You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Azọgbuola ihe ruru mmadụ 174 n'ọgbọ egwuregwu n'Indonesia

Ọtụtụ mmadụ nwụrụ ebe ụfọdụ meruru ahụ n'ama egwuregwu dị n'Indonesia.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ihe karịrị mmadụ 300 anwụọla n’aka idemmiiri na Naịjirịa kemgbe Julaị

    Gọọmentị Naịjirịa agbaala ama ihe ruru mmadụị 300 anwụọla site n’idemmiri dịka ya bụ ihe chụpụrụla ihe karịrị mmadụ 100,000 n’ebe obibi ha n’akụkụ Naịjirịa dị icheiche kemgbe ọnwa Julaị nke afọ a.

    Ihe ọdachị a emetụtala ọtụtụ ezinaụlọ nakwa ugbo ndị mmadụ n’ebe ndị a.

    Naịjirịa na-ahụ ụdịrị idemmiri a na-ahụbeghị n’afọ olemole gara aga.

    Ka ozi gọọmentị siri kwuo, idemmiri ndị a emetụtala steeti 29 n’ime 36 steeti ndị nọ na Naịjirịa.

    Oke mmiri ozizo nọ n’isi ihe na-akpata idemmiri ndị a. Ụlọọrụ gbata gbata Naịjriịa nke National Emergency Management Agency (Nema) ezipụtala ozi ịdọ aka na ntị ma kwuo ka ọha chee ghọrọ idemmiri ndị ọzọ nwereike ime n’izu olemole na-abịa abịa.

    Onyeisi ụlọọrụ a bụ Ahmed Mustapha Habib kwuru na ha ezipụla ọtụtụ ndị ọrụ gbatagbata nakwa akụrụngwa ọrụ ha maka ọnọdụ ihe na-eme ugbua na Naịjirịa.

  2. Amaju Pinnick achiliela aka n'ọrụ taa bụ Tuzde

    Taa bụ Tuzde ka ọrụ Amaju Pinnick ga-ebe dịka onyeisi ndị Nigeria Football Federation.

    Ọchịchị afọ asatọ ya buteere Naịjirịa iko Under 17 n'afọ 2015, Iko ọkaibe ụmụnwaanyị Nke Afrịka n'afọ 2018, iko ọla nchara na Olympics n'afọ 2016 na Iko ọkaibe Afrịka na 2019.

    Ka ọ dịna, ndị nkatọ na-ekwu na Pinnick emeghị nke ọma maka na onye oso n'afụ bụ Aminu Maigari ka ya mee nke ọma maka na o butere iko 13 n'afọ anọ ọ chiri nke gụnyere Iko African Cup of Nations (AFCON) ebe Pinnick butere naanị iko atọ n'afọ asatọ.

    Ha kwukwara na ọ bụ na ọchịchi Pinnick ka Naịjirịa kpụrụ afọ n'ala ugboro abụọ agaghị asọmpi African Cup of Nations (AFCON).

    Ndị nkatọ a sịkwa na ọchịchị Pinnick emeghịrị asọmpi Ụmụnwaanyị nke ọma site otu ha siri mee ugbua nke gosiri ọnyụpaa ha gbara n'asọmpi Women’s African Cup of Nations (WAFCON) n'afọ a.

  3. Ọrịa otoro egbuola ihe kaịrị mmadụ iri ndị bụbu ndị otu Boko Haram

    Ọrịa otoro egbuola opekete mpe mmadụ iri na abụọ n’ogige ndị bụbu ndị agha otu Boko Haram bi na Maiduguri.

    Otu Charity Medecins Sans Frontieres na-ekwu na ọnụ ọgụgụ ndị butere ya bụ ọrịa esila na mmadụ iri ise n’ime otu izuụka ruo mmadụ narị abụọ na iri ise n’izuụka gara aga.

    E dowere ọtụtụ ndị otu Boko Haram chegharịrị n'ogige Shokari camp dị na Borno steeti mgbe ọtụtụ n'ime ha gbapụrụ ọsọ ndụ mgbe e gburu onyeisi ha bụ Abubakar Shekau n'afọ gara ga.

    Mana ọtụtụ nọ ebe ahụ sị na ọnọdụ ebe ahụ adịghị ọcha nke bụ na mposi na-eweufu ewufu n'ụlọ mposi ha.

    O docheghị anya mmadụ ole ọrịa otoro gbugoro ebe ahụ mana otu onye nọ nso ebe ahụ sị na ya maara mmadụ anọ bụ ụmụaka nwugoro ebe ahụ.

    Ndị otu ọrụ obiebere Charity Medecins Sans Frontieres sị na ọrịa otoro na anyụ ndị mmadụ ịkpakwụ na Maiduguri nso nso a.

    N'afọ gara aga, Naijirịa hushiri anya n'ọrịa otoro nke mmadụ mmadụ ruru 100,000 butere nke tara isi 3,500 n'ime ha.

  4. Typhoon Nanmadol: Oke mmiri ozizo na oke ikuku anyụọla Japa Ikpakwụ

    Oke mmiri ozizo na ikuku a kpọrọ Typhoon Nanmadol egbuwola ihe dịka mmadụ abụọ na Japan meruo ihe dịka iri itoolu ahụ n'isi ụtụtụ ụbọchị ụka.

    Ụlọọrụ mgbasa ozi ha bụ NHK sị na ya bụ ikuku na oke mmiiri achụpụla nde kwuru nde mmadụ na be ha na Kyushu.

    Ihe ruru mmadụ nde itoolu agbaala ọsọ ndụ na mpaghara ndịdị mba ahụ ebe ihe ruru 350,000 enweghị ọkụ be ha.

    Ndị amụmụ sayiensi sị na mmiri nke ka njọ ka na-abịakwa na ha na-atụ anya ihe dịka mmiri ozizo ruru 400 mm maọbụ 16in ma a tụgharịa ya n'ime otu ụbọchị.

    NHK sị na otu nwoke nwụrụ mgbe ụgbọala ya furu n'ime ideremmiri ebe otu onye ọzọ nwụrụ n'ime apịtị, ebe a na-achọ otu onye achọ.

    Ha sịkwa na mmadụ 87 meruru ahụ.

    Ya bụ ajọ ikuku chị ọsọ ruru kilomita 234 maọbụ 144km/h mebiri ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ, okporoụzọ nakwa ụlọahịa ndị mmadụ.

    A sị na ya bụ ikuku rukwara ogogo nke anọ ma ọbụrụ oke ikuku 'hurricane'.

    Oke mmiri zokwara na Tokyo bụ isiobodo ha mere ka akwụsi ọrụ n'okpuruala ugbo oloko maka idemmiri ahụ.

    Ugbo Oloko, ụgbọelu, na ụgbọmmiri na ụlọọrụ ndị ọzọ mechichara ọrụ maka ya bụ oke ikuku.

    Ihe onyonyo si ebe ahụ pụta gosiri gbamgbam ụlọ ndị mmadụ fokalichara, na ụgbọedemede azụmahịa dịcha n'ụzọ dachaa.

    Nke a mere ka Praịm Minister mba ahụ bụ Fumio Kishida kwesiri ikwu okwu n'ọgbakọ UN na New York, Amerịka gatụ n'azụ oge.

    Amụma sayiense buru na ya bụ oke ikuku ga-ekuga ọdịda anyaanwụ mba ahụ, gafere ime Japan tupu o banye oshimiri ụbọchị Wenezde.

    Ndị amụmụ sayiensi ahụ kwukwara na oke ikuku ga-eku n'afọ a nke La Niṅa ga-ebute.

  5. Ụnụ asaala chi ee! Ọbọrọ chị kele chi, taa bụ Afọ.

  6. Otu NANS anọchiele ụzọ esi abanye ọdọụgbọelu dị na Legọs steeti

    Ndị otu jikọrọ ụmụakwụkwọ mahadum na Naịjirịọ́ bụ National Association of Nigeria Students anọchiela okporoụzọ Murtala Muhammed International Airport dị na Legọs dịka ka kwere na nkwa.

    Ụmụakwụkwọ ndị na-esi ọnwụ ka akwụsị abụbụ ọrụ ndị Asuu na-agba kemgbe ihe karịrị ọnwa isii ugbua.

    Onye na-achikọta mpaghara ọdịda anywnụ Naijirịa bụ Stephen Tegbe gwara ndị ntaakụkọ Vanguard sị " Mgbe anyị hụrụ etu o siri gaa taa, ka anyị ga-atule ihe anyị ga-eme, Oge ole ka anyị ga-anọ n'ụlọ na enweghị ihe anyị na-eme. NDị ọchịchị anyị na=akpa agwa ka ihe niile ọ dị mma maka na ụmụ ha na-aga akwụkwọ n'ala bekee.

  7. Unknown gunmen: "ndị niile anyị jidere bụ ndị Igbo" - Soludo

    Gọvanọ Anambra bụ Chukwuma Soludo ekwuola na ndị niile ha jidere maka ohi na mwakpo niile dị icheichi na Steeti ahụ bụchị ndị Igbo.

    O kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ na Channel TV n'abalị ụnyaanhụ ebe ọ nọ kwụọ na ndị oji egbe ahụ a sị na amaghị ndị ha bụ, na a macha ha.

    Ọ sị, "nke bụ eziokwụ bụ na ọ bụ ndị Igbo na-eme onwe ha ihe a niile. Ọ bụghị ndị si esi."

    O kwuru na ndị Igbo niile na-abịa n'Anambra steeti.

    O kwukwara na ndị mbụ ha jiere bụ ndị Igbo sicha mpaghara ala Igbo ndị ọzọ na-abụghị ndị Anambra steeti.

    Soludo kwukwara na mgbe ha banyeziri ya bụ agha ibuso ndị omekome ime, ha chọpụtaziri na ụmụ Anambra so eme ya bụ mpụ.

    Ọ sị, "anyị na-emesi ha ike, agbanyeghị ebe onye si. Onye ọbụla anyị hụrụ ji egbe nọrọ n'ọhịa bụ onye ekperima. Ọ nweghị ihe ọzọ onye ahụ na-eme ebe ahụ. Kedụ ka mmadụ ga-esị nọrọ 'ime ọhịa buru egbe,ọ naghị eri nrị otu ụbọchị, abụọ, atọ, otu ọnwa, ọnwa abụọ. Kedụ ka onye ahụ si eri ihe? Mbanụ. Onye ahụ bụ onye ohi."

    Soludo sị na ya dị njikere ịwebata udo n'Anambra steeti ịme ka ndị bi ebe ahụ biri n'udo na ọṅụ.

    Gịnị na-akpọtụ kemgbe Soludo weghaara ọchịchị?

    Ọnọdụ enweghị ezi nchekwa na-arị ibe ya elụ kemgbe Maachi 2022 soludo nweghaara ọchịchị.

    Mgbe adịghị anya, ndị oji egbe a sị na-amaghị ndị ha bụ tọọrọ ma gbuo otu onye omeiwu Steeti ahụ bụ Okechukwu Okoye.

    Ndị ntọ tọọrọ ya bụ anwaamadị ama dịka Okey di Okey na ụbọchị iri na ise nke ọnwa Mee 2022 n'Okpuruọchịchị Agụata bụ ebe o sị anọchite anye ndị Aguata ii constituency.

    Ka ha mechere nke a, the Omekome obi tara mmiri gbukwara otu nwaanyị onye ugwu bụ Hariri Jubril na ụmụ ya anọ.

    Ọ bụ mgbe ahụ ka Soludo jiri tinye ọnụdụ onye apụla ezi na Steeti ahụ malite n'elekere isii nke abalị ruo elekee isii nke isi ụtụtụ.

    Abalị ole ma ole gara aga, ndị omekome ahụ chọrọ ịgbagbu Ifeanyị Uba bụ nke tara isi mmadụ ise so ya.

  8. Unu Asaala Chi eee!. Taa bụ Orie. Orie biko wepụrụ anyị ajọ ihe ma nwetere anyị ihe ọma

  9. Anaghị atụ anya na Nwaeze Mohammed Bin Salman ga-esonye emume akwamuozu Ezenwaanyị

    Anaghịzị atụ anya na Nwaeze nke mba Saudi Arabia bụ Mohammed Bin Salma ga-esonye emume akwamuozu Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ dịka ụlọọrụ na-ahụ maka mmekọ mba na mba na Briten si kwuo.

    Nke a dị n’ozi ụlọ ntaakụkọ Reuters wepụtara nke kwuru na ọ bụ mba Saudi Arabia mere mkpebi a.

    Cheta na n’otu dị iche iche na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye nye ndị mmaọ̄ụ katọrọ oku a sị mba UK kpọrọ Nwaeze ahụ.

    Nke a bụ maka ebubo na ọ nyere iwu ka e gbuo otu onye ntaakụko mba ahụ bụ Jamal Khashoggi n’afọ 2018.

    Agbanyeghị na Nwaeze a ghọrọ aka ya na ụkwụ ya n’ebubo a, ịtụ aka etetọọla uwe ya n’ihu mmekọ ya ma ndị mba ofesi dị iche iche nke bụ na ọ bịabeghị mba Briten kemgbe egburu onye ntaakụkọ ahụ.

    Ọtụtụ ndị nọ ụlọọrụ na-anọchịteanya mba Saudi na Brịten nso kwuru na a na-atụ anyana Nwaeze Mohammed Bin Salma ga-abịa emume akwamuozu a mana ozi sị ndị nọ nso ụlọọrụ a na-ekwuzị na Nwaeze nke ọzọ bụ Turki al-Faisal bụ onye ga-esonye emume ahụ.

    Oku a kpọkwara mba Chaịna akpalitela ọtụtụ nkatọ ọkachasị dịka akụkọ pụtara na mba ahụ na-emekpa ndị ụka Alakụba nke Uyghurs ahụ n’akụkụ Xinjiang.

    Agbanyeghị nke a, mba Chaịna agbaala ama na osote onyeisiala ha bụ Wang Qishan ga-esonye n’akwamozu a.

  10. Ethan Nwaneri: Nwaamadị a abụrụla onye kacha dị nwata n’asọmpị Premier League

    Ethan Nwaneri dị afọ 15 abụrụla onye ọgbaa bọọlụ kacha dị nta n’asọmpị Premier League ugbua dịka o sonyere Arsenal n’egwu nke taa bụ Sọnde.

    Arsenal tiri otu Brentford mmanwụ dịka ha ji goolu atọ asataghị ihe ọbụla menya ha ihere n’ehihe a.

    A mụrụ nwaamadị a bụ onye mba Briten ugbua n’ọnwa Maachị nke afọ 2007 dịka ọ nọchịrịanya Fabio Vieira n’egwu nke taa.

    Onye jibụ ọkwa onye kacha dị nwata n’asọmpị Premier League bụ Harvey Elliott dị afọ 16 mgbe ọ gbaara Fulham egwu nke mbụ ya n’afọ 2019.

    Nke a mere Nwaneri onye ọgbaa bọọlụ mbụ na-erubeghị afọ 16 na-esonye n’egwu Premier League.

    Nwaneri esonyela n’ọtụtụ egwuregwu otu Arsenal nke ndị erubeghị afọ 18 wee gbaa dịka o sonyekwaara otu mba Ịnglandị nke ndị na-erubeghị afọ 16 mgbe ọ dị naanị afọ 14.

    N’ụbọchị asatọ nke ọnwa Ọọgọst, ọ nyere goolu n’asọmpị nyeere otu Arsenal nke ndị erubeghịafọ 17 goolu ụbọchị ha na otu Faroe Islands zutere.

  11. Ụlọụka Katolik n'Owere etinyechila 'Kiss of Peace' akwụsịburu maka covid-19

    Ụka katọlịk na Naịjirịa ewepụla mmachi ha tibụrụ n’ọmenala ikwe aka n’oge a na-aka ụka nke eji egosi nnabata na udo n’etiti ndị ụka.

    Ha machịbụrụ nke a n’oge mmbụbawanye ọrịa covid-19 n’ụwa mana dịka ha mechapụrụ ọgbakọ Catholic Bishops’ Conference of Nigeria n’Imo, ha kpebiri iwepụ ya n’ihi ọrịa covid anaghịzi efesasiike na Naịjirịa.

    Ha gbasara ozi maka nke a n'akwụkwọ nke onye enyemaka onyeisi ọgbakọ ahụ bụ Cosmas Uzoigwe binyere aka na ya.

  12. Ka chi fo

    Daalụ nụ n'isonye anyị taa.

    Anyị ga-amalitekwa ọzọ echi. Udo!

  13. Ndị uweojii anwụchiela nwoke mba Chaina gburu enyi ya nwaanyị

    Ndị uweojii Kano steeti anwụchiela otu nwoke mba Chaina gburu enyi ya nwaanyị na steeti ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ha bụ Abdullahi Kiyawa gwara BBC na ha jichiri nwoke ahụ ma na-agba ya ajụjụ ọnụ maka ihe mere.

    Akụkọ na-ekwu na nwoke ahụ gara be enyi ya nwaanyị bụ Ummukulthum Sani na mgbede ụbọchị Fraịde ebe o ji mma bewaa ya onu.

    Ọ bụ dịka ndị bi ebe ahụ malitere iti mkpu ka ejichiri ya bụ nwoke.

  14. Ụlọukwu 'Skyscraper' mba Chaịna agbaala ọkụ

    Akụkọ apụtala na-ekwu na ọkụ agbaala otu ụlọukwu Skyscraper dị n'obodo Changsha dị na mba Chaina.

    Ihe onyonyo eweputara na soshal midia gosiri ebe ọkụ na-agba n'ahụ ụlọ ukwu ahụ dịka ndị ọrụ na-agba ọsọ ịgbapụta n'ime ya.

    Ndị ọrụ gbatagbata akọwaala na emenyụọla ya bụ ọkụ ugbua ma kwukwaa na o nwebeghi onye ya bụ ihe tara isi ya dịka ha sị mara.

    Dịka ọ dị ugbua amabeghi ihe butere ya bụ ọkụ gbara n'ụlọ ahụ na mba Chaịna.

  15. Gọvanọ Nyesom Wike ewepụtala iwu ọhụrụ gbasara oke nwaanyị

    Gọvanọ Nyesom Wike nke Rivas Steeti ebinyeala aka na iwu ọhụrụ ga-eme ka ụmụnwaanyị nweta ikike iso keta oke n’akụnụba nne na nna ha.

    Iwu ahụ ga-eme ka nwoke na nwaanyị dịrị nhatanha n'okwu gbasara ike ala na akụnaụba nna maọbụ nne ma onye ahụ nwụọ.

    Wike gbarụrụ ihu maka etu ụfọdụ agbụrụ nọ na steeti ahụ si kwụsị ụmụnwaanyị iso keta oke nne na nna ha n'agbanyeghi na ha ka ụmụ nwoke ba uru n'obodo.

  16. Etu nwata si gbagbuo ọtụtụ mmadụ tinye ya n’ihe onyonyo n’Amerịka

    Ndị uweojii anwụchiela nwata dị afọ iri na itoolu na steeti Memphis mba Amerịka maka ịgbagbu mmadụ anọ ma merụọ ndị ọzọ ahụ.

    Nwata bụ onye a kpọrọ Ezekiel D. Kelly nọ n’aka ndị uweojii egbe ahụ nke ụda ya tinyere ụjọ n’ahụ ndị bi n’ogbe ahụ.

    Ọ gbara egbe ahụ ruo ihe ruru awa anọ n’abalị ụbọchị Wenesde.

    he onyonyo gosiri ebe Kelly banyere ụlọahịa a na-ere akụkụ ụgbọala ma gbagbuo otu nwoke.

    Ndị uweojii sị na ha e chere na o tinyere ya n’ihe onyonyo ‘Facebook live’.

    Ha dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha ghara ịpụta ezi, maọbụ ịbịa Kelly nso, na o ji egbe.

    Ndị uweojii sị na ha natara ọtụtụ akpọmoku banyere ogbugbu ndị mmadụ n’oge dị iche na ha niile bụcha aka ọrụ Kelly.

    Ndị uweojii a mechara nwuchie Kelly, napụ ya egbe ma bo ya ebubo igbu ọchụ.

  17. Naịjirịa akpachiela utu ịnyịnya-ibu achọrọ ibupu mba ofesi

    Ndị ọrụ Customs na ahụ maka mbụbata na ibupu ibu mba ofesi akpachiela utu ịnyanya-ibu dị puku asaa (7,000) n'ọdọụgbọelụ dị na Legọs.

    Ya bụ utu ịnyịnya-ibu na-aga Hong Kong mgbe ndị Custom kpachiri ya.

    Onyeisi ndị Customs nọ n'ọdọụgbọelụ Murtala Muhammed bụ Sambo Dangaladima sị na ha hụrụ utu ịnyịnya ndị ahụ na akpa iri na isii ebe agbara ha.

    Dangaladima sị na ọ bụ usi anụ ahụ gbaara ha ama.

    Ha na-akọwa na a ga-ereta utu ndị ahụ Naịra nde narị abụọ (N200,000,000) maọbụ Dọlla puku anọ, iri asaa na asatọ ($478,000.00).

    Ha sịkwa na onye bu ya bụ ibu gbara ọsọ hapụ ibu ya.

    Akụkọ na-ekwụ na a na-achọ anụ ịnyịnya achọ na China ebe a sị na ha ji ya eme ọgwụ.

    Iwu Naịjirịa machịrị ịre anụ ịnyịnya.

  18. Shooting of Police men in Enugu: Ndị uweojii Enugu steetị eforola ntụtụ taa maka onye otu ha ndị oshi gburu

    Ndị uweojii Enugu steeti ekwuputala ọnwụ ndị otu ha mmadụ atọ ndị omekome gburu n'abalị Wenezde na Upper Chime dị na New Haven Enugu steeti.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe sị na ndị omekome ahụ ji ụgbọala Lexus Jeep gbachiri ndị uweojii jikwa ụgbọala nke ha aga n'okporoụzọ ahụ were kwawa ha mgbo.

    Ndukwe sị na meruru mmadụ atọ ndị uweojii ahụ bụ ndị nwụrụ n'ụlọọgwụ ebe e bugara ha.

    Akụkọ ọzọ BBC hụrụ sị na ndị nọ nso ebe ya bụ ihe mere sị na ndị ohi ahụ chịkọọrọ egbe ndị uweojii ahụ gbaa ọsọ.

    Ndukwe sị na ndị uweojii amalitela ịma imi n'ala ịchọta ndị mere ihe ahụ mgbe o ji nkeji iri na ise gafee elekere iri nke abalị Wenezde.

    Ndukwe kọwara na ndị Uweojii ahụ nọ n'ụgbọala Hillux ha jiri nọrọ ọrụ abalị.

    "Ha ji ya bụ ụgbọala were na-agafe New Haven Enugwu, oge otu ụgbọala ji ọsọ gafee ha ma gbawa ha egbe".

    Otu onye bị na Nnanka Street na New Haven bụ Nkiru Ede kwuru na ha nụrụ ka ndị uwe ojii ahụ na eti mkpu ka ha na ndị ahụ na akwarịta mgbo na abali ahụ.

    Nkiru kwuru na ọge ụmụ ikorobia ogbe ahụ hụrụ na ndị ahụ apụọla ka ha gbapụtara were hụ ozu otu onye uweojii n'ime moto, ebe ozu abụọ nọ n'ime ọwammiri.

    Ọ bụzị DPO New Haven police station na ndị otu ya bịara buru ozu ndị otu ha na ụgbọala ha.

    PPRO Ndukwe kwuru na mmadụ atọ n'ime ndị uweojii ahụ anwụnụọla anya pii ma kwee mkwa na aka ndị uweojii ga-akpara ndị kpara ike ọjọọ a.

    Ka ọ dị ugbua ozu ndị uweojii atọ ahụ nọzi na be nchekwa ozu dị n'Enugwu.

  19. Nwaamadị gburu mmadụ na Canada anwụọla ka ndị uweojii nwuchichere ya

    Nwaamadị so na ndị gburu mmadụ iri ma meruo iri na itoolu ahụ na Canada anwụọla n'aka ndị uweojii ka anwụchichere ya.

    Myles Sanderson gbara afọ iri atọ na abụọ (32) nwuru ka ndị uweojii chụchara ya ajọ ọsọ n'ụzọ awara awara Saskatchewan.

    Ọsọ ndị uweojii chụrụ ya dị egwu nke mere ike jiri gwụ ya bụ nke butere ọnwụ ya.

    Ndị nweojii akọwaghị nke ọma ihe gburu ya mana ha kwuru na Sanderson meruru onwe ya ahụ.

    Mmadụ iri ha meruru ahụ ka nọ n'ụlọọgwụ, atọ n'ime ha nọ n'ọnụ ọnwụ.

    O dobeghị anya ihe mere mmadụ abụọ a jiri gbuwe ndị mmadụ agharaghara, mana ihe anyị ma bụ na mmadụ abụọ a mere ihe a Myles Sanderson na nwanne ya Damien, 31 anwụọla.

    Ọtụtụ n'ime ndị e gburu ma ndị gburu ha sị n'obodo James Smith Cree Nation.

    Ndị uweojii hụrụ ozu Damien ụbọchị Monde na enyocha ka ọ bụ nwanne ya gburu ya.

    Osote Komishona ndị uweojii n'ebe ahụ bụ Rhonda Blackmore kwuru n'abalị Wenezde na ha "ekuola ume ndụ ugbua".

    Ya bụ nwaada sị na ndị uweojii nweteburu ozi na Myles Sanderson gara zuru ụgbọala mmadụ n'ihu be ha, mana ha emerughị onye ahụ ahụ.

    Ndị uweojii chụrụ Sanderson ajọọ ọsọ ọgbara na kilomia 150 kwa awa.

    Ha chụbara ya n'olulu ebe ha nọ hụ mma dị na ụgbụọla ha bu.

    Ha jidere ya mgbe o ji ọkara gaa elekere atọ buga ya ụlọọgwụ dị na Saskatoon ebe ha nọzị kwupute ọnwụ ya.

  20. Ụnụ asaala chi e! Taa bụ Afọ. Afọ biko nwetere anyị ihe ọma o!