Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ndewonụ, ka chi fonu

    Ụmụ Igbo, anyị abịala na nchịkọta mgbasa ozi nke taa.

    Anyị ga-amalitekwa ọzọ n'elekere ise nke ụtụtụ echi.

    Ka ọ dị nụ.

  2. Ụlọakwụkwọ Mahadum ga-emepe na Legọs na Sepụtemba

    Babajide Sanwo-Olu

    Ebe foto si, Twitter/Babajide Sanwo-Olu

    Gọvanọ Legọs steeti Babajide Sanwo-Olu ekwuola na ụlọakwụkwọ mahadum niile dị na steeeti ahụ ga-amalite akwụkwọ ọzọ n'abalị iri na anọ nke ọnwa Sepụtemba.

    N'otu aka ahụ kwa ụlọakwụkwọ elementịrị na nke Sekọndịrị ga-amalite n'abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Sepụtemba.

    Sanwo-Olu kwuru nke a n'ọgbakọ ndị ntaakụkọ e nwere n'obi gọọmentị dị n'Ikeja n'ụbọchị Satọde.

    Cheta na ụlọakwụkwọ niile mechiburu emechi iji gbochie mfesa ọrịa coronavirus.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Mana Sanwo-Olu kwukwara na mkpebi ahụ nwere ike ịgbanwe ma ọ bụrụ na e nweta ndụmọdụ ọzọ n'aka ngalaba ahụike nke steeti ahụ.

    Ụlọ nri ga-emepe mana ụlọ nkiri onyonyo agaghị eso mepee

    Sanwo Olu gakwara n'ihu kwuo na ụlọ ebe a na-ere nri nke Bekee kpọrọ 'restaurants' na 'eatries' ga-amalite ịnabata ndị mmadụ ka ha nọrọ ebe ahụ rie nri.

    Cheta na iwu nyeburu ohere ka ụlọ nri mepee naanị maka ndị mmadụ ịbịa zụrụ nri ma laa, mana ugbua, onye chọrọ ịnọ ebe ahụ rie nri ya nwere ike ime otu a.

    N'aka nke ọzọ, ụlọ ebe a na-ekiri onyonyo, nke pụtara 'cinema' na bekee, agabeghi emepe.

    Sanwo-Olu kwuru na ọ bụ ma ọnwa Sepụtemba gachaa ka ha ga-eleba ya anya ma mara ma ha a ga-amalite.

  3. Ọnụọgụgụ ndị butere coronavirus na Naịjirịa kwa ụbọchị kachasị obere kamgbe ọnwa atọ

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ NCDC sị na mmadụ otu narị na iri isii ọhụrụ butere ọrịa coronavirus n'ụbọchị Fraịde.

    Nke a bụ ọnụọgụgụ a na-enwete kwa ụbọchị kachasị obere kamgbe ọnwa atọ gara aga.

    Ugbua a ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa a dị puku iri ise na atọ, narị anọ na iri asaa na asaa.

    Ndị gbakerela dị puku iri anọ na otu na iri na asaa ebe ndị nwụrụla n'ọrịa a dị otu puku na iri na otu.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  4. Igbo ndị ọma unu abọọla chi?

    Nke a bụ ka anyị nabata unu n'ọgbakọ anyị nke ụbọchị taa.

    Ndụ mmiri ndụ azụ.

  5. Nkeji coronavirus

  6. Onyeisiala mba Yuganda ekewapụtala "ụbọchị ekpere" maka covid-19

    Yoweri Museveni

    Ebe foto si, Getty Images

    Yoweri Museveni bụ onyeisiala mba Yuganda ekewapụtala ụbọchị Satọde dịka ụbọchị ndị mmadụ ga-eji kpe ekpere maka ọrịa covid-19.

    Museveni kwuru na o nwetara nchepụta ime nke a site n'aka otu onye mba ahụ nwetara mkpughe n'aka Chukwu.

    "Chineke gwara ya na mkpughe na m mee ekpere na mba niile ka Chinke were zọpụta anyị n'aka ọrịa covid-19, ya mere m ji kewapụta ụbọchị 29 n'ọnwa ọgọst maka ekpere a...nọrọnụ n'ụlọ unu kpee nụ ekpere" ka o kwuru.

    Ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa a na Yuganda bụ puku abụọ na narị isii na iri asaa na itoolu.

  7. NCDC awulitela ụlọ nyocha abụọ ọzọ maka nyocha orịa coronavirus

    Ngalaba NCDC awulitela ụlọ nyocha abụọ ọzọ na Naịjirịa maka nyocha ọrịa coronavirus.

    Otu ụlọ nyocha ahụ dị na Bayelsa Medical University dị na Bayelsa ebe nke ọzọ dị na Mhadum Porthacourt.

    Nke a mere na ọnụọgụgụ ụlọ nyocha niile ebe a na-eme nyocha maka ọrịa covid-19 dịzi iri isii na isii ugbua na Naịjirịa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  8. Ndị nwụru site n'orịa coronavirus na Naịjirịa agafeela otu puku

    N'ozi nke ngalaba NCDC wepụtara, o gisiri na ọnụọgụgụ ndị coronavirus gburu na Naịjirịa eruola otu puku na iri na otu.

    N'otu aka ahụ ọnụọgụgụ ndị butere ya bụ ọrịa eruola puku iri ise na narị atọ na iri na asaa.

    Mana ndị ọhụrụ a hụrụ ọrịa a n'ahụ ha bụzị mmadụ narị abụo na iri itoolu na isii.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  9. Ụtụtụ ọma Igbo bụ Igbo

    Nnọọ nụ na peeji anyị taa.

    Coronavirus agbanweela ọtụtụ ihe n'ụwa anyị ugbua, ya mere anyị ji ewetara gị ihe niile gbasara ya.

    Jisike sonye anyi. Daalụ.

  10. Ka chi foo nụ

  11. Paul Pogba ebutela nje coronavirus

    Paul Pogba

    Ebe foto si, Reuters

    Paul Pogba bụ nwafọ mba Fransị na-agbara Manchester United bọọlụ ebutela coronavirus dịka onye nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ mba Fransị bụ Didier Deschamps.

  12. Njem ụgbọelu ịgawa ofesi ga-amalitezi n'ụbọchị ise nke ọnwa Seputemba

    Ụgbọelu

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ọrụ njem ụgbọelu na Naịjirịa bụ 'Nigerian Civil Aviation Authority' (NCAA) ekwuola na njem ụgbọelu ifepu gawa ofesi ga-amalitezi n'ụbọchị ise ọnwa Seputemba na ọ bụghizi ụbọchị 29 nke Ọgọstụ.

    Onyeisi ụlọọrụ a bụ Musa Shuaibu Nuhu kwupụtara nke a mgbe otu ọtawaike maka coronavirus na-agwa ndị ntaakụkọ okwu.

    Ọ sị na dịka ụgbọelu nakwa ndị nwe ha adịla njikere ifepu mana ihe ndị ọzọ dị mkpa maka njem ụgbọelu mere e ji gbatịa ya ruo otu izuụka.

    Nuhu sị na nke a aghaghị ịdị ire n'ụbọchị 5 ọnwa Seputemba, n'oge na-adịghị anya na ha ga-ekwupụta usoro a ga-eji malite njem a.

  13. Nkeji coronavirus BBC Igbo

  14. Paul Pogba nke Manchester United ebutela coronavirus

    Paul Pogba

    Ebe foto si, Getty Images

    Paul Pogba bụ nwafọ mba Fransị na-agbara Manchester United bọọlụ ebutela coronavirus dịka onye nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ mba Fransị bụ Didier Deschamps.

    Nwamadị a dị afọ iri abụọ na asaa ga-edopu onwe ya iche ruo izuụka abụọ.

    Ọ gaghị eso ndị Fransị gbaa asọmpi Nations League game nke ha na ndị Sweden ga-adị n'ụbọchị Satọde.

    Mana o nwereike iso na ndị a ga-ahọrọ mgbe Manchester ga-ezute Crystal Palace n'Old Trafford n'ụbọchị 19 n'ọnwa Seputemba.

    Ndị otu ya na Manchester United na-ekpere ya ekpere ọma sị ka ọ gbakee ngwa ngwa dịka asọmpi Premier League ọhụrụ na-achọ ịmalite.

  15. Ụmụ Naịjirịa 261 tọrọ na Chaịna alaghachitela

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ụmụ Naịjirịa ruru narị abụọ na iri isii na otu tọrọ na Chaịna atụọla ụkwụ n’ọdọụgbọelu dị n’Abuja.

    Dịka ọ dị ugbua, ndị ahụ niile ewepụla onwe ha iche ihe ruru abalị iri na anọ dịka iwu ehibere maka coronavirus si kwuo.

    Ọ bụ ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ụmụ Naịjirịa na mba ofesi kwuputara nke a site n'akara Twitter ha

  16. Ụlọọgwụ coronavirus n'Itiopia ejula eju

    Ndị na-anata ume ndụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọgwụ nke ewepụtara iche iji gwọ ọrịa coronavirus na mba Itiopia ejula dịka o nweghizi ohere ị nabata ndị ọhụrụ maka ọgwụgwọ.

    Onyeisi ụlọọgwụ ahụ bụ Wuletwa Chaniegwara BBC na nke a nwereike ịme n’ime naanị otu izu.

    Ụlọọgwụ ahụ na-anabata ihe ruru mmadụ iri abụọ kwa ụbọchị ma na-agwọ mmadụ narị abụọ ugbua.

  17. Mmadụ 221 ọhụrụ ebutela coronavirus na Naịjirịa

    Ka ọ kwụ ugbua, mmadụ 53,021 ka ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ nke a kpọrọ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) sị bu nje ọrịa coronavirus.

    Nke a na-abịa dịka ngalaba ahụ kwuru na ọ bụ mmadụ 221 butere ya bụ nje ọhụrụ.

    Dịka mgbakọ NCDC siri kwụrụ, ọ bụ mmadụ 1,010 nwụrụ site na ọrịa coronavirus, ebe mmadụ 40,281 gbekere ma laa be ha.

    Mgbochi ụfọdu ka dị na Naịjirịa banyere ọrịa, dịka NCDC sị na esibeghi na mkpa mkpa ya pụta.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  18. Unu asaala chi?

    Akụkọ niile gbasara coronavirus na ihe sọ ya bụ ihe anyị na-ewetara unu taa.

    Gbaa nụ mbọ soro anyị taa.

    Yagazie!

  19. Nafdac sị na ha ka na-enyocha chloquine dịka ọgwụ coronavirus

    Mojisola Adeyeye

    Ebe foto si, Nafdac

    Onyeisi ngalaba na-ahụ maka nri na ọgwụ a kpọrọ NAFDAc n’ịchafụ bụ ọkammụta Mojisola Adeyeye sị na Naijiria ka na-atụle iji ọgwụ ịba bụ chloroquine were agwọ coronavirus.

    Adeyeye gwara BBC na o kwesịghị iji ogwu chloroquine agwọ onye ọrịa coronavirus jisi ike.

  20. Akụ na ụba jicha pasent iri na ụma asaa maa imi n'aka maka coronavirus

    Patrice Talon

    Ebe foto si, Getty Images

    Ọrịa Coronavirus kụpịkwara akụnaụba mba Bene dịka ihe ha tụrụ anya ga-abatara ha ji pasent iri na ụma asaa were daa na ọnwa atọ mbụ nke afọ 2020, dịka Mịnịstrị na-ahụ maka ego na akụnaụba mba ahụ si kwuo.