BVAS: CUPP ebola APC ebubo ịwepụ onyeisioche Inec tupuu 2023
Otu ndị pati anọghị n'ọchịchị na Naịjirịa kpọrọ onwe ha Coalition of United Political Parties (CUPP) etiela mkpu ọzọ na ndị otu APC chọrọ itinye aka enwe n'ofe ntuliaka 2023.
Onyeisi ha bụ Ikenga Ugochinyere gwara ndị ntaakụkọ ụnyaahụ na ọ nwere ndị gọvanọ APC chọrọ ịme ka agbanwee ndị isi ọrụ n'Inec ndị na-esi ọnwụ n'akụrụngwa BVAS.
Ndị otu ahụ na-ekwu na ụfọdụ ndị pati APC, ọkachasị Hope Uzodimma, Govanọ Imo steeti na-eme ihe ọbụla ha nwereike ịgba ntulịaka 2023 mgba okpuru.
Cheta na Ugochinyere etibuola mkpu na ọnwere ndị gbara akwụkwọ n'ụlọikpe ka e wepụ akụrụngwa BVAS bụ nke webatara teknụzụ n'atụmvotu Naịjirịa.
Kemgbe ahụ, otu APC azaghachikwala ha sị na ihe ahụ bụ okwu enweghị isi.