Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Yuganda etinyela n'akwụkwọ maka inwete ọgwụ mgbochi Covid-19 nde abụọ

    aSTRAZENECA

    Ebe foto si, Reuters

    Mba Yuganda ebinyela aka na-akwụkwọ ịzụta ọgwụ mgbochi Covid-19 nde abụọ dịka ndị butere nje ahụ na mba ahụ ruru mmadụ puku iri abụọ na ise.

    "Ngalaba ahụike etinyela akwụkwọ igo ọgwụ mgbochi AstraZeneca Covid-19 nke otu "Global Alliance for Vaccines and Immunization" (Gavi)" dịka ụlọntaakụkọ Chimp Reports siri dee na Onyesi Ahụike na mba ahụ bụ Henry Mwebesa kwuru.

    Dkt Mwebesa sị: "Ọgwụ mgbochi (AstraZeneca) nke gọọmentị ma ngalaba ahụike mba ụwa bụ World Health Organisation (WHO) mere nnyocha banyere... ọ dị mkpa ị ma na ọ bụ sọsọ nagalaba ahụike Yuganda nwere ikike ikwu ọgwụ a ga-enye ndị mba ahụ."

    Yuganda nwere olileanya inwete ọgwụ mbochi nde abụọ na mbido 2021 mana ha na-edobe ego ha ga-eji gote nke ga-ezu mba ahụ niile.

  2. Coronavirus ojirila ike na-abawanye na Naịjirịa?

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na mmadụ 675 ọhụrụ butere coronavirus na Naịjirịa na nyocha ha mere na ụbọchị iri nke ọnwa Decemba 2020.

    Mmadụ 183 n'ime ndị a nọ na Abuja, 128 nọ Legọs, ebe 85 nọ Kaduna.

    Ndi ọzọ bụ:

    Kwara-57 Katsina-50 Plateau-42 Rivers-39 Kano-33 Ondo-21 Ogun-17 Bauchi-10 Sokoto-5 Edo-2 Ekiti-1 Bayelsa-1 Delta-1

    Nke a pụtarala na ndị butere ya bu nje na Naịjirịa eruola 71,344.

    N'ime ha mmadụ 65,474 agbakeela ma laa be ha ebe mmadụ 1,190 lala mụọ site na ọrịa a.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  3. 'Nfesa Coronavirus nwereike ibiri ọkụ ọzọ ma akpachaghị anya' - Mịnịsta Ahụike

    Coronavirus

    Ebe foto si, Reuters

    Akpachaghị anya coronavirus nwereike ịpụta n'uju ya nke ugboro abụọ, dịka Mịnịsta Ahụike dọrọ aka na ntị ụbọchị Tọzde.

    Osagie Ehanire gwara ndị ntaakụkọ nke n'Abuja mgbe okwuru na ahụrụ ya bụ nje n'ahụ mmadụ ruru otu puku, narị asatọ na iri anụ na atọ (1,843) n'izu gara aga, iji ya tụnyere ihe ọ bụ izu abụọ gara aga bụ otu puku narị abụọ na iri atọ na ise (1,235).

    Otu onye ọkachamara n'ọrụ ahụike na-akọwa na Naịjirịa nwereike inweta ọgwụ mgbochị ya ebe Apreelụ afọ 2021.

    Osagie sị na "coronavirus nwereike ịmalite ịfesa ọzọ n'ike na ebube ma akpachaghị anya".

    Ọ sịkwa na ya bụ nfesa nwereike ịbụ nke si na ịme obodo ebe nke sị ndị njem mba ofesi n'aka nwereike ịpempe.

    Ọ sị na ya enyela iwu ka emepecha ogige nnọpụiche niile ha mechibụrụ oge nfesa ya bụ nje benataburu.

    Mmadụ 70,669 butere ya bụ nje na Naịjrịa ebe mmadụ 1184 nwụrụ n'aka ya ruo ụbọchị Tọzde.

    Onyeisi ndị National Primary Health Care Development Agency (NPHCDA), bụ Faisal Shuaib sị na ha " akwadowela ịnabata ọgwụ mgbochị na Naịjirịa tupu ọnwa anọ nke mbụ nke afọ na-abịanụ".

  4. Mmadụ 133 butere nje coronavirus ọhụrụ na Naịjirịa

    Ngụkọ nke ndị ngalaba 'National Centre for Disease Control' na-eme gosiri na ọ bụ mmadụ otu narị na iri atọ na atọ (133) butere nje coronavirus n'ụbọchị Sọnde.

    Lee etu ngụkọ ha si kwụrụ:

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  5. Remdesivir anaghị egbochi ọnwụ ndị na-arịa ọrịa covid-19 - WHO

    Remdesivir

    Ebe foto si, Reuters

    Ngalaba na-ahu maka ahụike mba ụwa bụ World Health Organisation (WHO) ekwuola na ọgwụ na-ebuso nje agha a kpọrọ remdesivir enweghị enyemaka ọ na-enyere ndụ ndị na-arịa covid-19.

    WHO nnyochara ọgwụ anọ e ji agwọ covid-19 gụnyere remdesivir na Hydroxycloroquine.

    Remdesivir so n'ọgwụ mbụ e ji agwọ coronavirus.

    O so n'ọgwụ e nyere onyeisiala Amerịka Donald Trump na nso a dịka o bụtere coronavirus.

    Ndị mere ọgwụ ahụ bụ ụlo ọrụ a kpọrọ Gilead anabataghị mkpebi nnyocha WHO.

    N'ozi ha zipụrụ, Gilead sị na nchọpụta WHO adabaghị na nke ndi ọzo mere.

    Ha sịkwa na enyochabeghi mkpebi a WHO wepụtara.

    Kedu ihe WHO chọpụtara?

    Na nnyocha sọsọ ha mere, WHO tinyere anya na ọgwụ anọ a sị nwereike gwụọ coornavirus - remdesivir, bụ ọgwụ Ebola sokwa. Hydroxychloroquine, interferon na mgwakọ lopinavir na ritonavir bu ndi ọzụ

    E nyere okenye 11,266 n'ime ụlọ ọgwụ 500 na mba 30 ọgwụ ndị a.

    Nchọpụta a, nke enyochabeghị, na-akọwa na onweghị ọgwụ ndị a niile nwere ihe pụrụiche ọ na-emere ndị bu coronavirus ọkachasị ebe o metụtara ọnwụ.

  6. Ka chi foo

    I meela wee nọnyere anyị taa.

    Ka chi bọọ.

  7. Gere akụkọ gbasara coronavirus n'Afrịka n'otu nkeji

  8. Ndị ọrụ Kamala Harris abụọ ebutela coronavirus

    Kamala Harris

    Ebe foto si, Twitter/Kamala Harris

    Kamala Harris bụ osote Joe Biden na-azọ ọchịchị ọkwa onyeisiala mba Amerịka, ekwuola na ndị otu ya abụọ ebutela coronavirus.

    Harris gara n’ihu kwuo na ya onwe ya ebughi ya bụ ọrịa n’ihi na e nyochaala ya ugboro abụọ n’izu a.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  9. Gọọmentị Abuja amachiela ngagharịiwe n'Abuja maka ịda iwu coronavirus

    Ngalaba a kpọrọ "FCT Security Committee" amachiela ngagharịiwen'Abuja maka ha sị na ndị mmadụ anaghị eruwe isi nye iwu banyere coronavirus.

    Ọ bụ n'akara Twitter FCTA ka e tinyere ozi a.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Ọtụtu ndị ntoroobia na-akwado ngagharịiwe gbarụrụ ihu maka atụmatụ a gọọmentị Abuja wepụtara.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Skip X post, 3

    End of X post, 3

  10. Barron, nwa Trump, ebutela coronavirus

    Barron, Donald na Melania Trump

    Ebe foto si, Reuters

    Nwunye onyeisiala Ameríka bụ Melania Trump ekwuoala na nwa ya nwoke bụ Barron ebutela Coronavirus dịka ya onwe ya gbakere na ya bụ ọrịa.

    Barron dị afọ 14 enweghị mmekpa ahụ ọbụla, dịka nne ya Melania siri kwuo.

    Nwunye Trump si na ihe ha "na-atụ ụjọ" bịara na mmezu" dịka nnyocha gosiri na nwa ya nwoke bu ọrịa coronavirus.

    Ọ sị: "Mana o ka bụ nwata, ma sikwa ike nke mere ojighi nwee nsogbu ọbụla."

    Melania na di ya bụ Donald Trump nakwa ọfọdụ ndị ọrụ ha butere coronavirus n'ime izuụka abụọ gara aga mana ha agbakeela.

    Nke a na-abịa dịka ụfọdụ mba na Yurope na-etinye mmachị nagharị maka igbochi mbawanye covid-19

  11. Unu asaala chi

    Anyị amalitela njem iwetela unu akụko pụrụichi taa.

    Nnọọ nu.

  12. Mmadụ 179 ọhụrụ ebutela coronavirus na Naịjirịa

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ "Nigeria Centre for Disease Control" (NCDC).

    Ekwuola na mmadụ 179 ọhụrụ butere ya bụ nje.

    N'ime ndị mmadụ 116 nọ na Legọs.

    Nke na-ewete ndị ọrịa fesarala na Naịjirịa 60,834.

    N'ime ndị mmadụ 52,143 agbakeela ma laa be ha dịka mmadụ 1,116 nwụrụ site ọrịa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  13. I meela wee nọnyere anyị

    Ka chi foo!

  14. ESUT: Ụlọakwụkwọ ga-emepe na Mọnde

    Mahadum Enugu State University of Science and Technology e ji Esut mara ewepụtala akwụkwọ iji gwa ndị nkuzi na ụmụakwụkwọ ha ka ha kwado mmepe.

    Ha kwuru na ha ga-emepegharị ọzọ n’ụbọchị Mọnde bụ iri na itoolu nke ọnwa Ọktoba, ma kwuo na ha ga-edebe iwu Covid-19.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  15. Gere akụkọ gbasara mkpamkpa coronavirus n'otu nkeji

  16. I meela wee bịakwute anyị

    Nọnyere anyị ka anyị wetara gị akụkọ ndị ị kwesịrị ịma maka coronavirus na mpaghara ụwa.

    Ndeewo

  17. Nkeji Coronavirus BBC Igbo

    Akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa

  18. Cristiano Ronaldo ebutela coronavirus

    Cristiano Ronaldo

    Ebe foto si, Getty Images

    Nwafọ Pọtugalụ na-agbara Juventus bọọlụ bụ Cristiano Ronaldo ebutela coronavirus.

    Ọ ga-edopu onwe ya iche n'ime izuụka abụọ dịka o butechara ọrịa a mgbe ọ na-agbara mba ya bọọlụ.N'ihi nke a ọ gaghị eso Pọtugalụ gbaa bọọlụ mgbe ha ga-ezute Sweden.

    Otu na-ahụ maka egwu bọọlụ na Pọtụgalụ mere ka a mata nke a.

  19. Trump alaghachịla n'ịchụ nta vootu

    Donald Trump

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Trump nọ na-atụrụ ndị mmadụ mkpuchi imi - ọtụtụ n'ime ha ekpuchighi imi ha

    Donald Trump bụ onyeisiala mba Amerịka alaghachịla n’ịchụ nta vootu na-erughi izu abụọ o butere coronavirus.

    Trump sonyere ndị na-akwado ya n’obodo Sanford, Florida bụ ebe mbụ n’ime anọ ọ ga-aga ịchụ nta vootu tupu ntuliaka a ga-eme n’ọnwa Nọvemba eruo.

  20. Mmadụ 208 butere Covid-19 agbakeela

    Ọnụọgụgụ nke otu na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) wepụtara na-egosi na mmadụ 208 bubu ọrịa Covid-19 agbakekwuola.

    Nke a ebutela ọnụọgụgụ ndị gbakerelanu site na 51,735 ruo 51,943.

    N'otu aka ahụ, a chọtakwuru ya bụ ọrịa n'ahụ mmadụ 164 ọzọ na Naịjirịa.

    Lee ọnụọgụgụ mmadụ ole a hụrụ ya n'ahụ ha na steeti na steeti.