Mba Zambia emepeela ụlọakwụkwọ na ụlọ ịṅụ mmanya

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Zambia bụ Edgar Lungu ekwuola ka ụlọakwụkwọ na ebe a na-aṅụ mmanya jiri nwaayọ n’ihi coronavirus.
Lungu kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị ụlọomeiwu okwu na Lusaka banyere usoro a ga-ji na-emepe obodo n'ihi coronavirus.
Ọ sị na ụlọakwụkwọ ga-amalite ọzọ n’ụbọchị iri na otu nakwa ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Sepụtemba.
N’otu aka ahụ ụlọ ebe a na-aṅụ mmanya ga na-agbape n’ụbọchị Fraịde ruo Sọnde site n’elekere isii ruo elekere iri na otu nke abalị.
"N'ọnwa Maachị, enyere m iwu sị ka a gbachie obodo n'iji buo agha megide coronavirus. Anụla m ahụhụ ndị nwe ọdọ mmanya nakwa ebe a na-agba awantị maka mmechie a... Ya mere m ji kwuo ka e mepetu ebe ndị a malite na Fraịde." O kwuru.
Ndị buterela coronavirus na Zambia dị 13,214 kamgbe ọ malitere n'ọnwa Maachị, mmadụ 300 anwụọla dịka Mahadum John Hopkins si kwuo.






