Ụlọikpe dị n'Abuja adaala Naira Marley nha N200,000
Dịka a kpọpụrụ otiegwu a ma dịka Naira Marley ụlọikpe maka ida iwu covid-19, a daala ya nha ruru puku narị naịra abụọ (N200,000).
Ụlọikpe ahụ dị n'Abuja kpebiri na Marley onye ezigbo aha ya bụ Afeez Fashola, dara iwu oge o si Legọs fee n'ụgbọelu gaa Jabi Lake Mall dị n'Abuja ime emume n'ụbọchị 13 nke ọnwa Juun, n'agbanyeghi na gọọmentị tinyere iwu mmachi ime njem.
Ụlọikpe kwukwara na ọ ga-edepụta ozi ịrịọ mgbaghara n'elu otu akwụkwọ ozi ndị ntaakụkọ ama ama.
Nke a na-abịa dịka ụlọikpe dị na Legos dakwara ya na onye nhazi ya nha ịkwụ otu puku narị naịra (N100,000) maka ịda otu iwu a.
Cheta na Naira Marley ji ụgbọelu e mechara chọpụta na ọ bụ otu ọkaikpe ka a haziri ya, mee ya bụ njem.