E burula Donald Trump gawa ụlọọgwụ

Ebe foto si, Getty Images
E burula onyeisi ala mba Amerịka bụ Donald Trump gawa ụlọọgwụ dịka obere ahụọkụ malitere ime ya.
Cheta na nnyocha gosiri na Trump na nwunye ya bụ Melania butere ọrịa coronavirus.
Ụlọọrụ onyeisiala wepụtara akwụkwọ ozi nke kwuru na "obere ike na-agwụ Trump" mana ya bụ ihe erijughị afọ.
Ha kwuru na ihe e ji buru ya gaa ụlọọgwụ bụ iji kpachapụrụ ya anya.
Trump n'onwe ya weụtakwara ihe onyonyo n'akara Twitter ya ebe o kwuru sị: "Adị m nnọọ mma, mana anyị chọrọ ịkpachapụ anya ka ihe niile gaa n'anya ya. Nwunye m dịkwa mma. Daalụnụ."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ụlọọgwụ e bugara Trump bụ ụlọọgwụ 'Walter Reed', ebe ndị isiala mba Amerịka niile na-anata ọgwụgwọ kwa afọ.
N'ime abalị ụbọchị Tuzde, o zipuru ozi ọzọ na Twitter na-ekwu na ya dị mma.
Ọnụ na-ekwuru 'White House' bụ Alyssa Farah kwuru na Donald Trump ahafebeghị ọchịchị n'aka osote ya bụ Mike Pence.
Dịka iwu mba Amerịka si dị, ọ bụrụ na ọrịa mesiwe Trump ike nke na ọ gaghị enwenwu ike ịrụ ọrụ ya dịka onyeisiala, ọ ga-ahafe ọchịchị n'aka osote ya nwa mgbe nta ruo oge ọ gbakechara nke ọma.









