You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. O meela ọnwa isii coronavirus batara Afrịka

  2. Ihe Ụmụ Igbo na-ekwu maka Amotekun

    Ụfọdụ ụmụ Igbo ji akpịrị elegara mpụta n' ọzụzụ ndị mbụ e were n'ọrụ Amotekun bụ nchekwa obodo dị ga n'Ọdịda-Anyanwụ Naijiria nke e mere ụbọchị Wenezde.

    Ha kwuru na ọ bụ ndị Ọdịda-Anyanwụ bụ ndị ji ọgwụ nsogbu nchekwa na-na-eche mpaghar dị iche iche na Naijiria.

    Emeka Ọpara kwuru na 'anyaọkụ egbuola m' ya maka nhibe ndị Yoroba hiwere Amotekun.

    N'ozi ya n'ọgbakọ maka mpụta ndị Amotekun, Rotimi Akeredolu bụ aka na-achị Ondo steeti gwara ha n'ọrụ ha abụghị otu nchekwa ya na ndị ọrụchekwa Naijiria ga na-akụk ọ isi kama ha ga-akwado ihe ndị ọrụ nckwa obodo dịbu adị.

  3. Coronavirus adịghị m n'ahụ - Hage Geingob

    Onyeisiala mba Namibia bụ Hage Geingob ekwuola na ya ebughị ọrịa coronavirus.

    E nyochara ya ahụ ụnyaahụ, ebe o ji aka ya lwuputa mpụtara ya taa n'isiụlọọrụ gọọmentị ya.

    Nke a ga-eme ya ugboro abụọ a na-enyocha Geingob ahụ maka ọrịa a.

  4. Anambara ehiwela ụlọikpe na-agagharị agharị maka ịda iwu coronavirus

    Gọọmenti Anambara steeti ekwuola na ha ga-ewepụtara ndị niile na-ada iwu e tinyere maka igbochi nkesa ọrịa Covid-19 anya e ji anyụ nsị site n'ịkpụpụ ha ụlọikpe mee-ngwagwa.

    Willie Obiano bụ gọvanọ steeti ahụ kwuru na nke abụ n'ihi na ọtụtụ ndị mmadụ na-eme ka o si masị ha n'ịkwa ozu, agbamaọkwụ na mmemme ndị ọzọ na-agbasoghị ntụziaka e nyere ha maka igbochi nkesa ọrịa coronavairus

    Obiano, onye kwuru nke a n'ozi Kọmishọna mgbasaozi na steeti bụ Don Adinauba wepụtara, tiri iwu ọkụ nke kwuru na ịkwọ aka, iyi mkpuchi ihu, nakwa mmadụ ịnọpụrụ onye nọ ya nso bụzị maka onye ọbụla.

    Onye ọbụla nupụrụ isi, aga-akpụya ụlọikpe na-agagharị agarị ikpe ya ikpe.

  5. International Youth Day: United Nations etoola ndị ntorobịa maka ịkwụ chịm

    Dịka ọrịa coronavirus na-akpa ike n'ụwa, Odeakwụkwọ Ukwu otu United Naations bụ Antonio Guterres etoola ndị na-eto eto maka ikwusi ike na amagba mbọ n'ụzọ dị iche iche.

    N'ozi iji kelee ha n'ụbọchị ncheta ndị na-eto eto, Guterres sị

    " Ọ bụ ha ndị na-eto eto nna-alụ ọgụ maka ọnọdụ ihu igwe, ha na-alụ ọgụ megide ịkpa oke agburu na nwoke na nwaanyị inweta oke ruru onye."

    Ọ kpọrọ oku ka e bido na-agụnye ndị na-eto eto n'otu na ụlọọrụ ga.

  6. Etu ọtanisi mba UK ga-esi metụta gị?

  7. Geoffrey Onyeama agbakeela site n'ọrịa Coronavirus

    Minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ bụ Geoffrey Onyeama agbakeela site n'ọrịa Coronavirus.

    Onyeama, onye kwupụtara nke a n'akara Twitter ya n' ụbọchi Wenezde s, "Site n'amara Chukwu, nnyocha Covid-19 m mere na nsonso gosiri na m enweghịkwa nje a dịka e dopuru m iche izuụka atọ.

    Cheta na Onyeama, onye so na otu onyeisiala hiwere maka ọgụ coronavirus kwụpụtara n'abali iri an itoolu nke ọnwa Julai na ya ebutela ọrịa ahụ dịka akpịrịbidoro gbakawa ya

    Lee dịka Onyeama malitere ọrụ taa:

  8. Rọshịa ekwụọla na ọgwụ mgbochi coronavirus ha wepụtrara ga-abụ n'efu ka aga agba ya

    Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin ekwụọla na ha agaghị ana ego maka ndị chọrọ ịnwale ọgwụ mgbochi coronavirus ha mepụtara.

    Ọ sịkwa na ọnweghị onye a ga-amanye amanye maka ịgba ya bụ ogwụ.

    Otu n'ime ụmụ ya nwaanyị so nwalee ya bụ ọgwụ bụ nke ọ na-ekwusi ike na ọ gaghị enye nsogbu ọbụla n'ahụ.

    Putin na-etuọnụ maka ya bụ ike mba ya kpara site n'ịmepụta ọgwụ mgbochi coronavirus mbụ n'ụwa.

    O kwuru na Facebook ya, na ọ bụ Rọshịa mepụtara ọgwụ mgbochi ọrịa otoro, ọkpantụwụ, ụkwara ntịrịrị, arụrụbara na ọrịa ndị ọzọ dị oke njọ.

    Cheta na ndị ọrụ ịkụ ọgwụ na mba ụwa adọọla Rọshịa aka na ntị ka ha ghara ịwepụta ọgwụ a.

  9. UK abaala ọtanisi, nke mbụ n'afọ iri na otu

    Mba Briten abanyela ọnọdụ ọtanisi nke Bekee kpọrọ recession, nke mere ya mbụ n'ime afọ iri na otu (mgbe ikpeazụ bụ n'afọ 2009) ha na-ahụ onwe ha n’ọnọdụ a.

    Ha sị na ọ bụ mkpamkpa coronavirus na-enye mbaụwa nsogbu mere ka akụnaụba mba ha jiri ihe karịrị pasentị iri abụọ na ụma (20.4%) kụọ afọ n'ala, mgbe a tụnyere ya n'ọnwa atọ bidoro afọ 2020.

    Ihe dịka ịzụ ahịa maka ihe ndị e ji ebi n'ụlọ nakwa ụlọọrụ mmepụta kụrụ afọ n'ala.

    Ngalaba na-ahụ maka ngụkọta bụ National Statistics (ONS) nke mba ahụ, kwuru na akụnaụba obodo ahụ malitekwara ime ọfụma n'ọnwa Juun, mgbe gọọmentị malitere imepegharị obodo.

    Jonathan Athow, bụ osote onyeisi ngụkọta n'ihe gbasara akụnaụba kwuru sị "N'agbanyeghi nke a, ihe niile anyị mepụtara bụ gross domestic product (GDP) nke ọnwa Juun ka jikwa isii karịa ihe ọ bụ n'ọnwa Febrụwarị tupu ọrịa coronavirus a esepụta isi."

  10. Ahụla coronavirus na ahụ mmadụ 423 ọhụrụ na Naijirịa ụnyaahụ bụ Tuzde

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi na nfesa nje na Naịjirịa bụ Nigeria Centre for Desease Control (NCDC) hụrụ nje coronavirus n'ahụ mmadụ 423 ọhụrụ ụbọchị Tuzde.

    N'ime ndị a Abia chịtara iri na itoolu (19), Ebonyi iri na asatọ (18), Delta iri na asaa (17), Anambra iri na anọ (14), ebe Imo chịtara isii (6).

    Nke a wetere ọnụọgụ ndị bu nje a na Naịjirịa na puku iri anọ na asaa, narị abụọ na iri itoolu (47,290).

    Mmadụ puku iri atọ na atọ,narị isii na itoolu (33,609) agbakeela ebe ya bụ ọrịa tagoro isi mmadụ narị itoolo, iri ise na isii (956) na Naịjirịa.

  11. Unu asaala chi e! Ndụ mmiri, ndụ azụ, ndụ nwoke, ndụ nwaanyị, Taa bụ Orie. Ka Chukwu Okike gọzịere anyị ụbọchị taa. Iseee!

  12. Ụlọọrụ Toyota agbachiela ụlọọrụ ha n'Yuganda maka coronavirus

    Ụlọ na-arụpụta ụgbaọala bụ Toyota agbachiela ụlọọrụ ha dị n'isiobodo Yuganda bụ Kampala maka ọrịa coronavirus.

    Mmadụ atọ n'ime ndị na-arụrụ ha ọrụ butere ọrịa ahụ dịka nyocha gọọmentị mba ahụ mere si kwuo.

    Ụlọọrụ ahụ gwara ndị ọzọ ha gba mbọ dopu onwe ha iche n'ihe ruru abalị iri na anọ dịka iwu si debe.

    Dịka ọ dị ugbua, mmadụ otu ouku na narị abụọ na iri itoolu na asaa butere ọrịa ahụ na mba Yuganda.

  13. Amrịka enyela Naịjirịa 'ventilator' narị abụọ

    Mba amerịka enyela Naịjirịa igwe nkuume bekee kpọrọ ‘Ventilator’ ruru narị abụọ iji nye aka n’agha a na-ebuso ọrịa coronavirus.

    Ọ bụ onye nnọchite mba Amerịka na Naịjirịa aha ya bụ Mary Bert Leonard hafere ihe enyemaka ndị ahụ n’Abụja n’ụbọchị Tuzde.

    Cheta na onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwere Naịjirịa nkwa enyemaka ọnwa anọ gara aga.

    N'ọnwa Eprel, Trump kpọrọ Buhari n'ekwentị iji mara etu Naịjirịa si agba mbọ n'agha gbasara ọrịa coronavirus.

    N'oge ahụ, ndị bu ọrịa coronavirus na Naịjirịa dị naanrị otu puku narị atọ na iri atọ na asaa (1,337) mana ka ọ dị ugbua, ndị buterela ya bụ ọrịa akarịala mmadụ puku iri anọ na isii.

    Mana ndị gbakere na ya agafeela puku iri atọ na atọ.

  14. A ga-eli otiegwu, Majek Fashek na New York maka coronavirus

    Nke na-eru anyị ntị taa bụ na a ga elị otiegwu a ma ama bụ Majek Fashek n'obodo New York, mba Amerịka dịka nwa ya nwoke bụ Randy Fashek siri kwupụta.

    Randy kelere ndị niile kwadoro nna ya oge ọ dị ndụ, ma kwukwaa na ọ bụ n'ihi COVID-19 ka ha ji chọo ili nna ya n'ofesi.

    Ọ nwebeghị ụbọchị a kara maka olili ya, mana akụkọ na-ekwu na obi adịghị onye nlekọta Fashek bụ Omenka Uzoma Day mma maka ili ya bụ otiegwu n'ofesi.

    Uzoma kwukwara na ya na ezinaụlọ Majek ka na-etinye ọnụ na ya bụ okwu, na ya ka nwere olile anya na ihe ka nwereike ịgbanwe.

    Mana ogbo ya n'egwu bụ Orits Wiliki sị na ya ahụghị ihe dị njọ n'ili Majek n'ofesi, na ọ bụ ihe mere ede o ji bee nwịị.

    Makej Fashek bụ enye e ji egwu dịka ‘Prisoner of Conscience’ na ‘Send Down the Rain’ mara, nwụrụ mgbe ọ gbara afọ iri ise na asaa n'ọnwa Juun.

  15. Achọpụtara nje coronavirus n'ahụ mmadụ n'ahụ mmadụ 290 na Naịjirịa ụnyaahụ bụ Monde

    Ụlọọrụ na ahụ maka mgbochi na nfesa nje bụ Nigeria Centre for Desease Control, NCDC, ekwụọla na ha hụrụ nje coronavirus n'ahụ mmadụ dị narị abụọ na iri itoolu (290) na Naịjriịa ụnyaahụ bụ Monde.

    N'ime ndị a Enugwu ji mmadụ itoolu (9) ,ebe Imo ji mmadụ atọ (3) naanị.

    Nke a wetere ọnụụgụ ndị bu ya bụ nje na Naịjriịa mmadụ puku iri anọ na isii, narị asatọ, iri isii na asaa (46,867).

    N'ime ndị a, mmadụ puku iri atọ na atọ, narị atọ, iri anọ na isii (33,346) gbakegoro, ebe mmadụ narị itoolu na iri ise (950) nwugoro n'aka ya bụ ọrịa.

  16. Unu asaala chi e! Ndụ mmiri, ndụ azụ, Taa bụ Eke, Eke bụ Eke kere ụwa. Eke kere ụwa biko ketere anyị ihe ọma taa. Iseeee!

  17. Coronavirus emebeghi ka ike ya ha na Naịjirịa - PTF

    Ngalaba nke onyeisiala Naịjirịa kpokọbara maka mgbochi ọrịa coronavirus pụtara Presidential Task Force na Bekee ekwuola na ọnụọgụgụ coronavirus na Naịjirịa erubeghi ogo kachasị.

    Onye kwuru nke a bụ Boss Mustapha bụ onyeisi ngalaba a ma kwukwa na ọrịa ahụ nwereike ịmetụta okpuruọchịchị niile dị na Naịjirịa.

    "Ọnụọgụgụ pere mpe na-apụta n'abalị ole na ole gara aga abụghị ka ndị mmadụ chewe na ọrịa a alawala" ka o kwuru.

    O jikwa ohere ahụ gwa gọọmentị steeti, ndị isi ahụịke nakwa ndị ọrụ mgbochi ọrịa a ha tinye uchu n'ịhụ na ọrịa a kwụsịrị ifesa.

  18. Gee akụkọ ga-amasị gị n'otu nkeji

    Akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile

  19. Ndị Lebanon iwe na-ewe agbahapụla iwu niile gbasara covid-19

    Onyeisi ụlọọgwụ na-agwọ Covid-19 agwaala BBC na ọ doro ya anya na iwe ndị mmadụ na-ewe maka ọkụ gbara na Beirut emeela ka ha kwụsị ịdebe iwu covid-19 gọọmentị tinyere.

    "Anyị na-ahụ ndị mmadụ iwe na-ewe, ike gwụrụ" ka Firass Abiad bụ onyeisi ụlọọgwụ Mahadum Rafic Hariri kwuru

  20. Lekwa ụkọchukwu ji "chopsticks" ekesa oriri nsọ

    Otu ụkọchukwu na mba Ingland aha ya bụ Eileen Harrop ewepụtala ụzọ ọhụrụ o si ekenye ndị mmadụ oriri nsọ.

    O ji ihe Bekee kpọrọ "Chopsticks" bụkwa ngajị pụrụiche ndị mba Chaịna ji eri nri were ekesa oriri nsọ ma na-edebe kwa iwu kpuchiri covid-19 na mba ahụ.

    O kwuru na ọ chepụtara nke a iji nyere ndị ụka na-echekasị onwe ha aka ịnata oriri nsọ dị ha mkpa.

    Ụlọụka mba Ingland nyere iwu ka ndị ụkọchukwu nọ n'okpuru ya kesaa naanị achịcha bekee ma hapụ ịkesa mmanya dịka otu iwu ha nyere iji gbochi mfesa coronavirus n'ụka.

    "Ime ya etu a ga-enye ndị ụka m obi umeala ịnaara oriri nsọ n'ihi na o nweghi mmekọ mmadụ ọzọ dị na ya" ka Harrop kwuru.