Ndeewo
Ka ụbọchị taa mụtara anyị ihe ọma
Iseee!
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.
Ka ụbọchị taa mụtara anyị ihe ọma
Iseee!
Echi ga-abụ echi ọma...Rahụ nụ duu.
Ụlọọrụ na-ahụ maka ndị Naịjirịa nọ na mba ofesi, a kpọrọ Nigerians in Diaspora Commission (NIDCOM), ekwupụtala na ụmụagbọghọ 68 tọrọ atọ na mba Lebanon alọghachila Naịjirịa.
Ọ bụ mgbe o ji ọkara agafee elekere atọ nke ehihie Sọnde ka ụgbọelu bu ha tụrụ ụkwụ n'ọdọụgbọelu dị n'Abuja.
Ngalaba ahụ kelere onye nnọchite anya mba Lebanon na Naịjirịa bụ Houssam Diab maka mbọ ọ gbara ịhụ na ụmụagbọghọ ndị ahụ lọtara.
Ndị a lọtara ga-ewepu onwe ha iche abalị iri na anọ dịka iwu si kwuo iji mata ma ha nwere ọrịa coronavirus tupu a hapụ ha ka ha lakwuru ezinụlọ ha.
Cheta na izuụka olemole gara aga ka ihe onyonyo pụtara na soshal midia ebe ụmụagbọghọ na-ebe akwa na-arịọ gọọmentị ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka na mba Lebanon ebe e ji ha dịka ohu.
Aka na-chị Dubai ebunyela mba Naịjiria na Sudan ọgwụ na ihe nri maka ibuso orịa coronavirus agha.
Ụlọọrụ mgbasa ozi mba ahụ depụtara n'akara twitter ha na Sheikh Mohammed bin Rashid Al Maktoum kwuru ka e mee nke a.
Naịjirịa ekwuputebeghị na ha enwetela ya bụ maọbụ mgbe ha na-atụ anya ọ ga-abata.
Cheta n'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Ọgọstụ, ka gọọmenti mba US nyere Naịjịrịa igwe na-enye ikuku ruru narị abụ ọ ha ga-eji buso ọrịa coronavirus agha.
N'aka ọzọ, ụmụ Naịjirịa ruru nari otu na asaa si United Arab Emirates bata Naịjirịa n'ubọchị Satọde iri ise nke ọnwa Ọgọstụ.
Nnọọ nụ na peeji anyị taa.
Anyị ga-ewetara unu akụkọ niile dị mkpa maka coronavirus taa.
Nọnyerenụ anyị.
Onye na-eme ihe ejije a ma ama na Naijirịa bụ Omotola Jalade-Ekeinde edepụtala n'akara Instagram ya na ọ butere ọrịa coronavirus.
O gwara ndị na-eso ya na ihe mere na ha anụbeghị maka ya bụ maka na ọ na-anata ọgwụgwụ maka coronavirus.
O kwuru na ọ na-enweta onwe ya nwayọ nwayọ.
Omotola kwukwara na obi dara ya mba mgbe o nụrụ akụko etu ụgbọala bu kọntena si adagbu ndị ntoroobia na Legọs steeti.
Ngalaba ahụike nke mba Rọshịa ekwuola na ha amalitela nrụpụta ọgwụ mgbochi ọhụrụ maka ọrịa coronavirus.
N'akwụkọ ozi ha wepụtara, ha kwuru na ha ga-ebido ịre ya na ngwụcha ọnwa ọzọ na-abịa.
Mana ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ahụike na-atụ ụjọ n'ihi na ha cheere na ngwa ngwa a na-emepụta ọgwụ a nwereike ịbụ na enyochaghị ya ọfụma.
Ndị uweojii mba Saụt Afrịka ekwuola na mpụ na ohi ji pasemtị iri anọ datuo n'ime ọnwa atọ emere mmachi obodo n'ihi coronavirus.
Ha kwukwara na ihe nyere ya aka ịdatu bụ mmachi mmanya ike na mba ahụ site n'ọnwa April rue ọnwa Juun.
Mpụ ndị daturu gụnyere ịwakpo nwaanyị n'ike nakwa isunye ụlọ mmadụ maọbụ ụlọahịa mmadụ ọkụ.
Dịka ọ dị ugbua, ihe ruru mmadụ puku narị ise ebutela ọrịa ahụ ebe ihe ruru puku iri na ise anwụọla site na ya bụ ọrịa na mba Sawụt Afrịka.
Ngalaba na-ahụ maka mgbochi na mfesa ọrịa Bekee kpọrọ "Nigerian Centre for Disease Control" ekwuola na a hụrụ nje coronavirus n'ahụ mmadụ 329 ọhụrụ na Naịjirịa.
Nke a wetere ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa ahụ 48445.
N'ime ndị a, 35998 agbakeela ma laa be ha ebe mmadụ 973 lala mụọ site n'ọrịa a.
Ndewo nụ na peeji anyị taa.
Eji m n'aka na unu ga-enweta akụkọ niile dị mkpa gbasara coronavirus n'aka anyị taa.
Mba asaa na Afrịka amalitela ime inyocha ọbara ndị rịachara coronavirus maka ebumnuche na e nwereike nwete ọgwụgwọ na ya.
Ọ bụ ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ nke Bekee kpọrọ "Africa Centre for Disease Control and Prevention" kwuru ihe a ma sịkwa na nnyocha a bu ohere iji mata etu ọrịa a si fesaa n'Afrịka.
John Nkengasong bụ onyeisi Africa CDC sị: "Liberia, Sierra Leone, Zambia, Zimbabwe, Cameroon, Nigeria, Morocco bụ mba mbụ kwenyere ime ihe a."
Ọ sị na Afrịka emeela nyocha nde 9.4 ruo ugbua, nke na-abịa nso na nyocha nde iri ha chọrọ ime.
Dọkịta Nkengason si na Afrịka na-agba mbọ ịrụpụta ọgwụ mgbochi covid-19.
Ọ sị na ha na-ahazi usoro eji ehibe nyocha ọgwụ mgbochi a na-arụ tupu amalite iwete ego eji eme ha.
Mmadụ 1,084,904 ebuterela coronavirus n'Afrịka dịka mgbakọ mahadum Johns Hopkins siri kwuo.
Gọọmentị Abịa steeti sị na ha ga-amalite usoro pụrụiche ịhụ na-ebelatara mfesa nje coronavirus na steeti ahụ.
N'ihi ya, gọọmentị steeti ahụ amalitela nnyocha ndị bu ya bụ nje n'ime obodo niile, ma rịọkwa ndị mmadụ ka ha pụta n'igwe maka nnyocha.
Ha sịkwa na ha ga-agba mbọ ịhụ na e zisara ozị banyere coronavirus n'obodo niile bụ nke ha ga-eme emume ya n'isi okpuruọchịchị Aba Saụt ụbọchị iri na itoolu, Wenezde, nke ọnwa Ọgụstụ 2020.
Gọomentị tiri mkpụ maka ndị kemist na-agwọ ndị nwere nje coronavirus, sị na nke ahụ ga-eme ka ya bụ nje fesaa karịa ka ọ dị ụgbụa.
Gọọmentị Abia steeti sị na ha ga-emere ndị kemist na ndị ọrụ na-akụ ọgwụ bụ 'Pharmacists' na Bekee ọzụzụ na Tọzde, ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Ọgụstụ 2020.
Ha sịkwa na ha ga-aga n'ihu n'usoro ndị ọzọ ha ji ebuso nje coronavirus agha.
1. Ahịa gana adịzị na Mọnde rụọ Satọde izuụka niile malite n'elekere asaa nke ụtụtụ ruo elekere ise nke mgbede, kwa ụbọchị.
2. Ndị ọbụla chọrọ ịme akwamozu maọbụ mmeme ọbụla kwesiri nata ikike n'aka TC Okpuruọchịchị obodo ha. Ezeobodo maọbụ ụkọchụkwụ ọbụla kwadoro emume na-anataghị ikike ga-aga zaa ajụjụ maka nke a.
3. Ndị nwere akwamozu ha ga-eme nwereike i me ya n'izuụka mbụ maọbụ nke atọ n'ime ọnwa, ụbọchị Tọzde, Fraịde nakwa Satọde.
4. Ụka ga na-emepe ụbọchị ụka niile, mana naanị mmadụ iri ise (50) kpuchiri ihu ga-anọ ebe ahụ.
5. Ụlọ oriri na nkwarị ga-emehe mana ndị nọ ebe ahụ ga-anọpụ iche dịka iwu coronavirus kwuru.
6. Ọnọdụ onye apụla n'abalị ka dịkwa ire site n'elekere iri abalị ruo elekere isii nke ụtụtụ.
Ha kpokukwara ndị ọrụ nchekwa ka ha tachie eze maka onye ọbụla ga-ada iwu gbasara agha coronavirus na steeti ahụ.
7. O nweghị emume omenala a ga-eme n'Abia steeti ruo mgbe gọomentị kwuru.
Onye tinyere aka na ya bụ akwụkwọ bụ odeakwụkwọ steeti ahụ nakwa onyeisioche ndị kọmiti maka agha coronavirus bụ Chris Ezem.
Ụlọọrụ na ahụ maka mgbochị na nfesa nje bụ NCDC ahụla nje coronavirus n'ahụ mmadụ dị narị atọ iri asaa na atọ (373) ọhụrụ na Naịjirịa ụnyaahụ bụ Tọzde.
N'ime ndị a, Abịa ji iri na anọ (14), Imo itoolu, (9), Enugu asaa (7), ebe Delta ji naanị ise (5).
Nke a wetere ọnụọgụ ndị niile bu nje a na Naịjịra na puku iri anọ na asatọ, otu narị na iri na otu (48,116). Mmadụ puku iri atọ na anọ, narị atọ na itoolu agbakeela n'ọrịa ebe mmadụ narị itoolu na iri isii na isii nwụrụ anwụ.
WHO kwuru n' Afrịka agbalịa n'ọgụ COVID-19 kemgbe ọnwa isii ọ batara.
Ọtụtụ mba dị n' Afrịka, mmachị ngagharị, na ntụziaka ahụike maka mgbochi nkesa coronavirus.
Ugbua mba enwela ike ime nnyocha maka dịka ebe iri na anọ n'ime ha na-emeli mmadụ 100, n'ime ọnmụọgụgụ mmadụ dị 10 000.
Ha kwuru etu nje ahụ si mụba rinne n'izu abụọ maọbụ atọ na mpagahara ndị ọcha, na omeghị etu a n'Afrịka.
Kama ihe na-eme n'otu mba dị iche na nke na eme n'ebe ndị ọzọ.
Otu jikọrọ ndị ọnụ na-eru n’okwu nke gọọmentị etiti bụ Federal Executive Council (FEC) ebinyela aka n’akwụkwọ ka e nye ndị Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ijeri naịra asatọ na ụma maka ịzụta akụrụngwa e ji enyocha maka ọrịa coronavirus.
Ha mere mkpebi a na nzukọ ha mere n'ụbọchị Wenezde, n'elu ịntanetị nke onyeisiala Muhammadu Buhari chịkọtara.
Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) wepụtara ọnụọgụgụ mmadụ narị anọ na iri ise na atọ (453) ọhụrụ bụ ndị ha chọtara ọrịa covid-19 n'ahụ ha.
N'ime mmadụ ole ahụ, Legọs ka a kacha nwee ndị butere ya, dịka a hụrụ ya n'ahụ mmadụ otu narị na iri atọ (113) ọhụrụ.
Steeti ndị si mpaghara ọwụwa-anyanwụ ebe a chọtara ya n'ahụ ndị mmadụ ọhụrụ gụnyere Enugwu (55), Ebonyi (20), nakwa Delta (8).
Kemgbe ọrịa a selitere isi na Naịjiria n'ọnwa Maachị, ọ taala isi mmadụ 956.
Ndụ mmiri, ndụ azụ, ọ ga-adịrị gị na mma.
Iseeee!
Nọnyere anyị taa ka ị nweta akụkọ niile dị mkpa metụtara mkpamkpa ọrịa coronavirus na-akpa n'ụwa.
Ndeewo!