Ọnụọgụgụ ndị butere coronavirus arịala elu ọzọ
Ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa coronavirus arịala elu ọzọ dịka ndekọ nke ngalaba NCDC wepụtara si kwuo.
O gosiri na mmadụ narị abụọ na iri na atọ bụ ndị butere ya bụ ọrịa n'ụbọchị Fraịde.
Cheta na izu ole na ole gara aga, ọnụọgụgụ ndị butere ya bụ ọrịa gbada ruru ihe pekarịrị otu narị.
N'agbanyeghi nke a, onyeisi ngalaba ahụ bụ Chike Ihekweazu adọọla aka na ntị ka ndị mmadụ gba mbọ na-echekwa onwe ha n'ihi na ọrịa ahụ anabeghi ka e si chee.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post







