You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ọ ka mma ka ụlọikpe kpezie esemokwu dapụtara na ntuliaka – Hope Uzodimma

Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo Steeti sị ka na-azọ ọkwa ṅụọ iyi iji ụlọikpe kpezie nhọtahie ọbụla pụtara na ntuliaka.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. BVAS: CUPP ebola APC ebubo ịwepụ onyeisioche Inec tupuu 2023

    Otu ndị pati anọghị n'ọchịchị na Naịjirịa kpọrọ onwe ha Coalition of United Political Parties (CUPP) etiela mkpu ọzọ na ndị otu APC chọrọ itinye aka enwe n'ofe ntuliaka 2023.

    Onyeisi ha bụ Ikenga Ugochinyere gwara ndị ntaakụkọ ụnyaahụ na ọ nwere ndị gọvanọ APC chọrọ ịme ka agbanwee ndị isi ọrụ n'Inec ndị na-esi ọnwụ n'akụrụngwa BVAS.

    Ndị otu ahụ na-ekwu na ụfọdụ ndị pati APC, ọkachasị Hope Uzodimma, Govanọ Imo steeti na-eme ihe ọbụla ha nwereike ịgba ntulịaka 2023 mgba okpuru.

    Cheta na Ugochinyere etibuola mkpu na ọnwere ndị gbara akwụkwọ n'ụlọikpe ka e wepụ akụrụngwa BVAS bụ nke webatara teknụzụ n'atụmvotu Naịjirịa.

    Kemgbe ahụ, otu APC azaghachikwala ha sị na ihe ahụ bụ okwu enweghị isi.

  2. Nato ga-enye Ukraine ngwa e ji egbochi ogbunigwe si Rọshịa

    Mba ndị nọ na Nato dịka Briten, Kanada, Fransi na Netherlands ekweela ngwa iji ngwagha ogbunuiigwe na nke na-enye nchekwa megide ogbunigwe akwado mba Yukren.

    Ha kwere nkwa nkwado a dịka mba 50 nọ na Nato nwreer Ọgbakọ na Brussel.

    Ka ọ dị ugbua, ngwa ọgụ nke si mba Jamanị erutela Yukren ugbua.

  3. Ụnụ asaala chi

    Igbo ndị ọma, ndeewonụ o!

    Soro anyị ebe maka akụkọ dị mkpa taa.

  4. Ọ bụ eziokwu na Gọvanọ Soludo sị ndị mmadụ kwụọ 100,000 maka ozi akwamozu?

    Akụkọ na-efegharị ebe niile na-ekwu na aka na-achị Anambra steeti bụ Gọvanọ Soludo nyere iwu ka ndị na-akwado ịkwa ozu kwụo 100,000 maọbụtụ na ha chọrọ ịweputa ozi akwamozu ezinaụlọ ha.

    Mana BBC ehiela asaa n'anya ma chọpụta nke bụ eziokwu maka ya bụ akụkọ.

    Mgbe BBC kpọtụrụ onyeisi nzipuozi n'Anambra steeti bụ Tony Odili Ujubuonu, ọ kọwapụtaara anyị okwu a nke ọma.

    O gosiri akwụkwọ ozi kọwara na ihe e ji mee nke a bụ n'ihi na ndị mmadụ ejiriala aka ha na-etinye akwụkwọ ozi maka ọnwụ nakwa akwamozu nakwa mmemme ndị ọzọ ebe ọ sọro ha n'akụkụ steeti ahụ niile.

    Ozi ahụ sị "ihe ndi a ndị mmadụ na-egosi ebe niile na-emechu steeti Anambra ihu ma na-ebutekwa nsogbu".

    N'ozi ahụ, Ujubuonu kwuru na ọ tụrụ anya na otu ndị obodo dị icheiche ga-akọwara ha na site n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba afọ a, ha ga-amalite ị na ndị mmadụ ụgwọ ozi ọ bụla ha tinyere.

    Lee ka ụgwọ ndị ahụ sị kwụrụ ugbua:

    Poster ndị 4X6 - N5000 izu abụọ

    Poster ndị 8x10 - N20,000 izu abụọ

    Poster karịrị 10ft - 100,000 otu ọnwa

    Poster nkịtị - 5,000 izu abụọ

    Mana ha kwukwara na ha agaghị a na ndị mmadụ ụgwọ maka ozi na-egosi etu ndị ọbịa na ndị nleta ga-esi garuo ebe ha na-aga.

    Gụọ ihe dị n'zo ahụ n'uju.

  5. Inec atufuola akwụkwọ atmvootu mmadụ 2.7 million maka ideba aha ugboro abụọ

    Onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahmoud Yakubu ekwuola na mpempe akwụkwọ voters card ọhụrụ ga-apụta na Nọvemba.

    Ọ sị na ha chọpụtara voters card nde abụọ na ụma asaa bụ ndị debere aha ha ugboro abụọ.

    Mahmoud kwuru nke a n'emume ndí National Endowment for Democracy mere n'isi obodo Ameríka bu Washington DC.

    Ọ sị na ihe ruru ọkara voter Card adịla njikere maka ndị nwe ha ịnwere ha.

    Ebe ahụ ka ọ nọkwa eti mkpu maka ọnọdọ nchekwa n'ụfọdụ ebe na Naịjirịa, na-ekwu na ọ ọbụ anya ka ha na-ele, ka ha na-aga n'ubi ka ji na-aka.

    "ọnọdụ nchekwa ugbua pụrụiche. Mgbe mbu ọnọdụ nchekwa bu naanị otu mpaghara ka ọ dị, mana ugbua ọgbasara ebe niile." ka Mahmoud kwuru. "Anya anyị dị na mpaghara Ọwnụwa anyanwụ ugwu nakwa ọnwụwa anyanwụ ndịda".

    Ọ maka ndị ọrụ anyị, ngwongwo anyị nakwa ndịbịara ịtụ vootu ka anyị na-eche maka ha.

    .

  6. Amerịka enyela Naịjirịa nka ọkpụ 23 ha zuuru mgbe gboo

    Mba Amerịka ebunyela Naijriịa nka ọkpụ (artefacts) ha zuuru mgbe mgboo.

    O ụnyaahụ bụ Tuzde ka ha bunyere ya onye nnọchite anya Naịjirịa na Washington DC.

    Mịnịsta mgbasaozi Naịjirịa bụ Lai Muhammed bụ onye jara mba Amerịka ike maka nke a sị na "nka ọkpụ ndị a dị oke mkpa maka ịkọwa akụkọ mgbe gboo ebe ha sị. Ekwesighị ịnapụ ndị mmadụ akaọrụ nna ha oche.Maka ya ka obi ji dị anyị ụtọ maka nka ọkpụ nke atụrụ na Benin".

    Muhammed sị na e sị na Smithsonia bute nka ọkpụ iri abụọ na otu (21), ebe otu sị National Gallery of Arts, nke ọzọ si Rhode Isand School of Design."

    Nka ọkpụ a ebulatara so na nkwekọrịta Amerịka na Naịjriịa nwere gbasara nkwusi iji ụzọ aghụghọ ezubata nka ọkpụ si Naịjirịa n'ime Amerịka.

    Odeakwụkwọ Smithsonian bụ Lonnie G. Bunch III sị na obi dị ha ụtọ maka inyemaka ha n'ime ka nka ọkpụ ndị a rute Naịjria aka.

    Nka ọkpụ ndị a so na puku kwuru puku nka ọkpụ maọbụ arụsị ndị Briten zuuru na Benin dị na Naịjirịa n'afọ 1897.

    Ebe ahụ ka sizi kesaa ya ọtụtụ ebe na Briten na Amerịka.

    Naịjirịa ka na-enweta ọtụtụ nka ọkpụ ndị a site n'aka ndị Netherlands, University of Aberdeen dị na Scotland, Mexico, University of Cambridge dị n'United Kingdom nakwa Germany.

    Naịjirịa sị na ha ga-eme ihe ngosi ga-eme ka ndị mbaụwa mata ebe ya nka ọkpụ si mgbe adịghị anya.

  7. Unu asaala chi e!Udo diri anyị niile taa bụ Eke. Eke biko ketere anyị ihe ọma oo!

  8. Etu nchopụta okporo mmanụ agbịdị adịgboroja si akpata ọtụtụ okwu na Naịjirịa

    Iwe ejula ọtụtụ obi na Naịjirịa dịka achọpụtara okporo mmanụ agbadị a sị na-ezufu mmanụ kemgbe ihe karịrị afọ itolu bụ okporo mmanụ ehibere nke iwu Naịjirịa akwadoghị.

    Ụlọọrụ gọọmentị na-ahụ maka mmanụ agbịdị bụ NNPCL kwuru na ha nyochapụtara okporo a toro ogologo ruo kilomịta anọ banyere n’ime oke osirimiri dịka ha malitere atụmatụ ikpachi nzufu mmanụ agbidị n’akụkụ Delta.

    Ekwubeghị m anwụchiela ndị nọn’iri nzufu a ma anwụchibeghị ha.

    Enwebeghị onye ma ibu mmanụ agbidi ndị e zufurula ugbua.

    N’oge gara aga, gọọmentị Naịjirịa ekwuola na a na-ezufu udu mmanụ agbịdị ruru 600,000 bareelụ kwa ụbọchị nke bụ pasentị 30 a na-emepụta.

    Nfuzu mmanụ agbịdị n’akụkụ Niger Delta Naịjirịa abụghị ihe ọhụrụ mana nzufu nke a bụ nke e ji okporo mmanụ mee bụ ihe ọhụrụ ma gosikwa na ndị ohi ahụ chepụtara echiche ọhụrụ n’ọrụ ha.

    Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mmanụ agbịdị na Naịjirịa bụ Mele Kyari ekwuola na ihibe usoro nchekwa ọhụrụ ha mere na amịta mkpụrụ ugbua.

    Mana ọtụtụ Naịjirịa na-egosi iwe ha na soshal midia na-ajụ ihe mere okporo mmanụ ehibere kemgbe afo ole m ole gara aga jiri nweeike rụọ ọrụ ruo afọ ndị a niile ma aghara inyochapụta ya ruo ugbua.

  9. Nyesom Wike ahọpụtala ndị ndụmọdụ mmadụ 14,000 ọhụrụ

    Gọvanọ Nyesom Wike nke Rịvas steeti ahọpụtla ndị ndụmọdụ mmadụ 14,000 ga-ahụ maka ọtụtụ ngalaba na steeti ahụ.

    Nke a dị n’ozi ọnụ na-ekwuru ya bụ Kelvin Ebiri zipụtara ebe ọ kọwara na ndị a ga-ahụ na eweteere steeti ahụ ọtụtụ echiche ọhụrụ.

    Ndị a aga-amalịte ọrụ ngwa ngwa dịka Ebiri siri dee.

    Cheta na oge ọchịchị Wike ga-ebe n’ọnwa Mee 2023 ma emechapụ ntuliaka dịka ọ ga-achịzu afọ asatọ ya ebe ahụ.

  10. A na-achọ otu nwoke a sị zufuru ego otu ụlọụka achọ na Kenya

    A na-achọ otu onyeisi ụka na Kenya achọ maka ebubo izufu ego karịrị dọla puku iri na abụọ atụkọrọ maka mwulite ụlọuka ACK All Saints Mountain View ndị n'akụkụ Kangemi na mba ahụ.

    Ndị isi ụka ahụ kọwara na ọ tụrụ ha n'ọnụ na mgbe ha banyere n'ebe a na-ebede ego n'ụka ahụ na akụsasiala ya ma wepụ ego ahụ n'ụbọchị Mọnde.

    Ndị uweojii kwuru na a na-eche na nwoke ahụ mere nke a maka etu e siri mebie ihe na-esete onyonyo n’ụka ahụ, bụ nke ọ na-elekọta, tupu ya bụ ego efuo.

  11. Ndị uweojii Legọs steeti anwụchiela Harrysong

    Ndị uweojii Legọs steeti anwụchiela otiegwu Harrison Tare Okiri nke a ma dịka Harrysongs n’ihi akwụkwọ mkpesa onye bụbu onye nlekọta ya bụ Soso Soberekon, wetere ha maka okwu ntetọ aha ya.

    Soso Soberekon onye bụbu onye nlekọta Harrysong n’ụlọọrụ five star music mere nke a ebubo Harrysongs boro ebubo ya n'otu mkparịtaụka o nwere nso nso a na ya bụ Soso zitere ndị nwara igbu ya n’oge gara aga na Rivas steeti.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs steeti bụ Benjamin Hundeyin gbara ama nke a ma kwuo na anwụchiri ya n’ọdụ ụgbọelu nke Legọs steeti dịka o si mba Amerịka tụọ ụkwụ na Legọs.

  12. Onyeisiala Buhari enyela ndị Naịjrịa karịrị 400 nturuugo pụrụiche gụnyere Ngozi Okonjo-Iweala, Chimamanda Adichie na ndị ọzọ

    Onyeisiala Buhari enyela mmadụ Naịjirịa karịrị 400 nturuugo pụrụiche gụnyere Ngozi Okonjo-Iweala, Chimamanda Adichie na ndị ọzọ

    Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela ndị Naịjirịa mmadụ 449 nturuugo pụrụiche taa bụ ụbọchị Tuzde n’Abuja.

    Nkwanye ugwu a bụ maka ọrụ ọma nakwa etu ha si akwalite aha Naịjiria n’ụzọ ọma.

    Osote onyeisiala Yemi Osinbanjo na onyeisi ọrụ Naịjirịa bụ Ibrahim Gambari so bịa emume a.

    Ụfọdụ ndị e nyere nturuugo a bụ Abba Kyari (nke larala mmụọ), Gọv. Rotimi Akeredolu, Ngozi Okonjo-Iweala, Ishaq Oloyede, Chimamanda Adichie, Babatunde Fashola, Gọv Ifeanyi Okowa na ndị ọzọ.

  13. Ndị agha Naịjiria egbuola ndị ojiegbe ruru 30 na onyeisi ndị ntọ na Kaduna

    Ndị agha Naịjirịa ekwuola na ha gburu ndị ojiegbe mmadụ 30 nke gụnyere onyeisi oru ndị ntọ n’akụkụ Kaduna steeti. N’ozi ha zipụtara ndị agha elu Naịjirịa kwuru na ọ bụ ogbunigwe ha tụrụ tugburu ndị ma gbuo nwoke ahụ a na-akpọ Ali Dogo Yellow.

    Ha kwuru na ndị a si Niger steeti gbaba akụkụ Giwa nke Kaduna ahụ dịka ndị agha siiri imi n’ala sipụta ụlọ ha zoro n’ime ya ma tụọ ogbunigwe ebe ahụ. Ọnụ na-ekwuru ndị agha elu Naịjirịa bụ Edward Gabkwet kọwara na tugbukwara ụfọdụ ndị otu ojiegbe ndị ọzọ na-atọ ndị mmadụ n’akụkụ Mando nke steeti ahụ na ngwụcha izu gara aga mana amabeghị ọnụ ọgụgụ ndị a ugbua.

    Cheta na ndị ojiegbe na-atọ ma na-egbu ndị mmadụ aghara agahra dịka ha na-ana ezinụlọ ndị a tọrọ ego mgbapụta na mpaghara ugwu Naịjirịa nke gụnyere Kaduna steeti.

    Iweghachite ezi nchekwa n’akụkụ Naịjirịa dị icheiche ga-eso n’okwu ndị mmadụ ga-achọ ina n’aka onye ọbụla ga-anọchite Onyeisiala Muhammadu Buhari na ntuliaka 2023 dịka ọtụtụ na-akatọ onyeisiala Buhari na ọ gbaghị mbọ nke ọma ibuso ndị ojiegbe ndị a na ndị ntọ agha etu ọ kwesịrị. Na nso nso a atụmatụ ndị agha Naịjirịa na-amịta mkpụrụ n’ibuso ndị otu ndị a agha.

  14. Ndị agha mmiri Naịjirịa agbaala ụgbọ bu mmanụ agbịdị ezpuru ọkụ na Warri

    Ndị agha mmiri Naịjirịa nakwa ndịọrụ nchekwa agbaala ụgbọmmiri ha jidere na mpaghara mmiri Niger Delta ọkụ.

    Ha mere nke a n’ihi na o bu mmanụ agbịdị e zupuru ezupu dịka onyeisi ụgbọ ahụ si kwuo mgbe agbara ya ajụjụọnụ.

    Anwụchiri onyeisi ụgbọ ahụ nakwa mmadụ asaa ọzọ na-arụ ọrụ n'elu ya n'ụbọchị isii nke Ọktoba izu gara aga.

    Mana onyeisi ụgbọ ahụ aha ya bụ Temple Manasseh kwuru na ọ bụghị ya zupuru ya bụ mmadụ agbịdị kama na ụfọdụ ụmụnwoke jichiri ya manye ya ya buru ya bu mmanụ achọtara n'ụgbọ ya.

  15. Amalitela ikpe Nọọsụ gburu ụmụaka ọhụrụ asaa ikpe n'ụlọikpe

    Amalitela ikpe otu Nọọsụ akpọrọ Lucy Letby nke ndị gọọmentị mba Briten na-ebo ebubo igbu nwa ọhụrụ asaa n'ụlọọgwụ ebe ọ na-arụ.

    A na-ebo Letby ebubo ịgbanye ikuku n'ime ọbara nwa ọhụrụ nakwa ịgbanye ọgwụ 'Insulin' n'ahụ nwa ọhụrụ ndị ahụ.

    Onye nọchitere anya gọọmentị n'ụlọikpe Manchester bụ ebe a na-ekpe ikpe ahụ kwuru na nyocha gosiri na n'ime ọnwa iri na asatọ ọnwụ nwa ọhụrụ ndị a mụrụ n'ụlọọgwụ ahụ rịrị elu.

    Ha kwukwara na mgbe Letby na-arụ n'abalị, ụmụaka na-anwụ n'abalị mana mgbe e buru ya gaa ọrụ ụtụtụ, ụmụaka malitekwa na-anwụ n'ụtụtụ.

    Ọnwụ ndị ahụ bidoro ịchekasị ndị isi n'ụlọọgwụ ahụ nke mere ka ha malite nnyocha banyere ya.

    Nọọsụ Lucy Letby n'onwe ya agọọla ebubo igbu ọchụ niile e boro ya.

  16. Anyị nwere olileanya na abụbụọrụ a ga-ebi n'oge adịghị anya - Asuu

    Otu jikọtara ndị nkuzi mahadum na Naịjiria bụ Academic Staff Union of Universities (Asuu) ekwuola na ha nwere olileanya na abụbụọrụ ha gbawara kemgbe ọnwa asatọ ga ha ebi.

    Emmanuel Osodeke, bụ onyeisi otu a, kwuru sị "Anyị nwere olileanya na anyị rụkọọ ọrụ, n'ime mkpụrụ ụbọchị ole na ole, anyị ga-akwụsịnwu ya bụ ihe mgbagwoju anya a dị n'agụmakwụkwọ na Naịjiria".

    O kwukwara sị "...Achọrọ m ịrịọ ka n'ọdịnihu, ka anyị ghara ikwe ka abụbụọrụ nọtee aka. Abụbụọrụ ekwesịghị ịnọfe ụbọchị abụọ.

    "Etu a Ụlọomeiwu si tinye ọnụ ugbua, ọ bụrụ na anyị mere etu a kemgbe, maọbụ na ndị nọ n'isi ihe gbasara ọrụ na agụmakwụkwọ mere etu a, anyị agaraghị ịnọ ebe anyị nọ ugbua. Anyị agaraghị ịnọfe izu abụọ maọbụ atọ n'elu abụbụọrụ a.

    "A na-agbakarị abụbụọrụ n'ụwa gbaa gburugburu - n'Amerịka, Briten, ebe niile - mana ha anaghị ekwe ya nọtee aka."

    Osodeke kwuru nke a na nzukọ ha na ụfọdụ ndị Ụlọomeiwu Nta - nke Femi Gbajabiamila bụ onyeisi ha - nwere nzukọ n'ụbọchị Mọnde, 10 nke ọnwa Ọktoba 2022.

    Cheta na Ụlọikpe Mkpegharị kpebiri n'Abuja n'ụbọchị Fraịde, ka ndị nkuzi kwụsị ịgba abụbụọrụ ma laghachị ọrụ ozugbo.

    Chetakwa na gọọmentị etiti hibere otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum ọhụrụ abụọ ọzọ a kpọrọ Congress of Nigerian Universities Academics (CONUA) na National Association of Medical and Dental Academics (NAMDA) iji kwaa Asuu nku, n'ụbọchị Tuzde, Ọktoba 4 2022.

  17. Mmanụ ụgbọala dị na mba anyị ga-ezuru anyị naanị otu izu - ndị Tunisia

    Ndị isi n’otu jikọtara ndị ọrụ bụ UGTT na mba Tunisia, ekwuola na ọ bụ naanị mmanụ ụgbọala ga-ezu otu izu, fọrọ na mba ha.

    Mmanụ ụgbọala fọrọ afọ na-anọrukarị ụbọchị 60.

    Ogologo ahịrị ọtụtụ ụgbọala kwụ na ya tochichara ụzọ n'isiobodo Tunis, dịka ha na-eche igbata mmanụ ụgbọala.

    Naila Nouira bụ minista na-ahụ maka mmanụ agbịdị na mba ahụ, kwuru na ọ bụghị eziokwu na mmanụ na-akọ na mba ahụ n’ihi akwụghịlighi ụgwọ nke gọọmentị, kama ọ sị na ọ bụ n’ihi na ndị na-anya ụgbọala na-agbara karịa ole ga-ezu ha.

    O kwukwara na ebutuwela otu tanka mmanụ ụgbọala ugbua, nke ga-eme ka ndị mmadụ gbatatu nke ga-ezu mkpụrụ ụbọchi ole na ole.

  18. Rọshịa agbaala ogbunigwe aghara aghara na Yukren

    Ndịagha Rọshịa agbaala ogbunigwe metụtara ewumewu dị mkpa dị na mpaghara iri na abụọ na mpaghara odo Kyiv dịka ndị ọrụ gbagbata menyụrụ ọkụ ọgbụgba ruru iri atọ taa bụ Monde.

    Mmadụ iri na otu (11) nwụrụ, ebe mmadụ iri asatọ na itoolu (89) meụrụ ahụ.

    Ọkụ latrik nyụrụ na mpaghara 15 gụnyere n'obodo Lviv, Kyiv na Zaporizhzhia dịka gọọmentị rịọrọ ndụmụala ha ka ha weleta aka na-etu ha si eji ọkụ latrik eme ihe.

    Onyeisiaala mba Rọshịa bụ Vladmir Putin kwuru na ogbunigwe ndị ahụ ha tụrụ bụ iji bọọọ, ogbunigwe a tụụ na akwammiri Crimera ụbọchị Satode.

    Putin na-ebo Yukren na ọ bụ ha tụrụ ogbigwe n'akwammiri ahụ ma kwe nkwa na ha ga-aga n'ihu na-tụ Yukren ogbunigwe.

  19. Ebere Udeagu, bụbu osote gọvanọ Imo steeti anwụọla

    Ebere Udeagu bụbu osote gọvanọ Imo steeti n’oge ọchịchị Achike Udenwa, alakwurula ndị nna nna ya.

    Ikedi Ohakim bụbu gọvanọ Imo steeti ma bụrụkwa otu onye zipuru ozi iti aka n'obi, kwuru na "ọnwụ Udeagu bụ ezigbo ihe fulahụrụ ndị mpaghara Okigwe, Imo steeti nakwa Naịjiria."

    Udeagu nwụrụ n’Owerri n’ụtụtụ Mọnde 10 nke Ọktoba 2022, ka ọ dị afọ 79.

    Ihe ị kwesịrị ịma maka ya:

    • A mụrụ Ebere Irodi Udeagu n'ụbọchị anọ nke ọnwa Epreelụ afọ 1943
    • Ọ bụ onye Ihube, n'Okpuru Ọchịchị Okigwe nke dị n'Imo steeti
    • Ọ gụchara 'Engineering' nke mmiri na mahadum Yaba College of Technology dị na Legọs steeti n'afọ 1966
    • Ọ lụrụ nwaanyị ma mụta ụmụ abụọ
    • Ọ natakwara asambodo agụmakwụkwọ na Higher Institute of Architecture & Civil Engineering, dị na Sofia, Bulgaria, n'afọ 1980
    • Ọ rụrụ dịka osote gọvanọ Imo steeti n'okpuru Gọvanọ Achike Udenwa site n'afọ 1999 ruo 2007, n'okpuru pati People’s Democratic Party (PDP)
    • Oge ọ bụ osote gọvanọ ka ọ rụkwara dịka kọmishọna na-ahụ maka Ọrụ na steeti ahụ
    • O mechara zọọ osote onyeisiala oge Alhaji Attahiru Bafarawa zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjiria, n'okpuru pati Democratic Peoples Party (DPP), n'afọ 2007
  20. Idemmiri ememinala ọtụtụ ụlọ na akụnụba ndị mmadụ n’obodo 33 n’Imo steeti

    Idemmiri achụpụla ọtụtụ ndị bi n’obodo 33 n’akụkụ Egbema nke okpuruọchịchị Ohaji-Egbema Imo steeti.

    Nke a bụ dịka ndị bi n’akụkụ ebe ahụ gwara ndị ntaakụkọ na ngwụcha izu a gara aga dịka ha rịọrọ gọọmentị etiti na goomenti steeti ahụ ka a gbatara ọsọ enyemaka na ya bụ ihe.

    Eze obodo ahụ bụ Eze Ikeji Bright kelere ndị ọrụ gbata gbata nke Nema bụ maka etu ha siri wụchịe ebe ahụ ngwa ngwa dịka akụkọ ihe na-eme ebe ahụ gbara n’ọha.

    Onyeisi otu Egbema North Development Area bụ Obinna Ariage kwuru na ndị ihe ọdachị a metụtara enweghịzị ike ịghagharị mkpa ha ebe eji ụgbọmmiri agbapụta ọtụtụ, ngwo ngwo na akụnaụba ha.

    Otu nwoke ọzọ aha ya bụ James Elemma bụ onye ihe ọdachị a metụtara gwara BBC Igbo na ihe a mere emeela na ya na ezinaụlọ ya enweghị ebe obibi dịka idemmiri mebisiri ụlọ, akụnụba nakwa ihe niile ha nwere.

    Idemmiri na-akpa ike n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche gụnyere akụkụ Anambra steeti bụ ebe ya bụ ihe chụpụrụla ndị mmadụ n'ụlọ ha ma gbochie ha ịzụ ahịa nakwa iga mkpa ha.