You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ọ ka mma ka ụlọikpe kpezie esemokwu dapụtara na ntuliaka – Hope Uzodimma

Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo Steeti sị ka na-azọ ọkwa ṅụọ iyi iji ụlọikpe kpezie nhọtahie ọbụla pụtara na ntuliaka.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ụlọikpe enyela iwu maka ego ụlọọrụ Chinmark

    Ụlọikpe elu nke Legọs steeti enyela iwu ka ụlọakụ niile nọ na Naijirịa hara itinye aka n'ego ọbụla gbasara ụlọọrụ Chinmark na mmadụ atọọzọ ikpe a metụtara.

    Kama ụlọikpe nyere iwu ka ewepụta naịra narị nde abụọ, na nde iri anọ na isii, na nari puku isii na iri maka ndị gbara akwụkwọ a n'ihji ụgwọ Chinmark ji ha.

  2. Lee oge a ga-azọ ọkwa gọvanọ Bayelsa, Imo na Kogi steeti.

    Ngalaba na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent Electoral Commission bụ NEC n'ịchafụ ekwuola na ọ bụ n'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Nọvemba afọ 2023 ka a ga-eme ntuliaka nke gọvanọ Bayelsa, Imo na Kogi steeti.

    INEC kwuru nke a n'akwụkwọ ozi kọmịshọna ngalaba a bụ Festus Okoye wepụtara bụ usoro iwu Naijirịa dịka ọchịchi gọvanọ Imo steti ga-agwụ n'ụbọchị iri na anọ nka ọnwa Jenụwarị afọ 2024, nke gọvanọ Kogi steeti ga-agwụ n'ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa Jenụwarị ma nke Bayelsa ga-abụ n'ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Febuwarị afọ 2024.

  3. Ụnụ abọọla chi

    Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

  4. Mgbanwe ndị ọkaikpe 'Appeal Court' abụghị maka ikpe Nnamdi Kanu

    Isi ụlọọrụ Ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja akọwaala na mgbanwe ndị ọkaikpe n'ụlọikpe mkpegharị dị icheiche na Naịjirịa abụghị maka ikpe Mazi Nnamdi kanu nke na-aga n'ihu n'ụlọikpe mkpegharị ugbua.

    Ha wepụtara nkọwa a taa bụ Tuzde, n'ihi akụkọ na-efegharị na soshal midịa nke na-ekwu na gọọmentị ewepụla ndị ọkaikpe atọ kụchapụrụ ebubo gọọmentị Naịjirịa na-ebo Nnamdi Kanu, ma kwuo na ikpe amaghị ya.

    Onye ji ọkwa 'Chief Registrar' n'isi ụlọọrọ Ụlọikpe Mkpegharị bụ Umar Bangari kwuru na ọ bụghị eziokwu na a gbanwere ndị ọkaiwu atọ ahụ n'ihi mkpebi ha nyere gbasara Nnamdi Kanu.

    "Anyị chọrọ iji ohere a kọwaa hoohaa na mgbanwe ndị Ọkaikpe nke Ụlọikpe Mkpegharị bụ ihe a na-emebu eme iji hụ na ọrụ ha na-aga n'ihu nke ọma etu o si kwesị."

    "N'ime ndị ọkaikpe 81 e nwere n'ụlọ ikpe mkpegharị niile dị na Naịjirịa, 21 bụ ndị e zigara na steeti ọzọ."

    "N'ime ndị ọkaikpe atọ kpebiri ikpe Mazi Kanu, naanị otu ka ya bụ mgbanwe metụtara."

    "Ya mere, ọ bụghị eziokwu na ọ bụ n'ihi ndị ọkaikpe kpebiri ikpe Nnamdi Kanu ka e ji bido atụmatụ nhazigharị a."

    Bangari kwuru na ụlọikpe mkpegharị na-enye onye ọbụla ohere ịbịa mata kpọmkwem ihe na-emenụ kama ikesasị akụkọ ụgha.

  5. Ihe Liz Truss kwuru dịka o si Downing Street pụọ

    Liz Truss ekwuola okwu ikpeazụ ya na Downing street bụ obi gọọmentị mba Briten dịka o kwuru “Ama m na anyị ga-aga n’ihu n’ibuso ihe ndị na-echere anyị aka mgba agha, e nwere m ntụkwasị obi n’ebe mba Briten nakwa be ndị mba Briten nọ, ama m na ọnọdụ ọdịnahu anyị ga-aka mma.”

    Truss na di ya esila n’ogige Downing Street pụọ ka o kwuchara okwu a.

    Cheta na ọ gbara arụkwaghaịm n’ọkwa Praịm minista mba ahụ n’ịzụ gara aga.

  6. St Louis: Onye ojiegbe agbagbuola mmadụ atọ n'ụlọakwụkwọ mba Amerịka

    Ihe ruru mmadụ atọ anwụọla ebe mmadụ asaa merụrụ ahụ mgbe onye ojiegbe wakporo ụlọakwụkwọ St Louis dị na Missouri mba Amerịka

    Nwaamadị a a na-eche mere ihe dị naanị afọ iri na itoolu wụbatara ụlọakwụkwọ ahụ n’ehihe Mọnde ma gbaa ebe aghara aghara tupu ndị uweojii awụchie ma kwụsị ya.

    Nnyocha gosiri na a gbachịrị ụzọ ụlọakwụkwọ a agbachị nke bụ na odebeghị anya etu ya bụ nwaamadị siri wụbata ogige ụlọakwụkwọ ahụ ma malite ịgba ndị mmadụ egbe.

    E kwukwara na ya bụ nwaamadị gụbụrụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ nke ụmụakwụkwọ nọ na ya ugbua ruru 400 ugbua.

    Ya na ndị uweojii kwakọrịtara mgbọ tupu ha ‘akwụsị’ ya.

  7. Lee ihe Buhari chọrọ ka e mee maka idemmiri na-akpa ike na Naịjirịa

    Onyeisiala Muhammdu Buhari enyela minista na-ahụ maka mmiri bụ Suleiman Adamu iwu ka o jiri ọnwa atọ wepụta usoro a ga-ei gboo nsogbu oke idemmiri na-akpa na Naịjirịa.

    N’ozi a onyeisiala Buhari zipụtara site n’aka onyeisi ndị ọrụ gọọmentị bụ Ibrahim Gambari, o nyere iwu ka minista mmiri na mmiri na-ahụ maka gburugburu ebe obibi nakwa minista njem rụkọọ ọrụ n’atụmatụ a ga-ebi n’ọnwa atọ.

    Ha kwuru na Buhari amalitela ịnata ozi ugboro ugboro banyere etu idemmiri a si akpa ike n’akụkụ Naijirịa dị icheiche.

    Cheta na ụlọọrụ gbata gbata Naịjirịa bụ National Emergency Management Agency (Nema) sị na idemmiri egbuolaihe karịrị mmadụ narị isii ma chụpụ ihe ruru mmadụ nde abụọ na ụma n’ụlọ ha na nso nso a.

  8. Otu ‘Actors Guild’ enyela onyeisi oche ngalaba nke Imo oche azụ

    Otu jịkọrọ ndị na-eme ihe ejije na Naijiria bụ ‘Actors Guild of Nigeria’ akwụsịla onyeisioche ngalaba ha nke Imo steeti bụ Nneoma Ukpabi ọrụ n’ike maka ebubo ‘ịkpa ajọ agwa”. Onyeisi otu ahụ bụ Emeka Rollas gwara BBC Igbo n’ozi ekwentị na ya bụ akụkọ bụ eziokwu, mana o kwughị kpọmkwem ihe Ukpabi mere. Ọ sịrị “Ee,ọ bụ eeziokwu mana agaghị m akọwa n’uju ihe mere . "

    "Oge ya na kọmiti na-ahụ maka ntaramaka ahụhụ mechara nnyocha ka anyị ga-ekwupụta n’uju ihe mere.”

  9. Ụlọikpe anapụla Diezani Alison-Madueke ụlọ abụọ, ụgbọala oke ọnụ ahịa abụọ

    Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja, enyela iwu ka a napụ onye bubu mịnịsta mmanụ agbịdị bụ Diezani Alison-Madueke,ụlọ ya abụọ n'Abuja nakwa ụgbọala dị oke ọnụahịa abụọ n'ụbọchị Monde.

    Ụlọ abụọ ndị a dị na "Plot 1854 Mohammed Mahashir Street, na #6, Aso Drive, dị na Asokoro, Abuja.

    Jọstịs Mobolaji Olajuwon,onye nọ n'isi okwu ahụ nyere iwu ka e nyefee Gọọmentị Etiti akụ ndị a.

  10. NAFDAC etiela mkpu maka ọgwụ adigboroja na-efegharị

    Ngalaba na-ahazi ọgwụ na nri na Naịjirịa bụ NAFDAC n'aha ịchafụ etiela mkpu gbasara ọgwụ akpọrọ ‘Augmentin’ nke adigboroja ya na-efegharị.

    Ha depụtara ọtụtụ ihe njirimara iji gosi na ọ bụ adịgboroja ma dọọ ndị mmadụ aka na ntị ha dịrị nkwadobe maka ya bụ ọgwụ.

    Ihe ndị ha depụtara gụnyere

    - aha ọgwụ

    - Akara njirimara ya

    - Ụbọchị arụpụlata ya (April 2021)

    - Ụbọchị ọ ga-emebi (April 2024)

    - Njirimara ụlọorụ adịghị ya.

    Ha gwara ndị mmaọdụ zụtara ya bụ ọgwụ ha kwụsi ire ya, ịzụta ya ma nyefee ụlọorụ NAFDAC ndị ka fọrọ ha n'aka.

  11. A gbagbuola Arshad Sharif , onye ntaakụkọ Pakistani na Kenya

    A gbagbuola onye ntaakụkọ Pakistani a ma ama bnbụ Arshad Sharif na Nairobi , mba Kenya.

    Ụlọọrụ ntaakụkọ Reuters kwuru na ọ bụ ndị uweojii na-achụ ndị ohi ụgbọala ọsọ gbara ụgbọala Sharif nọ na ya nke gbafere ogbochi okporoụzọ ha tinyerena-akwụsịghị,gbagburu ya, dịka ndị uweojii mba ahụ si kwuo.

    Ndị uweojii Kenya kwuru na ya bụ ihe mrere n’abalị ụbọchị Ụka , ebe Elekere iri.

    Onye uweojii welitere isi gwara otu ụlọntaakụkọ mba ahụ na ọ bụ ọnọdụ ịhụ mmadụ chee na ọ bụ onye ọzọ.

    Ozi si n’aka ndị uweojii na-ekwu na ọ bụ onye metụtara Sharif kwọ ụgbọala ahụ Sharif nọ n’ime ya gbafee, ndị uweojii wụrụ ụgbọala ahụ mgbọ itoolu , nke otu n’ime ya tụrụ ya n’isi.

    N’ozi o wepụtara n’akara Twitter ya, nwunye ya bụ Javeria Siddique kwuru na “ “enyi m, di m na onye ntaakụkọ kachasị masị m @arsched fularịrị taa.”

    Ọ gara n’ihu rịọ ka ndị ntaakụkọ ghara ikesa foto ezinaụlọ ha nakwa oge ikpeazu di ya n’akụkọ ha iji kwanyere ha ugwu.

    Arshad Sharif bụ onye ntaakụkọ Pakistani na-agbasaozi na ihe onyonyo TV.

    A mụrụ ya na Karachi n'afọ 1973.

    Nwa amadị a malịtere ọrụ ntaakụkọ dịka nwa akwụkwọ mahadum, arụọrọla ọtụtụ ụlọntaakụkọ dị iche iche na Pakistan nakwa mba Briten.

    Ọ hapụrụ nwunye ya bụ Javeria Siddique were laa mmụọ.

  12. Ihe ndị DSS kwuru maka ozi ịdọaka na ntị mba Amerịka zipụtara nye ndị bi n'Abuja

    Dịka mba Amerịka zipụtara ozi na-ekwu na a na-atụ anya mwakpo n’akụkụ ụfodụ ebe ole m ole n’Abuja, ngalaba ndị uweojii Naịjirịa pụrụiche bụ Department of State Services (DSS) ezipụtala ozi nye ndị bi n’Abuja banyere ya bụ ozi ịdọaka na ntị.

    Ozi DSS kwuru “Anyị anatala ọtụtụ ozi na-ajụ maka ihe a mba Amerịka kwuru n’ụbọchị 23 nke ọnwa Ọktoba, cheta na anyị ezipụtala udịrị ozi ndị a ugboro ugboro n’oge gara aga.”

    “Anyị na-arịọ ọha ka ha tinyere anyị aka n’ọrụ nnyopụta ma gbado anyị n’ihe ndị na-eme n’akụkụ ha”

    “Anyị na-arịọ ọha ka ha zitere anyị ihe ọbụla dị aṅaa ma na-ekwu ka mmadụ niile nọrọ juu n’ime Abuja, anyị nọ n’ọrụ anyị”

    Ozi mba Amerịka kwuru na a na-atụ anya na e nwereike iwakpo akụkụ Abuja ọkachasị ụlọọrụ gọọmentị dị iche iche, ụlọụka nakwa ebe ekpere, ụlọ oriri na nkwarị, ụlọ ndịna, ọdọ ebe ndị njem, ụlọikpe dị icheiche, isi ụlọọrụ ndị mba ofesi nakwa ebe ndị ọzọ.

    Ozi ha nye ndị mba ha kwuru ka ha zeere ebe ndị a, gbado anya, zeere ọgbakọ ọha, jiri akwakwọ njiri mara ha ma kwụnye ekwentị ha n’ọkụ ka o nwee ndụ maka ọsọ chụkwa.

  13. Boris Johnson akagbuola atụmatụ ya ịzọ ọkwa Praịm mba UK ọzọ

    Boris Johnson bụbu Praịm minista mba UK a chụrụ achụ akagbuola atụmatụ ya isonye zọọ ọkwa ahụ ọzọ dịka Liz Truss nọchiri anya ya rituru n’ọkwa.

    Mkpebi a nke Johnson sị na ọ chọbughi ime bịara mgbe ọ chọpụtara na ọ gaghị achịkọtanwu ndị omeiwu na-enweghi ịdị n’otu n’ime ha.

    Nke a mere ka ohere Rishi Sunak bụbu minista akụnaụba mba nwere ịbụ praịm minista ọhụrụ gbagoo elu.

    Johnson sị na mgbọ ọ na-agba ịchịkọta ndị ọzọ na-azọ ọkwa ahụ ka nwee nkwekọrịta maka ọdịmma mba UK amịtaghị mkpụrụ.

    “Ya mere akagbuola m atụmatụ m ịzọ ọkwa ma kpebie ịdọnyere ọnye ọbụla meriri ukwu.

    “Ekwenyere m na m nwere ọtụtụ ihe m ga-eme ma ọ bụrụ mana ugbua abụghị oge ahụ.”

  14. Gọmentị etiti akpọlatala ụmụnwaanyị 460 tọrọ atọ na UAE

    Gọọmentị etiti esila n'ụlọọrụ na-ahụ maka ọdịmma ndị Naịjirịa n'ofesi bụ NIDCOM n'ịchafụ kpọlata mmadụ 542 bụ ndị Nọ́ịjirịa tọburu atọ na mba UAE

    N'ime ndị ahụ, e nwere ụmụaka atọ, ụmụ nwoke iri asaa nakwa ụmụnwaanyị karịrị narị anọ.

    Dịka NIDCOM si kwuputa n'akara Twitter ha, ụgbọelu bu ndị ahụ feturu na Naịjirịa n'ụtụtu ebe elekere anọ n'ụbọchị Sunde.

    Ọ bụkwa n'ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n'Abuja ka nke a mere.

  15. Onyeisiala Muhammadu Buhari agawala South Korea maka ọgbakọ WHO

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ga-efepụ gawa mba Saụt Koria taa maka ọgbakọ nke ngalaba WHO hibere ebe ahụ.

    A na-atụ anya na onyeisiala ga- eso nye nkuzi na ya bụ ọgbakọ ma mehcaa zutekwa onyeisiala Saụt Koria bụ Yun Sook-Yeol ịkpa maka ihe ndị ọzọ gbasara mba abụo ha.

    Ọgbakọ a nke WHO hibere bụ iji kpa maka ọganihu ụfọdụ mba kwesiri ịnata enyemaka n'ihe gbasara ahụike ọ kachasị ọgwụ mgbochi.

  16. Unu abọọla chi ndị ọma!

    Soronu anyị na peeji anyị maka akụkọ dị ọkụ ka o si dị ọkụ n'ụbọchị ụka a!

  17. Ka chi foo nụ

    Rahụ nu duu...ka ọ dị echi

  18. Azọpụtala ụmụakwụkwọ Chibok abụọ atọọrọ n'afọ 2014 na ụmụ ha

    Ndị agha Naijirịa ekwuola na ha azọpụtala Yana Pogu na ụmụ ya anọ na Rejoice Sanki na ụmụ ya abụọ bụụmụ akwụkwọ Chịbok ndị boko haram tọọrọ n'afọ 2014.

    Ọ bụ ọchịagha Christopher Musa gwara ndị ntaakụko nke a n'Abuja ma sị na ha enyefeela ha n'aka gọọmentị.

    Cheta na otu Boko Haram tọorọ ụmụakwụkwọ 276 n'ụlọakwụkwọ nke Chibok dị na Borno steeti n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Aprel afọ 2014

  19. Etu Ndị uweojii si nwụchi nwoke gbara nwata nwaanyị ọtọ tie ya ihe

    Ndị uweojii Nasarawa steeti anwụchiela mmadụ abụọ aka ha dị n'iwakpo otu nwata nwaayị n'isi obodo steeti ahụ bụ Lafia.

    Ihe onyonyo malitere ifesa ebe otu nwoke bụ okenye, ụmụ nwoke ntorobia abụo ndị ọzọ nakwa otu nwaanyị jikọrọ aka na-eti nwata nwaanyị ọzọ ihe.

    Kepu kepu na-ekwu na nwoke okenye nọ n'ihe onyonyo ahụ bụ onye nkuzi ukwu na Mahadum gọọmentị dị na steeti ahụ mana o dobeghi anya ma nke a bụ eziokwu.

    Akụko kwukwara na ọ bụ esemokwu dapụtara n'etiti nwa nwoke ahụ nakwa nke etiri ihe butere nke a.

  20. Ụgbọelu akpọkasịala na Keene, mba Amerịka

    Ụgbọelu etinyela isi n'ụlọ ebe ndị mmadụ bi kpọkachia nwuru ọkụ Keene dị na New Hampshire dị n' Amerịka n'abalị Fraide.

    Ndị uweojii Keene kwuru na ndị nile nọ n'ụgbọelu ahụ amabeghị ole ha dị nwụrụ mana o nweghị onye bi n'ụlọ ahụ o metụtara.

    Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ndị bi n'ụlọ ahụ gbapụtara ka ha nụrụ ụzụ ụgbọelu ahụ dịka ọdachi ahụ mebiiri ụlọ ahụ nke dị nso n'ọdọụgbọelu.

    Ndị ọrụ gbatagbata azochiela n'ebe ihe mere .

    O dobeghị anya ma ụgbọelu ahụ ọ na-efetu efetu ka ọ na-efepụ efepụ oge ọdachi ahụ mere.