Opekatampe mmadụ
175 nwere ọnọdụ ahụike na-emetụta ọbara bụ haemophilia butere ọrịa HIV na mba Briten.
Nke a mere n’ebe afọ
ndị 1980 dịka akwụkwọ na-egosi ihe mere n’oge gara nke BBC hụrụ siri kwuo.
Otu onye na ndị ezinaụlọ
ihe a metụtara gosiri ihe ịgbaama nye otu nnyocha e hibere maka okwu a dịka ndị
mmadụ na-ekwu na ihe bụ ihe ọdachị kacha njọ so ọrụ ọgwụgwọ ụlọọrụ National
Health Service (NHS) ruo ugbua.
O ruola ihe ruru afọ
36dịka Linda chọpụtyara na nwa ya butere
ọrịa ahụ n’ọnwa Ọktoba nke afọ 1986 mana ọ nwebeghị ike chefuo etu obi dị ya ụbọchị
ahụ.
A kpọbatara ya na nwa
ya dị naanị afọ 16 bụ Michael n’ime ngalaba na-enye ndị mmadụ ndụmọdụ n’ụlọọgwụ
Birmingham Children Hospital.
Mgbe Michael ka dị na
nwata a chọpụtara n’ọnwere ọnọdụ ahụike nke ọbara a na-akpọ haemophilia bụ
ọnọdụ na-eme ka ọbara mmadụ ghara ịkpọkụ n’ahụ mmadụ ngwa ngwa.
Linda kọwara na oku a
kpọrọ ya bụ iji hụ na e bupụrụ nwa ya bụga ya ụlọọgwụ Queen Elizabeth Hospital.
“Anyị amaghịdị ihe
na-eme dịka anyị mesapụrụ ahụ mgbe dọkịnta kwuru ‘nwa gị bụ ọrịa HIV’, o kwuru
ya ka ọ bụ nkata nkịtị. Okwu ya kụdara ime afọ m”
“Mgbe m banyere n’ime
ụgbọala, a gwara m di m ihe dọkịnta kwuru, anyị enweghị ike kwuo okwu ruo mgbe
anyị ruru ụlọ n’ime obi mmapụ so ya bụ ozi”
Ihe a bụ mgbe ụwa ka
na-amata maka ọrịa tupu gọọmentị amalite mgbasaozi maka ya na mba Briten.
Ihe bụ mgbe ịkpaoke maka
ọrịa a ka na-amụbawanye.
N’afọ 1985, ọtụtụ nne
na nna wepụrụ ụmụ ha n’ụlọakwụkwọ Hampshire dịka a chọpụtara na otu nwata
akwụkwọ ahụ onye nwekwara ọnọdụ ahụike nke ọbara bụ haemophilia bụtere ọrịa
HIV.
Michael achọghị ka ndị
ezinaụlọ ya na ndị enyi ya chọpụta na o butere ọrịa a.
Linda kọwara na o
mere nke a dịka ụzọ iji chekwa onwe ya.
Bido n’afọ 1970 ruo
afọ 1991, mmadụ 1,250 nwere ọnọdụ ọbara ahụ butere ọrịa HIV na mba
UK dịka ha natarachara ọgwụ ọgwụgwụ ọnọdụ ọbara ahụ bụ Factor VIII.
Nnyocha gosiri na ụmụaka
ruru 175 natara ọgwụ ahụ n’aka NHS.
Ọkara ndị butere ọrịa
ahụ nwụrụ n’site na ya tupu amalite mmepụya ọgwụ e ji adajụ ikike ọrịa a.
Mba UK si mba Amerịka
bubata ọgwụ Factor VIIIaghara
aghara mgbe ahụ.
E ji mgwọkọ ụfọdụ ihe
dị n’ime ọbara ndị mmadụ mee ya bụ ọgwụ nke bụ na ọ bụrụ na mmadụ bụ ọrịa HIV
were ya ọbara ya maka ọgwụ a, ndị mmadụ nwereike isi n’ime ya bute ya bụ ọrịa.
Mgbe a na-anata ndị
mmadụ onyinye ọbara ha, a natara ụfọdụ ndị a na-atụ anya ga-ebu ya bụ ọrịa nke
gụnyere ndị nọ n’ụlọ nga nakwa ndị na-eji ntụtụ agba ọgwụike.