N'ụbọchị 24 ọnwa Ọgọstụ ka ụlọọrụ Facebook kwupụtara na ọ ga-enye ndị azụmaahịa dị 781 na Naịjirịa ego enyemaka dị nde naịra 500 nke so na nde dọla 100, ha mawapụtara iji nyere mbaụwa aka n'ihi ihe isi ike nke ọrịa coronavirus butere.
Ha sị na nke a ga-eru ndị azụmaahịa obere ruru puku iri atọ na mba karịrị iri atọ n'ụwa bụ ndị ọrịa coronavirus a metụtara azụmaahịa ha karịsịa.
Ụlọọrụ ga-ahụ maka nkesa ego a bụ Deloitte na njikọ aka nke ndị FATE Foundation na Afrigrants. Ndị azụmaahịa uche ha dị n'iketa ego a ga-amalite idebanye aha ha n'ụbọchị 24 ọnwa Ọgọstụ maka ndị si na mpaghara North East, North West na South East ebe ndị si na South West, South-South na North Central ga-amalite n'ụbọchị 26 ọnwa Ọgọstụ.
Nyocha Facebook mere na nso nso a maka ndị azụmaahịa obere na Naịjirịa n'oge coronavirus a, gosiri na ihe karịrị 37% n'ime ha sị na ụkọ ego kọrọ ha.
"Anyị ma na ọ bụ azụmaahịa obere ndị a ji akụnaụba Naịjirịa, nsogbu Covid-19 akarịala nke ahụike ma banye na nke akụnaụba bụ nke metụtara azụmaahịa obere ndị a. Anyị na-aṅa ntị na nsogbu ha na-agabiga ugbua ma kpebie inyere ha aka n'oge ihe isi ike a" Nunu Ntshingila, bụ onyeisi Facebook na mpaghara Afrịka kwuru.