Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Coronavirus egbuola ihe karịrị mmadụ 80,000 na India

    Akụkọ si mba India apụta na-akọwa na ihe karịrị mmadụ puku iri asatọ anwụọla site n'ọrịa coronavirus.

    Nke a ga-eme na mba India bụ mba atọ n'ụwa niile ebe ọrịa kachasị gbuo ndị mmadụ ugbua n'azụ mba Amerịka nakwa Brazil

    N'otu aka ahụ ndị butere ọrịa jisike eru nde ise ebe ndị ọkachamara na-ekwu na ọnụọgụgụ a abụghị nke ezigbo ya n'ihi na ọ bụghị mmadụ niile ka a na-enyocha.

    Onye a na-eme nyocha

    Ebe foto si, Reuters

  2. Mba UAE enyela ndị ọrụ ahụike ọgwụ mgbochi gbatagbata maka coronavirus

    Gọọmentị mba UAE enyela ikike gbatagbata ka ekesaa ndị ọrụ ahụike ọgwụ mgbochi coronavirus.

    Nyocha nke ugboro atọ n'ọgwụ mgbochi ahụ malietre n'ọnwa Julai mana emechabeghi ya rue ugbua.

    "Ndị ga-enweta ọgwụ a ga-abụ ndị ọrụ ahụike anyị bu ndị ọrịa kachasị nweike ịfee" ka ha kọwara n'akara Twitter ha.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  3. Mmadụ 132 butere coronavirus n'ụbọchị Monde na Naịjirịa

    Ọnụọgụgụ nke NCDC wepụtara gosiri na ọ bụ mmadụ 132 butere coronavirus na Naịjirịa dịka emechara nyocha.

    Legọs ka bụ steeti ebe ọrịa a kachasị dị etu ọnụọgụgụ gosiri.

    O gosikwara na ọ bụ naanị otu onye nwụrụ n'ime otu ụbọchị kemgbe abalị abụọ gara aga.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  4. Igbo mma mma nụ ooo!

    Unu abọọla n'ụbọchị taa? Biko buru oche gị bịa sonyere anyị maka akụkọ banyere coronavirus.

  5. Daalụ maka isonye anyị taa

    Ka chi foonu Ụmụ Igbo.

    Nọnyekwara anyị echi maka akụkọ ndị ga-amasị gị ịkọ.

  6. Ndị na-ebu ozu agbaala arụkwaghịm na Saụt Afrịka

    Ụgbọala e ji ebu mmadụ aga ụlọọgwụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Na mba Saụt Afrịka, ihe karịrị ndị na-ebu ozu puku atọ abanyela abụbụọrụ n’ihi akwụghị ha ezigbo ụgwọ nakwa ọnọdụ ha ji arụ ọrụ.

    N’ihi nke a, ha ajụla isi n’ụlọ nakwa n’ụlọọgwụ buru ozu, dịka ha na-akpọku gọọmentị ka e nye ha ego iti aka n’obi maka mkpamkpa covid-19 na-akpa.

  7. Mbaụwa keenu nkwụcha maka ọrịa ọzọ nwereike iselite isi n'ọdịnihu - WHO

    Tedros Gebreyesus

    Ebe foto si, Twitter/TedrosGebreyesus

    Ngalaba na-ahụ maka ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) akpọọla oku ka mba ndị dị n’ụwa tụpụta atụmatụ ga-anọte aka maka nchekwa ahụike na mba ha.

    Tederos Gebreyesus bụ onyeisi ngalaba a kwuru na Covid-19 agaghị abụ ọrịa ikpeazụ ga-etinye ụwa na gbagharịa etu a, ma kwuo na mbaụwa kwesịrị ike nkwụcha maka ụdịrị ọrịa n’ọdịnihu.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2

    End of X post, 2

  8. Gee akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa

  9. Mba Izrel amachiela obodo ọzọ maka coronavirus

    Mba Izrel na-akwado ịmachi obodo ha nke ugboro atọ iji belata mfesa ọrịa coronavirus.

    Ha mere mkpebia a dịka ihe ruru puku anọ na-ebute ọrịa ahụ na mba ha kwa ụbọchị dịka Praịm Minista ha bụ Benjamin Netanyahu si kwuo.

    Mmachi obodo ahụ ga-ebido n'ụbọchị Fraịde izu a ma norue izu atọ.

    Onye Izrel na-eme nyocha ọrịa coronavirus

    Ebe foto si, EPA

  10. Naanị mmadụ 79 butere coronavirus n'ụbọchị ụka

    Iri asaa na itoolu bụ ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa coronavirus na Naịjirịa ụnyaahụ dịka ngalaba Nigeria Centre for Disease Controlsi kwuo.

    Nke a ga-eme ya ọnụọgụgụ kachasị dị ala edekọrọ na Naịjirịa kemgbe ọnwa ole na ole gara aga.

    N'agbanyeghị nke a, ihe karịrị mmadụ otu puku anwụọla site n'ọrịa a.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  11. Ụtụtụ ọma ụmụ Igbo

    Gbado anya ebe a maka akụkọ dị mkpa metụtara coronavirus na mpaghara ụwa niile.

    Kedụ ekpere ịnwere onwe gị n'izu a? Ọ ga-abịa na mmezu

    Ndewonu

  12. Daalụ maka ịnọnyere anyị taa

    Izu ọhụrụ a ga-amịtara gị mkpụrụ ọma, Isee!

    Ka chi foo.

  13. Ihe karịrị mmadụ 10,000 butere coronavirus n'otu ụbọchị na France

    Onye a na-eme nnyocha

    Ebe foto si, Reuters

    A chọtara ọrịa coronavirus n’ahụ mmadụ puku iri na ụma ọhụrụ na mba Frans n’ụbọchị Satọde.

    Nke a na-abịa dịka ndị ọrụ ahụike na-adọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha jiri nwayọ na-agbakọ n’ihi na ọrịa a ka na-akpa mkpamkpa.

  14. Naanị ndị JSS3 na SS2 ga-emepe na Septemba 21 - Gọọmentị Legọs

    Ụmụakwụkwọ

    Ebe foto si, Lagos min of Education/Twitter

    Gọọmentị Legọs steeti ekwuola na ọ bụ naanị ndị nọ na klaasị JSS3 na SS2 ka a ga-ekwe laghachị gaa mepee akwụkwọ n'ụbọchị 21 nke Septemba.

    Folashade Adefisayo bụ Kọmishọna Agụmakwụkwọ nke steeti ahụ, kwuputere nke a site n'ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Kayode Abayomi, onyeisi ngalaba na-ahụ maka mmekọrịta ministrị agụmakwụkwọ na ndị mmadụ.

    Ha kwuru na Legọs ga-eji nwayọ nwayọ na-emepe ụlọakwụkwọ ọkachasị maka nke afọ 2020/2021, dịka a na-agba mbọ ịhụ na ha mezuru ihe niile iwu nchekwa Covid-19 kwuru.

    Ọ gara n'ihu kwuo "Ndị nọ na JSS3 ugbua na ndị SS2 ga-amalite akwụkwọ n'ụbọchị Mọnde bụ 21 nke ọnwa Septemba 2020.

    "Mmepe a ga-enye ndị Jss3 ohere ikwado maka ule "Basic Education Certificate Examination" nke Lagos State Examination Board (LSEB) na-ahazi, bụ nke a ga-ele site n'ụbọchị isii ruo ụbọchị 12 nke ọnwa Ọktoba.

    "Ọ ga-enyerekwa ndị nọ SS2 ugbua aka ikwado ọfụma maka ịbanye SS3. A ka ga-akpọpụta oge a ga-ele ule maka ịbanye na Model Kọleji nke Legọs steeti n'oge adịghị anya."

  15. A huru coronavirus n'ahụ mmadụ 160 ohuru a na Naịjirịa

    Otu narị na iri isii bụ ọnụọgụgụ ndị a chọpụtara nje coronavirus n’ahụ ha n’ụbọchị satọde, dịka ngalaba National Centre for Disease Control si gụpụta.

    Na mpaghara ọwụwa anyanwụ, naanị otu onye butere ọrịa a n'Abia steeti mana mmadụ iri atọ butere ya bụ ọrịa na Legọsị.

    Lee ka ha si depụta ya:

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  16. Ndewonu ụmụ Igbo

    Anyị amalitela iwetere ụnụ akụkọ niile gbara ọkpụrụkpụ maka coronavirus.

    Chee aka ghọrọ ya!

  17. Ka chi foo

    I mere nke ọma wee nọnyere anyị taa.

    Ka ebumnobi gị niile mezuoro gị dịka ị si chọọ, Iseee!

    Ka chi foo!

  18. Mahadum Oxford ga-amalitekwa ịchọ ọgwụ mgbochi covid-19 ọzọ

    Onye na-eme nnyocha

    Ebe foto si, Reuters

    AstraZeneca na Mahadum Oxford ga-amalite ịchọ ọgwụ mgbochi Covid-19 ọzọ n'agbanyeghi na a kwụsịburu ya ka ahụ otu onye na-arịa ya bụ ọrịa na mba Briten anabataghị ya.

    N'ụbọchị Tuzde gara aga, AstraZeneca kwuburu na ha ga-akwụsịtụ ịchọ ọgwụ mgbochi a, ka ha nwee ike ime nchọpụta mara ma ọ bụ ọgwụ mgbochi ahụ metụtara onye ahụ e nyere ya.

    Mana n'ụbọchị Satọdee, mahadum ahụ kwuru na a gwala ha gaa n'iwu mara ma ya bụ ọgwụ mgbochi ọ ga-enwe isi.

    Matt Hancock bụ onye na-ahụ maka ahụike mba Briten nabatara ozi na a ga-amalitekwa ịchọ ọgwụ mgbochi a.

    O kwuru sị "Nkwụsịtụ a gosiri na nchekwa dị anyị oke mkpa. Anyị ga-akwado ndị ọkammụta sayensị anyị iji hụ na ha chọtara ọgwụ mgbochi na-arụ ọrụ ọfụma, n'oge adịghị anya.

    Mahadum ahụ na onwe ha kwuru na ọ bụ ihe a tụwara anya na ụfọdụ ndị a ga-anwa ọgwụ mgbochi a n'ahụ ha agaghị anabata ya, ọkachasị n'ụdịrị nwale dịka nke a.

  19. Nwa Eze mba Spain abanyela na nnọsapụ maka coronavirus

    Princess Lenore

    Ebe foto si, Reuters

    Adaeze Lenore bụ onye ga-erite oche eze mba Spen ma nne na nna ya anọghịzị, abanyela na nnọsapụ dịka otu nwata akwụkwọ ibe ya butere ọrịa coronavirus, dịka ezinaụlọ ya si kwuo.

    A ga-enyocha nwatakịrị ahụ dị afọ 14 bụ nwa Eze Felipe na-achị Spen, dịka e nyochara ụmụakwụkwọ ibe ya, n'ụlọakwụkwọ ha bụ Santa María de los Rosales dị n'obodo Madrid.

    Ezinaụlọ eze kwuru na Eze Felipe na Ezenwaanyị Letizia ga na-arụ ọrụ ha, n'agbanyeghi na Spen na-agba mbọ ibuso coronavirus agha.

    Mara na ihe ruru ụmụakwụkwọ nde asatọ laghachịrị akwụkwọ na mba ahụ n'izu gara aga, mana ụfọdụ ụlọakwụkwọ emechiela ọzọ dịka a chọtara ọrịa coronavirus n'ahụ ụfọdụ ụmụakwụkwọ.

    A chọtara coronavirus n'ahụ mmadụ 4,708 ọhụrụ n'ụbọchị Fraịde, nke butere ngụkọta mmadụ ole buterela ọrịa a na mba ahụ ruo 566,326, nke bụ ọnụọgụgụ kacha na mpaghara Yurop.

    N'otu aka ahụ, ọ taala isi mmadụ 29,747 na mba ahụ.

  20. Ka ọ dị nu echi oo

    Anyi ji ekele na-asị unu emeela maka isonye anyị taa.