You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ọ ka mma ka ụlọikpe kpezie esemokwu dapụtara na ntuliaka – Hope Uzodimma

Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo Steeti sị ka na-azọ ọkwa ṅụọ iyi iji ụlọikpe kpezie nhọtahie ọbụla pụtara na ntuliaka.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. World Igbo Congress ekwuola ka Gọọmentị Naịjirịa tọhapụ Nnamdi Kanu

    Otu jikọtara ndị Igbo n'ụwa a kpọrọ World Igbo Congress (WIC) nakwa nke jikọtara ndị Igbo bi n'ofesi agwaala gọọmentị Naịjirịa ka ha tọhapụ Nnamdi Kanu bụ onyendu Indigenous People of Biafra (IPOB).

    Nke a dị n'akwụkwọ ozi onyeisi otu WIC nakwa odeakwụkwọ ha bụ Anthony Ejiofor na Chris Ogara wepụtara ma kwuo ka gọọmentị nakwa ọkaiwu ha rubeisi n'ihe ụlọikpe kwuru.

    Ha gara n'ihu kwuo na ikpe ahụ ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja nakwa ụlọikpe ukwu dị n'Umuahia kpere gosiri na olileanya ka dị maka ikpe ziri ezi na Naịjirịa.

    Cheta na ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja kachapụrụ ebubo niile dị n'isi Kanu ma nye iwu sị ka gọọmentị tọhapụ ya.

    N'otu aka ahụ ụlọikpe ukwu dị n'Umuahia nyere iwu ka gọọmentị kwụọ Kanu nde narị naịra ise (N500m) ma kpọghachị ya mba Kenya bụ ebe ha si kpọlata ya na Naịjirịa n'ike.

  2. Ndị isiala mba dị icheiche ezigarala mba South Korea ozi iti aka n'obi

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden na ogbo ya nke mba Kanada bụ Justin Trudeau ezigarala mba South Korea ozi iti aka n'obi maka ọdachi dakwasara mba ahụ.

    Mmadụ 151 nwụrụ n'ọgbakọ maka mmemme Halloween nke e mere na mba South Korea n'abalị ụbọchị Satọdee.

    Akụkọ kwuru na n'ime ndị a nwụrụ anwụ, 19 bụ ndị si mba ọzọ, nke gụnyere mmadụ atọ ndị mba Chaịna.

    Joe Biden na nwunye ya bụ Jill kwuru na ozi ọdachi a mere na South Korea wutere ha nke ukwu, ma rịọ ndị ezinụlọ o metụtara ka ha kara obi.

    "Anyị na-esonyere ndị mba Repọblik nke Korea n'iru uju, ma na-ekpekwa ekpere ka ndị merụrụ ahụ gbakee ngwangwa," Biden kwuru.

    "Mmekọrịta mba anyị abụọ na-esiwanye ike ma na-akwanye mma ugbua, ịdịnotu n'etiti ndị mba anyị esikwaala ike ugbua karịa ka ọ dị na mbụ.

    "Mba Amerịka kwudosiri ike ịkwado mba Repọblik nke Korea n'oge nnukwu iru uju a."

    N'aka nke ya, Justin Trudeau kwuru na ya na-echeta ndị niile nwụrụ n'ọdachi, ma nwekwaa olileanya na ndị merụrụ ahụ ga-agbake nke ọma n'oge adịghị anya.

  3. Etu ihe karịrị mmadụ 151 si zute ọnwụ ha na mmemme Haloween

    Mmadụ otu narị na iri ise na otu alaala mmụọ n’ọdachi dapụtara ebe igwe mmadụ gbakọrọ na mpaghara Itaewon nke mba South Korea iji sonye n’emume ‘halloween’ nke afọ 2022.

    Ihe karịrị mmadụ iri asatọ na abụọ merụkwara ahụ n'ọdachi ahụ, ebe ihe karịrị puku abụọ ka a na-achọ achọ.

    Onyeisiala mba ahụ bụ Yoon Suk-Yeol agaala njem na mpaghara ebe ihe a mere, ma nye iwu ka e nyochaa ihe kpatara ụdị ọdachi a.

    Nke a bụ nke a na-eme emume Halloween ebe o buru ibu, na-eyighi mkpuchi imi, kamgbe ọrịa covid malitere.

    Akụkọ kwuru na ọ bụ mgbe ndị mmadụ tinyere isi n'otu warawara ụzọ ka ya bụ ihe mberede mere, dịka ụfọdụ dara n'ala, ndị ọzọ ejiri ụkwụ zọpịa ha na-amagghị ama.

    Ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ anwụ bụkarị ndị ntorobịa nọ n'agbata afọ iri abụọ ha.

  4. Ụtụtụ Ọma

    Igbo ndị ọma, ụnụ asaala chi.

    Nke onye chiri ya zere.

    N'ebe a ka ị ga-ahụ isi akụkọ niile gbara ọkpụrụkpụ na Naịjirịa nakwa mba ụwa niile.

  5. Ọkwa ọchịchị abụghị ebe a na-ala ezumike nka - Peter Obi

    Onye na-azọ ọkwa ọchịchị n'aha otu Labour Party bụ Peter Obi ekwuola na gọọmentị ọ ga-akpọbata ga-abụ nke ndị ntorobịa nakwa ụmụnwaanyị.

    O kwuru nke a dịka ọ malitere njem achụmnta vootu ya n'ezie na Lafia bụ isiobodo Nasarawa steeti n'ụbọchị Satọde.

    Ihe ọzọ o kwukwara bụ na ọ gaghị ekpokọ ndị kara nka na gọọmentị ya.

    "Ọkwa ọchịchị abụghị ebe a na-ala ezumike nka" ka o kwuru ma kwuo na gọọmentị nke ya ga-abụ ndị dị ike ọrụ.

    N'otu aka ahụ, onyeisi otu Labout Party bụ Julius Abure kwuru na ahụ adịghị ala Naịjirịa mma nke mere na agaghị enyefe ya n'aka "ndị na-arịa ọrịa".

  6. Anyị nwetara nkwado Buhari maka ibi ego ọhụrụ- CBN

    Ụọakụ Etiti Bekee kpọrọ 'Central Bank of Nigeria'(CBN) akọwaala na ha soro usoro niile kwesịrị ma nwetakwa nkwado onyeisiala Muhamadu Buhari tupu ha ekpebie ịgbanwe akwụkwọ ego naịra ọhụrụ.

    Ọnụ na-ekwuru ụlọakụ ahụ bụ Osita Nwanisobi, kwuru nke a n'ọsịsa ebubo n'ọsịsa ebubo Mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Zainab Ahmed boro na mịnịstrị ya amaghị maka atụmatụ ahụ ndị CBN wepụtara.

    O kwuru na ndị isi CBN gbadoro ụkwụ na iwu hiwere CBN nke afọ 2007 ( CBN Act 2007) were nata ikike n'aka Onyeisiala Muhammadu Buhari ịgbanwe ego ọhụrụ.

    CBN maburu ọkwa na ha ga-agbanwe akwụkwọ ego N200, N500,nakwa N100 n'ọnwa Disemba afọ 2022.

  7. Etu otu nwoke si jiri 'hammer' wakpoo Paul Pelosi, di Nancy Pelosi

    Paul Pelosi, bụ di onyeisi ụlọomeiwu nke mba Amerịka bụ Nancy Pelosi, na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ dịka otu nwoke ji 'hammer' wakpo ụlọ ha dị na San Francisco.

    Mazi Pelosi, onye dị afọ 82, merụrụ ahụ n'isi nakwa n'aka nri ya na mwakpo ahụ, mana ndị dọkịnta kwuru na ọ ga-agbake nke ọma.

    Mwakpo a emeela ka ụjọ jide ndị ndọrọndọrọ ọchịchị dịka a na-akwado ntuliaka ndị omeiwu n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Nọvemba 2022.

    Akụkọ kwuru na nwoke mere mwakpo a bụ David Depape, onye dị afọ 42 kwuru na ọ bụ Nancy Pelosi ka ọ chọtara.

    Ndị uweojii anwụchiela ya ugbua ma bo ya ịbanye ụlọ mmadụ n'ike, iji ngwaọgụ nwere ike igbu mmadụ, nakwa ịchọ igbu mmadụ.

    Dịka ndị uweojii si kọwaa, ọ bụ Mazi Pelosi kpọrọ akara 911 n'ekwentị ya ma hapụzie ya ka ndị uweojii na-anụ mkparịtaụka ya na nwoke ahụ wakporo ụlọ ya.

  8. Amaghị m maka naira ọhụrụ CBN na-akwado ibipụta- Zainab Ahmed

    Minista na-ahụ maka ego bụ Zainab Ahmed ekwuola na ụlọakụ Etiti bụ CBN n’ịchafụna mịnịsta ya akpaghị maka mkpebi ya ibitta ego ha chọrọ ibitụta n’ọnwa Disemba.

    Ụlọakụ CBN mara ọkwa na nsonso a, na a ga-ebipụta N100,N200,N500 nakwa N1000 ọhụrụ.

    Ahmed onye gbara ama ụbọchị Fraide n’Abuja oge a na-eme nrụịtaụka banyere bọjet mịnịstrị na-ahụ maka ego kwuru na-agbanyeghị na ya bụ atụmatụ nwere iru dị na ya, na nsogbu sokwa ya.

    " A kọtụrụghị anyị, ọ bụ oge a mara ọkwa ya ka anyị nụrụ ya."

    Otu n'ihi e kwuru na e ji kwuo ka agbanwe ego bbụ na ọ ga-enye aka na-ibelata ọnụahịa ihe na-ada n'ahịa.

    Mana o nwere ihe ndị so ya. Ihe ndị ahụ ka anyị na-ele anya.

    "Amaghị m ma ụlọọrụ ahụ elere anya ọfụma na ihe ga-eso ịgbanwe ego a na ihe ha ga-eme iji gbobido ha."

  9. Ụnụ asaala Chi

    Ụtụtụ ọma ụmụ Igbo.

    Daalụ maka isonyere anyị na mgbasaozi nke taa.

    Ngwa ka anyị malite.

  10. Elon Musk emezuola nkwekọrịta ịji $44bn zụọ Twitter

    Ọgaranya kachasị n'ụwa bụ Elon Musk, emezuola nkwekọịta ịzụ Twitter ijeri dọla iri na anọ($44bn) dịka ụlọọụ ntaakụkọ mba Amerịka nakwa otu onye tinyere ego n'ụlọọụ ahụ si kwuo.

    Ụnyaahụ bụ Tọzde, Musk wepụtara ozi na'akara Twitter nke kwuru sị, " Nnụnụ enwerela onwe ya" nke e chere bụ maka nkwekọrịta ahụ ka ọ na-ekwu maka ya.

    Akụkọ kwuru na ozigbo ọ zụchara Twitter, na-achụrụ ụfọdụ ndị isi Twitter gụnyere Onyeisi na-ahazi Twiitter bụ Parag Agrawal.

    Twitter ekwubeghị ma Musk egoola ụlọọrụ ahụ n'ezie, mana otu onye tinyere ego n'ụlọọụ ahụ gwara BBC na n'ezie e mezuola nkwekọrịta Musk iweghara ụlọọrụ Twitter.

    Nke na-eweta n'isi njedebe, akụkọ na a ga-akpụ Musk ụlọikpe iji hụ na o mezuru nkwekọrịta iweghara Twitter nke e kwuburu na ọ chọrọ ịgbahapụ.

  11. Ndewoonu, Igbo ndị ọma

    Igbo ,mma mma nụ o!

    Ndewoonu, Igbo ndị ọma!

    Bia soro anyị maka akịkọ ndị mkpa taa!

  12. Ikpe amaala ndị ohi ịntanetị mmadụ 22 n’Enugu

    Ụlọọrụ na-egbuso mpụ agha na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) n’Enugu steeti enweta mmerị n’akwụkwọ ha gbara mmadụ 22 n’ụlọịkpe maka itinye aka n’ohi ịntanetị.

    Ọkaikpe Jọstịs Fatun Riman mere mkpebi a n’isi ndị a dịka e nnyochapụtara na aka ha adịghị ọcha n’okwu iji kọmpụta akụpụta ego n’akpa ndị mmadụ,

    Ndị a ga-aga nga ugbua ka e kpechara ikpe ha n’ụbọchị Mọnde nakwa Tuzde.

  13. Anyị agaghị akụja maka ama mwakpo USA mara - Lai Muhammed

    Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi na Naijirịa bụ Lai Muhammed ekwuola na gọọmentị Naijirịa agaghị etinye onwe ha na gbaharịa maka ama mba Amerịka gbara na ndị oyi ndụ egwu ga-awakpo Abuja. Nke a bụ dịka mba Amerịka, Kanada, Ọstrelia na Briten bidoro ịkpọla ndị ọrụ nnọchiteanya ha nọ n'Abuja dịka ha gbara ma sị na e nwereike ịwakpo ụlọọrụ gọọmentị, ụlọụka, ụlọ akwụkwọ na-ebe ọzọ ndị mmadụ na-agbakọ.

  14. Nwoke gbanwere onwe ya bụrụ nwaanyị azụọla ụlọọrụ 'Miss Universe'

    Nwaanyị bubu nwoke, onye mba Thailand azụọla ụlọọrụ na-ahazi asọmpi Nwaanyị kacha mma n'ụwa Bekee kpọrọ 'Miss Universe' ọnụ ego dị nde dọla 20($20m).

    Anne Jakapong Jakrajutatip bụ onye bụ onyeisi ụlọọrụ JKN Global Group' bụ ụlọọrụ na-eme ihe onyonyo TV na mba Thailand ma na-emepụta ihe onyonyo a ma ama a kpọrọ "Project Runway" na "Shark Tank".

    Jakrajutatip zụrụ ụlọọrụ ahụ dịka ya bụ ụlọọrụ nke Donald Trump nwebu sị na ọ mere nke a iji nye ohere ka ndị ọzọ a na-akpapụ akpapụ na-esonye.

    Trump so nwere ụlọọrụ Mis Universe malite n'afọ 1996 rue afọ 2015 mana o rere ya dịka ụlọọụ ihe onyonyo TV abụọ na-akwado ya bụ asompi kwuru na ha agaghị esokwa mee nke a n'ihi okwu Trump kwuru oge ọ na-azọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2016 megide ndị mbịarambịara.

  15. Bruce Lehrmann: Ụlọomeiwu mba Australia akagbuola ikpe metụtara ndịna ike n'ihi ndahie

    A kwụsịlla ikpe maka onye bụbu onye ndụmọdụ n'ụlọomeiwu mba Australia bụ onye ọrụ ibe ya na-ebo ebubo idina ya n'ike dịka otu n'ime ndị na-elenye anya n'ikpe ahụ dajọrọ.

    Bruce Lehrmann gbara afọ 27 na-aghọ agụgọ na ya awakpoghị Brittany Higgins n'oche dị otu onye mịnịsta n'abalị ha abụọ pụrụ mkpagharị na Canberra n'afọ 2019.

    Lehrmann kwuru na ya na Higgins enweghị mmekọrịta nwoke na nwaanyị ọbụla.

    Mana Higgins kwuru na ya mmanya na-egbu ya dịka ha gachara ụlọmmanya abụọ dị na Caberra, ha banyere ụgbọala butere ha abụọ n'ụlọomeiwu; ụra buru ya n'oche, ya teta hụ ka Lehrmann na-edina ya.

    Mana dịka ndị mmadụ a họpụtara inyocha ikpe ahụ ekwesịrị ikpe abalị 12, otu onye n'ime ha nọọ n'abalị nke ise ya, lee nnyocha e merela maka iwakpo mmadụ n'ike na agbanyeghị na iwu kwuru na ọ bụ naanị ihe akaebe e wetara n'ụlọikpe ka e kwesịrị ile anya were kpebie okwu ahụ.

  16. Inec achọpụtala ndị ọrụ ha 23 mere nrụrụaka na ndebanye aha

    Ngalaba nhazi ntuliaka bụ Inec ekwuola na ha achọpụtala ndịọrụ ha iri abụọ na atọ tinyere aka na mpụ n’oge ndebanye aha ndị mmadụ n’akwụkwọ ntuliaka.

    Mahmood Yakubu bụ onyeisi Inec kwuru nke a n’ụbọchị Wenezde, n’ọgbakọ ya na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche nwere n’Abuja.

    “Anyị chọpụtara ọtụtụ aha adigboroja nke ụfọdụ ndị ọrụ anyị ji ụzọ nrụrụaka debanye n’ime akwụkwọ ntuliaka,” Yakubu kwuru.

    “Anyị ehichapụla aha ndị ahụ, ma malite inye mmadụ 23 aka ha dị na mpụ a ntaramahụhụ kwesịrị ha.”

    Cheta na otu jikọrọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ‘Coalition of United Political Parties’ (CUPP) tiri mkpu maka ọtụtụ wuruwuru ha chọpụtara n’akwụkwọ ‘voters register’, ọ kachasị na mpaghara ụfọdụ n’Imo steeti.

  17. Nnamdi Kanu agbaala gọọmentị etiti akwụkwọ ego otu narị ijeri naịra (N100,000,000,000)

    Dịka gọọmentị Naịjirịa ka ji Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Indiegonus people of Biafra (Ipob) e ji n’ụlọ nga ndị DSS, Nnamdi Kanu site n’aka ndị ọkaiwu ya agbaala gọọmentị etiti Naịjirịa akwụkwọ maka ịghara irubere mkpebi ụlọikpe mkpegharị isi n’okwu ntọhapụ Kanu.

    N’akwụkwọ ozi ọkaiwu Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor zipụtara na soshal midia ya taa bụ ụbọchị 26 nke ọnwa Ọktoba, 2022, ọ kesara akwụkwọ e ji gbaa gọọmentị Naịjirịa akwụkwọ n’ụlọikpe ukwu nke Abuja.

    Ejiofor kọwara na ha na-eme nke a n’ihi na gọọmentị gara n’ihu jichie Kanu agbanyeghị iwu ụlọikpe mkpegharị nyere ka atọhapụ ya n’ụbọchị 13 nke ọnwa Ọktoba, 2022.

    O kwukwara na ahụike Kanu na-aga n’ihu na-adakpo n’ụlọ nga ndị ngabala ndị uweojii pụrụiche bụ Department of State Services (DSS) kemgbe ọnwa Juun 2021 mgbe a nwụchịrị ya.

    Akwukwo ikpe a depụtara na usoro nwuchị Kanu dara iwu ma ịga n’ihu na-ejichi ya n’ụlọ nga dakwara iwu ma megide ikike diri ya dịka mmadụ nakwa ikike nnwereonwe ya dịka mmadụ.

  18. Etu ụzọ Ugwogo-Opi Nsukka n'Enugwu si bụrụzie ọdụ ndị ntorị

    Ụzọ si Ugwogo gawa Opi Nsukka n'Enugwu steetị aghọọla ebe ndị ntọrị na-akpa ike dị egwu site n'ịtọrị ndị na-eme njem kwa izuụka.

    Ihe anya mmiri a mekwara ọzọ n'ụbọchị Sọnde 23 Ọktoba 2022 n'ihe dịka elekere anọ nke mgbede mgbe ndị a na-eche bụ ndị ọchịehi wakporo ndị njem n'ụzọ ahụ ma tọọrọ ha banye n'ime ọhịa.

    Otu onye ọrụ ugbo n'Opi Nsukka gwara BBC Igbo na "obodo anyị nọ n'egwu ugbua n'ihi na ọ bụ kwa izuụka ka ndị ọchịehị na-esi n'ime ọhịa Opi apụta bịa tọrọ ọtụtụ ndị mmadụ.

    Otu anya hụrụ ka ihe a jiri mee bụ Ibe Kenneth kwuru na o ji ụgbọala ya na-aga Nsukka mgbe ọ hụrụ ndị ntọrị kpuchiri ihu ha ma kwụsị ụgbọala abụọ na nke mmadụ enwe abụọ ma tọọrọ ndị niile nọ n'ime ha.

    Ọtụtụ ndị njem mere mkpesa kwuo na ha amaghị ihe mere ndị uweojii, ndị agha na ndị nchekwa ọzọ enweghi ike ichekwa ndị mmadụ nke ọma n'ụzọ ahụ.

    Ha katọrọ mmechi e mechiri ụfọdụ 'check point' dị n'ụzọ ahụ nke mere ndị ntọrị ji enye nsogbu ebe ahụ oge ọ masịrị ha.

    Mathias Ume bụ onye Ekwegbe rịọrọ gọọmentị ka ha banye n'ime ọhịa ma chụpụta ndị ọjọọ na-akpa ike ndị a.

    Cheta n'ọnwa abụọ gara aga ka gọọmenti wakporo ogige ndị ntọrị nọ na mpaghara Opi na Ekwegbe ma zọpụta ndị ha tọọrọ.

    Ugbua ndị omekaome ahụ apụtakwala ọzọ n'ujuu.

    BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugu Steetị bụ Daniel Ndukwe n'ekwentị ma zigara ya ozi mana ọ zabeghi tupu akụkọ apụta.

  19. Anyị zọpụtara mmadụ asaa n'ọkụ gbara n'ụlọọrụ WAEC Legọsn - LATSMA

    Ụlọọrụ gbatagbata nke Legọs steeti bụ LASEMA ekwuola na azọpụtara mmadụ asaa n’oku gbara ụlọọrụ na-ahazi ule bụ WAEC n’ịchafụ na steeti ahụ taa.

    Ngalaba a kwuru na ya bụ ọkụ latrik bidoro ya bụ ọkụ n’ogoogo nke atọ ụlọọrụ ahụ.

    N'akwụkwọ ozi ha depụtara ka ha kwuru sị, "Ọ bụ njịkọ aka ndị ụlọọrụ LASG FIRE, FED FIRE, UNILAG FIRE, LASAMBUS na LATSMA gbara mbọ menyụọ ya bụ ọkụ".

  20. Nwoke a sị kacha ruo unyi n'ụwa anwụọla n'afọ 94

    Amou Haji bụ otu nwoke ama ama dịka onye ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụ ya kacha rie unyi n'ụwa niile anụọla n'ụbọchị sụnde.

    A na-ekwu na Haji bụ onye mba Iran na-ekweghị iji ncha maọbụ mmiri saa ahụ ruo afọ iri ise.

    Kama ọ mechara kwete saa ahụ ọnwa olemaole gara aga ma oteghị aka ọ sachara ahụ, ọ dara ezigbo ọrịa ma nwụọ.

    Ụlọ ntaakụkọ IRNA nke mba Iran na-ekwu na ọ bụ anụ rere ere na mmiri na-adịghị ọcha ka nwoke a na-aṅụ.

    Haji bi na mpaghara Fars ma biri n'ụlọ mkpakara ndị obodo rụrụ ya ma na-ehi kwa n'ime ala.