Onyeisiala mba Russia bụ Vladimir Putin ekwuola na ya nwereike itinye nweobere ogbunigwe ọdị nkeke eme ire ọ kpọrọ "tactical nuclear weapon" n'agha ha na Ukraine ma akpasuo ya iwe, iji chekwa onwe ha.
Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden adọọla ya aka na ntị sị na nke abụ eziogbo mkpalite agha ụdị ahụbeghị kemgbe alụchara agha ụwa nke abụọ.
Gịnị bụ "tactical" nuclear weapon"?
"Tactical nuclear weapon" bụ nwaobere ogbunigwe nukịa e ji alụ agha.
Ọ na-emebi ihe mana ọ naghị eru ka nke nnukwu ya.
A rụrụ ya ka ọ ghara ị na-abasa ebe niile ka nke nnukwu.
Nke ọbere ya bụ ngwa ọgụ nwereike ịbu ihe dịka otu kiloton (mkpụrụ ogbunigwe dị n'ime ya nwereike iru 1000 tonnes TNT), ebe nke nnukwu ya a na-akpọ "strategic nuclear weapons" nwereike ịbụ 100 kiotons.
E nwereike ịnọ ebe tereaka tụọ nke nnukwu a.
Iji maa atụ, nke bụ "atomic bomb" Amerịka gbara na Hiroshima na 1945 bụ naanị 15 kilotons.
Tactical nuclear weapon ole ka Russia nwere?
Dịka ndị Amerịka chọpụtara, Russia nwere ya bụ ogbunigwe ọdị nkenke eme ire 2,000
E nwereike iji ụgbọufe e ji ebu ogbunigwe e ji ebu ndị ọzọ buo ya bụ ogbunigwe ọdị nkenke eme ire.
E nwekwara ike is na ụgbọmmiri maọbụ ụgbọelụ gbaa ya bụ ogbunigwe.
Amerịka sị na Russia malịtere ịrụgharị ya bụ ụgbọufe ogbunigwe n'ụdị bụ na ọ ga na-agate aka ma dakwa ebe a chọrọ ya.
Russia nwere ọdị nkenke eme ire a ụdịrị abụọ.
Otu bụ nke sị n'ime oshimiri agba, ha kpọrọ Kalibr missile (ss-N-30).
Nke a ka e si n'ụgbọmmiri agba.
Ọ na-aferuchakwa kilomita 1,500 ruo 2,500.
Ọ na-eru mita 6.2 n'ogologo.
Ọzọ bụrụ nke ha na-akpọ Iskander Mmissile launcher (SS-26 "Stone") bụ nke e sị n'ụgbọala atụ.
Ọ na-eferucha ihe dịka kilomita 400 ruo 500 ma e dụga ya ozi.
O ruru mita 7.3 n'ogologo.
O so n'ụdị ha kpọrọ "Solid-fule rocket".
Onwetụla ndị ji ogbunigwe ọdị nkenke eme iri a lụọ agha?
Mbanụ. Ọ nwebeghị ndị ji ogbunigwe 'tactical nuclear weapon" a lụọ agha.
Ọnwebeghị ndị mba na-arụpụta ogbunigwe obi kara itinye ya n'ọrụ.
Mana ọ dịka obi akara Russia iji ya lụọ agha ugbua.
Mbaụwa machiri iji ogbunigwe ụdị ọbụna lụọ agha.
Mana onyeisi n'International Security Programme bụ Patricia Lewis dị na Chatham House sị na ọnweghị ihe Russia were ya ka ọ bụrụ.
Ọ sị,"ha nwereike iwere ya ka ngwaọgụ nkịtị".