Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus
Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Nkeji Corona
Akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa:
Boris Johnson amachiela ngagharị n'Ingland
Onyeisiala mba Briten bụ Boris Johnson nọrọ n'ozi ọ gbasara nye ụmụ afọ ala ahụ na onye ọbụla ga-anọ n'ụlọ ruo etiti ọnwa Febụwarị dịka mba ahụ malitere mkpochi obodo ọhụrụ n'ihi coronavirus..
Johnson kwuru na ọ bụ naanị ndị e nyere ikike nwere ike ịpụtu ama.
Ụlọakwụkwọ niile nakwa koleji ga-emechi malite taa bụ Tuzde dịka gọọmenti na-agba mbọ ibelata ọnụọgụgụ ndị bu coronavirus na ndị ahụ adịghị nọ n'ụlọọgwụ.

Ebe foto si, Getty Images
Peter Okoye ebutela coronavirus

Ebe foto si, Paul Okoye/Instagram
Otu n'ime ndị ejima P-square na-eti egwu bụ Paul Okoye ebutela ọrịa coronavirus.
Pau onye a ma dịka KingRudy bụ ya iji aka ya gba ama nke a n'a soshal midia dịka o kwuru na ya n'ihe na-eme, ma dọọkwa ndị mmadụ aka na ntị ka ha mụụ anya ka azụ.
Oge BBC Igbo kpọrọ ya ka anyị na ya kelee, o kwuru na ya ya agaghị emeli ya.
Cheta na nwanne ya bụ Peter buteburu ọrịa coronavirus na agba nke mbụ ya n'afọ 2020.
Ubong King: Nwa afọ Naịjirịa e ji okwu mkpalite mmụọ mara, a laala mmụọ
Ihe ASUU Strike napụrụ anyị - Ụmụakwụkwọ Naịjirịa
Tupu ị palie njem lawa ala Igbo lekwa iwu coronavirus na-achị obodo gị
I nwereike ibute coronavirus site na ahụrụ?
Ndị Naịjirịa sị na ha achọghị 'lockdown' ọzọ dịka Covid-19 malitere mụbawa ọzọ
Daalụnụ
Ndị ọma, n'ebe a ka anyị ga-eweta ọba akụkọ nke a n'isi njedebe.
Anyị na-ekele gị maka ịnọnyere anyị ma na-agụkwa akụkọ anyị.
Biko jisi ike na-anọnyere BBC Igbo.
Daalụnụ.
Ihe ise kpatara ọnụọgụgụ ndị na-ebute coronavirus ji arị elu ọzọ

Ebe foto si, Twitter/Chikwe Ihekweazu
Nkọwa foto, Chikwe Ihekweazu bụ onyeisi ngalaba NCDC Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ ihe kpatara ọnụọgụgụ ndị na-ebute nje coronavirus ji malite ịrị elu ọzọ.
Dịka ngalaba 'Nigeria Centre for Disease Control' si wepụta, mmadụ 418 ka a hụrụ nje covid19 n'ahụ ha n'ụbọchị Sọnde.
Na Satọde, mmadụ 617 ka a chọpụtara. N'ụbọchị Fraịde, mmadụ 796.
Ka ọ dị taa ọrịa coronavirus egbuola mmadụ otu puku, otu narị na iri itoolu na asaa (1,197
Ọtụtụ ihe nwere ike ị kpata ọnụọgụgụ a ji agbali.
Kọmiti nke Onyeisiala Naịjirịa hibere maka covid19 gụpụtara ụfọdụ n'ime ha:
1) Ọnụọgụ ndị na-ebute nje a na-abawanye n'ụwa niile: N'ọtụtụ mba dị icheiche n'akụkụ ụwa niile, ọnụọgụgụ ndị na-ebute nje covid19 na-arị elu. Ndị ọkachamara kpọrọ nke a 'second wave infections' n'asụsụ Bekee.
2) Ọgwụ mgbochi: Ndị ọkachamara ụfọdụ ekwuola na akụkọ gbasara ọgwụ mgbochi coronavirus nwere ike ime ka ọtụtụ mmadụ chee na ya bụ ọrịa enweela ọgwụgwọ. Nke a ga-eme ka ha welata aka n'ihe dị icheiche ha na-emebu iji chekwaa onwe ha

Ebe foto si, NCDC
Nkọwa foto, Ọnụọgụgụ ndi butere nje covid19 n'ụbọchị Satọde gara aga karịrị 700, nke a bụ ọnụọgụgụ kachasị kamgbe ọnwa olemole 3) Ndị si mba ofesi abata Naịjirịa: A na-atụ egwu na ọtụtụ ndị si mba ofesi abata Naịjirịa anaghị eme nnyocha maka coronavirụs dịka iwu si kwuo. Ụfọdụ n'ime ha na-eji akwụkwọ nnyocha adigboroja gosi ndịọrụ ahụike Naịjirịa.
4) Ndị mmadụ anaghị echekwa onwe ha: Dịka ọ dị ka mfesa nje Covid19 ebelatara, ọtụtụ ndị mmadụ akwụsịla ịchekwa ichekwa onwe ha maka ya, nke mere o ji malitekwa ọzọ.

Ebe foto si, LSMH
Nkọwa foto, Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu butere coronavirus n'ọdị nso a 5) Mmepe Obodo:Dịka gọọmentị wepuru mmachi mkpagharị niile e tinyeburu iji gbochie mfesa ọrịa coronavirus, a tụrụ anya na ọnụọgụgụ ndị na-ebute nje ahụ nwere ike ịrị elu.
Ugbua, kọmiti na-ebuso nje coronavirus agha bụ 'Presidential Task Force on Covid19' adọọla aka na ntị ka onye ọbụla kpachapụ anya.
Aka na ntị a na-abịa dịka onyeisi otu ahụ bụ Boss Mustapha kwuru na ya onwe ya ewepụla onwe ya iche n'ihi na ụfọdụ ndị ezinụlọ ya butere coronavirus.
Mustapha kwuru na nnyocha gosiri na o bughi ya bụ ọrịa mana ọ ga-anọpụ iche ruo abalị iri na anọ dịka iwu si kwuo.
Ebonyi steeti agaghị emechi ụlọakwụkwọ maka coronavirus.

Ebe foto si, Dave Umahi/Facebook
Dịka akụkọ na-efegherị maka Ebonyi steeti imechị ụlọakwụkwọ maka nfesa coronavirus nke abụọ, Kọmishọna ahụike steeti ahụ ekwuola na nke ahụ abụghị eziokwu.
Kọmishọna, Daniel Umezurike, gbara BBC na ọ bụ naanị otu ụlọakwụkwọ na-etinye aka n'otu nzuzo ka ha mechiri.
Akụkọ na-efegharị na soshal midia bụ na Ebonyi steeti ga-emechị ụlọakwụkwọ maka nfesa coronavirus nke abụọ.
Praịm Mịnịsta mba Eswatini anwụọla n'ihi ọrịa coronavirus

Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ambrose Dlamini Praịm Mịnịsta mba Eswatini bụ Ambrose Dlamini, alaala mmụọ dịka ọ gbachara afọ iri ise na abụọ.
Amabeghị kpọmkwem ihe gburu Dlamini, mana akụkọ kwuru na o butere nje coronavirus n’izuụka anọ gara aga.
Dlamini nwụrụ n'ehihie ụbọchị Sọnde n'ụlọọgwụ dị na mba Saut Afrịka.
N'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Nọvemba ka |Dlamini kwuru na nnyocha gosiri na o butela coronavirus, mana oge ahụ, ọ naghịọ egosipụta ya n'ahụ.
Ka izuụka olemole gachara, gọọmenti mba Eswatini kwuru na e bugala Dlamini ụlọọgwụ na Saụt Afrịka iji nye ya ọgwụgwọ zuru oke.
Mana n'ụbọchị ụka ka gọọmentị kwuru na nwa amadi ahụ anwụọla, mana ha ekwughi kpọmkwem ihe gburu ya.
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Eswatini bụ ntakiri obodo e jibu Swaziland mara, nke dị nso na Saut Afrịka.
Mmadụ 418 butere ọrịa coronavirus na Naịjirịa na December 13,2020

Ebe foto si, NCDC
A hụrụ coronavirus n'ahụ mmadụ 418 na Naịjirịa ụnyaahụ bụ Sọnde ụbọchị iri na atọ nke ọnwa disemba 2020.
Na nkọwa ya, Legọs steeti ketere mmadụ otu narị, iri na atọ (113), ebe Abụja ji iri asatọ na isii (86) esochi ya azụ.
N'ala Igbo, mmadụ asatọ si Enugwu (8), Imo ji mmadụ asaa (7), ebe Ebonyi mmadụ isii (6).
Nke a butere ọnụọgụ ndị bu ya bụ nje na Naịjirịa puku iri asaa na atọ, otu narị na iri asaa na ise (73175).
Mmadụ puku iri isii na isii, na iri itoolu bụ ndị gbakegoro laa be ha, ebe mmadụ otu puku, otu narị na iri itoolu na asaa (1197) bụ ndị nwụrụ n'ime ya.
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ebe foto si, Nigerian Army Facebook page
Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.
Cheta na ndịagha kagburu ọgbakọ ndị isi ha nke malitere n’abalị asaa nke ọnwa Disemba, dịka otu onye n’ime ha nwụrụ na mberede n’ihi coronavirus.
Ụtụtụ ọma ndị Igbo
Nke onye chiri ya zere.
Iheọma zuo anyị ahụ n'izu ụka!
Ngwa sonyere anyị ka ịmata nke ekwe na-akụ dịka covid 19 malitere ịkpa mkpa mkpa ọzọ na Naịjirịa.
Mmadụ 617 butere ọrịa coronavirus na Naịjirịa na December 12,2020

Ebe foto si, Ncdc twitter Peeji
A hụrụ ọrịa coronavirus n'ahụ mmadụ narị isii, iri na asaa (617) na Naịjirịa n'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Disemba, 2020.
Lagos kachasị nwe ndị butere ọrịa a dịka ọnụọgụ ndị butere ya bụ narị abụọ, iri abụọ na ise.
Ndị buterela ọrịa covid-19 na Naịjirịa eruola puku iri asaa na abụọ,narị asaa, iri ise na asaa, ndị gbakerelanụ nọ na puku iri isii na ise, narị asatọ na iri ise ebe ndị nwụrụlanụ nọ na otu puku, otu narị, iri itoolu na anọ.
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndweonu ndị bee anyị!
Sonyere anyị ka ịmata nke ekwe na-akụ gbasara ọrịa coronavirus.
Gọvanọ Sanwo-Olu ebutela Coronavirus
Aka na-achị Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu ebutela ọrịa coronavirus.
Gboyega Akoshile bụ ọnụ na-ekwuchitere ya, ziputara ozi n'elu Twitter ebe ọ nọ kwuo na Gọvanọ Sanwo-Olu anatawala ọgwụgwọ.
Ọ gakwara n'ihu rịọ ndị mmadụ ka ha tinye Sanwo-Olu n'ekpere.
Skip X post, 1Hapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Skip X post, 2Hapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ọkammụta Akin Abayomi bụ kọmishọna ahụike nke Legọs steeti kọwara na a chọtara ya bụ ọrịa n'ahụ Sanwo-Olu ka e nyochara ya mgbe a hụrụ na otu onye n'ime ya na ya na-arụkọ ọru butere ya.
Skip X post, 3Hapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ọnụọgụgụ ndị butere Covid-19 ebidola ịgbali n'ike ọzọ - NCDC

Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) etiela mkpu gwa ụmụ Naijiria saa anya mmiri na ọrịa Coronavirus amaliterela ifesa ọzọ.
N'ozi ha wepụtara ụbọchị Fraide, NCDC kwuru na "kemgbe ọnwa Septemba rue ọnwa Novemba 2020 ọrịa coronavirus bidoro gbalitewa na Naijiria."
"Mana kemgbe izuụka gara aga (30th Novermba rue Disemba 6,2020) nnyocha gosiri na ọ gbalite rinne."
NCDC, ndị kwuru na ọnụọgụgụ ndị a na-ahụ ya n'ahụ ha kwa ụbọchị na-arị elu n'ike n'ike, dọọ ụmụ Naijiria aka na ntrị ka ha kee nkwụcha.
Ha chetara ndị mmadụ ka ha; belata ime njem na Naijiria nakwa mba ndị ọzọ ọkachasị mpaghara ebe ọrịa ahụ kpu ọkụ n'ọnụ.
Ha dụkwara ọdụ ka ndị mmadụ na-emekwa ihe ndị ọzọ dị mkpa maka igbochi ọrịa ahụ gụnyere; iji ncha kwọ aka mgbe ọbụla, iyi mkpuchi imi.
