Peter Obi meriri mpaghara ndida n'ihi agbụrụ na okpukperechi - Ifeanyi Okowa

Onye zọrọ osote onyeisiala Naịjirịa na PDP bụ Ifeanyi Okowa ekwuola uche ya maka ntuliaka emere na Febụwarị.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. Peter Obi ekwuola kpọm kwem ihe nọ n’ime mkpesa o bugaara ụlọikpe

    Peter Obi

    Ebe foto si, Getty Images

    Onye zọọrọ Labour Partyọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 bụ Peter Obi ekwuola ihe mere o ji agba Inec akwụkwọ n’ụlọikpe.

    Na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ ntaakụkọ Arise TV nwere n’ụbọchị Mọnde, o kwuru na ọ bụghị mpụtara ntuliaka ahụ a ka ọ na-agbagha ka ọ bụ usoro e ji mee ntuliaka nke nyere Bola Ahmed Tinubu nke APC mmeri bụ ihe ọ na-eme mkpesa n’ụlọikpe banyere.

    O kwuru: “Anaghị ma gbagha onye ha kpọpụtara dịka onye mmeri, abụghị mpụtara ya ka m na-agbaghara kama ọ bụ usoro e mụtara mkpọpụta onye mmeri a bụ ihe m na-agbagha.”

    Ọ gara n’ihu kwuo na usoro mịtara mkpụrụ mmeri dị mkpa karịa mpụtara ya bụ ihe.

    Cheta na o kwubuola ihe dị etu a n’izu gara aga mgbe ya na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka, o kwuru:

    “Onye ọbụla chọrọ ịza aha ‘Execellency’ kwesịrị iji ụzọ ziri ezi nweta ya bụ ọkwa.”

    Cheta na otu Labour party bụ pati Peter Obi buuru mkpesa gaa ụlọikpe ma na-ekwu na usoro ntuliaka onnyeisiala e mere n’ụbochị 25 nke ọnwa Februwarị ezighi ezi.

    Ya bụ okwu ka na-aga n’ihu ugbua.

    Ụfọdụ ihe ndị ọzọ dị mkpa o kwuru na mkparịtaụka a nọ n'ime ebe a.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  2. Enweghi pati a ga-enye ohere itinyeanya n'ime ozi ndị nọ na Bvas - Inec

    Ngwa Bvas Inec

    Ụlọọrụ nhazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec n’ịchafụ ekwuola na enweghị pati ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọbụla a ga-enye ohere inyocha ime ngwaọrụ Bvas ha.

    Ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye kwuru nke a na ngwa TV ebe o kwuru hoo ha “Enweghị pati ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla ga-enweike nyoo ozi ndị nọ n'ime ngwa Bvas”

    Nke a na-abịa dịka ụlọịkpe nyere Inec ikike ihaziri ma hichapụ ozi ndị nọ n’ime ngwa Bvas ha iji kwadobe onwe ha maka ntuliaka ọkwa gọvanọ na-abịa bịa.

    Ụlọikpe nyekwara Inec iwu isete foto ma mụgharị ozi niile nọ n’ime ngwa Bvas ha ma zobe ya n’ime ọbaozi pụrụiche Bekeena-akpọ ‘Server’ tupu ha ịhịchapụ ha maka nkwado ntuliaka ọkwa gọvanọ 2023.

    Inec kwere ndị pati gbara ha akwụkwọ ikpe banyere mpụtara ntuliaka a na ọkọ agaghị akọ ozi ndị a dịka a na-ebufe ya aga ‘Server’ Inec.

    Ndị pati gbara Inec akwụkwọ maka etu ntuliaka aha si gaa gụnyere otu Labour Party (LP) na otu Peoples Democratic Party (PDP).

    Inec kpọpụtara aha Bola Ahmed Tinubu nke All Progressives Congress (APC) dịka onye nwetere mmeri na ntuliaka ahụ mana ụfọdụ ndị so ya zọọ ọkwa onyeisiala ekweyeghịrị mpụtara ya n’ihi na ha na-ekwu na Inec esoghi usoro ha depụtara maka ime ya bụ ntuliaka.

    N’okwu nhazi Bvas, Inec ekwuola na ha ga-emechapụ ya bụ ihe n’ụbọchị Tuzde, abalị 14 nke ọnwa Maachị dịka ha malitere ya n’izu gara aga.

    Inec yigharịrị ntuliaka ọkwa gọvanọ ha zuburu bụrụ ime n’ụbochị 11 nke Maachi gaa ụbọchị 18 Maachi n’ihi ọrụ nhazị Bvas.

    Cheta na Labour Party meburu mkpesa ka Inec ghara ime nhazi Bvas ha n’ihi ha chọrọ itinyeanya n’ime ozi ndị nọ n’ime ha ngwa ngwa mana Inec kwuru na ime nke a ga-emetụta ntuliaka gọvanọ.

  3. Ihe mere anyí ji tụga onyeisi na-ahụ maka ‘ICT’ ebe ọzọ tupu ntuliaka-Inec

    Festus Okoye

    Ebe foto si, Inec

    Nkọwa foto, Festus Okoye

    Ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka na Naijiria bụ Independent National Electoral Commission (INEC) ekwuolana ihe mere ha ji tụgaonyeisi ngalaba na-ahụ maka teknuzu(ICT)’ n’ụlọọrụ ha bụ Chidi Nwafor, n’ebe ọzọ ka ọ fọrọ ọnwa ole na ole tupu ntuliaka 2023 bụ n’ihiha chọrọ aka chara acha ebe a tụgara ya.

    Inec wepụrụ Chidi Nwafor bụbu daịretọ na-ahụ maka teknụzụ n’isi ụlọọrụ Inec dị n’Abuja n’Ọnwa Ọgọstụ, afọ 2022 tuga ya Enugwu ebe ha mere ya odeakwụkwọ na-ahụ maka nhazi Inec (Administrative Secretary.)

    Ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n’okwu na-akatọ Inec maka iwepụ Nwafor bụ onye e kwuru guzowere ngalaba teknuzu ahụ,si na ha ma ụma wepụ onye ọrụ ahụ were anya nke nyere ohere nsogbu teknụzụ dapụtara na ntuliaka e mere na nsonso a..

    Mana ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye kwuru na mkparịtaụka ya na Channels TV nwere na nsonso a na ọ bụghị otu a.

    O kwuru na ndị isi Inec ugbua haziri ya n’ụdị na ngalaba ọbụla abụghị, a hụghị otu onye ihe agaghị aga aga.

    Okoye sịrị, “Ọ(Chidi Nwafor ) bụ dairetọ n’Inec,e nwere ike ịtụga onye ọbụla bụ dairectọ ebe ọbụlaka ọ ga bụrụ odeakwụkwọ na-ahụ maka nhazi.”

    “Oge anyị haziri aha ndị odeakwụkwọ nhazi bụ oge Inec na-atụ uche ma anyị aga enwe kọmịshọ na-ahụ maka ntuliakanakwa oge a na-akwado ntuliaka.

    “ Ya mere Inec ji kpebie iziga ndị ọrụ anyị aka ha kachasị sie ike n’ọrụ steeti dị iche iche ịbụ odeakwụkwọ nhazi iji kwado steeti ndị a maka ntuliaka.”

    “Anyị nwere ngalaba na-ahụ maka teknuzu, Chidi gbalirị wulite ngalaba nwere ike ị kwụrụ onwe ya ma ọ nọ ya maọbụ na ọ nọghị ya., Etu a ka e si eme ya na ngalaba ndị ọzọ.”

    Cheta na ndị ọrụ Inec enweghị ohere izha mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere n'abalị 25 ọnwa Febụwarị afọ 2023 na-agbayeghị na usoro ụlọrụ ahụ tụpụtara tupu ntuliaka kwuru na a ga-esi na ọgbọ atumvootu ziga.

    Inec boro ndahie nsogbu teknuzu.

  4. 'Enweghi ihe anyị na-ezo ezo, anyị ga-enye unu akwụkwọ niile unu na-achọ' - Inec

    Mahmood Yakubu

    Ebe foto si, Inec

    Ụlọọrụ nhazị ntuliaka Naịjirịa bụ Indepedent National Electoral Commison (Inec) agwaala otu ndọrọndọrọ ochịchị Labour Party ka ha nọrọ jụụ na enweghị ihe ha bụ ndị Inec na-ezo ezo.

    Onyeisi ụlọọrụ a bụ Mahmood Yakubu kwuru nke a taa bụ Mọnde dịka ndị otu ikpe pati ahụ bịakwutere ya n’Abuja.

    O kwuru na ọ ga-enyefe ha akwụkwọ niile nọ n’isi ụlọọrụ ha bụ ihe ha na-achọ inyocha.

    Cheta na otu Labour party buuru mkpesa gaa ụlọikpe ma na-ekwu na usoro ntuliaka onnyeisiala e mere n’ụbochị 25 nke ọnwa Februwarị ezighi ezi.

    Ụlọikpe Election Petition Court nyere Labour party ikike inyocha akwụkwọ niile nakwa ihe ndị ọzọ e ji mee ya bụ ntuliaka dịka ha na-ekwu na nke a ga-abụ ihe ịgbaama n’okwu ikpe anakwa ebubo a na-ebo Inec.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  5. Aga m etinye mmepe Aba n'ọnọdụ 'State of Emergency' ma m bụrụ Gọvanọ - Gregory Ibe

  6. Enwetara m vootu karịrị 50% na Rivers ma ọ bụrụ na a gụọ vootu nke ọma - Peter Obi

  7. Ụtụtụ ọma

    Igbo ndị ọ ga-adịrị mma, ụnụ abọọla chi.

    Ka anyị malite mgbasaozi nke ụbọchị taa bụ abalị iri na atọ nke ọnwa Maachị afọ 2023.

    Taa bụ ahịa Eke dịka Igbo si agụ izu.

    Ya dịkwara gị mma dịka ị na-esonye anyị.

  8. Tinubu, ọchịchị APC na ndị meriri ntụliaka ụlọomeiwu ga-enwe nzụkọ n'ụbọchị 13 nke ọnwa Maachị

    Ndị otu pati APC

    Ebe foto si, APC Nigeria/Twitter

    Otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke All Progressives Congress (APC) na Bola Ahmed Tinubu bụ onye ahọpụtara dịka onyeisiala Naịjirịa, osote ya bụ Kashim Shettima na ndị meriri ntụliaka nke ụlọomeiwu n'ime pati APC.

    Ọ bụ n'ụbọchị mọnde nke bụ ụbọchị 13 nke ọnwa maachị afọ 2023 ka ha ga-enwe ya bụ nzụkọ n'obi onyeisiala Naịjirịa nke dị n'Abuja.

    A gwara ndị ga-eso na ya bụ nzụkọ ka ha jiri asambodo ngalaba na-ahụ maka ntụliaka bụ Inec nyere ha dịka ndị meriri ntụliaka mgbe ha na-abịa.

    Ya bụ nzụkọ ga-ebido n'elekere abụọ nke ehihe kama mgbasaozi ha mere kwuru ka ndị a kpọrọ oku a nọrọ ọdụ n'elkere 12 nke ehihe.

  9. Ụnụ abọọla chi

    Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nụ.

    Anyị abatala n'izuụka ọhụrụ.

    Ihe ọma meere anyị niile. Ka anyị malite mgbasaozi.

  10. Peter Obi: Ihe Wike sara Ohaneze oge ha gara ịjụ ya maka agwa a sị ọ kpara na Ntuliaka Onyeisiala

  11. Ụlọikpe ekwuola na Inec emegideghi iwu site n’iji aka dekọọ vootu a tụrụ na ntuliaka

    Ndị ọrụ Inec

    Ọkaikpe Emeka Nwite nke ụlọịkpe ukwu Abuja n’ụbọchị Fraịdee Fraịde kwuru na ọ bụ naanị ụlọọrụ Independent Electoral Commission (Inec) nwere ikike ikpebi usoro ịchịkọta na ibufe vootu ndị a tụrụ na ntuliaka.

    Na ikpe a, o kwuru na Inec nwere ikike ihazi etu ndị ọrụ ha ga-esi nyefee mpụtara ntuliaka si ọdọ ntuliaka dị iche iche, gụnyere ọnụọgụ kwesiri ịtụ nakwa ihe ndị ọzọ.

    Ọ gara n'ihu kwuo na iji aka na-achịkọta nakwa mee nyefe nchịtọka vootu si ọdọ ntuliaka n’oge ntuliaka ọkwa onyeisiala 2023 emegideghi usoro iwu ntuliaka ọhụrụ 2022.

    Okwu a so ikpe ndị otu Labour Party gbara Inec nke mkpesa ya na-ekwu na Inec enweghi ikike iji aka na-achịkọta nakwa na-ebufe vootu ndị mmadụ na ntuliaka dịka akara iwu ntuliaka ọhụrụ nke e ji dee ntuliaka a si nye ntuzịaka ya.

    Cheta na n’ikpe e wepụtara na Jenụwarị 23, 2023, Jọstịs Nwite kwuru na onye gbara akwụkwọ aghọtahiere ihe ndị dị n'iwu ahụ wee mechaa kụchapụ ya bụ iwu.

    Ọkaikpe Nwite kwuru na ngalaba iwu ntuliaka 2022 nke akụkụ akara 62(2) kwuru na a ga-edobe akwụkwọ ndekọ aha ndị turu vootu na ntuliaka n’ọbaozi pụrụiche nke teknụzụ site n'isi ụlọọrụ Inec.

  12. Etu ntuliaka e yigharịrị siri metụta atụmatụ agbakwọkwọ anyị n'ụzọ ọjọọ

    Akpa, nrị nakwa ihe ndị ọzọ ezinaụlọ nwaada nwaamadị a chọrọ ịlụ hazịchara iji mee njem tupu Inec akụsaa atụmatụ ha.
    Nkọwa foto, Akpa, nrị nakwa ihe ndị ọzọ ezinaụlọ nwaada nwaamadị a chọrọ ịlụ hazịchara iji mee njem tupu Inec akụsaa atụmatụ ha.

    Otu nwaamadị bi na Kano steeti akọwala etu nyighari ntuliaka ọkwa Gọvanọ Inec mere siri metụta ya na ezinaụlọ ya.

    Inec buuru ntuliaka e kwesịrị ime taa bụ Satọdee ụbọchị 11 nke ọnwa Maachi gaa ụbọchị 18 nke ọnwa Maachi n’ihi ọrụ nhazi ngwa ọrụ Bvas ha nakwa ọrụ nkwadobe ndị ọzọ maka ya bụ ntuliaka.

    Maazị Alhaji Shuaibu Idi Amin bi na Kano steeti kwuru:

    ‘Anyị ekeesala akwụkọ agbamakwụkwọ anyị nke ehibere ụbọchị 18 Maachị, obi adịghị m mma mana dịka ndị ‘Obident’ na-erubere gọọmentị isi, anyị ga-eme ihe kwesịịrị ime.’

    Dịka ọtụtụ ma, oge ntuliaka na Naịjirịa na-eme amachie ngagharị ndị mmadụ na Naịjirịa gburu gburu dịka a na-emechi ọdụ ụgbọelu niile nakwa ole ala Naịjirịa niile, nke na-eme ndị mmadụ anaghị ehibe emume ọbụla dị mkpa n’ụbọchị ahụ.

    Alhaji Shuaibu gwara BBC na ezinaụlọ ya bi na Bauchi steeti akwaodolari kemgbe ịbịa emume a ‘mana ugbua, amalitela m ịkpọ ha gwaa ha na ya bụ emume agaghị agazị n’ihu n’ihi Inec ehibela ntuliaka ụbọchị ahụ’.

    Ọtụtụ ekwuola na nyịgharị a Inec mere n’ụbọchị Tọọzde metụtara ha dịka ha hibere emume, njem nakwa ihe ndị ọzọ dị ha mkpa ụbọchị ahụ.

    Ya bụ ihe emetụtakwala ụmụakwụkwọ mahadum na Naịjirịa bụ ndị e meechiri ụlọakwụkwọ ha maka atụmatụ ntuliaka kemgbe ọnwa Febụwarị.

    Ka ọ dị ugbua, mahadum abụọ na Legọs eyigahrịala mmepe ụlọakwụkwọ ha ozọ bụ nke ha zubere imepee me emechapụ ntuliaka e kwesịrị ime taa bụ Satọdee.

    Mahadum Legọs nke Unilag na Lasu so na ndị ya bụ ihe metụtara.

    Inec kwuru na a ga-eji Bvas mee ngụkọ na nzipụ vootu mana ya bụ agaghị etu e siri chee n'ụbọchị ntuliaka ọkwa onyeisiala

    Ebe foto si, Imo state new media

    Nkọwa foto, Inec kwuru na a ga-eji Bvas mee ngụkọ na nzipụ vootu mana ya bụ agaghị etu e siri chee n'ụbọchị ntuliaka ọkwa onyeisiala

    Ihe mere Inec jiri yigharịa ntuliaka ọkwa Gọvanọ na ndị ụlọomeiwu steeti

    Ụlọọrụ nhazi ntuliaka Naịjirịa bụ Inec n’ịchafụ kwuru na ha mere mkpebi a dịka ụlọikpe nyere iwu banyere ngwa ọrụ Tenkụzụ Bvas ha ji mee ntuliaka ọkwa onyeisiala n’ụbọchị 25 nke ọnwa Maachị.

    Inec kwuru na ha chọrọ ime nke a ka ha nwee ike kwado ma jirikwa ya bụ ngwa Bvas mee ntuliaka ọkwa gọvanọ mana ụfọdụ ndị bu okwu na ha enwenyeghi mpụtara ntuliaka ahụ achọghị ka Inec mee nke a, ụlọikpe kụchapụrụ mkpesa ndị a ma nye iwu ka Inec hazịgharị ma hịchapụ ozi ndị nọ n’ime ngwa Bvas ha mana nyekwa iwu na ha ga-ezobe ozi ndị gụnyere vootu ndị mmadụ tụrụ n’ọdụ ntuliaka dị iche iche n’ime ọba ozi pụrụiche na ịntanetị a na-akpọ ‘Server’ na Bekee.

    Ndị buu okwu a gaa ụlọikpe gụnyere Peter Obi nke Labour Party (LP), Atiku Abubakar nke People’s Democractic Party (PDP) na ndị ọzọ sokwa zọọ ya bụ ọkwa onyeisiala bụ nke e mechara a họpụtara Bola Tinubu nke All Progressives Congress (APC) dịka onye mmeri.

    Mkpesa ndị a na-eme gụnyere ebubo na usoro ntuliaka ahụ agaghị n’ụzọ ziri ezi ọkachasị dịka Inec esoghị usoro ha kwupụtara iso na ya bụ ntuliaka nke gụnyere iji ngwa Bvas zipụ nchịkọta vootu ndị a tụrụ na ọdọ ntuliaka dị iche iche n’akụkụ Naịjirịa niile nakwa ịgba n’anwụ etu vootu ndị ahụ niiile si abata, ebe ha si, ọnụ ọgụgụ na ihe ndị ọzọ n’akụkụ ọba ozi ha a kpọrọ ‘Irev’.

    Inec kwuru n’oge ahụ na ha kwetere na ihe agaghị etu ha siri chebuo dịka ụfọdụ nsogbu teknụzụ metụtara ha mana ndị mmadụ ọkachasị ndị nso nso ndị a na-emerịghi, na-arụ Inec aka ebe ya bụ okwu nọ n’ụlọikpe ugbua.

    Inec kwuru na ha ga-eji ohere nyịgharị oge ntuliaka a hazịgharị ngwa Bvas ha ma kwadobe nke ọma ịhụ na ihe ndị cheere ha aka mgba na ntuliaka ọkwa onyeisiala anọchịghị ha ụzọ ọzọ.

  13. Frank Nweke Jnr: Nye m otu afọ, mmiri ga-agba n’Enugu

  14. Enugu auto-crash: Ọ bụ oke ọsọ butere ihe mberede okporoụzọ n'Enugwu Steeti - FRSC

  15. Africa Eye: 'Seychelles, ije mụ na ọgwụike heroin'

  16. Ihe ndị ahịa ha gbara ọkụ n'Ajegunle gwara BBC Igbo

  17. Anyị nụrụ na e nwere ndị chọrọ ibute tigbuo zogbuo n’ọwụwa anyanwu oge ntụliaka a

    Ndị Eze

    Nzụkọ ndị ọchịchị ọdịnala nke ọwụwa anyanwụ bụ Southeast Council of Traditioinal Rulers etiela mkpụ maka ebubo na e nwere ndị na-akpa antaka ha ga-eji bute ọgbaaghara ha ga-eji ghasaa ntụlika nke Gọvanọ na nke ndị omeiwu steeti n'ụbọchị 18 nke ọnwa maachị afọ 2023.

    Ọ bụ na mgbasaozi ha mere n'Enugwu steeti ka onyeisi nzụkọ ndị Eze a bụ Eze Ogbunechendo nke Ezema nọrọ kwuo nke a.

    Ndị Eze

    N'akwụkwọ ozi a ka ha kelere ndị ọwụwa anyanwụ maka etu ha siri gee ha ntị ma pụta n'igwe tụọ vootu ha ma kelee kwa ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị ọrụ nchekwa maka mbọ ha gbara iji hụ na ọ gara nke ọma.

    Ọ gara n'ihu sị, "Nke kacha mkpa bụ na anyị wetara ozi na e nwere ndị na-akpa nkata iji ọgbaaghara mebie ntụliaka nke a na-akwado ime maka ọkwa Gọvanọ na nke ndị omeiwu steeti".

    Ha ji ohere a rịọ ndị ntoroọbịa ka ha hapụ ikwe ka ndị omekome were ha kwara ngwa ọrụ.

    Ndị Eze
  18. Ụlọikpe enyela iwu ka ejichie Gerald Irona onye bụbu osote Gọvanọ Imo Steeti na mkpọrọ.

  19. Women in Politics: Ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị bara n'Ụlọmeiwu na Ntuliaka 2023 ọ na-agbada?

  20. Igbo mma mmanụ o!

    Igbo, mma mmanụ o!

    Ya gazie onye ukwu, gaziere onye nta!