World Igbo Congress ekwuola ka Gọọmentị Naịjirịa tọhapụ Nnamdi Kanu
Otu jikọtara ndị Igbo n'ụwa a kpọrọ World Igbo Congress (WIC) nakwa nke jikọtara ndị Igbo bi n'ofesi agwaala gọọmentị Naịjirịa ka ha tọhapụ Nnamdi Kanu bụ onyendu Indigenous People of Biafra (IPOB).
Nke a dị n'akwụkwọ ozi onyeisi otu WIC nakwa odeakwụkwọ ha bụ Anthony Ejiofor na Chris Ogara wepụtara ma kwuo ka gọọmentị nakwa ọkaiwu ha rubeisi n'ihe ụlọikpe kwuru.
Ha gara n'ihu kwuo na ikpe ahụ ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja nakwa ụlọikpe ukwu dị n'Umuahia kpere gosiri na olileanya ka dị maka ikpe ziri ezi na Naịjirịa.
Cheta na ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja kachapụrụ ebubo niile dị n'isi Kanu ma nye iwu sị ka gọọmentị tọhapụ ya.
N'otu aka ahụ ụlọikpe ukwu dị n'Umuahia nyere iwu ka gọọmentị kwụọ Kanu nde narị naịra ise (N500m) ma kpọghachị ya mba Kenya bụ ebe ha si kpọlata ya na Naịjirịa n'ike.