Emume Headies nke afọ 2022 abịla ma gafee, mana akụkọ ya ka ọtụtụ ndị ntorobịa ka kpụ n'ọnụ ọ kachasị na soshal midia na Naịjirịa taa.
Headies so na nturuugo ndị otiegwu nke a kacha akwanyere ugwu na Naịjirịa.
Ihe pụrụ iche n'emume Headies nke afọ a bụ na e mere ya n'obodo Atlanta nke dị na mba Amerịca.
Ọtụtụ ndị otiegwu a ma ama na Naịjirịa nakwa ụfọdụ ndị ka na-ebilite ebilite ritere nturuugo dị icheiche
Wizkid na Burnaboy gosikwara ihe ha ji bụrụ ndị otiegwu a kacha anụ aha ha na Naịjirịa ugbua.
Ngwa lee etu okwe siri gbaa na nke afọ a:
Wizkid (Big Wiz) ritere nturuugo anọ
Egwu RnB kacha mma - Wizkid na Tems - Essence
Egwu kacha mma mmadụ abụọ jikọrọ aka ọnụ gụọ - Wizkid na Tems - Essence
Efere egwu kacha mma n'afọ 2022 - Wizkid - Made in Lagos (Deluxe Edition)
Efere egwu 'Afrobeat' kacha mma n'afọ 2022 - Wizkid - Made in Lagos
Burnaboy na Davido ritekwara nturuugo abụọ abụọ
Otiegwu bụ ọkaibe n'afọ 2022 - Burna Boy
Otiegwu nwoke kacha bụrụ ọkaibe - Burna Boy
Nturugo 'Digital Artiste' nke afọ 2022 - Davido
Otiegwu kacha nwee mmụọ inyere ọha aka - Davido
Ndị ọzọ ritere nturuugo gụnyere:
Egwu ntabi ire (Rap) kacha mma - Olamide - Carpe Diem
Ode egwu kacha ibe ya n'afọ a - Adekunle Gold - Sinner
'Recording' kacha mma n'afọ a - Patoranking - Celebrate me
Efere egwu Reggae na Dancehall kacha mma - Patoranking - Three
Ome egwu (Producer) kacha mma - SARZ - Monalisa - Lojay na SARZ
'Alternative Album' kacha mma - Ibeji - Intermission
Headies Viewers Choice - Arya Starr - Bloody Samaritan
Egwu Afrobeat kacha mma - Fireboy DML (Peru)
Onyonyo Egwu kacha mma - TG Omori - Champion – Fireboy DML na D Smoke
Olu ọma kacha mma (nwaanyị) - Waje - Last Time
Olu ọma kacha mma (nwoke) - Oxlade - Ojuju
Ode egwu kacha mma (Lyricist) - AQ - The Last Cypher
Streethop Artiste kacha mma - Goya Menor & Nektunez - Amenor Amapiano remix
Egwu rap kacha mma – Ladipoe feat BNXN - Feeling
'Alternative Single' kacha mma – Flavour - Doings
Onye ọhụrụ kacha mee ọfụma n'afọ a (Rookie of the year) – Fave
Egwu kacha metụ n'obi ('Inspirational Single') – Kcee na Okwesili Eze group - Cultural Praise