Yuganda etinyela n'akwụkwọ maka inwete ọgwụ mgbochi Covid-19 nde abụọ

Ebe foto si, Reuters
Mba Yuganda ebinyela aka na-akwụkwọ ịzụta ọgwụ mgbochi Covid-19 nde abụọ dịka ndị butere nje ahụ na mba ahụ ruru mmadụ puku iri abụọ na ise.
"Ngalaba ahụike etinyela akwụkwọ igo ọgwụ mgbochi AstraZeneca Covid-19 nke otu "Global Alliance for Vaccines and Immunization" (Gavi)" dịka ụlọntaakụkọ Chimp Reports siri dee na Onyesi Ahụike na mba ahụ bụ Henry Mwebesa kwuru.
Dkt Mwebesa sị: "Ọgwụ mgbochi (AstraZeneca) nke gọọmentị ma ngalaba ahụike mba ụwa bụ World Health Organisation (WHO) mere nnyocha banyere... ọ dị mkpa ị ma na ọ bụ sọsọ nagalaba ahụike Yuganda nwere ikike ikwu ọgwụ a ga-enye ndị mba ahụ."
Yuganda nwere olileanya inwete ọgwụ mbochi nde abụọ na mbido 2021 mana ha na-edobe ego ha ga-eji gote nke ga-ezu mba ahụ niile.






