Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus
Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
UK, Brazil, Australia na mba ndị ọzọ banyerela 'recession' n'ihi ọrịa coronavirus

Ebe foto si, Getty Images
Ikuku ọrịa coronavirus ejirila nwayọ nwayọ na-ekucha na mba ụwa dị icheiche, mana ụbịam ya bụ ọrịa kpatara agaghị ala ọsọ ọsọ.
Mba dị icheiche mechiri obodo ha, kwụsị azụmahịa n'ụzọ ọbụla, ọrụ, akwụkwọ, nakwa okpukperechi iji jichie ya bụ ọrịa.
Nke a mere na ihe na-eku ugbua bụzị ikuku ụbịam, dịka ọtụtụ mba banyere ọtaniisi nke Bekee kpọrọ 'recession'.
Lee ụfọdụ mba ndị ya bụ ihe metụtara:
Mba UK - Ọnọdụ akụnụba mba UK ji pasentị iri abụọ wee datuo n'agba nke abụọ nke afọ 2020.
Nke a bụ nke mbụ UK na-enwe ọnọdụ dị otua kamgbe afọ 2009.
Mba Brazil - 'Gross Domestic Product' nke mba Amerịka daturu ala n'agba nke abụọ nke 2020.
GDP bụ otu ụzọ e si atule etu ọnọdụ akụnụba obodo si dị. A na-agụkọ ya ugboro anọ n'ime otu afọ.
Ọ bụrụ na ya bụ GDP agbatuo ugboro abụọ, mara na mba ahụ abaala ọtaniisi.
Pasentị itoolu na ụma asaa ka GDP mba Brazil ji gbatuo n'agba nke abụọ nke 2020.

Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Oke ọkụ ọgbụgba sokwa nye akụnụba mba Australia nsogbu Mba Australia- Malite n'ọnwa Eprel ruo ọnwa June afọ a, akụnụba mba Australiaji pasentị asaa datuo.
Ụdị ihe a emebeghị na mba ahụ kamgbe afọ 1959.
Oke ọkụ ọgbụgba na mba Australia metụtara akụnụba mba ahụ n'ụzọ ọjọọ mana coronavirus bịaziri kụọ ya jaajaa.
Mba South Korea- Mba South Korea bụ mba nke anọ kacha baa ọgaranya na mpaghara Asia.
Mana akụnụba ha jipasentị abụọ na ụma gbatuon'agba nke abụọ nke afọ a.
Mbupu ahịa (export) bụ ihe kacha enye mba South Korea ego, mana ha enweghị ike ibupu ahịa etu ha si emebu n'ihi ọrịa coronavirus.
Mba India- Ndị ọkacha mara na-ekwu na mbaIndia agaghị agbanahụ ịbanye recessionn'afọ 2020 a.
Nke a bụ maka na ọtụtụ ihe ngụkọ na-egosi ọnọdụ akụnụba mba ahụ gbaturu nke ukwuu n'agba nke mbụ nke afọ 2020.

Ebe foto si, Reuters
Nigeria- Ụlọakụ mba ụwa (World Bank) kwuru na Naịjirịa ga-abenye ọtanisitupu afọ 2020 agwụ.
Ihe kpatara nke a bụ maka na ọnụahịa mmanụ agbidi - nke bụ nnukwu ihe na-enye Naịjirịa ego - daturu nke ukwu.
N'oyu aka ahụ kwa, Naịjirịa mechiri ahịa na ọrụ ruo ọnwa abụọ iji gbochie mfesa ọrịa coronavirus.
Ndị ọkacha mara adọọlarị aka na ntị ka onye ọbụla kee ajị n'ume.
Unu asaala chi?
Ọrịa coronavirus ka na-akpa ike dị egwu n'ọtụtụ mba ụwa niile.
Echezọna ịsonye anyị ka ị maara nke na-akpọtụ.
Jisike.
Ndị Igbo ka chi foo nụ
Onye a hụrụ taa ka a hụ ya echi
Nkeji Coronavirus
Gere akụkọ banyere akụkọ Coronavirus n'Afrịka n'otu nkeji.
Ndị dọkịnta Naịjirịa ebidola abụbụọrụ ebighebi

Ebe foto si, Getty Images
Otu dọkịta ndị na-arụ n’isiobodo Naịjirịa bụ Abuja ga-edido abụbụ ọrụ ebighebi n’ihi ụgwọ ọrụ coronavirus eji ha kemgbe ọnwa Eprelu.
Ha jisike ekwu na gọọmentị emezughi nkwa ekwere ndị ọtụ ha na-agwọ ma na-eleta ndị nwere covid-19.
Abụbụ ọrụ a malitere dịka abalị iri na anọ ha nyere gọọmentị iji tụgharị uche ma gee ha ntị gafechara.
Rue ugbua, gọọmentị apụtabeghị kwuo ihe ọbụla maka okwu a mana ndị dọkịnta ahụ foro ntutu taa na ha agaghị alaghachi ọrụ ganye mgbe gọọmentị ga enye ha ihe niile ha chọrọ.
Onyeisiala mba Kenya ebidola nyocha Ministri ahụike mba ahụ

Ebe foto si, Reuters
N’Afrịka onyeisiala mba Kenya bụ Uhuru Kenyatta enyela iwu ka ministri ego niile ha mefuru maka ọgwụgwọ coronavirus na mba ahụ.
Iwu a na-abịa dịka ndị mmadụ na-ebo ministri ahụike ahụ ebubo mpụ na nrụrụaka ha mere n’ego amapụtara maka covid-19.
O nyere ha naanị abalị iri atọ maọbụ otu ọnwa ịgosi "ụzọ na usoro niile ha ji zụta ngwa ọrụ eji gwọ ọrịa coronavirus na mba ahụ".
Osun steeti akwadola ịgbape Mahadum

Ebe foto si, AFP
Gọọmentị Osun steeti ekwuola na ha ga-agbape ụlọakwụkwọ ndị dị na steeti ahụ n'ụbọchị 21 nke ọnwa Sepụtemba.
Kọmịshọna mgbasaozi na steeti ahụ bụ Funke Egbemode gbara nke a n'anwụ dịka emechara nzụkọ ndị isi steeti ahụ
O kwuru na a ga-ahụ na edebere usoro nchekwa covid-19 niile dịka gọọmentị si wepụta gbasara mmepe ụlọakwụkwọ.
Ha kwuru na agba nke mbụ ga-ebido na 21 sepụtemba gwụcha na 30 ọktoba ebe agba nke abụọ ga-ebido na 9 Novemba rue 24 Disemba.
Oge erubeghị ịgbape Mahadum - ASUU

Ebe foto si, Getty Images
Otu na-elekọta mahadum dị icheiche bụ ASUU adọọla gọọmentị aka na ntị ha agbapela Mahadum gọọmentị ndị dị na Naịjirịa
Ha kwuru na gọọmentị kwesiri ịchere n’ihi na enwebeghi usoro nwere isi a ga-eji dopu ndị mmadụ iche na Mahadum ndị gọọmentị
Nke a na-abịa dịka #backtoschool na-ewu na soshal midia dịka gọọmentị Legọs steeti na steeti ndị ọzọ na-akwado ịmepe Mahadum n'ọwa sepụtemba.
Covid-19 ka na-akpa ike dị egwu - Boss Mustapha

Onyeisi otu gọọmentị kpokobara iji luso coronavirus agha bụ Boss Mustapha adọọla aka na ntị ka ndị mmadụ kpachara anya ha maka ọrịa ahụ.
Mustapha kwuru na n’agbanyeghị n’ọnụọgụgụ ndị bu ya bụ ọrịa na-adatụ na ọ ka na-efesa na akpa ike dị egwu.
O kuwkwara na ọnụọgụgụ ndị emere nyocha a na-ewebata abụghị ihe na-akpalite mmụọ ma gwakwa ndị mmadụ ha jisike na-ewepụta onwe ha maka nyocha.
Igbo bụ Igbo ụnụ asaala chi?
Anyị ji n'aka na unu pụtara ọfụma n'ụtụtụ a
Biko gbanụ mbọ soro anyị maka isiokwu ndị na-ewu taa.
Yagazie
Ka chi foo nụ
Nkeji Coronavirus BBC Igbo
Gere nkeji BBC Igbo maka coronavirus
Akin Abayomi, kọmishọna ahụike Legọs steeti agbakeela n'ute ọrịa coronavirus

Ebe foto si, Twitter/Akin Abayomi
Akin Abayomi bụ kọmishọna ahụike nke Legọs steeti esila n'ute ọrịa coronavirus gbakee.
N'ozi Gbenga Omotosho bụ kọmishọna mgbasa ozi na steeti ahụ zipuru, o kwuru na e nyochakwara Abayomi ahụ ọzọ wee chọpụta na ọrịa ahụ adịghịzị n'ahụ ya.
Cheta na nnyocha Abayomi mere n'izu gara aga gosiri na o butere ọrịa coronavirus.
Aka na-achị Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu kwuputere na ozi mgbake a emeela ya obi ụtọ, dịka ọ na-ekwukwa ka ndị mmadụ hie asaa n'anya n'ihi na ọrịa Covid-19 a alachabeghi.
Ọ dụrụ ndị mmadụ ọdụ ka ha gbaa mbọ na-eyi mkpuchi imi, na-akwọ aka ha nakwa gbaara nnukwu ọgbakọ ọsọ.
A tụọla nwoke mara 'window' iji gbalahụ nnọsapụ nga
A tụọla nwoke mara 'window' iji gbalahụ nnọsapụ nga ọnwa isii na mba Ọstrelia.
Nwoke ahụ aha ya bụ Yusuf Karakaya mịpụrụ ebe e tinyere ya na nnọsapụ n'ụlọoriri na nkwari, gaa ileta enyi ya nwaanyị.
Karakaya lọghachịrị obodo Perth dịka ọ gachara Sydney na ngwụcha ọnwa Julaị ịga leta nwanne ya na-arịa ahụ, dịka ndị ntaakụkọ mba Ọstrelia kwuru na akwụkwọ ndị ụlọikpe kwuru.
Mana dịka ọ lọghachịrị, e nyere ya iwu ịbanye na nnọsapụ izu abụọ na Mercure Hotel dị n'obodo Perth, mana n'ime ụbọchị atọ, ọ nọ na-amịpụ na-amịbata.
Kamera CCTV setere ubube dị n'elu ụgbọala mmadụ na-eji abịa eburu ya.
A nwụchiri Karakaya ebe o zokpuru n'ime kọbodụ dị n'ụlọ enyi ya nwaanyị, dịka ọ gwara ndị uweojii na ọ bụ n'ihi na ọ gaara abanye nsogbu ma ọ bụrụ na ọ bịaghị nọnyere ya n'ụbọchị ncheta ọmụmụ ya, mere o ji mịpụ ịbịa hụ ya.
Ọ ga-anọ otu ọnwa n'ime ụlọmkpọrọ dịka a kwụsịtụrụ ikpe ya.
Mmadụ 138 ọhụrụ ebutela ọrịa coronavirus na Naịjiria
Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ewepụtala ọnụọgụgụ mmadụ ole butere ọrịa coronavirus ọhụrụ.
Site n'ọnụogụgụ ha wepụtara, naanị mmadụ otu narị na iri atọ na asatọ (138) butere ya bụ ọrịa n'ime otu ụbọchị.
Mmadụ iri na otu butere ya n'Ebonyi steeti, asatọ si Abịa, ebe asaa si Anambara.
Lee steeti ndị ọzọ ebe a chọtakwuru ndị bu ya bụ ọrịa.
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ị bọọla chi?
Ka ụbọchị taa maara gị mma o!
Iseee!
Nọnyere anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị ịkọ taa niile gbasara ọrịa coronavirus.
'Anyị akpọlatala ndị Naịjirịa karịrị 10,000 site n'ofesi kamgbe coronavirus malitere'

Ebe foto si, Geoffrey Onyeama
Gọọmentị etiti sị na ha akpọlatala ụmụafọ Naịjirịa karịrị puku iri site na mba ofesi dị iche iche site n’ọnwa Mee ruo ọnwa Ọgọstụ iji chekwaa aha n’ihi coronavirus.
Nke a si n’ọnụ onye mgbasaozi ngalaba na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi n’ofesi bụ Abdul-Rahman Balogun onye sị na a na-edopu ha iche ruo izuụka abụọ.
Ọ sị na gọọmentị etiti, ụlọọrụ ha bụ NIDCOM n'ịchafụ, mịnịstrị na-ahụ maka mmekọrịta mba ndị ọzọ nakwa ụlọọrụ Naịjirịa dị n'ofesi gbakọtara aka malite mkpọlata a n'ụbọchị asaa nke ọnwa Mee.
Geoffrey Onyeama bụ mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta mba ndị ọzọ sị na ndị ka na-eche ka a kpọlata ha nọ na Chaịna, Amerịka, UK, Saụt Afrịka, India, Kanada, mpaghara Middle East nakwa ndị ọzọ.
Ụgbọelu ndị ha ji na-ebulata ndị a gụnyere Emirates, Ethiopian, Air Peace na ndị ọzọ.
Mmadụ 250 ọhụrụ butere coronavirus na Naịjirịa na Satọde
Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ Nigerian Centre for Disease Control ekwuola na ọ bụ mmadụ narị abụọ na iri ise butere coronavirus ọhụrụ na Naịjirịa n'ụbọchị Satọde.
N'ime ndị a, mmadụ iri na atọ si Enugwu, mmadụ abụọ si Ebonyi ebe otu onye si Imo Steetị.
Ndị butere ọrịa eruola puku iri ise na atọ, narị asaa na iri abụọ na asaa, ndị gbakerela dị puku iri anọ na otu, narị atọ na iri na anọ ebe ndị nwụrụla dị otu puku na iri na otu.
Skip X postHapụ X ihe dị na ya?Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ụtụtụ ọma nụọ ooo!
Igbo ndị ọma anyị ji aka na umu hiri ụra nke ọma?
Obi ọma ka anyị ji anabata unu n'ọgbakọ nke taa. Nọsie ike ka ị mara nke ekwe na-akụ maka coronavirus.
