You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Azọgbuola ihe ruru mmadụ 174 n'ọgbọ egwuregwu n'Indonesia

Ọtụtụ mmadụ nwụrụ ebe ụfọdụ meruru ahụ n'ama egwuregwu dị n'Indonesia.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Otu bọọlụ ụmụnwaanyị Spen ekwuola ka achụọ onye nchịkọta ha bụ Jorge Vilda

    Otu bọọlụ ụmụnwaanyị nke mba Spen akpọọla oku ka achụọ onye nkuzi ha bụ Jorge Vilda maka mmekpa ahụ ahụike ha na ahụike ụbụrụ ha.

    Ha kwuru na ha ga-apụ n’otu ahụ maọbụrụ na achụghị Valdi n'ọrụ.

    Mana otu bọọlụ mba ahụ bụ RFEF na-ekwu na ha agaghị ekwe ndị ọgba bọọlụ kwuo ihe ga-eme n'ọrụ onye nchịkọta ahụ.

    "Ọ bụghị ha ka ọ dịịrị ịme ụdịrị iwu a" ka ha RFEF kwuru ma kwuo na ha ga-aga ihu jiri ndị ntọrọbịa nwaanyị gbaa bọọlụ maọbụru na ọ bụ ihe chi fotere.

  2. Etu otu Chief na ụkọchukwu si jikọọ aka tọrọ ma gbuo nwa agbọghọ a

    Ndị uweojii mba Gana anwụchiela otu Pastor echeere na ọ tọrọ, gbuo ma lie otu nwata akwụkwọ nọsụ n'ebe akpọrọ Makessim na mba ahụ.

    E gwuputara ozi nwa ada ahụ mgbe Pastọr anwụchiri du ha bụ ndị uweojii gaa be ya na ya so kpa ya bụ arụ ma gosi ha ebe ọ dị.

    Ndị uweojii ka na-achọ Chief ahụ bụ onye gbapụrụ ọsọ rue ugbua.

    Nwata akwụkwọ nọsụ ahụ aha ya bụ Georgina Asor Botchwey malitere ifu efu kemgbe ihe gafere otu izu ụka.

    Akụkọ kwuru na ọ gara nyocha ibanye ụlọakwụkwọ Nursing dị n'ebe akpọrọ Ankaful mana ọ nataghị nke mere ka ndị enyi ya nakwa ezinaụlọ ya malite ịchọ ya.

    Akpọro ekwentị ya ma hụ na agbanyụrụ ya agbanyụ.

  3. Onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila akpọọla Chris Ngige na ndi ọzọ oku

    Onyeisii ụlọọomeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila akpọọla Minista ọrụ bụ Chris Ngige na ndị ọrụ gọọmentị ọzọ ka ha bịa za oku maka abụbụ ọrụ otu ndị nkuzi Mahadum bụ ASUU ka na-agba.

    Ndị ọzọ ọ kpọro oku a bụ ọdeakwuwkọ gọọmentị etiti bụ Boss Mustapha, Onyeisi Civil Service bụ Folasade Yemi-Esan, ọgụego gọọmentị etiti bụ Okolieboh Sylva na-anọchị anya Ahmed Idris bụ onye a na-enyocha maka ebubo ịzupu ego.

    Cheta na Gbajabiamila enwebuola nzụkọ n'ụbọchị Tuusde ebe ya na ndị isi otu ASUU nwere mkparịtaụka maka ihe a ga-eme iji bi ya bụ abụbụ ọrụ.

    E mechara kpọọ onyeisi ụgwọ ọnwa gọọmentị etiti nakwa ndị ọrụ gọọmentị ndị ọzọ ka ha bịa zaa ajụjụ maka okwu a na-aga ihu.

    Cheta na abụbụ ọrụ a ASUU malitere kemgbe ụbọchị 14 nke ọnwa Febụwarị na-akwado ibanye ọnwa asatọ ya ugbua.

  4. Ecowas ekpebiela ihiwe mmachi n'isi mba Guinea

    Otu Econimic Community of West African States (Ecowas) ekwetela ihiwe mmachị n'ịsị ndị agha na-achị mba Guinea maka ịnapụị ndị nkịtị ọchịchị ha napụrụ ha n'afọ 2021.

    Ndị otu Ecowas nwere nzukọ na New York dịka ha bịara nzụkọ nke UN General Assembly.

    Ha gwara ndị ntaakụkọ AFP na ha ga-ehiwe mmachi a nwayọ nwayọ ma sịkwa na ha ga-akpọpụta aha ndị ọmetụtara nsonso a.

  5. Ị bọọla chi

    Ndewo! Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

  6. Aka akparala ọkammụta tiri onye uweojii ihe

    Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Usman Alkali Baba akatọọla ya bụ agwa otu nwaanyi kpara site n'iti otu onye uweojii nwaanyị ihe.

    Ọkammụta Zainab Duke Abiola, nwa be ya na ndị ọzọ tiri Inspector Teju Moses ihe.

    Ndị uweojii nwuchiri ya bụ Ọkammuta bụ onye a sị tiri Teju Moses ihe maka na ọ jụrụ ịgara ya ozi n'ụlọ.

    Onyeisi ndị uweojii enyela iwu ka a malite nnyocha ya bụ akụkọ ozugb ozugbo ma taa ya bụ nwaanyị na ndị niile aka ha dị na ya bụ mpụ ahụhụ ka iwu kwuru.

    Zainab bụ onye a sị si Mbaise tiri onye uweojii na-echere ya nche ihe ụbọchị Tuzde bụ 20/9/22 maka na ọ jụrụ ijere ya ozi n'ụlọ.

    N'akwụkwọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Olumuyiwa Adejobi tinyere aka, ọ sị na onyeisi ha enyela iwu ka ndị uweojii niile na-eche Zainab nche si ebe ahụ pụta.

    Alkali Baba sị na ọ gbagwojuru ya anya na mmadụ dịka Zainab ọrụ ya bụ ịzọchitere ndị enweghị ike oke ha nwereike ịkpa ụdịrị agwaa.

  7. Nje Ebola efesawala n'Uganda

    Ministri ọrụ ahụike n'Uganda ekwuola na mmadị isii ọzọ ebutela nje Ebola na be ha.

    Ya bụ nje malitere ịpụta ihe ọzọ na mbido izụụka a.

    Nke ịkpeazụ ahụrụ bụ otu nwaokorobia gbara afọ iri abụọ na anọ (24) nwụrụ n'aka ya bụ ọrịa ụbọchị Tuzde n'obodo Mubende.

    Nke a bụ ugboro atọ ya bụ nje, ụdịrị nke a na-ahụ na Sudan na-apụta ihe.

    Mmadụ iri anọ bụ ndị ya ndị ahụ nwere mmekọ anọpụla iche ugbua.

    Ndị agbataobi ha sị na ha kere nkwụcha maka ọnọdụ ahụ dị n'Uganda.

    Ka ọ dị ugbua, ndị ọkacharamara kwuru na ụdịrị nje Ebola si Sudan adịghị oke njọ ka nke si Zaire.

    Ndi isiọrụ na Uganda nọkwa na-akasị ndị mmadụ obi ka ha ghara ịnwe obi nkoropụ maka na ha ga-akpachili nje a.

  8. Onyeisiala Yukren arịọla ka ehibe ụlọikpe pụrụiche iji kpe Rọshịa ikpe

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky akpọọla oku ka ehibe ụlọikpe pụrụiche iji kpemba Rọshịa ikpe maka mkpamkpa ha kpara na mba ya.

    O kwuru nke a n’ozi ihe onyonyo o zigara ọgbakọ ndị UN bụ UNGA na New York na mba Amerịka.

  9. Ndị ọrụugbo ebeela akwa arịrị maka nsogbu chere ha aka mgba

    Ndị ọrụ ugbo na steeti ndị dị na mpaghara ugwu ebeela arịrị na mgbanwe ihu igwe nakwa ọnọdụ nchekwa ọjọo anapụla ha ọrụ n’aka.

    Nke a pụtara ihe n'akụkọ nyochara ya bụ atụmatụ ọfụma nke ụlọntaakụkọ Premium Times mere.

    Kebbi steeti na steeti iri ndị ọzọ gụnyere Adamawa, Bauchi, Gombe, Jigawa, Kano, Katsina, Sokoto, Yobe, na Zamfara na-agabiga ihe Bekee kpọrọ 'Desertification'

    Nke a pụtara na ihe bụbu ala nkịti ebe a na-akọ nri na-akpọ nkụ na-aghọrọ ala Ọzara ugbua maka mgbanwe ihu igwe na-agbanwe ya n'ike n'ike.

    "Anyị na-akọbu nri ebe a mana o nweghizi ihe na-etopute ebe ahụ, nke mere ka anyị gbadawa akụkụ ndida" bụ ihe otu nwoke bụ Usman Kaita si Katsina steeti kwuru.

    Nke a na-abịa dịka nyocha Nigeria Security tracker (bụ ngalaba mba Amerịka) mere gosiri na ndị omekome gburu ihe karịrị mmadụ otu puku ma tọrọ mmadụ narị asaa site na Jenụwarị rue Maachi afọ a.

    "Nchekwa na-enye ndị ọrụ ugbo anyị nsogbu ọ kachasị na Zuru na Yauri (dị na Kebbi steeti ma dịrị nso na Niger steeti), ha enweghizi ike ịje n'ugbo. Ihe anyị na-enweta ejirila pasentị ihe karịrị pasentị 50 datuo"

    Okwu a bụ okwu onye nlekọta ụlọ nrụpụta rice nke Labana bụ Maazi Zuru gwara ụlọntaakụkọ ahụ.

    Ihe nsogbu abụọ ndị a pụtara bụ ụkọ nri nke so eme ka ọnụ nri na-arịelu kwa ụbọchị.

  10. Unu abọọla chị

    Daalụ ma sonye anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

  11. Russia akpọkuola ndị agha ha e dopụrụ iche maka ọrụ dị mkpa

    Onyeisiala mba Russia bụ Vladimir Putin kwuru n’ụtụtụ taa bụ Wenezde na ga-akpọku ndị agha ha e dopụrụ iche maka ọrụ dị mkpa nke ruru mmadụ 300,000.

    Nke a bụ oke ihe omume dịka ọnwa asaa garala kemgbe ha malitere iwakpo mba Ukraine.

    A na-eche na ihe kpalitara omume nke a bụ etu ndị agha Ukraine si na-eweghachi ebe ndị agha Russia jibidoburu na mba ha aghara aghara na nso nso a ọkachasị n’akụkụ mpaghara ọwụwa anyanwụ obodo Kharkiv.

    Dịka ozi mkpoku ndị agha a pụtara, nghagharịiwe dapụtara n’akụkụ Russia megide oku a.

    Ozi Putin taa rụtukwara ka na ndị agha mba ha nọ nso iji ọgwụnigwe ngwa agha nuklia ha.

    O boro ndị mba ofesi ebubo na ha chọrọ ikpụsa mba ha.

    Mana onyeisiala bụ Volodymyr Zelensky kwuru na Russia chọrọ “iwushị ọbara ndị mba ha aghara aghara”.

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden kwuru taa n’ọgbakọ United Nations e mere na New York ka ụwa gbakọta ọnụ kwudoro mba Ukraine n’oge dị etu a.

    Praịm minista mba Briten bụ Liz Truss kwuru na ‘tụtụ gaga” mba Russia na-eme ugbua gosiri na ikike mwakpo ha na mba Ukraine adakpowala.

  12. Ikpe ọhụrụ adakwasịla Donald Trump na ụmụ ya atọ

    Ikpe ọhụrụ adakwasịla Donald Trump na ụmụ ya atọ

    Ikpe ahụrụ adasala n’elu aka chịbụrụ mba Amerịka bụ Donald Trump na ụmụ ya atọ dịka e mechara nnyocha nke na-arụ aka na ụlọọrụ ha bụ Trump Organisation na-eme usoro ọrụ nke aghụghọ nọ n’ime ya.

    Ebubo nọ n’isi ha na-ekwu na ha tụrụ asị banyere ego ruru “ọtụtụ ijeri” ma sị n’ụzọ aghụghọ betulata ego ụtụ isi dịịrị ha ma natakwa ọtụtụ ego megbazite

    Ndị ọkaiwu bupụtara ikpe ọhụrụ kwuru na ụlọọrụ Trump Organisation mere ọtụtụ ihe aghụghọ n’ọrụ ha site n’ebe oge 2011 ruo 2021.

    Trump akụchapụla okwu ikpe a ma kwuo na nke a bụ okwu “Mgbe okpuru ndị iro ya na-gba ya”

    Akpọpụtara aha ndị isi abụọ n’ụlọọrụ Trump Organisation, bụ Allen Weisselberg na Jeffrey McConney, nakwa ụmụ ya atọ bụ Donald Jr, Ivanka na Eric Trump.

    Ọkaiwu mpaghara New York bụ Letitia James, nke bụ onye bụ ọkaiwu kachasị elu na steeti ahụ, butere ikpe a ka e mechara nyocha a sị ruru afọ atọ.

  13. Ihe Atiku kwuru maka okwu nsepụ aka Wike n'otu 'Campaign Council' PDP

    Onye ji ọkọlọtọ pati People’s Democratic Party (PDP) azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abubukar agwaala ndị nwere agba na patị ahụ ka ha jịkoọ aka ọnụ gawara onwe ha n’ọrụ imezi obodo Naịjirịa ma ghara ndọrọ ndọrọ na-akpọtụ n’otu ahụ ugbua.

    Nke a na-abịa dịka n’ụbọchị Wenezde gọvanọ Nyesom Wike nke Rịvas steeti bụ onye ya na Atiku na-adụ onwe aka n’ọnụ kemgbe e mechara ntuliaka ime ụlọ patị ahụ, du ndị na ndị otu ya kwupụta na ha na-esepụ aka na otu na-ahazị achụmnta vootu pati ahụ bụ 'Campaign Council' dịka o kwuru na ọ bụ ma onyeisi pati ahụ ugbua bụ Iyorcha Ayu arịturu n'ọkwa ma nye onyeọzọ si na mpaghara ndịdịa anyanwụ ohere ịnọ na ya bụ ọkwa.

    Nke a mere na Pọta kọtụ nke Rivas steeti dịka ụfọdụ ndị sonyere n’ọgbakọ ebe e kwupụtara okwu nsepụ aka a gụnyere Gọvanọ Oyo steeti bụ Seyi Makinde, aka chịbụrụ Krọsụ Rịva steeti bụ Donald Duke nakwa Ayo Fayose chibụrụ Ekiti steeti.

    Atiku zipụtara ozi a n’ụbọchị Wenezde were saa omume Wike na ndị otu ya.

    O kwuru ‘Ihe a Wike na ndị otu ya mere tụrụ m n’anya.’

    ‘Ọ bụrụ na Iyorcha Ayu chọ iritu n’ọkwa ya, nke a bụ mkpebi dịịrị ya, ọ bụghị ihe onye ọbụla ga-amanye ya ime’.

    Cheta na Wike kwuru ugboro ugboro n'oge gara aga na ọnụnọ Ayu n'ọkwa ahụ megidere iwu pati ahụ nke sị ka a na-ewegharị ọkwa ọchịchị site na mpaghara gaa na mpaghara.

  14. Ọgbaghara so ngagharịiwe maka ọnwụ otu nwaada n’Iran ataala isi ihe ruru mmadụ isii

    Ọnwụ otu nwaanyị nọ n'aka ụlọ ndị uweojii mba Iran akpalitela ọtụtụ ngagharịiwe na mba ahụ nakwa mba ndị ọzọ.

    Nwaada Mahsa Amini gbara afọ 22, danyere n’ọnọdụ ọdịndụọnụ ka mma awa olemole ka ndị uweojii jidere ya maka ebubo ịda iwu gbasara iyi akwa mkpuchi ahụ nke ndị okpukperchi alakụba a na-akpọ ‘hijab.’

    Mahsa mechara nwụọ n'ụbọchị Fraịdee dịka ọ nọrọ n'ọnọdụ ahụ ruo abalị atọ.

    A na-eche na opekatampe mmadụ isii na ndị na-eme ngagharịiwe a anwụọla kemgbe a malitere ya.

    Otu n'ime ndị a bụ otu nwa nwoke a sị dị naanị afọ 16 nke e kwuru ndị ọrụ nchekwa gbagburu mgbe ha gbara egbe ebe ahụ iji chụsaa ndị a.

    Ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị so akwado ngagharịiwe ndị a e jirila iwe gbaa ‘Hijab’ ha ọkụ n’ama iji gosi etu obi dị ha maka ọnwụ Amini.

    Ọgbaaghara so ngagharịiwe a eruola abalị ise ugbua ma gbasaa n'obodo ndị ọzọ ruru 20 na mba ahụ nakwa mba ndị ọzọ nke gụnyere ma na n’obodo Istabul nke mba Turkey.

    Cheta na ndị uweojii mba ahụ kwuru na ọ konọpụrụ n'ihi ha na-eche na o nwebụrụ ọrịa maọbụ nsogbu ahụike o bu mana ezinaụlọ ya gbara okwu a ma na-atụ aka na nwa ha lara mmụọ n'ihi mmekpa ahụ ndị uweojii.

    Onyeisiala mba Iran bụ Ebrahim Raisi ekwuola na ha ehibela otu ndị nnyocha ịma ihe mere ya bụ nwaada n’ezie.

  15. ASUU sí na ha nwereike ịga ụlọikpe mkpagharị

    Onyeisi ndị Academic Staff Union of Universities (ASUU) ekwuola na ha nwereike ịga ụlọikpe mkpegharị ịga kpesa mkpebi Industrial Court kpebiri n'isi ha taa bụ Wenezde.

    Onyeisi ndị otu a bụ Emmanuel Osodeke gwara Channels TV na ha enwebeghị ọnụ okwu maka mkpebia ruo mgbe ha na ndị okaiwu ha hụrụ.

    Mana Osodeke kwuru na otu ọ dị ugbua, na ọ dịzị ka gọọmentị etiti eji aka ike e so ha.

    Ọ sị na nke ahụ nwereike ịme ka ya bụ okwu kawanye njọ.

    Ọ jụrụ sị, "kedụ ka ọ ga a dị gị ma onyeisi ụlọọrụ gị sị na ọ bụ iwu na ị ga-arụrịrị ọrụ a?"

    Ọsodeke sị na nke a nwereike ịme ka ọtụtụ ndị nkuzi "jakpaa".

    O kwukwara na ndị otu ha ka nwekwara ohere ị ga ụlọikpe mkpegharị maka na ya bụ okwu ebibeghị ebe a.

    O kwuru na ụzọ kacha mma iji dozie ya bụ okwu bụ ụzọ ndị ụlọomeiwu nta Naịjirịa so.

    Cheta na ASUU na ụlọomeiwu nta nwere ọgbakọ pụrụiche ụnyaahụ Tuzde bụ nke onyeisi ha bụ Femi Gbajabiamila kọwara ka "ihe gara nke ọme".

    Gbajabiamila sị na ha ga-akpọ onyeisi ụlọọrụ ngụkọego bụ Auditor General ka ọ bịa kọwaara ha ihe ụfọdụ ga-enyere ha aka ịkpezi ya bụ ikpe.

    Ọ sị na ha na Auditor General ga-ahụ ụbọchị Tọzde.

    Ọ sị na ha ga-ebugazịrị onyeisiala Muhammadu Buharị ihe ọbụla ha kwutere mgbe ọ si nzụka United Nations ọ gara n'Amerịka lọta.

    Ụlọikpe nke National Industrial Court nyere otu Academic Staff Union of Universities bụ (ASUU) n'ịchafụ iwu ka ha kwụsị abụbọ ọrụ ha na-agba malite ọrụ ngwa ngwa.

    Akụkọ ka na-abịa

  16. Onyeisiala Buhari aghọpụtala Salihu Dembos dịka onyeisi NTA

    Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buharị aghọpụtala Salihu Dembos dịka onyeisi ụlọ ntakụko Nigerian Television Auhtority.

    Ọ bụ Mịnịsta mgbasa ozi bụ Lai Mohammed kwuru nke a ma sị na Dembos ga-ebu ụzọ rụọ ọrụ afọ atọ.

  17. Ide mmiri egwuputala ozu 1500 na Niger Steeti

    Alhassan Musa Na'ibi bụ ụkọchukwu ukwu nke obodo Mariga dị na Niger Steeti gwara BBC na ha eligharịala ihe ruru ozu mmadụ otu puku ide mmiri gwuputara na obodo ahụ.

    O kwurkwara na ili karịrị narị ise ka idemmiri a mebiri ebe ahụbeghị ozu ndị nọ n'ime ha kamgbe otu izuụka.

    Ọ bụ oke ide miri butere nke a kama ndị bị na mpaghara ọdọ ili a na-ekwu na ndị na-egwu ọla ọlaedo soro na ihe kpatara oke mwakpo ide mmiri a.

  18. Unu abọọla chi!

    Daalụ dịka ị sonyere anyị taa maka akụkọ ga-amasị gị

  19. A machiela ịma mmadụ ikpe ọnwụ n’Equatorial Guinea

    Mba Equatorial Guinea akagbuola atụmatụ ịma mmadụ ikpe ọnwụ n’iwu ọhụrụ onyeisiala Teodoro Obiang binyere aka

    Oge ikpeazụ a mara mmadụ ikpe ọnwụ na mba ahụ bụ n’afọ asatọ gara aga dịka e kwuru na iwu ọhụrụ ga-amalịte ịdị ire n’ọnwa atọ na-abịa abịa.

    Cheta na n’afọ atọ gara aga na onyeisiala Obiang kwere nkwa ikagbu iwu a.

    Kọmịshọna UN nke na-ahụ maka ịlụ ọgụ ikike diri onye bụ Nada Al-Nashif toro iwu ọhụrụ a.

  20. Enyochapụtala ọrịa Ebola n’Uganda ọzọ

    Ndị ọrụ ahụike mba Uganda ekwuola na otu nwoke gbara afọ 24 butere ọrịa Ebola anwụọla na mpaghara etiti mba ahụ.

    Minista ahụike mba ahụ gwara ndị ntaakụkọ na nwoke ahụ gosiri ọtụtụ ihe ịgbaama na o butere ọrịa ahụ tupu ọ danye n’ime ya bụ ọrịa n’uju.

    Otu ahụike ụwa nke World Health Organization (WHO) nakwa ụlọọrụ nnyocha nje ọrịa nke Uganda Virus Research Institute gbara ama na nwoke a nke a sị bi n’obodo Ngabano butere ụdịrị nje ọrịa nke si mba Sudan.

    Ha kwukwara na mmadụ asatọ ndị ọzọ a na-enyo enyo nwereike ibu ọrịa na-anata ọgwụgwọ ugbua.

    Cheta na na mba Uganda enyochapụtabuola ọrịa a na mba ahụ n’afọ 2012.