otu 'Labour Party' bụ Peter Obi etoola otu nwaanyị ndị agboro sụkasịrị ụbọchị ntuliaka sị na o "gosiri ịka obi na nkwenye na Naijiria ọhụrụ".

    Ndị agboro sụkasịri Efidi Jennifer karama n'abalị 25 nke ọnwa Febụwarị dịka ha ji ngwaọgụ chụsaasịa ndị mmadụ pụtara ịtụ vootu n'ọgbọ atụmvootu na Surulere , Legọs.

    Efidi gbara isi akwara laghachite bịa tụọ vootu ya ka ọ natachara nleta maka ahụ o merụrụ.

    Obi kwuru nke a oge ọ gara leta nwaanyị n'ụlọ ya sịrị, "Jennifer so n'otu ndị kwụpụtara n'okwu ọchịchị onyekwuucheya na Naijiria".

    O kwuru na o ji Efidi na-eti ndị ọzọ gabigara ihe mgbu na oge ntuliaka ahụ aka n'obi.

    E nwere nsogbu mwakpo na mmmaja ndị pụtara ịtụ vootu n'ụfọdụ ebe na Legọs, Rịvas steeti nakwa Kogi ụbọchị ntuliaka 2023.

  16. Anyị nwere ihe akaebe na Peter Obi merriri ntuliaka 2023- Obaneze

    Akụkọ Ugha na Ohaneze

    Otu Ohaneze ekwuola na ha nwere ihe akaebe gosiri na ọ bụ nwa afọ bụ Peter Obi nke Labour Party bụ onye meriri na Ntuliaka Onyeisiala afọ 2023.

    Nkwụpụta nke otu a so akụkọ na-efegharị na soshal midia nke boro ebubo na Ohaneze sịrị n’ịbụ onyeisiala abụghị akalaka Peter Obi.

    Otu onye a kpọrọ 'Ambassador Tony' nọrọ n’ozi ekele nke ọ sị na ọ bụ n'aha otu Ohaneze Ndigbo zigaara Bola Tinubu nke APC maka mkpọpụta Inec kpọpụtara ya dị a onye meriri na ntuliaka e mere n’abalị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023, sị na akalaka obi abụghị ka ọ bụrụ onyeisiala ugbua.

    Mana Odeakwụkwọ Ukwu Ohaneze Ndịgbo bụ Ambassador Okey Emuchay gbarụrụ ihu na ya bụ ozi, sị na ndị ntaakụkọ na-ege onye abụghị onye otu ha nke ọ na-enwe ikike ikwuru otu Ohaneze ntị.

    Ohaneze na Peter Obi

    N’ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru Ohaneze bụ Alex Ogbonnaya binyere aka ma wepụta ụbọchị Monde, kwuru sị, “Anyị na agọpụ onwe anyị n’akụkọ sị na Peter Obi enweghị akalaka ịbụ onyeisiala, kama anyị nwere ihe akaebe doro anya na ọ bụ Peter Obi na Datti Ahmed meriri na ntuliaka onyeisiala e mere na Satode, abalị 25, afọ 2023.”

    “Obi dị Ohanaeze Ndigbo nnukwu ụtọ na ụdị mkpalite Obi-Datti ụmụafọ Naijiria nke dị nnukwu iche na ihe na-emebu.”

    Cheta na Inec kpọpụtara Bola Tinubu dịka onye meriri na ntuliaka 2023 mana Peter Obi nke Labour Party na Atiku Abubakar nke PDP kwuru na wuruwuru dị na ya dịka Inec agbasoghị usoro ha wepụtarara maka ntuliaka.

  17. Election 2023: Gini butere nsogbu n'etiti ndị ntorobịa na Peter Mbah nke PDP n'Enugwu?

  18. Enugu East Senatorial Election: Ụjọ ndụ m na-atụ m - Ada Ogbu

  19. 2023 Nigeria Elections: Ikpe udo, nchekwa, ndị ntorobia na ihe ndị cheere Onyeisiala ọhụrụ aka mgba

  20. Ntụliaka onyeisiala Naịjirịa ejughị ndị mmadụ afọ - Onye Nnọchiteanya Amerịka

    Mary Beth Leonard

    Ebe foto si, U.S. Mission Nigeria/Twitter

    Onye nnọchiteanya mba Amerịka na Naịjirịa bụ Mary Beth Leonard ekwuola na mpụtara ntụliaka onyeisiala Naịjirịa emere ejughị ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa afọ.

    N'akwụkwọ ozi ọ depụtara ka Leonard kwuru sị, " O doro mmadụ niile anya na ntụliaka nke e mere n'ụbọchị 25 ọnwa Febụwarị ejughị ndị Naịjirịa afọ".

    Ọ gara n'ihu kwuo sị, "N'ụbọchị ndị na-abịa, ọ ga-adị mma ka ndị Naịjirịa gbochie ihe ọbụla ka ebutere ha oke maka ọdịmma Naịjirịa, kama ha hapụ ka iwu Naịjirịa kpezie ihe gbasara ntụliaka a".

    Leonard ji ohere a gwa Inec ka ha hazie nsogbu ọbụla sitere na ntụliaka ahụ tupu ebido ntụliaka nke ụbọchị 11 ọnwa maachị.

    O kelekwara Peter Obi na Atiku Abubakar maka ịkweta iji usoro iwu Naịjirịa kpezie nsogbu ha ma Kele kwa Bola Ahmed Tinubu maka ịnabata ikike ha nwere ịga ụlọikpe.

    Cheta na e mere ntụliaka onyeisiala Naịjirịa n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023, nke Ngalaba Inec jiri kpọpụta Tinubu nke otu APC dịka onye meriri ya bụ ntụliaka.

    Agbanyeghị nke a ndị dịka Peter Obi nke Labour Party na Atiku Abubakar nke PDP ha na ya soro zọọ ya bụ ọkwa sị na ha anabataghị ya bụ mpụtara.