You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ọ ka mma ka ụlọikpe kpezie esemokwu dapụtara na ntuliaka – Hope Uzodimma

Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo Steeti sị ka na-azọ ọkwa ṅụọ iyi iji ụlọikpe kpezie nhọtahie ọbụla pụtara na ntuliaka.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Iwu ọhụrụ gọọmentị Somalia nye ndị ntaakụkọ a ga-emetụta otu Al-Shabab nke ukwuu?

    Otu ndị agha nnupuisi nke alakụba bụ al-Shabab adọọla ndị ọrụ ntaakụkọ mba Somali aka na ntị ka ha ghara ige iwu ọhụrụ gọọmentị nyere ntị nke gbochiri ha itinye ozi ọbụla otu ahụ zipụtara n’akụkọ ha.

    Gọọmentị mba ahụ bipụtara nchịkọta aha websaịt otu ndị na-akwado ndị agha nnupụisi ahụ n’ụbọchị Satọdee ma nye ndị ọrụ nkesa intanetị iwu ka ha gbochie ha inwetazị ikike mgbasaozi.

    Ha gakwara n’ihu gbachịe soshial midia 40 na-agbasasi ozi nakwa echiche ndị si n’aka otu al-Shabab ma kwuo “Anyị ga-ewere mgbasaozi ọbụla gụnyere ozi ndị al-Shabab si n’aka ụlọọrụ ntaakụkọ ọbụla pụta dịka mpụ nakwa mmegide iwu ga-ebute ntaramahụhụ”

    Iji saa nke a, otu ahụ wepụtara ozi gwaa gọọmentị na ha na-agba mbọ ikpachị eziokwu.

    Ha gara n’ihu dọọ ndị ọrụ nkesa intanetị aka na ntị ka ha ghara ikpachị ikike ha ịgbasaozi.

    al-Shabab nwere ọtụtụ atụmatụ nakwa ngwa ọrụ mgbasaozi nke gụnyere ọtụtụ akara soshal midia.

    Ngalaba mgbasaozi ha na-ezipụta ọtụtụ ozi nke gụnyere ihe onyonyo, ederede nakwa ozi a na-ege na ntị iji mgbasaozi ihe otu a na-eme nakwa rabata ndị mmadụ ka ha sonye ha.

  2. Etu mmadụ 175 si bute ọrịa HIV na mba UK

    Opekatampe mmadụ 175 nwere ọnọdụ ahụike na-emetụta ọbara bụ haemophilia butere ọrịa HIV na mba Briten.

    Nke a mere n’ebe afọ ndị 1980 dịka akwụkwọ na-egosi ihe mere n’oge gara nke BBC hụrụ siri kwuo.

    Otu onye na ndị ezinaụlọ ihe a metụtara gosiri ihe ịgbaama nye otu nnyocha e hibere maka okwu a dịka ndị mmadụ na-ekwu na ihe bụ ihe ọdachị kacha njọ so ọrụ ọgwụgwọ ụlọọrụ National Health Service (NHS) ruo ugbua.

    O ruola ihe ruru afọ 36dịka Linda chọpụtyara na nwa ya butere ọrịa ahụ n’ọnwa Ọktoba nke afọ 1986 mana ọ nwebeghị ike chefuo etu obi dị ya ụbọchị ahụ.

    A kpọbatara ya na nwa ya dị naanị afọ 16 bụ Michael n’ime ngalaba na-enye ndị mmadụ ndụmọdụ n’ụlọọgwụ Birmingham Children Hospital.

    Mgbe Michael ka dị na nwata a chọpụtara n’ọnwere ọnọdụ ahụike nke ọbara a na-akpọ haemophilia bụ ọnọdụ na-eme ka ọbara mmadụ ghara ịkpọkụ n’ahụ mmadụ ngwa ngwa.

    Linda kọwara na oku a kpọrọ ya bụ iji hụ na e bupụrụ nwa ya bụga ya ụlọọgwụ Queen Elizabeth Hospital.

    “Anyị amaghịdị ihe na-eme dịka anyị mesapụrụ ahụ mgbe dọkịnta kwuru ‘nwa gị bụ ọrịa HIV’, o kwuru ya ka ọ bụ nkata nkịtị. Okwu ya kụdara ime afọ m”

    “Mgbe m banyere n’ime ụgbọala, a gwara m di m ihe dọkịnta kwuru, anyị enweghị ike kwuo okwu ruo mgbe anyị ruru ụlọ n’ime obi mmapụ so ya bụ ozi”

    Ihe a bụ mgbe ụwa ka na-amata maka ọrịa tupu gọọmentị amalite mgbasaozi maka ya na mba Briten.

    Ihe bụ mgbe ịkpaoke maka ọrịa a ka na-amụbawanye.

    N’afọ 1985, ọtụtụ nne na nna wepụrụ ụmụ ha n’ụlọakwụkwọ Hampshire dịka a chọpụtara na otu nwata akwụkwọ ahụ onye nwekwara ọnọdụ ahụike nke ọbara bụ haemophilia bụtere ọrịa HIV.

    Michael achọghị ka ndị ezinaụlọ ya na ndị enyi ya chọpụta na o butere ọrịa a.

    Linda kọwara na o mere nke a dịka ụzọ iji chekwa onwe ya.

    Bido n’afọ 1970 ruo afọ 1991, mmadụ 1,250 nwere ọnọdụ ọbara ahụ butere ọrịa HIV na mba UK dịka ha natarachara ọgwụ ọgwụgwụ ọnọdụ ọbara ahụ bụ Factor VIII.

    Nnyocha gosiri na ụmụaka ruru 175 natara ọgwụ ahụ n’aka NHS.

    Ọkara ndị butere ọrịa ahụ nwụrụ n’site na ya tupu amalite mmepụya ọgwụ e ji adajụ ikike ọrịa a.

    Mba UK si mba Amerịka bubata ọgwụ Factor VIIIaghara aghara mgbe ahụ.

    E ji mgwọkọ ụfọdụ ihe dị n’ime ọbara ndị mmadụ mee ya bụ ọgwụ nke bụ na ọ bụrụ na mmadụ bụ ọrịa HIV were ya ọbara ya maka ọgwụ a, ndị mmadụ nwereike isi n’ime ya bute ya bụ ọrịa.

    Mgbe a na-anata ndị mmadụ onyinye ọbara ha, a natara ụfọdụ ndị a na-atụ anya ga-ebu ya bụ ọrịa nke gụnyere ndị nọ n’ụlọ nga nakwa ndị na-eji ntụtụ agba ọgwụike.

  3. A ga-edu ọchị agha mba Chat nọ n’isi ọchịchị iyi ọrụ ọzọ ka ọ chịa ruo afọ abụọ ọzọ

    Aga edu ọchị agha mba Chad bụ Mahamat Déby iyi ọrụ taa bụ Mọnde dịka ọ ga-abụ onyeisiala nchere oge gaa n’iru ruo afọ abụọ ọzọ.

    Nke a so na mpụtara ọgbakọ emere maka ịhụ na e menyere mmadụ niile namba ahụ e mere n’izuụka gara aga.

    Ọtụtụ otu ndị na-anọghị n’ọchịchị, ụka Katọlịk nakwa ndị agha nnupụisi aka nọ n’ogbugbu nna Déby bụ Idriss Déby ekweghị sonye n’ọgbakọ ahụ.

    Mba Amerịka kwuru ha ga-enye mba ahụ ntaramahụhụ ma adọtia oge ọchịchị ya gaa n’ihu.

    Otu jịkọrọ mba Afrịka bụ African Union dọkwara mba ahụ aka na ntị ka ha ghara ime nke a mana ha gara n’ihu na ya bụ atụmatụ.

    Ọchị agha Mahamat onye ga-etozu isonye ntuliaka ndị na-abịa abịa kwuru na ọ ga-ehibe usoro ntuliaka ziri ezi, iwu ntuliaka ọhụrụ nakwa mgbanwe usoro ọchịchị n’ụzọ ọma.

    A na-eche na enweghị nkwekọrịta mmadụ niile jịkọ aka mee nwereike ikwanye ọkụ n’ọnọdụ ọgbaghara nọ n’etiti ọchịchị mba ahụ nakwa ụfọdụ ndị agha nnupuisi.

  4. Ọnweghị onye nwụrụ na Madonna Catholic Church idemmiri buturu n'ọgbaru

    Ozi ọzọ rụrụ BBC Aka na mgbede a bụ na idemmiri buturu ụlọ ụka Madonna Catholic Church dị n'Okpuruọchịchị Ọgbaru n'Anambra steeti n'ụtụtụ ụbọchị ụka.

    Akụkọ BBC nụrụ bụ na ụka ahụ dị na Iyiowa Odekpe dị n'ime ọgbarụ bụ ebe oke idemmiri riru ọtụtụ ụlọ ebe ahụ.

    Odeakwụkwọ Ogbaru Development Union bu Peter Ebeze kelere Chuklwu na ya bụ ụlọ adagbughị mmadụ dịka ụfọdụ akụkọ akwụkwọ buru.

  5. MC Oluomo emeerala Tinubu 'five million Man match' na Lagos

    Ọ kpọtụrụ akpọtụ na Lagọs taa mgbe Musiliu Akinsanya bụ onye a na-etu MC Oluoma na ndị nsonso ya mere ngaghị nkwado nye Bola Tinubu bụ onye ji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2022.

    A ma ya bụ nwaamadị dị ka onyeisi ndị Lagos State Parks and Garages management committee maọbụ onyeisi ndị agboro na Lagos.

    Ndị mmadụ dị ọtụtụ bu mmiri na ezo na-agagharị ebe ụfọdụ na Lagos iji gosi nkwado ha nye Bola Tinubu.

    Ya bụ njem malitere n'ọgbọ egwuregwu Taslim Balogun ruo Oshodi.

    Ọtụtụ ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ zuru n'ụzọ ịhụ na-enweghị ọgbaaghara mana e nwere kpachi kpachi n'ụzọ niile ha siri gaa, ọkachasị na okporoama Funsho Williams Avenue, Yaba - Ikorodu road ruo Surulere.

    Ndị egwu Yoruba ama ama bụ Sulaimon Adio, onye e ji Atawewe mara, nakwa Sulaimon Adekunle Alao, onye e ji Malaika mara sonyere ha igosi nkwado ha.

    Ndị uweojii gbochiri ndị mmadụ ịgba ụzọ ndị ahụ ha siri gaa nke mere ka ọtụtụ ndị ụgbọala gbaa ụzọ ọzọ.

    Mana ọdịghị otu a mgbe ndị Obidients mere nke Peter Obi.

  6. 'Ọkụ gbara na Balogun agbagbughị mmadị mana ọ mebiri ọtụtụ ihe' - LASEMA

    Akụkọ ọzọ na-ekwu na ọkụ gbara otu ụlọahịa na ahịa Balongun dị na Lagos. n'ụtụtụ Sọnde.

    Odeakwkwọ ndị Lagos State Emergency Management Authority,bụ Femi Oke-Osanyitolu, sị na ọnweghị onye nwụru na ya bụ ọkụ mana o mebiri ọtụtụ ihe.

    Ndí nọ ebe ya bụ ọkụ gbara sị na o bụ n'otu ụlọ ogogo anọ (Four storey building) dị na Martins Street ka ya bụ ọkụ malitere were chọo ịba ebe ndị ọzọ tupu ndị ọrụ ọkụ awakpo ya n'ike.

    Ndị akaebe ọzọ sị na ya bụ ọkụ malitere n'ogogo nke ikpeazụ n'elu bụ ebe ọ gbara akwa ndị ahịa gwogwo.

    Cheta na ọbụghị taa ka ogbe ahụ n'ọkụ mewere.

    Ọkụ agbabula ebe ahụ n'ọnwa Nọvemba nke 2019, 2022. 2021 nakwa na mbido afọ 2022.

    Ọnweghị ọkụ ndị a gara ghara ịgba ijeri ngwaahịa ndị mmadụ ọkụ.

    Ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ nke gọọmentị etiti, nke ndị Lagọs nakwa nke ndị UBA bụ ihe tikọrọ aka ọnụ gbanyụọ ya bụ ọkụ gbochie ya ka ọ ghara ịgbasa ebe ndị ọzọ.

  7. Anyị akwụghị shịshị wee gbapụta mmadụ 23 atọrọla n'ụgbọoloko - Gọọmentị Etiti

    Gọọmentị Etiti Naịjiria ekwuola na ha akwụghị shịshị n’isi mmadụ iri abụọ na atọ bụ ndị fọrọ na ndị esi n’ụgbọoloko si Abuja gawa Kaduna tọrọ n’ụbọchị 28 nke ọnwa Maachị afọ 2022.

    Mu'azu Jaji Sambo, bụ minista njem na Naịjiria, kwuru nke a ebe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n’Abuja n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Ọktoba.

    Ọ gwara ha na mmadụ iri abụọ na atọ ahụ alakwurula ezinaụlọ ha ka e nyochachara ahụike ha.

    Mu'azu kwuru na obi dị ha ụtọ na mmadụ 23 ahụ enwerela onwe ha, ma kọwaa na ihe dị mkpa bụ ịhụ na agbapụtara ndị ahụ na-akwụghị ụgwọ mgbapụta ọbụla, nke ọ sị na ha mezuru.

    Ọ gakwara n'ihu kwuo na a ga ha amalite imewe njem ụgbọoloko n'ụzọ Abuja-Kaduna ọzọ.

    Cheta na gọọmentị etiti kwuputere na mmadụ 23 ahụ fọrọ n'aka ndị ntọ nwerela onwe ha n'aka ndị oyiegwu Boko Haram n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọktoba 2022.

  8. Ị bọọla chi?

    Daalụ maka ịbịakwute anyị n'ụtụtụ a.

    Nọnyere anyị ebe a inweta akụkọ ndị dị mkpa taa.

    Nnọọ.

  9. WHO ekwuola na ọgwụ adịgboroja gburu ụmụaka 66 nwereike isi India

    Onyeisiala mba Gambia bụ Adama Barrow akwaala arịrị maka ọnwụ ụmụaka iri isii na isii bụ nke asị na ọgwụ adịgboroja gburu na mba ahụ.

    N'ihe ha, Barrow enyela iwu ka minista ahụike mba ahụ nyochaa ma megharịa iwu gbasara ibubata ogwu na mba ahụ.

    Ọ sịkwa na mba ahụ na-agbambọ ihiwe ụlọọrụ ga-ana anyocha ma na ahụ na ọgwụ ha na-aṅụ na mba hụ dị mma.

    Ọ sị na ike ya bụ ọgwụ adịgboroja na-akpa ebelatawala maka na ọ bụ naanị mmadụ abụọ ka achọpụtagoro o metutara n'izuụka abụọ gara ga.

    Ndị ọrụ ahụike niile nọ na mba ahụ nakwa ndị America Centres for Disease Control nakwa nke ndị India na-enyochakwa ka ya bụ mmir siri banye opi ụgbọghịrị.

    Ụlọọrụ WHO na-arụjerr ọgwụ akụrụ n'otu ụlọọrụ akpọrọ Maiden Pharmaceuticals dị na India dịka be ya bụ ajọ ọgwụ ga-esi pụta.

    Ha na adọ mba niile aka na ntị ka ha kee kwụcha gbaara ya bụ ọgwụ ọsọ.

  10. Etu e si chọta ụmụ Naịjirịa iri na otu zopuru n'ụgbọ mmiri ịga mba ofesi

    Ụlọọrụ Nigerian Immigration Service anabatala ndị Naịjiria iri na otu ndị otu ha na mba Liberia nwetara dịka ha zupuru n’ụgbọmmiri na-aga ofesi.

    A zọpụtara ụmụokorobịa a si Apapa dị na Legọs pụọ n’ụbọchị asaa nke ọnwa Septemba, n’ụgbọmmiri ahụ n’ụbọchị iri na otu nke ọnwa ahụ, dịka ndị na-arụ n’ụgbọmmiri ahụ tachara ha ahụhụ gburu mmadụ abụọ

  11. Goolu zoro ka mmiri n’asọmpi premier League a gbara taa bụ Satụde n’England.

    Chelsea ji ọkpụ goolu atọ asataghị ihe nyụọ Wolves ịkpagwụ ebe Manchester City jị ọkpụ anọ saa Southampton ahụ n’asọmpị Premier League agbara taa bụ Satọde.

    Onyeisi ndị Chelsea bụ Graham Potter jakwara Wolves ike ka ha sịrị gbalịa na ya bụ aasọmpị ọkacha mgbe a lọtara ezumike.

    Ọ jakwara onye egwu ha bụ Armando Broja maka goolu o nyere.

    N’otu aka ahụ, New castle United ji ọkpụ goolu ise a satara otu cheere Brentford ọji na be ha ebe Bournemouth Ji goolu abụọ asatara otu sị Leicester City ngaa jidere m.

    Onyeisi ndị Brentford bụ Thomas Frank sị na ọnweghị mgbe ya ji tụwa anya na a ga-eme ha ụdịrị ihe New Castle mere ha.

  12. Ụlọikpe na Lagos amaala otu nwaanyị onye Italy Ikpe afọ atọ maka ịzọ ụlọ mmadụ na Naịjirịa

    Uloikpe pụrụiche dị na Legọs atụọla otu nwaanyị onye Itali bụ Floriana De Stefani mkpọrọ afọ atọ maka ịzọrọ ụlọ onye o bi na be ya na Naịjrịa.

    Ụlọọrụ EFCC kpụpụrụ Stefani ụlọikpe n'afọ2019 maka ebubo ịkpụ asambodo iji nweghara ụlọ ahụ bụ ebe di ya bi ka di ya nwụchara.

    Ọkaikpe Mojisola Dada nwere mkpebia ka ọ lebechara anya na ebubo isii ụlọọrụ EFCCboro ya.

    Ọkaikpe Dada hụrụ na n'ezie na Stefani ji akwụkwọ adigboroja chọọ iwere ya bụ ụlọ mgbe di ya bụ Luca Signorelli nwụchara.

    Ọ bụ otu nwaanyị aha ya bụ Stella Ogboru na Stefani ka a kpupuru ụlọịkpe otu mgbe maka ebubo ise bụ nke ha mechere gbakwunyekwuo otu ọzọ mezuru ya isii.

    Ha mechakwara wepụ aha Stella na ya bụ ikpe tupu ekpebie ya bụ ikpe.

    A mara Stefani Ikpe ịrụ akwụkwọ adịgboroja, ịzu ụlọ mmadụ nakwa iji akwụkwọ adịgboroja maọbụ iji aghụghọ nwere ihe mmadụ.

    Ya bụ nwaanyị gawara ụlọikpe na ikpe dịghịrị ya bụ nke mere ikpe ya jizi gawa n'ihu.

    Ụlọikpe nyere iwu ka ha were ya bụ ụlọ nyeghachị ndị nwere ya bụ Waterside Properties Limited tupu ịzụụka atọ agacha.

    Ya bụ ụlọikpe nyekwara ohere ka Stefani were nde Naịra iri ise (N50,000,000) gbara onwe ya maọbụ gaa mkpọrọ.

  13. Jacob Zuma apụtala na mkpọrọ

    Jacob Zuma chịburu mba South Africa abụrụla onye nwerela onwe ya dịka o si n’ụlọmkpọrọ pụta n’ụbọchị Fraịde.

    Cheta na ụlọikpe tụrụ ya nga ọnwa iri na ise n'ọnwa Julaị 2021, maka ịlelị ụlọikpe anya dịka ọ jụrụ ịpụta gbaa akaebe n’ihu ụlọikpe maka mpụ na nrụrụaka.

    E mechara tọhapụ ya nwa mgbe nta (ọnwa abụọ) maka ịga lekọta ahụ ike ya ka ọnwa abụọ a tụrụ ya mkpọrọ gachara.

    N'ozi o ziputara n'ụbọchị Fraịde, Zuma kwuru sị "Amaghị m etu ụbọchị taa dị m adị...".

    Ọ gakwara n'ihu kelee ndị nkwado ya maka "ịkatọ ịtụ nga na-ezighi ezi".

    Cheta na Zuma chịrị mba Saụt Afrịka site n'afọ 2009 ruo 2018.

  14. Folasade Ogunsola: Ihe i kwesịrị ịma maka nwaanyị mbụ na-abụ onyeisi mahadum Unilag

    Mahadum ‘University of Lagos’ ahọpụtala nwaanyị mbụ ga-abụ onyeisi mahadum ahụ kemgbe afọ 60 e jiri hiwee mahadum ahụ n’abalị asaa nke ọnwa Oktoba afọ 2022.

    Folasade Ogunsola, onye bụ ọkammụta Microbiology ga-anọchi Ọkammụta Oluwatoyin Ogundipe, bụ onye oge ya ga-agwụ n’ọnwa Novemba afọ a.

    Ogunsola so na mmmadụ asaa ewepụtara aha ya maka ọrụ ahụ.

    Ozi mahadum ahụ wepụtara n'akara Facebook ha n' ụbọchị Fraide, ụlọakwụkwọ kwuru sị,"Ndị isi ọchịchị mahadum 'University of Lagos' ebinyela aka na nhọpụta ọkammụta Folasade Tolulope Ogunsola, dịka onyeisi nke 13 mahadum a."

    Ozi ahụ kwuru na Ogunsola ga-anọ n'ọkwa ahụ afọ ise.

    Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Ọkammụta Ogunsola

    Tupu a họpụta ya dịka onyeisi mahadum, Unilag, Ogunsola bụbu Osote Onyeisi mahadum ahụ na-ahụ maka mmelite 2017 na 2021.

    Agbara nwaanyị ahụ nna ya bụbu onyenkuzi mahadum 'University of Ibada'n gara mahadum mbụ ya na mahadum 'University of Ife', nke abụọ ya na mahadum 'University of Lagos', ebe o nwetara nzere ọgachaaọgwụ (PhD) na mahadum 'University of Wale'.

  15. Etu kọntena si dagide ụgbọala bu ndị njem n'Abia steeti

    Otu nnukwu kọntena dara ma dagide ụgbọala na-ebu mmadụ iri na asatọ, n’Aba, Abịa steeti, n’ụbọchị Fraịde.

    Ya bụ ihe mberede okporoụzọ mere na mpaghara Alaoji nke ụzọ Enugu-Aba-Pọtakọt.

    Amabeghi kpọmkwem ma e nwere ndị nwụrụ, mana ụfọdụ ndị a zọpụtarala n'ụgbọala ahụ natara ọgwụgwọ n'aka ndị ọrụ gbatagbata nke Abịa steeti.

    Ndị hụrụ ka ihe mere, kwuru na ọ bụ ọnọdụ ọjọọ ụzọ ahụ dị na ya butere ọdachi a.

    Ha ji ohere ahụ na-arịọ ka gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka ma ruzie ụzọ ahụ bụ okporoụzọ gọọmentị etiti kwesịrị ịhụ maka ya.

  16. Ales Bialaitski: Onye bụ nwaamadí a nwetere nturuugo "Nobel Peace Prize"?

    Ales Bialiatski bụ nwafọ Belarus so n'otu ndị na-ekwuchitere ndị enweghị nkwuwe okwu bụ onye e ji na mkpọrọ ma ghara ikpe ya ikpe.

    Mazị Bialiatski gbara afọ iri isii (60) bụ onye hiwere ụlọọrụ Viasna (Spring) Human Rights Centre mgbe gbọọmentị Belarus machịrị ndị mere ngagharịiwe n'afọ 1996 n'aka ọchịchị Alexander Lukashenko.

    Viasna nyeere ndị gọọmentị ahụ ji eji aka ha na ezinaụlọ ha ma na-edukwa aha ndị nille gọọmentị ahụ mejọrọ n'ụzọ ọbụla nke gụnyere ndị ndọrọndọrọ ọchcịhị esoghị n'ọchịchị bụ ndị na-agbagha gọọmentị etiti ha.

    "Ya bụ nwaadị etinyela ọtụtụ mgbe ndụ ya ịkwalite ọchịchị onye kwuo uche ya be ha" dịka onyeisi ndị kọmitii Nobel Prize ahụ bụ Berit Reiss-Andersen siri kwuo.

    Mazị Bialiatski apịchala afọ atọ na mkpọrọ maka ebubo ịgbalahụ ịtụ ụtụisi n'afọ 2011 bụ ke ọ sị na ya emeghị.

    A tọhapụrụ ya n'afọ 2014.

    Emechakwara nwuchie ya ọzọ n'afọ 2021 mgbe e mere nagharịiwe ọzọ ebe ha nke ihe butere ya bụ nruruaka ndị so zọọ ndọrọndọrọ ọchịchị sị na e mere bụ nke dowere Lukashenko n'ọchịchị ruo ugbua.

    Reiss-Andersen sị na ọ teela gọọmentị mba ahụ chọwara ịmechi Bialiatski ọnụ mana ọ kweghị.

  17. Nwaada Ukraine ritara nturuugo Nobel Peace Prize akpọọla oku ka e kpee Putin Ikpe ọchụ

    Otu onyeisi si ụlọọrụ Center for Civil Right Liberties nke mba Ukraine so na ndị e nyere nturuugo Nobel Peace Prize taa akpọọla oku ka e kpee onyeisiala mba Russia bụ Vladimir Putin ikpe ọchụ.

    N'ihe ọ dere na Facebook ya, Olexandra Matviychuk sị na " anyị kwesiri ihiwe ụlọikpe ga-ekpe Putin na Lukashenko nke Belarus ikpe ọchụ".

    Matviychuk sịkwa na obi dị ya ụtọ ịnata ya bụ nturuugo.

  18. Onye ndụmọdụ Onyeisiala Ukraine agbaruola ihu maka nturugó Nobel Prize e nyere ụlọọrụ Russia bụ ndị na-agbagha gọọmentí Russia okwu

    Onyendụmọdụ onyeisiala Ukraine bụ Volodymyr Zelensky na-ajụ ajụjụ gbasara otu ndị otu na-enye nturuugo Nobel Prize siri nweta mkpebi ha maka ịnye ụrọọrụ ndị Russia ama maka mgbagha okwu na Russia, Belarus nakwa Ukraine.

    "Ọnwere ihe ịrụbaama dị na nchọpụta ndị kọmitii a na-nye nturuugo Nobel Prize ebe ọ bụ na ọ bụ ụlọọrụ mba abụọ na-awakpo Ukraine ka e nyere ya bụ nturugo udo".- Mikhailo Podolyak

    Ọ bụ na Belarus ka Russia si nwakpo Ukraine mgbe mbụ agbanyeghị na ndị agha ha esoghị na ya.

  19. Ụlọikpe Mkpegharị enyela ASUU iwu malite ọrụ

    Ụlọikpe Mkpegharị dị n’Abuja enyela otu jikoro ndị nkuzi bụ Asuu ntuziaka ka ha malite ọrụ ozugbo.

    Nke a na-abịa dịka Asuu wetara akwụkwọ na-arịọ ka Ụlọikpe ahụ dota n’akụkụ iwu nke ụlọikpe pụrụ iche maka ndị ọrụbụ 'National Industrial Court', na Bekee nyere si ka ndị nkuzi ahụ laghachi bido ọrụ.

    Ụlọikpe Mkpegharịị nke ọkaiikpe Jọstis Hamman Barka (na ọkaikpe abụọ) nọ n’isi ya nyere ASUU ohere ịgbagha mkpebi nke ụlọikpe ndị ọrụ nyere ha mana si ha malitegodi ọrụ n’abalị asaa nke ọnwa Oktoba, afọ 2022 dịka ụlọikpe mbụ si nyebu ha iwu.

    Ụlọikpe Mkpegharị kwuru na ọ ga-ebu ha aka ikpe ya bụ ikpe ma ọ bụrụ na Asuu amaliteghị ọrụ.

    Cheta na ndị nkuzi mahadum gbara agbụbọọrụ kemgbe ọnwa Februwarị afọ 2022 n'ihi ọnọdụ ọrụ ha.

    Mana n'ọnwa gara aga, Gọọmentị Etiti kpụpụrụ ha ụlọikpe ndị ọrụ,rịọ ka ụlọikpe ahụ nye Asuu ntuziaka laghachi na klassi.

    N'ọnwa Septemba, ụlọikpe ndị ọrụ nyere iwu ahụ mana Asuu gara ụlọikpe Mkpeghari ịga gbaghaa ya bụ ntuziaka.

  20. Bandits attack: Mmiri eriela ụmụnwaanyị 18 na ụmụaka na-agba ọsọ ndụ

    Mmiri eriela o pekata mpe ụmụnwaanyị iri na asatọ na ụmụaka dịka ha na-agba ọsọ ndụ ịgbalahụ ndị omekome gbakporo obodo Birnin Wajje dị na mpaghara Bukkuyum, na Zamfara steeti.

    Mmadụ so n'ọtụtụ ndị mmadụ na-agba ọsọ dịka ndị bu egbe wakporo obodo ha gbagbuo mmadụ isii ma tọrọ mmadụ mmadụ asaa dịka ndị bi obodo ahụ si gwa BBC .

    Ndị mmiri riri nọ n'ụgbọmmiri abụọ tupu ụgbọ ha kpuo.

    Ndị onye obodo ahụ si gwaa BBC, ọ bụ ụda egbe tinyere ọgbaghara mere ka ụgbọmmiri ahụ kpuo.

    O kwukwara na ahụla ozu mmadụ 18 ma na-achọkwa ụfọdụ ndị mmadụ achọ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii gwara BBC na a wakporo obodo ma kwukwa n'ezie na mmiri riri ndị mmadụ mana o kwughị mmadụ ole.

    N'otu aka ahụ, ndị ntọ tọọrọ mmadụ 16 na obodo Dargaje dịkwa nso n'obodo ahụ.