You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ọ ka mma ka ụlọikpe kpezie esemokwu dapụtara na ntuliaka – Hope Uzodimma

Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo Steeti sị ka na-azọ ọkwa ṅụọ iyi iji ụlọikpe kpezie nhọtahie ọbụla pụtara na ntuliaka.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Karim Benzema abụrụla naanị eze ga-akwụ ọtọ n'egwuregwu bọọlụ mba ụwa

    Karim Benzema na-agbara otu bọọlụ Real Madrid nakwa mba Fransị eritela nturuugo Ballon d'Or nke bụ nturuugo kacha nwee nkwanye ugwu n'egwuregwu bọọlụ n'ụwa niile.

    Benzema ritere nturuugo a n'emume e mere na mba Fransị n'ụbọchị Mọnde, ebe Sadio Mane nke mba Senegal gbara onye nke abụọ, Kevin de Bruyne nke Belgium gbara onye nke atọ.

    Nke a bụ nke mbụ Benzema, onye dị afọ 34 na-erite nturuugo a, nke bụ n'ihi ike ọ kpara n'afọ bọọlọ 2021/2022.

    N'ime afọ bọọlụ ahụ, Benzema nyere goolu 44, ma buo ike Champions League, iko La Liga, na nke 'World Club Cup'.

    Ọ bụkwa nke mbụ nwa afọ Fransị na-erite nturuugo Balon d'Or kamgbe Zinedine Zidan nwetachara ya n'afọ 1998.

    "Obi bụ m sọ aṅụrị maka nturuugo a e nyere m," Benzema kwuru. "Nke a bụ nrọ m rọrọ kamgbe m bụ nwatakịrị, mana akwụdosiri m ike. Onweghị ihe na-agaghị ekwe omume."

    Ọ bụ ndị ntaakụkọ 100 n'ụwa niile na-atụ vootu iji họpụta onye a ga-enye nturuugo Balon d'Or nke afọ ọbụla.

    Lee etu e si tụọ vootu maka Balon d'Or nke afọ 2021/2022

    1. Karim Benzema (Real Madrid, France).

    2. Sadio Mane (Bayern Munich, Senegal).

    3. Kevin de Bruyne (Manchester City, Belgium).

    4. Robert Lewandowski (Barcelona, Poland).

    5. Mohamed Salah (Liverpool, Egypt).

    6. Kylian Mbappe (Paris St-Germain, France).

    7. Thibaut Courtois (Real Madrid, Belgium).

    8. Vinicius Junior (Real Madrid, Brazil).

    9. Luka Modric (Real Madrid, Croatia).

    10. Erling Haaland (Manchester City, Norway).

    11. Son Heung-min (Tottenham Hotspur, South Korea)

    12. Riyad Mahrez (Manchester City, Algeria).

    13. Sebastien Haller (Borussia Dortmund, Ivory Coast).

    14. Fabinho (Liverpool, Brazil) gbara nhatanha ya na Rafael Leao (AC Milan, Portugal).

    16. Virgil van Dijk (Liverpool, Netherlands).

    17. Luis Diaz (Liverpool, Colombia) gbara nhatanha ya na Dusan Vlahovic (Juventus, Serbia) na Casemiro (Manchester United, Brazil).

    20. Cristiano Ronaldo (Manchester United, Portugal).

  2. Ụtụtụ ọma

    Ụnụ asaala chi ụmụ Igbo.

    Daalụ maka isonyere anyị dịka anyị na-amalite mgbasaozi nke taa.

    Ya gazie.

  3. Ndí China kpụbara otu nwoke Hong Kong na-akwado ọchịchị onyekwuouche ya n'obi ha dị Manchester ga tie ha ihe

    Nwoke Hong Kong na-akwado ọchịchị onye kwuo uche ya ka ndị China kpụbara n'obi ha dị na Manchester dị London ga kụọ ya gwogwo.

    Ndị amaghị aha ha sị na obi ndị China ahụ pụta kpụụrụ ya bụ nwoke n'ike baa ebe ahụ ga tiwa ya ihe, kụpee ya imi tupu ọ gbaa ọsọ ndụ ya site na-enyemaka ndị uweojii na dị ọzọ ha na ya so eme ngagharịiwe,

    Ya bụ nwoke gwara BBC ihe o ji anya ya bụọ hụ sị, "ha kpụ bara ma n'ime tiwe m ihe".

    Ọnụ na-ekwuru Kọnsụleti ahụ sị na ndị ndi ngagharịiwe ahụ na-akpa ajọ agwa na-ekwụ ajọ ihe gbasara onyeisiala mba Chaịna.

    Onyeisi ọrụ ebe ahụ sị na ya ka na-achọ ịghọta ebe mmiri si baa opi ụgbọghịrị ebe ndị uweojii malitegoro ịma imi n'ala.

    Otu nwoke a na-akpọ Bob gwara BBC nke China na ndị na-eme ngagharịiwe si n'ime obi ebe ahụ pụta dọkawa posta ndị Chaịna dị ebe ahụ.

  4. Achụọla onye ruburu ọrụ na Al Jazeera n'ọrụ ọhụrụ o nwetere na TVNZ maka ịmetọ ụmụnwaanyị

    Kamahl Santamaria bụ onye ama ama n'ọrụ ntaakụkọ ihe onyonyo,ọkachasị na Al Jazeera ebe ọ rụgoro ọrụ afọ iri na isii (16) tupu ọ gawa TVNZ dị na New Zealand.

    Akụkọ sị na ya bụ nwaamadị tinyere akwụkwọ arụkwaghị m ka ọ rụchara ọrụ ụbọchị iri atọ na abụọ (32) na TVNZ maka ebubo ịkpaakaala nye ụmụnwaanyị.

    Mgbe ahụ ka ndị otu ọrụ ya n'Al Jazeera malitere ikwu ihe ya bụ nwaamadị ji ụmụnwaanyị eme n'ulọọrụ ahụ.

    Ihe onyonyo nzụzọ ndị BBC mere n'isi Al Jazeera nwere ọtụtụ ihe ngosi ebe Santamaira na-akpa agwa dị aghaa ya na ụmụ nwaanyi n'isi ụlọọrụ Al Jazeera na Doha,

    Ụfọdụ sị na ọ bụghị naanị ya na-akpa ụdịrị agwa ahụ.

    Ha bokwara ya bụ ụlọọrụ ebubo na ọ na-eleghara arụrụala ndị mmadụ na-arụsa ụmụnwaanyị anya ebe ahụ.

    Ndị gwara BBC okwu sị ka a ghara ịkpọ aha ha maka egwụ ịchụ ha n'ọrụ.

    A gbanwere aha ndị gwara BBC okwu n'akụkọ a.

    Maazị Santamaria ekweghị agwa BBC okwu mana ihe ọ deere ndị ntaakụkọ kwuru na n'ezie na ya nwere ụfọdụ ihe ndị ahụ a na-ebo ya, ebe ọtụtụ n'ihe ha bụ asị.

    Ọ rịọrọ mgbaghara maka ajọ agwa ọbụla ọ kpasara onye ọbụla n'ụdị ọbụla.

  5. Ukraine war: E jirila ụgbọufe aṅụ (drone) kamikaze tụọ ogbunigwe na Kyiv

    Akụkọ na-eru BBC ntị n'ụtụtụ a bụ na e werela ụgbọufe aṅụ (drone) kamizake tụọ ogbunigwe anọ n'isiobodo Ukraine bụ Kyiv.

    "Nke a gosiri na ha na-amazị ọnwụ", otu onyeisi kwuru.

    Onyeisi okpuruọchịchị etiti Kyiv Shevchenkivskiy bụ Vitalii Klitschko sị ya bụ ogbunigwe mebiri ọtụtụ ihe ebe ndị mmadụ bi.

    Izu gara aga Russia tụkwara ogbunigwe na Kyiv mgbe ndị mmadụ na-agagharị, gbuo mmadụ iri na itoolu.

    Amarawala ndị mmadụ ahụ ihu ụgbọufe aṅụ (drone) na-atụ ogbunigwe dịka ọ mere n'ụtụtụ a.

    Ụda egbe mere ka ebe niile na Kyiv maa jijji ebe ndị agha na-achọ ịgbatu ụgbọufe aṅụ ndị ahụ.

    Ihe onyonyo gosiri otu a gbaturu.

    Atụrụ ya bụ ogbunigwe n'isiụtụtụ ebe elekere isii na ọkara nke ụtụtụ ha, mana elekere atọ na ọkara nke ime abalị anyị mgbe anụrụ ụda ya bụ ugbonigwe ugboro ise, nke ịkpeazụ bụrụ na elekere asatọ na nkeji iri nke ụtụtụ ha.

    Abụọ dara n'etiti Kyiv ebe opike nakwa opi ụgbọala dara aghaaghara.

    Gịnị bụ ụgbọufe Kamikaze?

    Nke a bụ obere ụgbọufe anụ n'atụ ogbunigwe Bekee na akpọkwa "munitions' bụ nke na gbara ma ọ tụpụ ogbunigwe ya.

    Ebe ụgboufe aṅu ndị ọzọ na-alọta, kamikaze na-agbarị onwe ya ebe ọ tụrụ ogbunigwe.

    Aha ya sị na aha ndị agha Japan ji onwe ha chụọ aja site na ịgbari onwe ha n'ime ogbunigwe ha ihụ na ha tụtara ihe ha chọrọ mgbe a lụrụ agha mbaụwa nke abụọ.

    Onyeisiala mba Ukraine ebobuola Russia na ha ji ụgbọufe aṅụ ndị Iran atụ ha alụsa ha agha, mana Iran gọọrọ ebe Russia ekwubeghị ihe ọbụla maka ya.

    Onyeisiala mba Russia bụ Vladimir Putin sị na ya bụ ogbunigwe ha tụrụ izu gara aga bụ ụbọ ka ha bọrọ maka ya bụ isiakwa mmiri jikọrọ Russia na Crimea ha na-ebo Ukraine ịgbari.

    Nke a bụ nke mbụ a na-atụbata ogbunigwe n'etiti Kyiv.

  6. Gọọmentị ebupụtala nri ruru 'tonne' puku 12 iji nyere ndị mmadụ aka

    Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela iwu ka e si n’ebe nchekwa nri gọọmentị bupụta nri kariri tọn puku iri na abụọ iji nyere ndị ọdachi ide mmiri a metụtara aka.

    Ozi a si n'akara 'Twitter' nke ụlọọrụ onyeisiala

    Ụlọọrụ onyeisiala na-ekwu na ngalaba ‘National Emergency Management Agency’ amalitelaarịị ikesa nri ndị a na steeti dị icheiche.

  7. Ọdachi ide mmiri nke afọ a egbuola mmadụ 603 - Gọọmentị Naịjirịa

    Ọnụọgụgụ ndị nwụrụla n'ọdachi ide mmiri nke na-aga n'ihu ugbua na steeti dị icheiche na Naịjirịa eruola narị isii na atọ.

    Onye kwuru nke a bụ Sadiya Umar Farouk, ji ọkwa Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ enyemaka, njikwa ihe mberede, na mwulite obodo, nke a na-akpọ 'Minister of Humanitarian Affairs, Disaster Management and Social Development' na bekee.

    O kwuru nke a dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja n'ụbọchị Sọnde, ebe ọ nọrọ kwuputa na ihe karịrị ụlọ 200,000 alaala n'iyi n'ihi ọdachi ide mmiri a.

    "Ọtụtụ ala ebe ndị mmadụ kọrọ nri alakwaala n'iyi, ndị mmadụ karịrị nde 1.3 enweghịzi ebe obibi n'ihi ọdachi a," ka Umar Farouk kwuru.

    Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya bụ ọdachi abịabeghị n'isi njedebe maka na a na-atụ anya na ide mmiri a ka ga-abịa karịa n'izuụka ndị di n'hu.

    Ngalaba gọọmentị na-akọwa maka ihu eligwe bụ 'Nigeria Meteorological Agency' na-adọ aka na ntị na ide mmiri a ga-adigide ruo ngwụcha ọnwa Nọvemba na steeti dịka Anambra, Delta, Rivers, Cross River, Bayelsa, na ndị ọzọ.

    Mịnịsta ahụ kwuru na gọọmentị etiti dọrọ aka na ntị maka ọdachi ide mmiri a, "mana ọtụtụ gọọmentị steeti emeghị ihe ọbụla iji kee nkwụcha maka ya, nke kpatara ọtụtụ mbibi nakwa ọnwụ anyị na-ahụ ugbua".

    Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmenị amalitela ikesa ọtụtụ ihe enyemaka dịka nri nakwa ihe e ji ebi ndụ, nye ndị ọdachi ide mmiri a metụtara.

    Ihe kpatara ọdachia bụ oke mmiri ozuzo nakwa mmepe e mepere ebe a na-eche mmiri a kpọrọ 'dam' na mba Kamerun, mana ndị ọkacha mara na-ekwu na ọ bụ adịghị nkwadebe nakwa na gọọmentị etinyeghị ihe mgbochi mere ọdachia ji ka njọ.

  8. Ụtụtụ ọma

    Ekele dịrị gị onye ọma na-esonyere anyị taa.

    Ka izuụka a maara gị mma nke ukwuu.

    Ngwa ka anyị malite mgbasaozi anyị na-egbughị oge.

  9. Biodun Oyebanji abanyela ọchịchị Ekiti steeti

    E duola Biodun Oyebanji n’iyi ọrụ dịka gọvanọ ọhụrụ nke Ekiti steeti.

    Ka e duchara ya iyi ọrụ, o kwere nkwa ịhụ na Ekiti bụ obodo mmụbawanye akụnaụba, udo na ọganihu.

    Oyebanji kwere nkwa ịhụ na ụmụakwụkwọ gara akwụkwọ ma mụtakwa ihe.

    Cheta na Oyebanji bụbu onye odeakwụkwọ nye gọvanọ Kayode Fayemi ka pụrụ apụ, tupu ọ zọọ ma zọta ọkọlọtọ pati APC na ntuliaka gọvanọ.

  10. Gọvanọ Zamfara Steeti enyela iwu ka emechie ụfọdụ ụlọ ntaakụkọ na steeti ahụ

    Gọvanọ Zamfara Steeti bụ Bello Matawalle enyela iwu ka emechie ụfọdụ ụlọ mgbasa ozi nke gụnyere Radio Nigeria, Nta Gusau, Vision FM na Pride Gusau FM na ndị ntaakụkọ ndị gara emume achụmnta vootu otu pati PDP mere na steeti ahụ.

    Ọ bụ n’akwụkwọ ozi kọmịshọna mgbasa ozi steeti ahụ bụ Ibrahim Dosara depụtara ka o kwuru nke a ma sị na ụlọ ntaakụko ndị amegidere iwu mmachi achụmnta vootu gọọmentị steeti ahụ hiwere maka iwu mmachi.

  11. Egbuola mmadụ 11 ebe a na-azụ ndị agha ọhụrụ mba Rọshịa

    Egbuola mmadụ iri na otu n'ogige a na-azụ ndị batara ọhụrụ dịka ndị agha mba Rọshịa na mpaghara Belgrood n'ụbọchị satọde.

    Ọ bụ n'ogige a na-akuziri ndịa etu esi agba egbe ka mmadụ abụọ wakporo ebe ahụ.

    Ndị a emechara gbuo oge mwakpo a merụwakara mmadụ iri na ise ọzọ ahụ.

    Ngalaba nchekwa nke mba Rọshịa kwuru na mmadụ abụọ sị na mba ndị nọbu n'okpuru Soviet Republic.

    Nke a na-eso iwu onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin ka ahọpụta mmadụ 300,000 ọzọ dịka ndị agha mba ahụ.

    Nke a butere ọtụtụ nsogbu na ngagharịiwe iwe na mba Rọshịa.

    Rọshịa wakoro mba Yukren n'ọnwa Febuwarị nke afọ 2022 maka ebubo na a na-akpa oke agbgụrụ na mba ahụ.

  12. Ebola in Uganda: Ọrịa Ebola egbuola mmadụ 15 na nsonso a na mba Yuganda

    Etinyela mmachi ngagharị na mpaghara Mubenda na Kassanda nke mba Yuganda maka mfesa ọrịa Ebola na mpaghara abụọ a.

    Ọ bụ onyeisiala mba Yuganda bụ Yoweri Museveni nyere iwu ka ehiwe mmachi abalị iri abụọ na otu iji gbochie mfesa ya bụị ọrịa.

    Kamgbe ọrịa selitere isi ọzọ na mba Yuganda, o gbuola mmadụ iri na itolu ebe ahụtarala ya n'ahụ mmadụ iri ise na asatọ.

    Museveni kwuburu na ọbaghụ uru ọbụla ihiwe mmachi kama etu ọ dị ugbua,ọ mechara nye iwu mmachị ngagharị.

  13. A chọpụtala okporo ọzọ e si ezupu mmanụ agbidi na Naịjirịa

    Ndị ọrụ nchekwa okporo mmanụ agbidi nke gọọmentị etiti hiwere achọpụtala ebe ọzọ e si ezupu mmanụ a dị n’Obodo Okuntu nke Delta Steetị na ngwụcha izuụka a.

    Okporo mmanụ a dị inchisi isii ka a kwụnyere n’okporo mmanụ ukwu ụlọọrụ Shell a kpọrọ Trans Forcados Trunkline dị inchisi iri ise na asatọ (58) ma jiri ya mịrị mmanụ agbidi gawa na ngwaọrụ ndị Agid a gbahapụrụ agbahapụ dị n’oke osimmiri.

    Ndị nchekwa Tantita a nke Government Ekpemupolo nọ n’isi sị na nyocha gosiri na e jiri okporo ahụ amị mmanụ agbidi na nzuzo kamgbe ihe ruru afọ atọ ma karịa.

    Ụlọọrụ nchekwa a chọpụtala ihe karịrị okporo mmanụ adịgborojia iri ise e ji ezupu mmanụ agbịdị na Naịjirịa site Delta nakwa Bayelsa Steeti.

  14. Igbo ndị ọma ndewo nụ!

    Obi ọma ka anyị ji anabata unu n'ọgbakọ anyị nke taa.

    Ngwa buru oche gị bịa nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa gbaa gburugburu.

  15. Gọọmentị etiti akpọgala ndị 'ex-terrorist' 101 ebe a ga-agbanwe mmụọ ha tupu ha abaghachị obodo

    Gọọmentị etiti Naịjiria ekwuola na ha akpọgala mmadụ otu narị na otu bụ ndị oyindụegwu ikpe maburu nakwa ndị na-echebiri ikpe, ebe a ga-akpọghachịta mmụọ ha tupu a hapụ ha ka ha laghachịta n’obodo dịka ndị nkịtị.

    Maj. Gen Lucky Irabor bụ onyeisi ndị agha nchekwa, gwara ndị ntaakụkọ nke a ka e mechara nzukọ ndị isi nchekwa Naịjiria n’obi gọọmentị etiti n'Abuja, na Fraịde, 14 nke Ọktoba 2022.

    Ka ọ na-ekwu okwu, Irabor kwuru na e si n'ebe ejibu mmadụ 101 ahụ kpọga ha n'atụmatụ a kpọrọ 'Operation Safe Corridor', bụ nke Gọọmentị Etiti hibere n'afọ 2016 maka ịnabata ndị oyindụegwu chegharịrị echegharị.

    Ọ sị "Ndị a bụbu ndị oyindụegwu e jichiri kemgbe ọtụtụ afọ, ụfọdụ ndị nọzurula oge ha na mkpọrọ, ndị ọzọ bụ ndị na-echebu ka e kpee ha ikpe ha n'ihi ọtụtụ oge ha nọrọla nakwa n'usoro e ji eso onye ọbụla merela ihe gbasara iyi ndụ egwu."

    Aregbesola tinyere ọnụ, kwuru sị na e nwere mkpebi ụlọikpe nyere kwadoro atụmatụ a.

    Ọ sị "E nwere iwu ụlọikpe nyere nke mere ka e si n'ebe e jichiri ha kpọga ha ebe a ga-agbanwe mmụọ ha..."

    Ndị bịara ya bụ nzukọ nke Onyeisiala Muhammadu Buhari kpokọbara gụnyere, Rauf Aregbesola bụ minista na-ahụ maka Ime ụlọ nakwa Mohammed Dingyadi bụ minista na-ahụ maka ihe gbasara ndị uweojii.

  16. Ụlọikpe akagbuola mpụta Aishatu Binani dịka onye meriri ntuliaka imeụlọ APC Adamawa

    Ụlọikpe Ukwu dị na Yola, isiobodo Adamawa steeti, akagbuola ntuliaka imeụlọ APC wepụtara Sinetọ Aishatu Binani dịka onye zọtara ọkọlọtọ ịzọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ.

    Nke a na-abịa dịka Nuhu Ribadu gbara onye nke abụọ oge ahụ, kpụpụrụ ya na APC na Inec ụlọikpe, n’ebubo na ọ zụrụ vootu n’aka ndị delegate.

  17. A chụọla Kwasi Kwarteng n’ọrụ dịka onyeisi ụlọakụ mba Briten

    A chụọla Kwasi Kwarteng n’ọrụ dịka onyeisi ụlọakụ mba Briten.

    Kwarteng gbakwuru arụkwaghịm dịka minista na-ahụ maka ego mba ahụ, mere nke a na-erughi otu ọnwa e were ya n’ọrụ ahụ.

    N'ozi Kwarteng ziputere n'elu Twitter ya, o gosiri na a gwara ya gbaa arụkwaghịm nke o kwetere mee.

    Liz Truss bụ Praịm Minista mba Briten, kwuru na "ọ dị ya mwute" na Kwarteng na-apụ, mana kwuo na ọ bụ "ezigbo enyi ya".

    Ọchụchụ a emeela Kwarteng onye nke abụọ na ndị minista ego mba Briten oge ọchịchị ya pekarịchara na mpe. Onye nke mbụ bụ Iain Mcleod - nwụrụ ka naanị otu afọ e ji mee ya minista n'ọnwa Juun 1970 gachara.

    Cheta na Kwarteng banyere ọchịchị n'ụbọchị isii nke ọnwa Septemba afọ 2022.

    N'otu aka ahụ, a họpụtala Jeremy Hunt dịka onye ga-anọchi Kwarteng dịka onyeisi ụlọakụ mba Briten.

  18. Unu abọọla chi e! Afọ ga-enwetere anyị ihe ọma taa.

  19. Agụnyela Tobi Amusan na ndị nwereike ịweta nturu ugo 'World Athlete of the Year 2022

    Tobi Amusan egosila obi ụtọ ya dịka a họpụtara ya na ndị nwere ike irite nturuugo 'World Athlete of the Year nke afọ a nke otuWorld Athletics na-ahazi.

    Ọ sị na ya enwetela ọtụtụ nturugo mbụ mana nhọpụtanke a nyere ya obi ụtọ pụrụiche.

    Cheta na gọomentị Naịjirịa nyere ya nturuugo Member of the Order of the Niger (MON) ụbọchị gara ga.

  20. Ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa enyela nkwenya ha ka agụọ akwụkwọ mkpata na mmefu akụ 2023 nke ugboro abụọ ya

    Ụmụibe, ụlọomeiwu ukwu Naịjrịa akwadola ka a gụọ akwụkwọ mkpata na mmefu akụ nke 2023 ugboro abụọ n'ọgbakọ ha dịka ha gara ezumike otu ọnwa.

    Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari nyere ụlọomeiwu bọjetị nke ego ya dị tarị Naịra iri abụọ na ụma n'izu gara aga.