Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ọnụọgụgụ ndị butere coronavirus arịala elu ọzọ

    Ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa coronavirus arịala elu ọzọ dịka ndekọ nke ngalaba NCDC wepụtara si kwuo.

    O gosiri na mmadụ narị abụọ na iri na atọ bụ ndị butere ya bụ ọrịa n'ụbọchị Fraịde.

    Cheta na izu ole na ole gara aga, ọnụọgụgụ ndị butere ya bụ ọrịa gbada ruru ihe pekarịrị otu narị.

    N'agbanyeghi nke a, onyeisi ngalaba ahụ bụ Chike Ihekweazu adọọla aka na ntị ka ndị mmadụ gba mbọ na-echekwa onwe ha n'ihi na ọrịa ahụ anabeghi ka e si chee.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  2. Unu anọ ya eh?

    Unu abọọla chi?

    Anyị ji n'aka na unu na-eme ọfụma.

    Sonyere nụ anyị n'ụbọchị taa maka akụkọ niile dị mkpa gbasara coronavirus dịka o si kwụrụ n'ụwa ugbua.

    Yagazie!

  3. Ndewo nụ

    Ụmụ ibe, daalụnụ maka isonyere anyị taa.

    Echi ga-aka mma.

    Ya gazie.

  4. Coronavirus bụ ihe mgbaama na Chineke na-ewere ụwa iwe - Aisha Buhari

    Aisha Buhari

    Ebe foto si, Instagram/Aisha Buhari

    Nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Aisha Buhari ekwuola na ọrịa coronavirus bụ ihe ọgbụgba ama na-egosi na Chineke na-ewere ụwa iwe.

    Dịka ndị ntaakụkọ 'News Agency of Nigeria' (Nan) si depụta, Aisha kwuru nke a n'ofufenru pụrụ iche nke ndị ụka alakụba iji malite emume afọ iri isii Naịjirịa ji nwere onwe ya n'aka mba Briten.

    Ọ kwuru sị: "Ụwa a adịkwaghị etu ọ dịbu na mbụ n'ihi mgbasa ọrịa coronavirus. Nke a gosiri na obi adịghị Chineke mma n'ebe anyị no."

    "Anyị kwesịrị ikpesi ekpere ike ma rịọ Chineke mgbaghara."

    "O nweghị ụzọ ọzọ ka mma na-abụghị ịrọ Chukwu mgbaghara."

    Aisha gara n'ihu rịọ ụmụ Naịjirịa ka ha kwado mbọ nke onyeisiala Muhammadu Buhari na-agba iji mee ka ihe kara ụmụ Naịjirịa mma.

  5. Mmadụ 125 ọhụru butere coronavirus na Naịjirịa

    Ngalaba na-ahụ maka mbochi ọrịa bụ Nigerian Centre for Disease Control (NCDC) ekuwola na ọ bụ mmadụ 125 ka a hụrụ nje ahụ n'ahụ ha na Naịjirịa n'ụbọchị Tọọzde.

    Nke a butere ọnọ ọgụgụ ndị buterela ọrịa a na Naịjirịa mmadụ 57849.

    N'ime ndị a, mmadụ 49098 agbakeela ma laa be ha ebe mmadụ 1102 lara mụọ siti n'ọrịa a.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  6. Unu apụtala ụra?

    Onye tetara ụra kelee Chi ya.

    Daalụnụ maka isonye anyị n'ụtụtụ a.

    Ụbọchị taa ga-ewetara anyị ihe ọma, Iseeee.

    Nọnyere anyị dịka anyị na-ewetara unu akụkọ ga-amasị unu taa.

    Nnọọ.

  7. Ka chi bọọ

    Ụmụ Igbo, anyị abịala n'isi njedebe nke mgbasaozi nke taa.

    Daalụ maka isontere anyị.

    Rahụ jụụ.

  8. Nkeji Coronavirus

  9. Imo ehigharịala mgbape ụlọakwụkwọ, Machie ndị ọrụ 'task force' niile

    Hope Uzodinma

    Ebe foto si, Hope Uzodinma/Facebook

    Gọọmenti Imo steeti enyeela ntuziaka maka nhigharị mgbape ụlọakwụkwọ na steetti ahụ ganye oge a ga-emecha nnyocha maka coronavirus na sokpuruọchịchị 27 dị na steeti ahu.

    Nke a bụ mkpebi gọọmenti nwere ka Gọvanọ Hope Uzodinma na ndị imeobi mechara ọgbakọ ụbọchị Wenezde.

    Gọvanọ nọkwara n' ọgbakọ ahụ machie ndị ọrụ 'task force' niile no na steeti ahụ sị na ha aghọọla nnukwu nsogbu nye gọọmenti na ndị Imo.

    N'ozi nke ọnụ na-ekwuru gọvanọ Uzodinma bụ Oguwike Nwachukwu binyere aka, o kwuru na ndị a machiri gụnyere; like 'Owerri Capital Development Authority (OCDA) Task Force, 'Emblem collection Task Force', nakwa 'Revenue Task Forces'.

  10. Ndị nọọsị akwụsịla abụbụọrụ na mba Ghana

    Ndị nọosị mba Gana akwụsịla abụbụọrụ ha gbara dịka gọọmentị kwere ha nkwa imezu ihe ha chọrọ n’ime otu ọnwa.

    Ha jụburu ịrụ ọrụ kemgbe Mọnde, maọbụghị ma gọọmentị etinyekwuru ha ego ụgwọ ụlọ na ụgwọ njem.

    Mara na abụbụọrụ a ha gbara mere ka ọtụtụ ndị bu ọrịa gụnyere coronavirus tọkịrị n'ụlọọgwụ dị iche iche na mba ahụ na-anataghị nlekọta, dịka e kwuru na ndị mmadụ na-anwụkwa ebe ahụ.

  11. Izrel ga-emechi ụlọọrụ nrụpụta ha izu abụọ n'ihi coronavirus

    Izrel ekwuola na a ga-emechi ụlọọrụ nrụpụta niile dị na mba ahụ kpam kpam maka iji lụso coronavirus agha.

    Mana ha kwuru na naanị ndị nke a ga-ahapụ ka ha na-arụ ọrụ bụ ndị nke dị oke mkpa maka nrụpụta ihe ndị e ji alụso COVID-19 agha.

  12. A chọtala coronavirus n'ahụ mmadụ 111 ọzọ na Naịjirịa

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjiria bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) wepụtara ọnụọgụgụ mmadụ 111 bụ ndị ọhụrụ a chọtara ọrịa coronavirus n'ahụ ha.

    Na Legos ka a kacha hụ ndị bu ya bụ ọrịa dịka mmadụ 31 butere ya, ebe ọ bụ mmadụ atọ ka a hụrụ ya n'ahụ ha n'Imo steeti.

    Ka o sila dị, mmadụ 149 ọzọ agbakekwuola n'ute ọrịa a n'etiti Tuzde na Wenezde.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  13. Ụtụtụ ọma ụmụ Igbo

    Anyị ji anya ọma na-anabata unu n'ụtụtu a.

    Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị ịkọ oge niile.

    Nnọọ.

  14. Akụkọ coronavirus n'otu nkeji

  15. Enugwu steeti ga-amalite agụmakwụkwọ n'izuụka na-abịa

    Enugu

    Ebe foto si, Enugu State

    Gọọmentị Enugwu steeti ekwupụtala na ụlọakwụkwọ praịmarị na sekọndịrị niile dị na steeti ahụ ga-amalite ọzọ n'ụbọchị Mọnde, abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Sepụtemba afọ 2020.

    Kọmishọna agụmakwụkwọ na steeti ahụ bụ Ọkammụta Uche Eze kwupụtara nke a n'ụbọchị Wenezde.

    O kwuru na ọ bụ n'ọgbakọ nke gọọmentị na ndị na-elekọta ụlọakwụkwọ nwere ka a nọ kwekọrịta ka ụlọakwụkwọ mepee ọzọ.

    Eze kwuru sị: "Gọọmentị etinyela ihe niile dị mkpa iji hụ na ụmụakwụkwọ malitere akwụkwọ ọzọ n'atụghị egwu ọbụla."

    E kwubeghị mgbe ụlọakwụkwọ mahadum ga-amalite.

    Lee ihe onyonyo na-egosi etu agụmakwụkwọ ga-esi dị n'Enugwu steeti n'afọ a nakwa afọ na-abịa abịa.

    Atụmatụ agụmakwụkwọ n'Enugu State

    Ebe foto si, Enugu State

  16. Ụlọakwụkwọ ga-emepe na Delta steeti

    Patrick Ukah

    Ebe foto si, Facebook/DBS

    Nkọwa foto, Patrick Ukah, Kọmishọna agụmakwụkwọ na Delta steeti

    Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi nke Delta steeti enyela nkwado ka ụlọakwụkwọ praịmarị na sekọndịrị na steeti ahụ mepee.

    Dịka Kọmishọna agụmakwụkwọ bụ Patrick Ukah si kwuo, n'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Sepụtemba a kja ha ga-emepe.

    Ndị n'ọ n'ogogo praịmarị, ndị JS1 na JS2, nakwa SS1 na SS2 bụ ndị ga-amalite agụmakwụkwọ.

    Nke a bụ maka na ndị nọ n'ogogo JS3 na SS3 eburula ụzọ malite ma lee ule Waec nke ukwu na nke nta ha.

    Ndị nọ n'ụlọakwụkọ ọtaakara na ndị nọ bido na praịmarị 1 ruo praịmarị 3 ga-amalite akwụkwọ nke ha n'afọ 2021.

    Lee etu e si depụta ya n'akara Facebook nke ụlọọrụ ntaakụkọ gọọmentị Delta Steeti:

  17. Mmadụ 8777 ka bu ọrịa coronavirus na Naịjirịa

    Dịka ngalaba Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) si kwuo, a chọtara ọrịa coronavirus n'ahụ mmadụ 176 n'ụbọchị Tuzde.

    Nke a emeela ka ọ bụrụ mmadụ 8777 ka bu ya bụ ọrịa na Naịjirịa ugbua.

    NCDC kwukwara na mmadụ 48,836 agbakeela na ya bụ ọrịa na-anyụ mbaụwa anya.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  18. Coronavirus egbuola ihe karịrị mmadụ 200,000 n'Amerịka

    Donald Trump

    Ebe foto si, Reuters

    Dịka mahadum Johns Hopkins si kwuo, ndị coronavirus gburula na mba Amerịka agafeela puku narị abụọ (200,000).

    Mmadụ ole a anwụọla n'ime ihe karịrị nde isii na ụma butere ọrịa a na mba ahụ kemgbe ọnwa Jenụwarị o selitere isi na mba ahụ.

    Ọzọ bụ na ọrịa a akpasiwekwala ike ọzọ n'ụfọdụ steeti gụnyere Nọt Dakota na Utah dị na mba ahụ.

    Onyeisiala mba ahụ bụ Donald Trump kwuru sị na ọ bụ "ihe mwute na mmadụ ole a anwụọla n'ọrịa a" ma kwuo na Chaịna "gaara akwụsị nje a".

    Ọ gakwara n'ihu kwuo na o sighi ya n'aka, na ọ bụrụ na Amerịka emeghi ihe ha mere mgbe ha mere ya, na "ihe ruru mmadụ nde abụọ maọbụ atọ gaara anwụ n'ọrịa a".

    Mara na mahadum Johns Hopkins malitere ịgụkọ ọnụọgụgụ ndị ọrịa a metụtara na mba Amerịka nakwa mbaụwa kemgbe ọrịa malitere inye nsogbu na Chaịna n'afọ gara aga.

  19. David Moyes na ndị ọgbabọọlụ ya abụọ ebutela coronavirus

    David Moyes

    Ebe foto si, Getty Images

    David Moyes bụ onye nchịkọta otu egwu West Ham United na ndị ọgbabọọlụ ya abụọ ebutela ọrịa coronavirus.

    Ndị ọgbabọọlụ abụọ ahụ a chọtara ọrịa a n'ahụ ha bụ Issa Diop na Josh Cullen.

    Ha n'ọgbọegwuregwu na-akwado maka izute Hull City n'asọmpi Iko Carabao mgbe ha natara ozi na a chọtara ọrịa a n'ahụ ha; ha pụwara ozugbo ma laghachi n'ụlọ.

    Ndị West Ham ziputere ozi kwuru na ọrịa a anaghị egosi n'ahụ ha, mana ha ga-anọ na ndopu n'ụlọ ruo izu abụọ.

  20. Ndewonụ ndị Igbo

    Ya gaziere onye ukwu na onye nta taa.

    Sonye BBCIgbo.com ka ị mara nke ekwe na-akụ n'akụkọ ụwa.