You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Azọgbuola ihe ruru mmadụ 174 n'ọgbọ egwuregwu n'Indonesia

Ọtụtụ mmadụ nwụrụ ebe ụfọdụ meruru ahụ n'ama egwuregwu dị n'Indonesia.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Mwakpo ụgbọala ndị agha Burkina Faso egbuola mmadụ 11

    Gọọmenti Burkina Faso si na e gburu ndị agha 11 ebe a ka na-achọ mmadụ nkịtị ruru 50 kamgbe ndị na-achọ jihad wakporo ha ka ha n-aga n'igwe.

    Ndị ọzọ karịrị mmadụ iri abụọ na asatọ gụnyere ndị agha 20 so na ndị merụrụ ahụ na mwakpo e mere na Monday. Ha si na ha amalitela ịchọ ndị furu efu.

    Ndị ọrụ nchekwa na ndị ọrụ a kwụ n'ụgbọala ndị ahụ na-eburu nri na ihe ndị ọzọ ndị bi n'ugwu mba ahụ.

    Mwakpo a sokwa mwakpo e mekwara ndị agha n'ụbọchị Sọnde merụrụ mmadụ anọ ahụ.

    Ndị agha Burkina Faso weere ọchịchị gọọmenti mba ahụ na Jenụwarị kwee nkwa na ha ga-akwụsị mwakpo ndịọ omekome gbugoro puku kwụrụ puku mmadụ ma gbasasịa ihe karịrị ndị mmadụ ruru nde abụọ kamgbe 2015.

  2. O nweghi onye nwere ikike izụta egbe na ngwa agha - Gọọmentị etiti asaala Akeredolu

    Ụlọọrụ Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na o nweghi steeti ọbụla ha nyere ikike ịzụta ngwa agha ma kwuo na onyeọbụla ji egbe ọbụla dara iwu.

    Ha kwuru nke a dịka Gọvanọ Ondo steeti bụ Rotimi Akeredolu na-akatọ gọọmentị maka ịkwụsị ụfọdụ steeti ịzụta ngwa e ji echekwa onwe ha ma nyekwa ụfọdụ steeti ikike ime nke a.

    Cheta na Akeredolu kwuru na gọọmenti etiti nyere otu ndị ọrụ nchekwa esoghi na gọọmentị ikike ibu ngwa agha na Katsina steeti mana ha enyeghi ndị Amotekun ụdịrị ikike ahụ.

    O kwuru maka otu ihe onyonyo na-efegharị gosiri ebe ndị nchekwa ahụ bu egbe AK-47 ha ji eme nchekwa.

    N'ozi ọnụ na-ekwuru onyeisiala Muhammad Buhari bụ Garba Shehu wepụtara, o kwuru hoo haa na "o nweghi steeti ọbụla, ma Katsina steeti e nyere ikike ibu ngwa agha maka nchekwa onwe ha".

  3. Nnọọnụ na peeji anyị taa

    Ịbọọla chi?

    Daalụ maka isonye anyị na peeji anyị taa.

  4. Attack on Labour Party Meeting in Enugu: Ohaneze Ndị Igbo enyela iwu ka ụdịrị ihe ahụ ghara ịme ọzọ

    Ọhaneze ndị Igbo agbarụọla ihu maka ya bụ ọgbaaghara mere na Nome, dị n'Okpuruọchịchị Nkanu East nke Enugu steeti, ụbọchị Satọde.

    Odeakwụkwọ mgbasa ozi ha bụ Alex Ogbonnia, na-akwụkwụ ha depụtere taa bụ Tuzde, sị na " Ọ dị nwụte na mgbe ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa na-akwado Labour Party dịka Pati ga-enye ha zọpụta, na ọ bụ ụmụ Igbo na-emebi ihe a na-eme".

    Ha dọrọ aka na ntị ka nke a bụrụ nke ikpeazu ụdiri ihe a na-eme n'ala Igbo.

    Ogbonnia rịrọ ndị isiobodo, ndị nche obodo na ndị isioche okpuruọchịchị obodo ka ha kee nkwụcha ma hụ na gbochiri ụdịrị ajọ akparamagwa.

    Ndị oji egbe amaghị ndị ha bụ bịara gbasaa ndị nọ n'ụlọakwụkwọ dị na-eme ahụ eme ọgbakọ.

    Ihe onyonyo ndị ahụ wepụtara na-ekwu okwu sị, "Obu ndị Labour Party. Ha chọrọ ịkpọta ndị Fulani ebe a". A nụrụ ụgba egbe ebe ahụ, hụkwa ebe ndị mmadụ na-erị mbọmbọ ọsọ.

    Igwe ndị Nomeh bụ Igwe Emmanuel I O Mba sị na "anọghị na ụlọ mgbe ya bụ ihe mere. Mgbe m nụrụ ya, akpọwara onyeisi ndị uweojii bụ onye sị na ya anubeghị ya mana na ndị ere ọgbakọ ahụ agwaghị na ha chọrọ ịme ọgbakọ".

    Mba sị na ọ dị mma na onye ọbụla chọrọ ịme ọgbakọ gwara ndị uweojii ka ha nye ha nchekwa.

    Igwe Ume sịkwa na ha amaghị ndị mere ya bụ ihe ma na tụrụ anya na ndị uwojii ga-achọta ha.

    Nke a bụ nke ugboro abụọ ụdịrị ihe a na-eme na Enugu steeti bụ ebe ndị oji egbe chụsara ndị Labour Party na-eme nzukọ.

    Nke mbụ bụ na okpuruọchịchị Awgụ dịkwa n'Enugu steeti n'ụbọchị anọ nke ọnwa Septemba 2022.

  5. Ụnụ anọọla ee! Ụbọchị ọma ee!

  6. 'Africa's Titanic': Ncheta ụgbọ Joola nke Senegal dakporo na mmiri

    Na Septemba 2002 ka ụgbọ mmiri a kpọrọ The Joola, nke gọọmenti Senegal nwere, dakporo na mmiri n'ọnụ mmiri Gambia, gburu ihe karịrị mmadụ 1,800. Sọọsọ mmadụ 64 ka dị ndụ.

    Ọ bụ ihe ọdachị nke abụọ kachasị njọ n'oge abụghị n'oge agha n'ụwa niile, nke tara isi mmadụ karịa ụgbọ mmiri Titanic ụwa niile ma ama.

    Ka afọ 20 gara, BBC lebara anya etu mmiri jiri baa n'opi mgbọrọọgụ ịmata ihe kpatara ya bụị ụgbọ mmiri ji wee dakpoo site n'anya ezinaụlọ ndị nwụrụ ma ndị fọrọ ndị dị ndụ ka na-akpoku ka ha welite ya bụ ụgbọ elu ebe ọ dakporo.

  7. Kerala lottery: Ike agwụla nwoke mba India nwetere ihe nrite n’asọmpị okwe ntụnye dịka ọha na-arịọ ya ego

    Otu nwoke onye mba India ekwuola na ike agwụla ya dịka ọtụtụ na-arịọ ya ego enyemaka kemgbe o nwetere ihe nrite ego n’asọmpị okwe ntụnye nke ‘Kerala lottery.’

    Nwoke a a kpọrọ Anoop bụ onye ọkwọ ụgbọala si na steeti Kerela nwetere ego ruru nde 250 rupee ($3.06m, £2.9m) n’asọmpị okwe ntụnye nke gọọmentị steeti ahụ hazịrị na mbido ọnwa a.

    Ka otu izuụka gachara mgbe o nwetere mmeri a, Anoop wepụtara ihe onyonyo na-arịọ ọha ka ha harazie izitere ya arịrọ ego enyemaka.

    O kwuru “Ọ ghara akara m mma na m enwetaghị mmerị”

    “Ọ bụrụ na m bụ onye nke atọ, ọ ghara aka mma.”

    O kwuru na ihe onyonyo ahụ na ọ dị ya ka ọ ya gbapụ n’ụlọ ya ma kwabaa ebe ọzọ n’ihe a na-arịọ ya ego aghara aghara.

    Aha nwoke aka gbara akwụkwọ akụkọ ụwa dị iche iche dịka enwebeghị onye nwetere ihe nrite bara ụba ka nke ya.

    O kwuru “Mgbe m mmeriri, obi dị m ezigbo ụtọ mana ugbua anya ọha niile na-elezi m na ezinụlọ m.”

    “Enweghizi ike ịpụta ezi, ahụ adịghị nwa m mana enweghi m ike ibuga ya ụlọọgwụ.”

    “Agwaala ọha na m enwetebeghi ego a e kwere na nkwa ruo ugbua mana enweghi onye chọrọ inwete okwu m.”

    O kwuru na ya na ezinụlọ ya na-ezo onwe ha na be otu nwanne ya iji gbalahụ etu ọha si achọgharị ha.

  8. ‘Ndatụ ọkụ latrịk agaghị ebi na nso nso a’ – Cyril Ramaphosa, Onyeisiala Saụt Afrịka

    Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa agwaala ndị mba ahụ na etu e si ewe ọkụ latrịk ebe ahụ na nso nso a agaghị agbanwe n’ihi ha ka na-ahazị ngwa ọrụ ha nwayọ nwayọ.

    O zipụtara ozi dee, “Anyị na-agba mbọ ihibe usoro ọrụ ọhụrụ nke ndị ma kwupụtara n’ọnwa Julaị mana mpụtara ya ji nwayọ nwayọ adị ire ugbua.”

    Mba Saụt Afrịka malitere na nso nso a danye n’ọnọdụ ndatụ ọkụ latrịka ha dịka ụlọọrụ na-emepụta ọkụ latrịka ha bụ Eskom danyere n’ọnọdụ ndatụ ego nkenya anaghịzị eru ha aka nakwa ebubo nrụrụaka dapụtara ebe ahụ.

    Mba Saụt Afrịka na-esi n’ihe ọnatarachi koolu emepụta pasentị 80 ọkụ latrịk ha mana nkwekọrịta ọhụrụ na ụfọdụ ụlọọrụ nwere chọrọ ka e wulitekwuo mmepụta ọkụ latrịka ha ruo pasentị 10 ọzọ site n’ikike ikuku nakwa anwụ nke a na-akpọ ‘Wind energy’ na ‘Solar energy’.

    Mana ka ihe dị ugbua, mmezu nke a ga-adị ire n’afọ 2024.

  9. Ndị ọrụ ahụike amalite abụbọọrụ n’Uganda dịka Ebola na-efesa ebe ahụ

    Ndị ọrụ ahụike n’otu ụlọọrụ ebe a na-eleta ndị bụ ọrịa Ebola na-anata ọgwụgwọ na Kenya agbala abụbụọrụ n’ihi ebubo na gọọmentị enyịghị ha ngwa ọrụ zuruoke iji chekwa onwe ha.

    Nke a na-abịa dịka ọrịa a na-efe efe malitere ifesa na mba ahụ ọzọ n’ọnwa a dịka o gburula ihe a na-eche rurula mmadụ 23.

    Ndị ọrụ ahụike nke ụlọọgwụ Uganda’s Mubende hospital gunyere ndị dọkịnta, ndị ọrụ ngo mmadụ 34, ndị nọọsụ nakwa ndị na-ahụ maka inye ndị ahụ adịghị ọgwụ so na-agba ya bụ abụbọọrụ dịka ha kwuru na ha agaghị abịa ọrụ ọzọ dịka ha na-achọ ka ebuga ha ụlọọrụ ebe nwere ezi nchekwa n’aka ọrịa ahụ.

    E kwuru na a na-enyo mmadụ isii bụ ndị ọrụ ahụike ebe ahụ enyo na ha nwereike ibu nje ọrịa ahụ ugbua dịka e dopụrụ ha iche ma na-eche ka agbaa mpụtara nyocha ime ahụ n’anwụ.

    Gọọmentị mba ahụ ekwuola na a na-eche na mmadụ ole buterela ọrịa a ebe ahụ eruola 36 mana enwetachabeghị ihe ịgbaama kwadoro nke a ugbua.

    Ọgwụ mgbochi nke dị ire maka ụdịrị nje ọrịa a nke Zaire agaghị adị ire n’Uganda n’ihi nje ọrịa ahụ nke a sị si mba Sudan bụ ihe na-efesa ebe ahụ ugbua.

  10. John Lyon: Ihe ndị uweojii kwuru maka nwoke a na-enyo enyo maka ntọrọ ọtụtụ mmadụ

    Ndị uweojii anwụchịela ma gbaa mmadụ anọ n’anwụ dịka ndị a na-enyo n’ọrụ ntọrọ ndị mmadụ nke gụnyere otu onye a ma ama dịka John Lyon.

    Otu ọnụ na-ekwuru ndị uweojii gwara BBC na e jidere Lyon site n’ama mmadụ atọ ọzọ a na-eche bụ ndị otu ya gbaara ndị uweojii.

    E mechara nwụchie ya n’Abuja ebe ọ nọ na-ebi ndụ ndị ọgaranya ma kpọghachite ya Bayelsa bụ ebe a sị bụ isi ọrụ ntọrọ ndị mmadụ a na-enyo ya enyo maka ya.

    Ndị ọrụ nchekwa kwuru na opekampe na a na-enyo na ya nọ na ntọrọ ihe ruru mmadụ 10 nke bụ ndị ọganranye nakwa ndị nwereike ịkwụta ụgwọ mgbapụta gbara agba.

    Na otu n’ime okwu ndị a na-eche aka nọ ya, ya na ndị otu ya napụrụ otu onyeisi ụlọakụ ego ruru nde narịa 60 ($140,000; £130,000)

    Ndị orụ nchekwa kwukwara na e nwere okwu ntọrọ ọzọ nọ n’isi ya a sị ha napụrụ onye a tọọrọ ego karịrị $150,00 maka mgbapụta.

    Ndị uweojii kwuru ha na-atụ anya na udo ga-alọghachite n’akụkụ Bayelsa steetiu bụ ebe a sị na nwaamadị ndị otu ya na-akpa ike mana anwụdobeghị ụfọdụ ndị otu ya ndị ọzọ.

  11. Nwoke amụnyela onwe ya ọkụ dịka ọ na-ebo nwunye ọhụrụ ya ebubo mmegbu

    Muritala Afolabi, otu onye akaọrụ n'Osun steeti mụnyere onwe ya ọkụ nso nso a dịka o boro nwunye ọ ka lụrụ ọhụrụ ebubo imekpa ya ahụ.

    N'okwu ya, ọ gwara ndị ntaakụkọ Punch na ọ bụ oke mkpọmiyi na mmegbu nwunye ya na-eme ya, tinyere ya uche ọjọọ a n'isi.

    O kwuru na ọ bụ enweghi ego na ihe isi ike ọ na-agabiga, butere okwu dị n'etiti ya na nwunye ya.

    Afolabi kwuru na ọ lụrụ nwunye ya n'ọnwa Julaị 2022, mana nwunye ya ekwebeghi ya kuru mmiri tọgbọ iko kemgbe ahụ.

    Ndị na-agafe agafe nụrụ olu ya n'ime ọhịa ma zọpụta ya ma kpọga ya n'ụlọọgwụ.

    Ka ọ dị ugbua, ọ natawala ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ.

    Ka ndị ntaakụkọ kpọtụrụ nwunye ya, o kwuru na "amaghị m ihe mere o jiri mụnye onwe ya ọkụ."

  12. Ndí isi nwere agba n'ụkwụ awụsa ekwetala na "state policing"

    Hakeem Baba-Ahmed bụ ọnụ na-ekwuru ọgbakọ jịkọtara ndị ugwu awụsa sị na ha bụ ndị awụsa ekweta ugbua na ọ dị mkpa na steeti obula nwere ndị uweojii nke ha maka nsogbu enweghị nchekwa dị na Naịjirịa ugbua.

    Baba Ahmed kwuru nke a na nkata ya na Channels TV n'abali Sọnde.

    O kwuru na nsogbu dị na Naịjirịa ugbua anyịka gọomentị etiti aka.

    Ọ sị na ihe mere o jiri rie oge ikwete ya bụ ihe bụ na ya bụ okwu abụghị ihe e ji ike ekweta.

    O kwukwara na ọ dị mkpa itinye ọnụ n'okwu ndị ọzọ gbasara njiko Naịjirịa.

    Baba-Ahmed sị na ọ dị mma ịnwe ọgbakọ ndị Naịjirịa ga-ezuko kpaa maka ụdị ọchịchị onye kwuo uche ya ha na-eme.

    Ọ sị na "ụdịrị ọchịchị Naịjirịa na-eme ugbua anaghị enyere onye ọbụla aka".

    Baba-Ahmed sị na ọ dị mmkpa ịnwe ya bụ mkparịta ụka nke taa na nke echi.

    Ọ sị na ihe mere ndị steeti ji ekewapụta ndị uweojii nke ha bụ maka na ndị uweojii gọọmentị etiti adaala maa afọ n'ala.

    Ọ sị na ọ bụ ya mere ndị gọvanọ ji were ohere ahụ na-ekewapụta steeti ha.

    Ọ sị na ndị Gọvanọ ahụ enweghị ikike ihiwe ndị uweojii nke ha nye ha egbe ọbụla ha chọrọ.

    Ọ sịkwa na ọ dịghị na iwu Naịjirịa.

    Kama na ọ dị mkpa ilebe ihe niile anya otu mgbe maka ọbụghị naanị ya bụ nsogbu ka Naịjirịa nwere.

    Ọ jụrụ sị, "ọ bụrụ na steeti niile nwee ndị uweojii nke ha ọpụtara na a ga-enwe ndị uweojii na steeti iri atọ na asaa (37).

    O sị na e kwesiri iwe iwu ga-achịkọta ndị uweojii a niile.

    Ọ sịkwa na ndị Ugwu ma udiri ndị ọchịchị ha chọrọ.

    Ọ sị na ha agaghị eche maka ebe onye si.

    "Anyị ga-akwado onye ndịda obula ga-emere anyị ihe anyị chọrọ. Anyị ma ihe anyị chọrọ".

    "Anyị enweela nzụkọ kwekọrịta ihe anyị ga-ajụ onye obula ga-abịakwute anyị. Anyị ga-agba ha ezigbo ajụjụ ọnụ".

    "Anya anaghị akwado onye ọbụla ka ọ dị ugbua. Anyị kwadoro Buhari na 2015 mana anyị gwara ndị mmadụ akwadola ya na 2019. Mana ndị mmadụ ekweghị. Ugbua anyị agaghị eme ya bụ mehie ọzọ. Anyị ga-agba onye ọbụla bịara ezigbo ajụjụ ọnụ ka ọgwa anyị ihe ọ ga-emere anyị dịka ndị ugwu".

  13. Ukraine war: Russia o nwereike iji ogbunigwe nuklịa lụọ agha a?

    Onyeisiala mba Russia bụ Vladimir Putin ekwuola na ya nwereike itinye nweobere ogbunigwe ọdị nkeke eme ire ọ kpọrọ "tactical nuclear weapon" n'agha ha na Ukraine ma akpasuo ya iwe, iji chekwa onwe ha.

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden adọọla ya aka na ntị sị na nke abụ eziogbo mkpalite agha ụdị ahụbeghị kemgbe alụchara agha ụwa nke abụọ.

    Gịnị bụ "tactical" nuclear weapon"?

    "Tactical nuclear weapon" bụ nwaobere ogbunigwe nukịa e ji alụ agha.

    Ọ na-emebi ihe mana ọ naghị eru ka nke nnukwu ya.

    A rụrụ ya ka ọ ghara ị na-abasa ebe niile ka nke nnukwu.

    Nke ọbere ya bụ ngwa ọgụ nwereike ịbu ihe dịka otu kiloton (mkpụrụ ogbunigwe dị n'ime ya nwereike iru 1000 tonnes TNT), ebe nke nnukwu ya a na-akpọ "strategic nuclear weapons" nwereike ịbụ 100 kiotons.

    E nwereike ịnọ ebe tereaka tụọ nke nnukwu a.

    Iji maa atụ, nke bụ "atomic bomb" Amerịka gbara na Hiroshima na 1945 bụ naanị 15 kilotons.

    Tactical nuclear weapon ole ka Russia nwere?

    Dịka ndị Amerịka chọpụtara, Russia nwere ya bụ ogbunigwe ọdị nkenke eme ire 2,000

    E nwereike iji ụgbọufe e ji ebu ogbunigwe e ji ebu ndị ọzọ buo ya bụ ogbunigwe ọdị nkenke eme ire.

    E nwekwara ike is na ụgbọmmiri maọbụ ụgbọelụ gbaa ya bụ ogbunigwe.

    Amerịka sị na Russia malịtere ịrụgharị ya bụ ụgbọufe ogbunigwe n'ụdị bụ na ọ ga na-agate aka ma dakwa ebe a chọrọ ya.

    Russia nwere ọdị nkenke eme ire a ụdịrị abụọ.

    Otu bụ nke sị n'ime oshimiri agba, ha kpọrọ Kalibr missile (ss-N-30).

    Nke a ka e si n'ụgbọmmiri agba.

    Ọ na-aferuchakwa kilomita 1,500 ruo 2,500.

    Ọ na-eru mita 6.2 n'ogologo.

    Ọzọ bụrụ nke ha na-akpọ Iskander Mmissile launcher (SS-26 "Stone") bụ nke e sị n'ụgbọala atụ.

    Ọ na-eferucha ihe dịka kilomita 400 ruo 500 ma e dụga ya ozi.

    O ruru mita 7.3 n'ogologo.

    O so n'ụdị ha kpọrọ "Solid-fule rocket".

    Onwetụla ndị ji ogbunigwe ọdị nkenke eme iri a lụọ agha?

    Mbanụ. Ọ nwebeghị ndị ji ogbunigwe 'tactical nuclear weapon" a lụọ agha.

    Ọnwebeghị ndị mba na-arụpụta ogbunigwe obi kara itinye ya n'ọrụ.

    Mana ọ dịka obi akara Russia iji ya lụọ agha ugbua.

    Mbaụwa machiri iji ogbunigwe ụdị ọbụna lụọ agha.

    Mana onyeisi n'International Security Programme bụ Patricia Lewis dị na Chatham House sị na ọnweghị ihe Russia were ya ka ọ bụrụ.

    Ọ sị,"ha nwereike iwere ya ka ngwaọgụ nkịtị".

  14. Peter Obi esorola narị mmadụ ahọpụtara bụ ndị nwere ezi nkwuwe okwu na-akwụwa aka ọtọ na Naịjirịa

    Peter Obi, onye ji ọkọlọtọ Labour Party azọ ọkwa onyeisiala na Naịjirịa so na ndị aha ha dị na ndị ahọpụtara bu ọdịmma Naịjirịa n'isi a kpọrọ “Portraits of Patriots: 100 Nigeria’s Foremost Thought Leaders” n'okwu mbite.

    Ndị ọzọ aha ha dị na ya bụ akwụkwọ bụ mmadụ dịka Nyesom Wike, Gọvanọ River steeti, Yemi Osinbajo bụ Osote onyeisiala Naịjirịa, Onyeisi nchụaja ụka Redeem Christian Church of God, Enoch Adejare Adeboye, Oji ego achụ ego bụ Aliko Dangote, Onyeisi nchụ aja ndị ụka RCCG Africa bụ Ezekiel A. Odeyemi.

    Ndị ọzọ aha ha so na ya bụ Ngozi Okonjo-Iweala nke Osote odeakwụkwụ otu United Nations, Amina Mohammed, Onyeisi African Development Bank bụ Akinwunmi Adeshina, Bolaji Akinyemi, Bishop Oyedepo, Pastor Kumuyi, Governor Zulum, na Bishop Hassan Kukah.

    Ka o sina dị, aha Atiku Abubaka bụ onye ji ọkọlọtọ PDP azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa nakwa nke Ahmed Bola Tinubu nke ji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa esoghị na ya bụ akwụkwọ ndị nwetere nturu ugo a.

    Ndị wepụtara nturu ugo a bụ Editors, Kammonke Abam na Tammie Edet Kammonke, sị na ihe ha jiri họpụta ndụ nwe ya bụ nturu ugo bụ ndị nwere nkwuwe okwu na-akpalite mmụọ ndị mmadụ,

    Ha sị na-agwa e ji amata ụdị ndị a bụ ndị bu ọdịmma Naịjirịa n'isi na-emepụta ya n'omume.

    Ha sị na ndị ahụ bụ, "Ndị ji onwe ha chọọrọ Naịjirịa aja, were Naịjirịa buru ụzọ imepụta ebum n'uche ndị nnanna anyị ha".

    Ha sị na ndị a edepụtara aha ha bụ ndị "obuụzọ egwu" Naịjirịa ndị mbaụwa ga-eji mara Naịjirịa.

    Ọbụghị ndị omekome, agụụ, ụbịam na agha ndị mba dị ọzọ chọrọ ka e were mara Naịjiria.

    Ndị a na-akọwa na "e nwere ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na-eme zigbo ihe, nwekwa ezigbo nkwuwe okwu nọcha na-ebe dị iche iche dịka ndị na-achụ nta ego, ndị ọrụ Bekee, ndị ụka, ndị ọrụ obi ebere na-arụsi ọrụ ike ịme ka Naịjriịa bụrụ mba e ji eto ọnụ".

    Kammonke Abam na Tammie Edet Kammonke sị na ha ga na edepụta akwụkwọ a kwa fọ iji na-akwalite mmụọ ụmụ Naịjirịa ma na-egosikwa ndị mbaụwa ihe Naịjirịa riri biri.

    Ha na-akwọwa na ọbụghị naanị aka na ụba ka e ji amata mba, kama ọ bụkwa na site na ndị ezigbo mmadụ nọ na ya.

    Ha sị na ọtụtụ ụmụamala Naịjirịa ji onwe ha achụ aja n'ụzọ abụna ụzọ ihu na obodo ahụ dị mma,

    "Ọtụtụ n'ime ha anaghị eme mkpọtụ mana ha na-arụ ọrụ pụrụiche na nzuzo.

    Ha sị na ha tụkwara anya ndị mmadụ ga-akatọkwa ọrụaka ha.

    Ha mekwara ka a mata na ndị aha ha apụtaghị na nke a egosighị na ha adịghị mma, kama na ha sị na ọ bụ mmadụ otu narị ka ha ga-etinye aha ha n'akwụkwọ nke mbụ a ha ga-ere na Amazon.

  15. Eliud Kipchoge egosila ụwa na ọ bụ ọkaibe n’ọsọ ogologo awa

    Ọgba ọsọ ụwa a ma ama bụ Eliud Kipchoge mere ihe mmadụ emetụbeghị n’egwu ọsọ dịka o ji awa abụọ, otu nkeji na otu tịn kọm gbacha ologoso nke Berlin Marathon taa bụ Sọnde.

    Eluid mebụrụ ihe dị etu a n’afọ anọ gara aga na Germany mana oji nkeji iri atọ menyekwuo ya na nke taa.

    Chetakwa na ọ werelarị otu nkeji na tin kọm tin kọm 20 kụchapụ ogbo ya bụ Dennis Kimetto n’afọ 2014 nke ji awa 2:02.57 nwetabuola mmeri n’ọsọ a gbara na Berlin.

  16. Anwụchiela ọtụtụ ndị ngagharịiwe na Russia dịka a na-amanye ha isonye n'agha Ukraine

    Ndị uweojii na Russia anwụchịela ihe ruru mmadụ narị asaa na-eme ngagharịiwe megide atụmatụ onyeisiala Vladimir Putin imanye ihe ruru mmadụ puku narị atọ ka sonye n’agha Ukraine dịka ndị agha.

    Ụlọọrụ OVD-Info gabra ama na ndị anwụchirila ugbua eruola mmadụ 724 n’akụkụ obodo 32 nke mba ahụ.

    Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndị mba ahụ akwụnyeghịrị atụmatụ a ebe ndị ọzọ jị ọsọ agbapụ dịka ha achọghị isonye na mmadụ 300,000 Putin na-akwado itinye n’agha ha na Ukraine.

    Ụfọdụ n'ime ndị ejidere n’ụbọchị Satọdee kwuru na e nyere ha akwụkwọ ndebanye aha maka isonye n’agha ahụ ma nye ha iwu ka ha gaa n'ụlọọrụ ndị na-ewe ndị agha. Gọọmentị Russia gbachitere omume a na mbido izu a, na-ekwu na "ọ megideghị iwu anyị".

    Gọọmentị ha ebinyela aka n’atụmatụ ntaramahụhụ ọhụrụ siri ezigbo ike maka ndị a ga-ebo ebubo ịgbapụ n’ọrụ ha dịka ndị agha ma e debanye aha ha n’akwụkwọ.

    Putin bịanyere aka n'akwụkwọ iwu ọhụrụ n’ụbọchị Satọde inye ndị mba a ntaramahụhụ ihe ruru afọ 10 maka onye agha ọbụla ejidere, na-anwa ịgbahapụ ndị agha maọbụ jụ ịlụ ọgụ.

    O bịanyekwara aka n'akwụkwọ iwu inye onye mba ọzọ ọbụla nke debanyere aha isonye ndị agha Russia n’agha otu afọ akwụkwọ ikike ịbụ onye mba Russia.

  17. Roger Federer eferela egwuregwu Tennis aka ikpeazụ ya

    Ọpịa Tennis a ma ama bụ Roger Federer bere akwa dịka ọ feere egwu Tennis aka ikpeazụ ya n’abalị Fraịdee.

    Nke mere mgbe o zutere ogbo ya bụ Rafael Nadal n’asọmpị Laver Cup a gbara n’abalị ahụ.

    Ndị kwadoa Federer guzoro ya ọtọ iji kwanyere ugwu dịka ha kuuru ya aka mgbe o si n’ama egwuregwu Tennis ahụ bere akwa pụọ.

    Federer gosiri na ọ bụ ọkaibe n’egwu Tennis dịka o nwetere ihe nrite nke aha ‘Grand Slam’ ugboro 20 mgbe ọ nọ n’ihu egwuregwu Tennis ahụ.

    O kwuru n’abalị Fraịdee “Obi dị mma na m pịaruru egwu ruo etu a, anaghị m ewe iwe, taa bụ ụbọchị pụrụiche”.

    Ogbo ya bụ Nadal bere akwa aghara aghara dịka ọ makọrọ ya ugboro ugboro n’ama egwuregwu O2 nke London.

    Federer gbara afọ 41 kwuru na mbido ọnwa a na ọ ga-akwụsị ịpịa egwu Tennis ma ha pịachapụ asọmpị Laver Cup ahụ n’ihi na ahụ ya e ziterela ya ozi ugboro ugboro ka o zuzieike.

  18. ASUU eburula okwu abụbụọrụ ha gaa ụlọikpe mkpesa

    Otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum na Naịjirịa bụ 'Academic Staff Union of Universities' (ASUU) agaala ụlọikpe mkpesa ịgbagha mkpebi nke ụlọikpe 'Industrial Court' bụ nke nyere ha iwu ka ha kwụsị abụbụọrụ ha na-agba.

    Ọkaiwu ndị ASUU bụ Femi Falana bụ onye wepụrụ okwu n'ụlọikpe mkpesa, ma nye ihe akaebe iri na anọ nke ọ chọrọ ka ụlọikpe ahụ tinye anya.

    Cheta na gọọmentị etiti kpụpụrụ Asuu ụlọikpe n'ihi abụbụọrụ ha gbara nke nọrọla ọnwa asaa ugbua.

    Ọkaikpe Polycarp Hamman nke 'Industrial Court' nyere ndị ASUU iwu ka ha laghachi ma malite nkuzi dịka a na-ekpe ya bụ ikoe.

    Hamman kwuru na abụbụọrụ a Asuu gbara emekpaala ụmụakwụkwọ ahụ nke ukwuu.

    Mana Asuu na-ekwu na gọọmentị Naịjirịa agaghị eti ha ihe ma sịkwa ha ebela akwa.

  19. Nyesom Wike ebola Iyorchia Ayu ebubo mgba okpuru mgbe PDP mere ntuliaka imeụlọ

    Gọvanọ Nyesom Wike nke Riva steeti ebola onyeisioche Patị ha bụ Iyorchia Ayo ebubo gbara ọkpụrụ.

    Wike sị na Ayu gbara ha mgba okpuru mgbe ha mere ntuliaka imeụlọ wepụtara Atiku Abubakar dịka onye nnọchịte anya pati ha na ntụlịaka onyeisiala nke 2023.

    Mgbe Wike gwara ndị ntaakụkọ okwu taa bụ Fraịde, ọ sị na Ayu kpọrọ ụfọdụ ndị so zọọ ya bụ ndọrọndọrọ imeụlọ nke PDP ka ha rituoro Atiku Abubakar.

    "Ọ kpọrọ ndị anyị na ha so azọ ya bụ ọchịchị ka ha rituo. A nọ m ebe ahụ, Saraki na ndị ọzọ nọkwa ebe ahụ".

    Wike Kwuru sị, "o ji ndị otu anyị zọrọ ya bụ ọchchị tụọ epele. Ọnweghị ihe Ayu emeghị ka Wike ghara ịpụta".

    Nke a bụ okwu ọzọ pụtara na PDP ebe ọtụ ụzọ kpọrọ ekwo nkụ na Ayu ga-arituriri maka na ọnweghị onye ndịda so n'isi ọchịchị PDP iji gosi na ha so na ihe a na-eme.

    Wike sị na ya dọrọ Ayu aka na ntị ka ha ghara ire "fọmụ" rụọ mgbe kọmiti na ahụ maka ike oke ebe ndị ọchịchị ga-esi pụta ha kpọrọ "zoning" na Bekee mechere.

    Mana Ayu kpọrọ ekwo nkụ malite ịre ya bụ akwụkwọ e ji edeba aha.

    Wike sị na mgbe ahụ ka ya ma na ya bụ ọkpụkpụ ga-agbado ha n'akpịrị, mana ya gbara nkịtị soro gbata ya bụ akwụkwọ soro ibe ya zọwa ya bụ ọkwa.

    Mgbe ahụ ka ha malitere ịs n'ụzọ aghụghọ. "ọnweghị ihe ọ mere, kemgbe dị mmadụ malitegoro ịgba "fọmụ",

    "Onyeisioche anyị majara ndị so zọọ ya bụ ọchịchị sị na ọ bụrụ na Wike merie ya bụ ntuliaka na ya ga-arịda n'ọkwa ya. Ọ kwa Onyeisioche kwesiri ịkwụwa aka ọtọ na ndọrọndọro ịhụ na ọnweghị onye ọ kwadoro iche, iji nye onye ọbụla ohere, bụ onye na-ekwu ihe a"

    Ọ sị na ha nwere ọtụtụ ọgbakọ ebe ha na-akpa ihe a nke mere ya bụ nzụkọ ji malite n'azụ ọge."Ihe e kwesiri ịmalịte ebe 11:00 ụtụtu bido 5;30 nke mgbede.

    Kọmitii niile ọ hibere bụ ndị otu Atiku ka o tinyere na ya. "A jụkwara m ha sị, ndị niile nọ na Kọmitii ha niile bụ ndị otu Atiku".

    "Ayu gọkwara, ṅụọ iyi. A sị m ya kawa ahụ mee ezigbo ihe nke ga-eme anyị niile obi ọma mgbe e mechere.

    Wike sị, "iji gosi na a rụrụ ya bụ ihe arụ, ọ bụ mgbe mmadụ niile kwuchara okwu n'ọgbakọ ya bụ ntuliaka ka ha tiputere mmọnwụ ha jiri bịa. Ọ bụ mgbe ahụ ka Tambowa jiri pụta nke ugboro abụọ ya si na ya arịtuola. Ọ beghị ebe ahụ. Ọ sị na ndị otu ya niile ga-atụnyere Atiku. Ọ bụrụ na anyị ahụghị pati a na-anya, ebe ahụ ka anyị kara ịnọ kụwaa ihe niile."

    "Ayu aga agọ na ọ nataghị otu ijeri Naịra na Lagos? Ya gọọ ka m gwa ya onye nyere ya ego ahụ. Ọ bụkwaghị gọomentị Lagos nyere ya ya bụ ego. Ọ gwara otu n'ime ndị so azọ ya bụ ọkwa na ya ejighị n'aka na ndị gọvanọ ga-ekwe tinye ego na ya bụ ndọrọndọrọ.

    Mgbe a jụrụ ya ka o jikwa n'aka maka ya bụ ebubo ndị a.

    Ọ sị, "Ayu gọọ ka m mara. A ga m akpọ aha ndị oji ego achụ ego bụ ndị wetere ya bụ ego na Lagos. Ya bụ ego abaghị n'akpa PDP. Ọ bụghị ya ka anyị na-ekwu. Ya pụta bịa gọọ ka m hụ".

  20. Ụlọelu ọzọ adaala na Legọs

    Otu ụlọelu ogoogo atọ adaala na mpaghara Mushin dị na Legọs.

    Akụkọ kwuru na ndị bi n'ogbe ahụ zọpụtara mmadụ abụọ, otu nwatakịrị na otu okenye, tupu ndị ọrụ gbatagbata abịaruo.

    Ka ọ dị ugbua, ndị mmadụ na-ekwu na mmadụ abụọ ka tọrọ n'ime ụlọ ahụ, mana ndị ọrụ na-agba mbọ ịzọpụta ha.

    Nke a na-abịa dịka o rubeghị otu ọnwa onye jibu ọkwa Kọmishọna nhazi obodo na Legọs steeti bụ Idris Salako tinyere akwụkwọ ịgba arụkwaghịm n'ihi etu ụlọ si ada aghara aghara na steeti ahụ.

    Salako gbara arụkwaghịm dịka otu ụlọelu ogogo asaa dara na mpaghara Oniru dị na Lekki, Legọs, ma gbuo mmadụ abụọ.

    Akụkọ na-abịa.