Onyeisi ndị Academic Staff Union of Universities (ASUU) ekwuola na ha nwereike ịga ụlọikpe mkpegharị ịga kpesa mkpebi Industrial Court kpebiri n'isi ha taa bụ Wenezde.
Onyeisi ndị otu a bụ Emmanuel Osodeke gwara Channels TV na ha enwebeghị ọnụ okwu maka mkpebia ruo mgbe ha na ndị okaiwu ha hụrụ.
Mana Osodeke kwuru na otu ọ dị ugbua, na ọ dịzị ka gọọmentị etiti eji aka ike e so ha.
Ọ sị na nke ahụ nwereike ịme ka ya bụ okwu kawanye njọ.
Ọ jụrụ sị, "kedụ ka ọ ga a dị gị ma onyeisi ụlọọrụ gị sị na ọ bụ iwu na ị ga-arụrịrị ọrụ a?"
Ọsodeke sị na nke a nwereike ịme ka ọtụtụ ndị nkuzi "jakpaa".
O kwukwara na ndị otu ha ka nwekwara ohere ị ga ụlọikpe mkpegharị maka na ya bụ okwu ebibeghị ebe a.
O kwuru na ụzọ kacha mma iji dozie ya bụ okwu bụ ụzọ ndị ụlọomeiwu nta Naịjirịa so.
Cheta na ASUU na ụlọomeiwu nta nwere ọgbakọ pụrụiche ụnyaahụ Tuzde bụ nke onyeisi ha bụ Femi Gbajabiamila kọwara ka "ihe gara nke ọme".
Gbajabiamila sị na ha ga-akpọ onyeisi ụlọọrụ ngụkọego bụ Auditor General ka ọ bịa kọwaara ha ihe ụfọdụ ga-enyere ha aka ịkpezi ya bụ ikpe.
Ọ sị na ha na Auditor General ga-ahụ ụbọchị Tọzde.
Ọ sị na ha ga-ebugazịrị onyeisiala Muhammadu Buharị ihe ọbụla ha kwutere mgbe ọ si nzụka United Nations ọ gara n'Amerịka lọta.
Ụlọikpe nke National Industrial Court nyere otu Academic Staff Union of Universities bụ (ASUU) n'ịchafụ iwu ka ha kwụsị abụbọ ọrụ ha na-agba malite ọrụ ngwa ngwa.